Isi 2
Ụmụ Mmadụ Hà Pụrụ Iweta Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Na-adịgide Adịgide?
1. Olee ajụjụ ndị ọ dị mkpa na anyị ga-ajụ, n’ihi gịnịkwa?
KA OLILEANYA wee nwee nzube, ọ ghaghị inwe ntọala n’ihe mere eme, n’eziokwu. Olileanya ụgha na-ekpu nnọọ ndị mmadụ ìsì n’ebe ihe mere eme dị. Ya mere, ọ dị anyị mkpa ịjụ, sị: Ànyị ghọtara nnọọ nke ọma otú nsogbu ahụ a na-aghaghị imeri iji weta ezi udo na ntụkwasị obi haruru? Ànyị matara oké ịdị ngwa nke ọnọdụ ahụ dịworo? Ọ̀ dị ihe àmà na-egosi na ihe ngwọta nke ụmụ mmadụ ga-ezu iji rụọ ọrụ a chọrọ maka nsogbu ndị a?
2, 3. (a) Gịnị mere ọchịchọ maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ji dị ọbụna oké ngwa karị taa? (b) Olee ihe ndị ọzọ na-eyi ndụ egwu n’elu ụwa?
2 Ruo ọtụtụ puku afọ ụmụ mmadụ achọọla udo na ntụkwasị obi na-adịgide adịgide, n’enweghị ihe ịga nke ọma. Ma ugbu a ọnọdụ ahụ dị oké ngwa karị n’ihi iyi egwu nke agha nuklia. Otu akụkọ si Canada dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ dịghị ihe dị ka onye ga-emeri n’agha nuklia n’ihi na ihe ga-esi na ya pụta ga-adị egwu nke na ndị lanarịrị ga-ekwosa ndị nwụrụ anwụ ekworo.”3 N’igosi ihe mere ọ ga-eji dị otu ahụ, Carl Sagan, bụ́ onye na-enyocha mbara igwe sịrị: “E nwere ugbu a ihe karịrị 50,000 ngwa agha nuklia, . . . nke zuru iji kpochapụ otu nde Hiroshima.” O kwukwara, sị: “Ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-ekpochapụ ọkà mmepeanya ụwa nile.”4
3 Tinyere nke a, ọtụtụ ihe egwu ndị ọzọ na-etinye ndụ n’elu ụwa n’ihe ize ndụ. Otu bụ mmetọ zuru ụwa ọnụ nke a na-emetọ ala, ikuku na mmiri. Ọzọ bụ ntiwapụ nke ụba mmadụ tinyere agụụ, ọrịa na ọgba aghara ọ na-akpata.
4. N’ụzọ dị aṅaa ka e siworo kọwaa ọnọdụ mmadụ taa?
4 Banyere ọtụtụ ihe egwu ndị ihe a kpọrọ mmadụ na-eche ihu ugbu a, òtù na-ahụ maka udo na Norway sịrị: “Ọnọdụ zuru ụwa ọnụ taa bụ nke jupụtara n’oké ọgba aghara n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’akụkụ nile nke ihe omume ụmụ mmadụ: akụ na ụba na mmekọrịta mmadụ na ibe ya, ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ibu agha, ihe ime mmụọ na omume ọma.” O kwukwara, sị: “Ime ihe ike na-amụba, ijikwa ike mere ngwa ọrụ nke iguzobe ụkpụrụ na mmekọrịta mba na mba agbasawo ebe nile. . . . Ịha nhata dị n’etiti udo na agha na-aghọ n’ụzọ ka ukwuu, ihe a na-ejighi n’aka.”5 Ebee ka ihe a na-eduga? Odeakwụkwọ ukwu nke òtù UN dọrọ aka ná ntị, sị: “Anyị nọ nso oké ihe ize ndụ nke ọnọdụ enweghị ọchịchị ọ bụla na mba nile.”6
À Ga-enwe Ụwa Agha Na-adịghị Na Ya Site ná Mgbalị Ụmụ Mmadụ?
5. Gịnị ka akụkọ ihe mere eme na-egosi banyere ike mmadụ nwere iweta agha ná njedebe?
5 Ọ̀ dị ihe mere a ga-eji kwere na ụmụ mmadụ pụrụ ime ka agha kwụsị? Dị ka akụkọ ihe mere eme na-egosi, e nwere nanị afọ ole na ole na-adịkọtaghị ọnụ mgbe ụwa a na-enweghị agha a na-alụ n’ime ya. N’ime narị afọ nke iri abụọ nke a nanị, e gbuola ihe ruru 100 nde mmadụ n’agha! Ma òtù League of Nations nke gara aga ma òtù United Nations nke ugbu a enwebeghị ike ịkwụsị mgbukpọ nke a.
6. Egwu maka agha nuklia ọ̀ bụ ezi ntọala maka udo?
6 Ma ọ̀ bụ na egwu nke mbibi site ná ngwa agha nuklia agaghị agbanwe nke a? Ọ̀ bụ na a kpalighị egwu zuru ezu maka ngwa agha nuklia laa azụ n’afọ 1945 mgbe mgbọ atọm kpochapụrụ obodo abụọ nke Japan? Ma, kemgbe ahụ nkwakọba nke ngwa agha nuklia ndị karịrị ike nke ukwuu amụbawo otu puku okpukpu. Nanịkwa kemgbe 1945, e gbuola ihe dị ka 35,000,000 ndị mmadụ n’agha na ná nnupụisi dị iche iche megide ọchịchị nke metụtara ihe karịrị otu narị mba. N’otu afọ na-adịbeghị anya, 45 mba dị iche iche nọ n’esemokwu!7 Ee e, egwu ngwa agha nuklia akwụsịbeghị agha.
7. À pụrụ inweta udo na-adịgide adịgide site n’ịbịanye aka n’akwụkwọ nkwụsị mkpụpụta ngwa agha na nke nkwekọrịta udo?
7 Ọ bụ eziokwu na mba dị iche iche na-abịanye aka n’akwụkwọ, ma eleghị anya ha ga-anọgide na-eme otú ahụ, maka ịkwụsị mkpụpụta ngwa agha ma ọ bụ nke nkwekọrịta maka udo. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, a bịanyela aka n’ọtụtụ puku akwụkwọ ndị a. Ma, mgbe ọ bụla echiche agha siri nnọọ ike, akwụkwọ nkwekọrịta ndị ahụ na-aghọ iberibe akwụkwọ na-abaghị uru. Òtù United Nations adawokwa n’ịkwụsị agha, n’ihi na n’agbanyeghị na ọ fọrọ nke nta ka mba nile taa bụrụ akụkụ òtù UN, ha na-ama ụma elefuru ya anya. N’ihi ya ọ̀ bara uru inwe olileanya na ndị ndú ụwa n’ọdịnihu ga-eme ihe ha kwuru karịa ka ndị bu ha ụzọ mere?
8. Olee otú Bible siworo kwuo eziokwu maka ọdịda mmadụ daworo iweta udo na-adịgide adịgide?
8 N’aka nke ọzọ, ihe Bible na-ekwu kwekọrọ n’ihe akụkọ mere eme na-akụzi. Ọ naghị agba anyị ume itinye olileanya anyị ná mgbalị nile nke ụmụ mmadụ iweta udo. N’ụzọ megidere nke ahụ, o kwuwo mgbe dị anya gara aga na mgbalị nile nke ụmụ mmadụ apụghị iweta udo na-adịgide adịgide ma ọlị. Ọ dọrọ aka ná ntị mgbe oge ya erubeghị na tupu ọgwụgwụ usoro ihe dị iche iche nke a, agha na ọgba aghara dị iche iche ga-akawanye njọ n’ụwa nile, ka ‘mba na-ebili megide mba na alaeze na-ebili megide alaeze ọzọ.’ (Luk 21:9, 10, 31; Mkpughe 6:1-4) Ihe ndị na-eme n’ụwa kemgbe 1914 na-emezu amụma ndị ahụ. Ya mere kama ịkpali olileanya ụgha, Bible na-ekwu n’eziokwu, sị: “Ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23.
Mmadụ Hà Pụrụ Imeri Ntiwapụ nke Mmụba Ụba Mmadụ?
9-11. (a) Ruo ókè ha aṅaa ka ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ na-amụba ọsọ ọsọ? (b) Ọnọdụ dị aṅaa na-emekpa ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ụmụ mmadụ ahụ?
9 Ọnụ ọgụgụ mmadụ n’elu ụwa ruru otu ijeri na narị afọ nke iri na itoolu. Ugbu a ọ bụ ihe dị ka ijeri ise,8 a na-erukwa ijeri ọhụrụ ọ bụla ọsọ ọsọ karị. Kwa afọ ọ bụla, a na-atụkwasị ihe ruru 90 nde mmadụ! Ihe ka ukwuu ná mmụba a na-atụkwasị nnọọ ihe n’ahụhụ a na-ata n’ebe jupụtawororịị n’ịda ogbenye, agụụ na ọrịa. Mmụba ụba mmadụ nke a ka a kpọrọ ntiwapụ ụba mmadụ n’ụzọ ziri ezi. Akwụkwọ akụkọ The New York Times sịrị: “Ọ pụrụ ikwe mee na akụkụ dị ukwuu nke ụwa ga-aghọ ọzara site ná nrụgide nile nke ụba mmadụ na ịda ogbenye a na-apụghị ịchịkwata achịkwata dịkwa ka mkpochapụ site ná mgbukpọ nke nuklia.”9
10 Banyere ịdị ukwuu nke agụụ zuru ụwa ọnụ, magazin bụ Time sịrị: “Nsogbu nke agụụ taa pụrụ iche nke ukwuu site na nke oge ndị gara aga . . . Ugbu a e nwere nnọọ ntakịrị ihe oriri n’ọtụtụ akụkụ dị iche iche nke ụwa site n’afọ ruo n’afọ, nke na 25 pasenti zuru ezu nke ndị bi ná mbara ụwa nọ n’agụụ ma ọ bụ na ha adịghị eri ezigbo nri.”10 Otu ihe akụkọ mara amụma na kwa afọ ihe dị ka 11 nde ụmụ ọhụrụ na-anwụ tupu ha agbaa otu afọ n’ihi nsogbu nke erighị ezigbo nri na ọrịa.
11 Otu akụkọ ahụ sịkwara: “Ya dịkarịa ala otu mmadụ n’ime mmadụ ise ọ bụla dara ogbenye ọnụ ntụ, ọnọdụ ụkọ ihe dị oké njọ nke na ọ bụ ọ dị ndụ ọnwụ ka mma.”11 Nke a kwa, dị ka The Toronto Star kwuru, bụ mgbe e kwesịrị nkwa ná nzukọ ụwa nile maka ihe oriri e mere na Rome n’ihe karịrị afọ iri gara aga “na tupu afọ iri agasịa, ọ dịghị nwata ọ bụla ga-ebu agụụ lakpuo ụra, ọ dịghị ezinụlọ ọ bụla ga-enwe nchekasị banyere nri ha nke ụbọchị na-esonụ, nakwa na ọ dịghị ọdịnihu mmadụ ọ bụla nke erighị ezigbo nri ga-egbochi.”12 Lee otú nkwa ndị ahụ si bụrụ nke efu! Ihe bụ eziokwu bụ dị ka akwụkwọ akụkọ bụ Guardian nke England kwuru, sị: “Ụwa dum nọ nso oké mbibi nke agbụrụ mmadụ. . . . Kọntinenti nile ahụwo ka olileanya ha maka ọdịnihu na-apụ n’anya.”13
12. Ibelata ihe a na-emefu ná ngwa agha ọ̀ ga-eme ka a gwọta nsogbu ahụ n’ezie?
12 Ókè dị ukwuu nke nsogbu ndị a na-adabere, ọ bụghị n’ebe ụwa dị, kama n’ebe ndị na-achị isi na ndị mmadụ na omume ha nọ. Dị ka ihe atụ, mba nile na-emefu ihe dị ka otu puku ijeri dollar ugbu a ná ngwa agha kwa afọ ebe ọtụtụ nde ndị mmadụ na-anwụ n’agụụ. Ma ọbụna ma a kwụsị mkpụkọba nke ngwa agha ndị a, usoro akụ na ụba ụwa nke e kewara ekewa ga-arụ ọrụ megide ezi ngwọta ọ bụla nye nsogbu ahụ. Ọtụtụ mgbe, mgbe nri dị, ọchịchọ inweta oké uru na-egbochi ikesa ya nye ndị nọ ná mkpa. N’ebe ụfọdụ, ndị gọọmenti na-akwụ ndị ọrụ ugbo ụgwọ ka ha ghara ịkọpụta ụdị nri ụfọdụ, n’ihi na ịkọpụta ha hie nne ga-ebuda ọnụ ahịa ya ala karị. A lawokwa ókè dị ukwuu nke ihe oriri n’iyi n’ihi na ọ karịrị akarị.
13. Bible ò kwuru eziokwu mgbe o buru amụma banyere ọnọdụ ndị ga-adị n’oge ọgwụgwụ ụwa?
13 N’ihi nke a, n’agbanyeghị ọganihu ya nile n’ọkà mmụta sayensi, ọha mmadụ ugbu a enwebeghị ike imeri ọnọdụ ndị ahụ nke Bible buru amụma ha. O buru ụzọ kwuo n’ụzọ eziokwu na a ga-enwe “oké ụnwụ” na mgbe “ọgwụgwụ oge.”—Matiu 24:3, 7; Mkpughe 6:5-8.
Ụmụ Mmadụ na Ụwa Hà Pụrụ Ịdị n’Udo?
14-16. Ruo ókè hà aṅaa ka nsogbu mmetọ mbara dịruru njọ?
14 Kemgbe ọtụtụ iri afọ, ụmụ mmadụ anọwo na-ebuso ụwa ebe ha onwe ha bi, agha. Ha emewo ka ọtụtụ ọgwụ ọjọọ dị iche iche banye ná mmiri, ikuku, na n’ala. Otu isiokwu Toronto Star kwuru, sị: “Mmetọ Na-etinye Ụwa n’Ihe Ize Ndụ.” Isiokwu ahụ sịrị: “A na-ebuso mbara ụwa agha dị ilu. Onye na-alụsokwa ya ọgụ bụ mmadụ.” O hotara na “nsí nke ọganihu ya” na-eyi ịdị adị ya egwu ugbu a, o kwukwara, sị: “Ndị ọkà mmụta sayensi na-ewere mkpụtọ ọ bụla nke mbara ụwa dị ka ihe siri ike dị ka iyi egwu agha nuklia.”14
15 Dị ka ihe atụ, banyere United States, magazin bụ Discover sịrị: “Nsí na ígwè ndị na-emerụ ahụ na-abanye n’ime ala na-eyi egwu imebi mmiri dị n’okpuru ala nke mba ahụ. Ụfọdụ ndị na-amụ banyere mmiri na-atụ egwu na ọ pụrụ ịbụ na ma eleghị anya oge agabigala ókè ịzọpụta otu ụzọ n’ime ụzọ anọ n’ime ha.”15 N’England The Observer sịrị na mmetọ site n’ọgwụ emebiwo “ihe ka ukwuu nke mmiri ọṅụṅụ ndị England.”16 New Scientist kwukwara, sị: “Òtù World Health Organisation sịrị na ọrịa a na-ebute site ná mmiri ruru unyi na-egbu 50,000 mmadụ kwa ụbọchị.”17
16 Na United States nchọpụta òtù dị iche iche jikọrọ aka mee gosipụtara na e nwere ókè dị ukwuu nke nsí dị iche iche n’ikuku. The New York Times kọrọ: “Puku kwụrụ puku tọn nke ihe ndị na-akpata ọrịa cancer na ihe ndị ọzọ na-emerụ ahụ nke ukwuu ka a na-agbanye n’ikuku site n’ọtụtụ narị nke ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ihe.”18 Tụkwasị na nke a bụ ọtụtụ ọgwụ ndị na-emerụ ahụ a na-awụnye n’ala, dị ka ihe atụ, n’ụdị ọgwụ ndị na-egbu ụmụ ahụhụ, na ndị na-abanye n’usoro mmepụta nri dị ka nri ụmụ anụmanụ.
17. Ò yiri ka nkà na ụzụ ọ̀ ga-agwọta nsogbu nke a?
17 Nkà na ụzụ ọ̀ pụrụ inye aka? Nke ahụ ọ̀ pụrụ ikwe mee, ebe ọ bụ ya kpatara ọtụtụ nsogbu ndị a? akwụkwọ bụ Environmental Ethics sịrị: “Nkà na ụzụ bụ ohu nye ihe ole na ole bara uru, a pụghịkwa ịtụkwasị ya obi ma ọlị. Mgbe ọ bụla o meriri otu nsogbu, ọ na-akpatakarị abụọ ndị ọhụrụ.—ọ na-esikarịkwa ike ịhụta ihe ndị ga-esi na ha pụta.”19
18. N’iche mmetọ mbara ụwa ihu, olee amamihe dị mkpa nke ụmụ mmadụ na-enweghị, ma olee onye nwere ya?
18 Ọzọ, Bible ekwuolarị banyere enweghị amamihe mmadụ n’iji ihe ala na-emepụta na-eme ihe. Otu amụma dị ná Mkpughe 11:18 kwuru maka oge mgbe Chineke ga-eme ihe “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.” Ụmụ mmadụ kwetara na ha aghọtazughị njikọ dị mgbagwoju anya nke dị n’etiti ihe nile e kere eke n’ụwa. Ma Chineke ghọtazuru ya, ebe ọ bụ ya keworo ha. Ọ̀ bụ na amamihe adịghị ya ilegara Isi Iyi nke a anya maka ihe ngwọta nye nsogbu ndị ahụ?
Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Site n’Iwepụ Imempụ
19. Egwu gịnị ka ọtụtụ ụmụ mmadụ na-atụ taa, n’ihi gịnịkwa?
19 Mmetọ na-etinye ihe ndị dị nnọọ mkpa maka ịdị adị nke mmadụ n’ihe ize ndụ. Ma ọ bụ mmụba nke imempụ na-akpata ihe ka ukwuu n’ime ụmụ mmadụ ịnọ n’egwu. Imempụ na-anapụ ọtụtụ ụmụ mmadụ karị ịnọ ná ntụkwasị obi onwe ha, ọ bụghị nanị n’obodo ukwu dị iche iche kamakwa n’obodo nta na n’ime obodo dị iche iche. Ọ bụghị nanị ihe onwunwe kama mgbe mgbe ahụ na ndụ mmadụ na-anọ n’oké ihe ize ndụ.
20, 21. (a) N’ihi gịnị ka iguzobe iwu ndị ọhụrụ na-agaghị eji kwụsị imempụ? (b) Mmụba nke akụ na ụba ma ọ bụ ụzọ ọhụrụ nke isi lụso imempụ ọgụ ọ̀ ga-agwọta nsogbu ahụ?
20 Ụmụ mmadụ hà pụrụ iweta ezi nchebe pụọ n’ihe ize ndụ ndị a, ma eleghị anya site n’imebe iwu ndị ọhụrụ? E nweworị puku kwụrụ puku iwu dị iche iche ugbu a n’akwụkwọ iwu ndị dị n’ụwa. Ma ndị a akwụsịbeghị imempụ. Ọzọkwa, mmebi iwu gbara mkpọrọgwụ mgbe mgbe na-adị n’etiti ndị na-ahụ na e debere iwu n’onwe ha. Emeghị ihe n’eziokwu n’ebe nile dị elu pụrụ ime ka mgbalị nke ndị na-ahụ na a na-edebe iwu bụ ndị na-akwụba aka ha ọtọ ghara ịdị irè.
21 Azịza ya ọ̀ dabeere n’usoro ọhụrụ dị iche iche nke ịchọpụta na igbochi imempụ? Maka usoro ọhụrụ ọ bụla nke e wepụtara, ndị na-eme mpụ na-achọpụta ụzọ ndị ọhụrụ ha ga-eji gbanarị ya. Mgbe ahụ, inwe mmụba nke akụ na ụba ọ̀ ga-egbo mkpa ahụ? Ọ ga-abụ nkwuhie ọnụ ikpebi na ọ bụ nanị ndị na-eri ụgwọ dị ala ka e ji imempụ mara. Imempụ nke ndị oké ozu na-arịkwa elu. Dị ka ihe atụ, na United States, $80 ijeri ma ọ dịkarịa ala na-efu kwa afọ n’ihi imempụ dị otú ahụ. Ihe dị ka 30 pasenti nke ụlọ ọrụ nile na-ada, bụ ndị na-ada n’ihi ya. South Africa kọrọ na ohi ndị e were n’ọrụ zuru tinyere 1,500 ụlọ ọrụ dị iche iche n’ụkọ ego n’otu afọ.20
22. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na mgbalị ụmụ mmadụ nanị apụghị imeri imempụ?
22 Mmụba nke imempụ emetụtaghị nanị mba ole na ole. O zuru ebe nile. Lee isiokwu ụfọdụ dị iche iche gburugburu ụwa. Brazil: “Oké Mmụba Ọnụ Ọgụgụ Mmebi Iwu.” Canada: “Ọnụ Ọgụgụ nke Imempụ Ụmụ Nwanyị Na-amụba nke Ukwuu.” England: “Mmebi Iwu Ụmụntakịrị Nọgidere Na-arị Elu.” India: “Mmebi Iwu A Haziri Ahazi Bụ Ọrụ Na-amụba Amụba.” Soviet Union: “Soviet Nọ n’Ụjọ n’Ihi Mmụba nke Mmebi Iwu.”21 Magazin bụ Maclean’s kwuru, sị: “Iji ime ihe ike na-eme mpụ na Detroit akarịwo akarị nke na mgbe ụfọdụ igbu ọchụ na-abụ nanị ihe a kpọtụrụ uche ná mkpirikpi n’azụ akwụkwọ akụkọ dị iche iche.”22 Ya mere, mmụba nke imempụ bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ, mgbalị nke mmadụ nanị apụghịkwa ịgwọta ya. A sị na mgbalị nke ụmụ mmadụ pụrụ ịgwọta ya, imempụ agaraghị anọgide na-abụ nsogbu kemgbe oge na mgbalị ndị a nile.
23. È mezuola ihe Bible kwuru banyere ọnọdụ ndị ga-adị n’ụbọchị anyị?
23 Ihe na-eme bụ nnọọ dị ka Bible buru ụzọ kwuo ya ogologo oge gara aga, sị: “Oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, . . . ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, . . . ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:1-4) Jisọs bukwara ụzọ kwuo na ‘ịba ụba nke mmebi iwu’ bụ ihe a ga-eji mara oge ga-ebute ụzọ kpọmkwem tupu mgbe Alaeze Chineke ga-eme ụwa ka ọ bụrụ ebe nanị “ndị dị nwayọọ n’obi” ga-ebi. ‘Ịba ụba ahụ nke mmebi iwu’ bụ ihe na-eme eme ná ndụ n’oge anyị.—Matiu 24:12; 5:5; Abụ Ọma 37:29.
Nsogbu Ndị Kachasịnụ
24. Ọ bụrụgodi na ụmụ mmadụ pụrụ imeri nsogbu ndị a tụleworo, ndị iro ka ukwuu dị aṅaa ka ga-afọdụ?
24 Ka a si na ụmụ mmadụ pụrụ imeri nsogbu nke agha, ịda ogbenye, agụụ, mmetọ na imempụ. Nke a ọ̀ ga-ewetara gị udo na ịnọ ná ntụkwasị obi zuru ezu? Ee e, e nwere ihe ka ga-afọdụ. Ọrịa na ọnwụ ka ga-anọgide dị ka ndị iro a na-emeribeghị. N’ezie, uru gịnị ka nnapụta site ná nsogbu ndị ọzọ bara mgbe ị hụrụ onye ị hụrụ n’anya ka ọ rịara ọrịa ma nwụọkwa, ma ọ bụ na otu ọrịa na-egbu egbu enyebe ahụ gị nsogbu?
25, 26. Olileanya dị aṅaa ka ndị ọkà nchọpụta ọgwụ nwere maka imeri ọrịa?
25 Ọ bụ ezie na e nwewo ọganihu dị iche iche n’ịgwọ ọrịa, nke a ò wetaworo anyị inwe onwe pụọ n’ọrịa na ọnwụ? Otu onye ọrụ ahụ ike zara, sị: “E meribeghị ọrịa ndị na-efe efe. Ha ka bụ isi ihe ndị na-akpata ọnwụ n’ụwa, n’ebe a [United States], ha bụkwa isi ihe na-akpata ahụ adịghị ike.”23 N’Africa otu akụkọ sịrị na ọrịa karịrị akarị “nke na n’ime 1,000 ụmụntakịrị a mụrụ ọhụrụ, ihe dị ka 500 ga-anwụ tupu ha eruo afọ ise.”24 Gburugburu ụwa, ọtụtụ narị nde ụmụ mmadụ na-arịa ịba, ọrịa ụra, otoro, ekpenta na ọrịa ndị ọzọ. N’obodo ụfọdụ ndị mepere emepe, ọrịa obi na-akpata ọnwụ nke ihe dị ka ọkara ndị nile na-anwụnụ, ọrịa cancer na-akpatakwa otu n’ime ise. The Lancet kwa, bụ́ akwụkwọ ahụ ike nke ndị Britain kwuru, sị: “Gburugburu ụwa a na-enwe ihe dị ka 250 nde ndị ọhụrụ na-arịa ọrịa gonorrhoea na 50 nde ndị ọhụrụ na-arịa ọrịa syphilis kwa afọ. A pụrụ ịdị na-ebute ọbụna karị ọrịa ndị ọzọ a pụrụ isi n’inwe mmekọahụ na-ebute.”25
26 Otu onye ọkà mmụta sayensi kwuru na ọ bụrụ na a chọta ihe ngwọta nye ọrịa cancer, ọrịa obi, na ọrịa akụrụ, ọrịa ndị ọzọ ga-amalite igbu mmadụ karị. O kwuru, sị: “E nwere olileanya dị nta na n’ọdịnihu dị nso, anyị pụrụ ịmụbawanye ogologo afọ ndụ ma ọ bụ mee ka a ghara ịdị na-aka nká ọsọ ọsọ.”26 Ndị dibịa na Soviet Union kwukwara, sị: “N’agbanyeghị ihe ịga nke ọma nile nke mmụta ọgwụ na ahụ ike, dị ka ihe ndekọ nke ihe mere eme si na-egosi, ogologo afọ ndụ a na-adị agbanwebeghị.”27
27. (a) Okwu dị aṅaa n’ime Bible banyere ogologo afọ ndụ mmadụ ka bụkwa nnọọ eziokwu taa? (b) Ebee ka anyị pụrụ isi mụta ihe kpatara ndụ mmadụ ji dị mkpụmkpụ ma jupụtakwa ná nsogbu?
27 Lee otú okwu Bible na Job 14:1, 2 si nọgide na-abụ eziokwu ruo taa: “Mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ. Dị ka okooko osisi ka ọ pụtaworo, e wee na-ebipụ ya: o wee na-agbalaga dị ka onyinyo, ọ dịghị eguzokwa.” Bible gosikwara ihe kpatara nke a, ọ kọwapụtakwara ihe kpatara nsogbu nile nke mmadụ, dị ka anyị ga-ahụ ma e mesịa.
Na Gịnị Ka Ị Ga-enwe Olileanya?
28-30. Iji merie nsogbu ndị na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu, gịnị mere o ji zie ezi karị ịtụkwasị obi n’ihe ngwọta nke Chineke karịa na nke mmadụ?
28 N’ikwu nnọọ eziokwu, ezi uche ọ̀ dị n’ịtụkwasị mmadụ obi imeri nsogbu nile chere ihe a kpọrọ mmadụ ihu? Ka ezi uche ọ̀ dị karị n’ịtụkwasị obi n’ihe ngwọta nke Bible na-atụ aka na ya, nke bụ ihe Chineke ga-eme n’onwe ya site n’ọchịchị ezi omume nke eluigwe?
29 Ogologo oge gara aga, ọbụ abụ ahụ nwere ike mmụọ nsọ dere okwu ndị a, sị: “Atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere. Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi. Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ahụ bụ nke Chineke nke Jekọb bụ onye na-enyere ya aka, nke olileanya ya dịkwasị Jehova, bụ́ Chineke ya: onye meworo eluigwe na ụwa.”—Abụ Ọma 146:3-6.
30 Echefukwala na n’agbanyeghị otú ụmụ mmadụ pụrụ isi nwee ezi nzube obi ma ọ bụ ụdị mmetụta ma ọ bụ ike ndị ndú ụwa pụrụ inwe, ha nile bụ ihe ndị e kere eke na-anwụ anwụ. Ebe ọ bụ na ha apụghị ịzọpụta onwe ha, olee otú ha pụrụ isi zọpụta ndị ọzọ? Ha apụghị. Nanị Chineke pụrụ, site n’ọchịchị Alaeze ya.
[Foto dị na peeji nke 13]
N’akụkọ nile nke ihe mere eme ụmụ mmadụ nọ na-asọgharị ìsì site n’otu ihe ọjọọ gaa n’ọzọ—agha, mmụba nke imempụ, mmetọ mbara, ịda ogbenye, na ọtụtụ ndị ọzọ. Dị ka Bible kwuru n’eziokwu: “Ọ bụghị onye ọ bụla na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike”
[Foto dị na peeji nke 21]
“Atụkwasịla obi n’ahụ . . . nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere”