Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 5/8 p. 12-15
  • Ònye Pụrụ Iweta Udo Na-adịgide Adịgide?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Pụrụ Iweta Udo Na-adịgide Adịgide?
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ibelata Ndị Agha
  • Ahịa Ngwá Agha nke Mba Nile
  • Iyi Egwu Nuklia Ka Dị
  • Ịchịsa Ngwá Agha na Udo
  • Mmụba nke Ịma Aka Agbụrụ
  • Nsogbu Ndị Dị Nso
  • Agha Nuklia—Olee Ndị Na-eyi Egwu Ya?
    Teta!—2004
  • Agha Nuklia—À Ka Na-atụ Egwu Ya?
    Teta!—2004
  • Iyi Egwu Nuklia Akwụsịbeghị Ma Ọlị
    Teta!—1999
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Agha Ọgwụrụ Mba?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 5/8 p. 12-15

Ònye Pụrụ Iweta Udo Na-adịgide Adịgide?

“Ha ga-akpụgharị mma agha ha ịghọ mma ogè, na ube ha ịghọ mma ịkwa osisi: mba agaghị eweli mma agha megide mba, ha agaghịkwa amụta agha ọzọ.”

AKỤKỤ ihe odide ahụ dị n’elu sitere n’Aịsaịa isi 2, amaokwu nke 4, ná nsụgharị Bible nke King James. Akwụkwọ bụ́ Human Development Report 1994 nke Usoro Ihe Omume Mmepe nke Mba Ndị Dị n’Otu (UNDP) bipụtara, hotara okwu ndị a wee gbakwụnye, sị: “O yiri ka oge maka amụma nke a abịawo mgbe agha nzuzo ahụ kwụsịrị [na 1990]. Ma ruo ugbu a, nke a aghọwo olileanya a na-ejighị n’aka.”

Ibelata Ndị Agha

Otu ihe na-eme ka olileanya ndị e nwere maka udo ghara isi ike bụ na e jighị mbelata dị ukwuu n’ego a na-emefu n’ihe banyere agha sochie mgbanwe e nwere n’ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’ụzọ zuru ụwa ọnụ. N’ezie, e nwewo mbelata ụfọdụ. Dị ka ọnụ ọgụgụ òtù UN si dị, ihe ndị agha na-emefu n’ụwa nile dalatara site n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu e nwetụrụla bụ́ $995 ijeri na 1987 ruo $815 ijeri na 1992. Ma, $815 ijeri bụkwa ọnụ ọgụgụ buru oké ibu. Ọ fọrọ nke nta ka ọ hà ka ngụkọta ego ọkara mmadụ bi n’ụwa na-akpata!

Ihe ọzọ na-emegide nchịsa ngwá agha bụ echiche ahụ bụ́ na ịdị ike nke ndị agha na-eweta ịnọ ná ntụkwasị obi. N’ihi ya, ọ bụ ezie na Agha Nzuzo ahụ akwụsịwo, ọtụtụ ndị nọ ná mba ndị na-emepụta ngwá ahịa na-ekwu na ihe a na-emefu maka nchebe nke mba kwesịrị ịnọgide n’ọ̀tụ̀tụ̀ ndị dị elu. James Woolsey, mgbe ọ bụ onye ntụzi nke Ụlọ Ọrụ Etiti Na-enye Ihe Ọmụma Maka Nchebe na United States, gwara Nzukọ Ezumezu na February 1993, sị: “Anyị egbuwo otu nnukwu dragọn [mba U.S.S.R.], ma anyị na-ebi ugbu a n’ime ọhịa nke jupụtara n’ọtụtụ agwọ ọjọọ onwe ha.”

Ná mba ndị ka na-emepe emepe, a na-ekwu na ihe a na-emefu n’ihe banyere agha ziri ezi n’ihi na ọ bụ ụzọ isi gbochie mwakpo site ná mba ndị e chere na ha pụrụ ịbụ dragọn na agwọ ọjọọ. Ma n’eziokwu, ka òtù UNDP rịbara ama, “mba ndị ka na-emepe emepe alụwo agha mba nile ole na ole, ọtụtụ ejiriwokwa ìgwè ndị agha ha kpagbuo ndị ha.” N’eziokwu, akụkọ òtù UNDP kọwara, sị: “Ná mba ndị ka na-emepe emepe, ohere ndị e nwere ịnwụ site ná nleghara anya ọha na eze (site n’erighị ihe na-edozi ahụ na ọrịa ndị a pụrụ igbochi) ji 33 ugboro dị elu karịa ohere ndị e nwere ịnwụ site ná mwakpo sitere ná mba ọzọ. Ma, ná nkezi, e nwere ihe dị ka 20 ndị agha maka otu onye dibịa. Otú o sina dị, o yikarịrị ka ndị agha ga-ebelata nchebe onwe onye karịa ịmụba ya.”

Ahịa Ngwá Agha nke Mba Nile

N’oge Agha Nzuzo ahụ, mba abụọ bụ dike resịrị ndị ha na ha na-eso emekọrịta ihe ngwá agha iji mesiwanye nkekọ mmekọrịta ha ike, nweta ebe obibi ndị agha, ma jigide ikike. Ndị agha nke ọtụtụ mba dị ike. Dị ka ihe atụ, nke ọ bụla n’ime 33 mba nwere ihe karịrị 1,000 ụgbọ ọgbọ agha ugbu a.

Ugbu a Agha Nzuzo ahụ kwụsịworo, izi ezi aghụghọ na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị maka ire ngwá agha ebelatawo. Ma, ihe mkpali n’ụzọ akụ̀ na ụba ka siri ike. Ego dị na ya! Ya mere, ka mba ndị na-achọ ngwá agha na-adalata, ndị na-emepụta ngwá agha na-arụgide gọọmenti ha na ụzọ isi chekwaa ọrụ ma mee ka ọnọdụ akụ̀ na ụba dịgide mma bụ ire ngwá agha n’ofesi.

Magazin bụ́ World Watch na-ekwu, sị: “N’ụzọ dị mgbagwoju anya, dị nnọọ ka mba ndị bụ́ dike na-adọghachi nnukwu mgbọ ogbunìgwè nuklia ha azụ, ha na-achọ ngwa ngwa ụzọ ndị ha ga-esi resị ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla ga-azụ ihe ka ukwuu ná ngwá agha nkịtị ha.” Gịnị bụ ọnụ ọgụgụ ya? Dị ka Ụlọ Akwụkwọ Maka Nnyocha Udo Mba Nile nke Stockholm si kwuo, ọnụ ahịa nke ngwá agha nkịtị e rere n’ahịa mba nile n’ime afọ 1988 ruo 1992 bụ́ $151 ijeri. Ndị kasị bupụ ngwá agha mba ọzọ bụ United States, ebe ná mba ndị dị n’ebe bụbu Soviet Union sochiri.

Iyi Egwu Nuklia Ka Dị

Gịnị banyere iyi egwu nuklia? United States na Soviet Union (ma ọ bụ mba ndị nọchiri ya) bịanyere aka ná Nkwekọrịta n’Ịkpa Ókè Iji Nuklia Eme Ihe n’Agha na 1987 na Nkwekọrịta Mbelata Ọkpọka Ngwá Agha (START) abụọ n’afọ 1991 na 1993.

Nkwekọrịta START ahụ machibidoro iwu mgbọ ogbunìgwè a na-agbapụ n’ala bụ́ ndị nwere ihe karịrị otu isi mgbọ, kwuokwa ka e bibisịa, ka ọ na-erule afọ 2003, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ nke isi mgbọ nuklia n’ihe nwere isi mgbọ. Ma ọ bụ ezie na iyi egwu nke Agha Ụwa nke Atọ e ji nuklia alụ apụwo n’anya, a ka nwere nnukwu nkwakọba nke ngwá agha nuklia—nke zuru ezu ibibi ndụ nile dị n’elu ụwa ọtụtụ ugboro.

Ịtụghasị ngwá agha ndị a na-amụba ohere ndị e nwere maka ohi nuklia. Dị ka ihe atụ, Russia na-atụghasị ma na-akwakọba ihe dị ka 2,000 isi mgbọ kwa afọ, na-esi na ha ewepụta plutonium hà ka aka a kwụkọbara akwụkọba a na-akpọ pit. Otu mgbọ ogbunìgwè pit, nke na-ewe mmefu na nkà na ụzụ dị ukwuu iji mee ya, bụ isi ihe dị na bọmbụ nuklia. Ebe ọ bụ na a na-ejikarị igbe ígwè na-egbochi ụzarị ọkụ ekpuchi pit ndị ahụ, onye ohi pụrụ itinye otu n’ime akpa ya wee pụọ. Onye na-eyi mmadụ egwu nke nwetara pit a kpụworo akpụ pụrụ iji ihe ndị na-agbawa agbawa gbaa ya gburugburu iji mepụtagharịa bọmbụ nwere ikike dị egwu.

Nchegbu ọzọ bụ iyi egwu nke mgbasa ngwá agha nuklia gaa ná mba ndị ọzọ. A rịbara mba ise ama dị ka mba ndị bụ dike ná ngwá agha nuklia—China, France, Russia, United Kingdom, na United States—a na-echekwa na ọtụtụ mba ndị ọzọ nwere ikike iji ngwá agha nuklia mee ihe n’egbughị oge.

Ka mba ndị ọzọ na-enweta ngwá agha nuklia, ikwe omume na ọ dị onye ga-eji ha eme ihe na-arị elu. Ụmụ mmadụ nwere ezi ihe mere ha ga-eji atụ ụjọ na a ga-eji ngwá agha ndị a dị ebube eme ihe. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Transformation of War si tinye ya, “ike ha dị ukwuu nke na ha na-eme ka ngwá agha nkịtị yie ihe e ji egwuri egwu.”

Ịchịsa Ngwá Agha na Udo

Ma gịnị ma ọ bụrụ na mba dị iche iche ga-ebibisị ọkpọka ngwá agha na-ebibi ihe ndị ha nwere? Nke ahụ ọ̀ ga-eme ka e nwee ụwa dị n’udo? Ọ dịghị ma ọlị. Ọkọ akụkọ ihe mere eme agha bụ́ John Keegan na-ekwu, sị: “Ọ dịbeghị onye ngwá agha nuklia gburu kemgbe 9 August, 1945. Nde mmadụ iri ise ndị nwụworo n’agha kemgbe ahụ abụrụwo, n’akụkụ ka ukwuu, ndị e gburu site ná ngwá agha ndị dị ọnụ ala a na-emepụta n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu na ụmụ obere ngwá agha, bụ́ ndị ọnụ ahịa ha ji ihe dị nta karịa ọnụ ahịa redio nkịtị na ọnụ ahịa batrị nkịtị, bụ́ ndị jupụtaworo n’ụwa n’otu mgbe ahụ.”

Otu ihe atụ na-adịbeghị anya nke iji ngwá agha ndị e ji nkà na ụzụ dị ala mee na-eme ihe bụ mgbukpọ ahụ na Rwanda, bụ́ mba nke akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia (1994) na-ekwu banyere ya, sị: “Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ahụ bụ ndị Roman Katọlik. . . . Ndị Roman Katọlik na chọọchị ndị ọzọ nke ndị Kraịst na-ahụ maka ihe ka ọtụtụ n’ụlọ akwụkwọ praịmarị na ụlọ akwụkwọ dị elu.” Ma, ndị ji mma alụ ọgụ gburu ihe ruru ọkara nde mmadụ na Rwanda. N’ụzọ doro anya, iji weta udo zuru ụwa ọnụ, e nwere ihe ọzọ dị mkpa karịa mbelata nke ngwá agha nuklia na ngwá agha nkịtị. Ọzọ, ọ dị ihe dị mkpa karịa nkụzi nke okpukpe dị iche iche nke ụwa na-akụzi.

Mmụba nke Ịma Aka Agbụrụ

Sadako Ogata, kọmishọna ukwu nke òtù UN maka ndị gbara ọsọ ndụ, kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Ozugbo Agha Nzuzo ahụ gasịrị, anyị chere na a ga-edozi nsogbu ahụ nile. Anyị amaghị na Agha Nzuzo ahụ nwere akụkụ ọzọ—na mba ndị bụ dike nyere iwu ma ọ bụ mee ka e nye iwu n’ógbè ha nwere ikike n’otu n’otu. . . . Ya mere ugbu a, mgbe Agha Nzuzo ahụ gafeworo, anyị na-ahụ ntiwapụ nke esemokwu agbụrụ ndị ọzọ, ndị a kwụsịtụrụ, ma eleghị anya ụdị ọgba aghara agbụrụ a na-enwe tupu Agha Ụwa Mbụ.”

Arthur Schlesinger, ọkọ akụkọ ihe mere eme na onye na-ede akwụkwọ nke nwetara onyinye nrite Pulitzer, kwuru ihe yiri nke ahụ, sị: “Otu njikọ akpọmasị na-anọchi ibe ya. Ịtọhapụ ihe nkegide ígwè ahụ nke mbịada echiche onwe onye n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe na n’ebe bụbu Soviet Union na-atọhapụ mmegide agbụrụ, mba, okpukpe, na asụsụ a bịadara abịada na mbụ, bụ́ nke gbanyere mkpọrọgwụ n’akụkọ ihe mere eme na n’echiche. . . . Ọ bụrụ na narị afọ nke 20 abụrụwo narị afọ obubu agha echiche onwe onye, narị afọ nke 21 na-amalite dị ka narị afọ nke obubu agha agbụrụ.”

N’agbata 1989 na 1992, dị ka ngụkọ nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu mere si dị, e nwere 82 mburịta agha, nke a lụrụ ihe ka ọtụtụ n’ime ha n’etiti mba ndị ka na-emepe emepe. Na 1993, 42 mba lụrụ agha ndị buru ibu, 37 mba ndị ọzọkwa nwere ime ihe ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ka ọ dị ugbu a, Mba Ndị Dị n’Otu—n’iji oké mgbalị mee atụmatụ mmefu ego ya—gbalịrị n’enweghị oké ihe ịga nke ọma n’iweta udo n’ịlụ agha ime udo 17 nanị. N’ụzọ doro anya, ihe a kpọrọ mmadụ aghaghị ilega anya n’ebe dị iche maka ụwa nke dị n’udo.

Nsogbu Ndị Dị Nso

N’ụzọ na-arị elu, kama iji nchekwube na-ele anya n’ọdịnihu, ọtụtụ na-ekwupụta ihe ọjọọ dị n’ihu. Ihu akwụkwọ nke mbipụta February 1994 nke magazin bụ́ The Atlantic Monthly chịkọtara otu amụma e buru maka ọtụtụ iri afọ ndị dị n’ihu, sị: “Mba dị iche iche na-ekewa n’ihi oké njupụta nke ndị gbara ọsọ ndụ n’ihi ọdachi gburugburu ebe obibi na nke ọha mmadụ. . . . A na-alụ agha n’ihi ụkọ nke ihe e ji adị ndụ, karịsịa mmiri, agha n’onwe ya na mpụ na-agakọkwa mgbe nile, ka ìgwè ndị ọlụọ ọgbalaga ndị na-enweghị mba ha sitere na-ezute ìgwè ndị nche onwe onye nke ndị nọ n’ọkwá dị elu.”

Nke a ọ̀ pụtara na a pụghị inweta udo na-adịgide adịgide? Ọ dịghị ma ọlị! Isiokwu na-esonụ na-egosi ihe mere anyị pụrụ iji jiri nchekwube na-elepụ anya n’ọdịnihu.

[Igbe dị na peeji nke 13]

Okpukpe—Ọ̀ Bụ Ikike Nkwali Maka Udo?

Mgbe mba dị iche iche na-alụ agha, okpukpe nke ụwa na-agbahapụ nkụzi nke udo na òtù ụmụnna. Banyere ọnọdụ dị n’oge Agha Ụwa Mbụ, ọchịagha ukwu nke Britain bụ́ Frank P. Crozier sịrị: “Chọọchị dị iche iche nke ndị Kraịst bụ ndị anyị nwere kasị akwalite mwụfu ọbara, anyị na-ejikwa ha eme ihe n’ụzọ dị ukwuu.”

Òkè okpukpe na-ekere n’agha abụrụwo otu ihe ahụ n’ọgbọ nile. Ọkọ akụkọ ihe mere eme nke Katọlik bụ́ E. I. Watkin kwetara, sị: “Ọ bụ ezie na ikweta ya pụrụ ịdị na-egbu mgbu, anyị apụghị iji n’ihi ọdịmma nkụzi ụgha ma ọ bụ iguzosi ike n’ihe na-ezighị ezi gọnarị ma ọ bụ leghara eziokwu nke akụkọ ihe mere eme anya, na ndị Bishọp anọgidewo na-akwado agha ndị ọchịchị mba ha na-alụ.” Otu uche akwụkwọ akụkọ na Sun nke Vancouver, Canada, kwukwara, sị: “Ọ bụ, ma eleghị anya, adịghị ike nke okpukpe nile a haziri ahazi na chọọchị na-agbaso ọkọlọtọ . . . Olee agha a lụrụla nke a na-azọọrọghị na Chineke nọ n’akụkụ nke ọ bụla?”

N’ụzọ doro anya, kama ịbụ ikike nkwali maka udo, okpukpe nke ụwa akwalitewo agha na igbu mmadụ—dị ka mgbukpọ Rwanda ahụ mere ihe atụ ya n’ụzọ siri ike.

[Igbe dị na peeji nke 14]

Ihe Efu nke Agha

N’akwụkwọ bụ́ I Found No Peace, nke e bipụtara na 1936, onye nta akụkọ ihe na-eme n’ofesi bụ́ Webb Miller dere, sị: “N’ụzọ na-eju anya, ụjọ na-ebibi ihe nke [Agha Ụwa Mbụ] ya na ihe arụ na ihe efu ya nile emetụtaghị m n’ụzọ siri ike ruo mgbe afọ asatọ kpọmkwem gasịworo eri a lụsịrị ya.” N’oge ahụ o letaghachiri ọgbọ agha Verdun, bụ́ ebe o kwuru na 1,050,000 mmadụ anwụwo.

“A ghọgbuwo mụ na ọtụtụ nde ndị ọzọ n’oge agha ahụ,” ka Miller dere. “Agha Ụwa ahụ nwere nanị ihe ịga nke ọma n’ịkpata agha ndị ọhụrụ. Nde mmadụ asatọ na ọkara anwụwo n’efu, ọtụtụ iri nde anọrọwokwa n’ụjọ a na-apụghị ịkọ akọ, ọtụtụ narị nde atawo ahụhụ ọdachi, ụkọ, na enweghị obi ụtọ. Ihe a nile emewokwa n’okpuru nghọgbu jọgburu onwe ya.”

Afọ atọ mgbe e bipụtasịrị akwụkwọ a, Agha Ụwa nke Abụọ malitere. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Washington Post rịbara ama: “Narị afọ nke 20 anyị abụrụwo ‘agha zuru ezu’ megide ma ndị na-ebu agha ma ndị nkịtị. . . . Agha ime ọhịa nke narị afọ ndị gara aga dị nnọọ obere n’iji ihe tụnyere ibe ya.” Dị ka otu atụmatụ otu onye ọkachamara mere si dị, 197 nde mmadụ anwụwo kemgbe 1914 n’agha na ná nnupụisi megide ọchịchị.

Ma, agha na nnupụisi nile megide ọchịchị nke mmadụ ewetabeghị udo ma ọ bụ obi ụtọ. Dị ka The Washington Post ahụ si kwuo, “ọ dịbeghị usoro ọchịchị ma ọ bụ nke akụ̀ na ụba e nweworo ruo ugbu a n’ime narị afọ a nke meworo ka obi jụrụ ma ọ bụ nke gboworo mkpa ọtụtụ nde ụmụ mmadụ na-agba aghara.”

[Foto dị na peeji nke 15]

Nne a bụ n’otu n’ime ọtụtụ narị puku ndị e gburu na Rwanda—ọtụtụ site n’aka ndị òtù okpukpe nke ha

[Ebe E Si Nweta Foto]

Albert Facelly/Sipa Press

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya