“M Ga-esi Aṅaa . . . Ma Ọ Bụrụ na Ọ dịghị Onye Ga-edu M?”
1 Mgbe Filip onye na-ezisa ozi ọma jụrụ ọnaozi Etiopia ma ọ na-aghọta ihe ọ na-agụ n’Okwu Chineke, nwoke ahụ zaghachiri, sị: “M ga-esi aṅaa pụ ịmata ma ọ bụrụ na ọ dịghị onye ga-edu m?” Filip ji obi ụtọ nyere ya aka ịghọta ozi ọma banyere Jisọs, nke mere ka e mee nwoke ahụ baptism n’egbughị oge. (Ọrụ 8:26–38) Filip na-erube isi n’iwu ahụ Kraịst nyere ‘ime mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, na-eme ha baptism na-ezikwa ha ihe.’—Matiu 28:19, 20.
2 Anyị aghaghị irube isi n’iwu ahụ nke ime ndị na-eso ụzọ dị nnọọ ka Filip mere. Otú ọ dị, a dịghị ahụkarị ka ndị anyị na-amụrụ Bible na-enwe ụdị ọganihu ime mmụọ ahụ dị ngwa nke ọnaozi Etiopia ahụ nwere. Nwoke ahụ, bụ́ onye na-eso ụzọ ndị Juu nke maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma, nwere obi na-anabata ihe, bụrụkwa onye ihe dị ya mkpa bụ nanị ikwere na Jisọs bụ Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa. Ọ bụ ihe ịma aka ma ọ bụrụ na ndị anyị na-amụrụ ihe amaghị Bible, bụrụ ndị e jiworo ozizi ụgha nke okpukpe duhie, ma ọ bụ ndị nsogbu ndị siri ike ha nwere na-anyịgbu. Gịnị ga-enyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma n’iduzi ndị anyị na-amụrụ Bible ime nraranye na ịbụ ndị e mere baptism?
3 Ghọta Mkpa Ime Mmụọ nke Onye ahụ A Na-amụrụ Bible: Ogologo oge ha aṅaa ka anyị pụrụ iji broshuọ Na-achọ na akwụkwọ Ihe Ọmụma mụọrọ ndị mmadụ ihe? Ọ dị mkpa ikpebi oge ọmụmụ ihe ahụ ga-ewe na-adabere n’ọnọdụ na ikike nke onye ahụ a na-amụrụ ihe. Anyị agaghị ekwe ka inwe nghọta zuru ezu nke onye ahụ a na-amụrụ ihe funahụ ya n’ihi ịmụ ihe ọsọ ọsọ. Ọ dị onye ọ bụla a na-amụrụ ihe mkpa inwe ihe ndabere siri ike maka okwukwe ọhụrụ o nwere n’Okwu Chineke. N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịghara ịmụ akwụkwọ Ihe Ọmụma ọsọ ọsọ, n’echiche nke ịgbalị ịmụcha akwụkwọ ahụ n’ọnwa isii. Ọ pụrụ iwe ihe karịrị ọnwa isii iji nyere ụfọdụ ndị aka inwe ọganihu ruo n’ókè nke ịbụ ndị e mere baptism. Ka ị na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ site n’izu ruo n’izu, tinye oge ọ bụla dị mkpa iji nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịghọta na ịnakwere ihe ọ na-amụta n’Okwu Chineke. N’ọnọdụ ụfọdụ, ọ pụrụ iwe izu abụọ ma ọ bụ atọ iji mụchaa otu isiokwu dị n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Nke a ga-enye ohere ịgụ na ime ka ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha doo anya.—Rom 12:2.
4 Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na mgbe unu mụchara akwụkwọ Ihe Ọmụma, ị chọpụta na nghọta onye ị na-amụrụ ihe nwere banyere eziokwu ahụ kwesịrị izukwu ezu, ma ọ bụ na o nwebeghị mkpali zuru ezu iji eziokwu ahụ kpọrọ ihe na ịrara ndụ ya nye Chineke? (1 Kọr. 14:20) Olee ihe ị pụrụ imekwu iji duzie ya ịba n’ụzọ na-eduba ná ndụ?—Mat. 7:14.
5 Gboo Mkpa Ime Mmụọ nke Onye Ị Na-amụrụ Bible: Ọ bụrụ na o doro anya na onye ahụ na-enwe ọganihu, ọ bụ ezie na ọ bụ nwayọọ nwayọọ, nakwa na ọ na-enwe ekele maka ihe ọ na-amụta, mgbe ahụ gaa n’ihu n’ọmụmụ Bible ahụ site n’ịmụ akwụkwọ nke abụọ mgbe a mụchara broshuọ Na-achọ na akwụkwọ Ihe Ọmụma. Nke a nwere ike ghara ịdị mkpa n’ọnọdụ nile, ma mgbe ọ dị mkpa, gaa n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ site n’ịmụ akwụkwọ Ezi Udo, Ịdị n’Otu n’Ofufe, ma ọ bụ akwụkwọ Nlanarị. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị nkwusa nwere akwụkwọ ndị a ha na-eji eme ihe ma ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ha. Ọ bụ nanị akwụkwọ Nlanarị ka a pụrụ ime ọda ya site n’alaka ụlọ ọrụ. N’ọnọdụ nile, a ga-ebu ụzọ mụọ broshuọ Na-achọ na akwụkwọ Ihe Ọmụma. E kwesịrị ịgụrụ ọmụmụ Bible, nletaghachi na oge ndị e tinyere iji gaa n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ ma nye ha n’akụkọ ozi ma ọ bụrụgodị na e meela onye ahụ a na-amụrụ ihe baptism tupu ọ mụchaa akwụkwọ nke abụọ.
6 Nke a ọ̀ pụtara na ndị e mere baptism ọhụrụ ọ bụ ezie na ha mụrụ nanị otu akwụkwọ kwesịrị ka e nyere ha aka ọzọ ugbu a ịmụ akwụkwọ nke abụọ? Ọ bụchaghị otú a. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na ha adịghị ejekwa ozi ma ọ bụ na ha enwebeghị ọganihu n’eziokwu, ha pụrụ iche na ha chọrọ enyemaka iji jiri eziokwu ahụ mee ihe n’ụzọ ka ukwuu ná ndụ ha. E kwesịrị ime ka onye nlekọta ije ozi mara tupu a maliteghachiri onye nkwusa e mere baptism ọmụmụ ihe. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị maara ụfọdụ ndị mụrụ akwụkwọ Ihe Ọmụma n’oge gara aga ma ha enweghị ọganihu ruo n’ókè nke ime nraranye na ịbụ ndị e mere baptism, ị pụrụ ịchọ ime ihe iji hụ ma hà ga-achọ ịmaliteghachi ọmụmụ Bible ha.
7 Ọ bụ akara e ji ama ịhụnanya ndị Kraịst ilebara onye ọ bụla nwere mmasị nke anyị na-amụrụ ihe anya n’ụzọ pụrụ iche ma chie anya. Nzube anyị bụ inyere onye ahụ a na-amụrụ ihe aka inwe nghọta ka ukwuu nke eziokwu nke Okwu Chineke. Mgbe ahụ, ọ pụrụ ime ihe doro anya na nke amamihe dị na ya maka eziokwu ahụ ma rara ndụ ya nye Jehova, na-egosipụtakwa nraranye ahụ site n’ịbụ onye e mere baptism n’ime mmiri.—Abụ Ọma 40:8; Efe. 3:17–19.
8 Ì chetara ihe mere mgbe e mesịrị ọnaozi Etiopia ahụ baptism? “Ọ na-aga n’ụzọ ya na-aṅụrị ọṅụ” dị ka onye ọhụrụ na-eso ụzọ Jisọs Kraịst. (Ọrụ 8:39, 40) Ka anyị na ndị anyị duziri ịga n’ụzọ nke eziokwu ahụ n’ụzọ gara nke ọma nweta ọṅụ dị ukwuu n’ijere Jehova Chineke ozi—ugbu a ma ruo mgbe ebighị ebi!