Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọktoba 5
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 5
Abụ nke 13 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 31 ¶13-20 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Ihe E Mere 1-4 (Nkeji 8)
Nke 1: 1 Ihe E Mere 1:28-42 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú Ndị Rom 8:26, 27 Si Emesi Anyị Obi Ike na Chineke Hụrụ Anyị n’Anya? (Nkeji 5)
Nke 3: Mmadụ Ò Nwere Ike Ịghọta Ihe E Dere na Baịbụl? Olee Otú Anyị Ga-esi Aghọta Ya?—wp13 4/1 p. 16 para. 1-4 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: ‘Gbasie àmà ike banyere ozi ọma.’—Ọrụ 20:24.
10 min: Otú A Ga-esi Enye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Ọktoba. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ mee ihe ngosi otú a ga-esi nye mmadụ Ụlọ Nche nakwa otú a ga-esi nye mmadụ Teta! A ga-eji ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi ndị a. E mechaa ha, ụmụnna ekwuo ihe ha mụtara n’ihe ngosi nke ọ bụla.
10 min: Mkpa ọgbakọ.
10 min: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gwa ndị nkwusa ka ha kọwaa otú ihe e kwuru n’isiokwu bụ́ “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Izi Ozi Ọma n’Ebe Ndị Mmadụ Na-akpa Afọ Ha,” sirila nyere ha aka n’ozi ọma. Gwakwa ha ka ha kọọ ahụmahụ ọ bụla dị ụtọ ha nwere.
Abụ nke 98 na Ekpere