Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/97 p. 4
  • Nyere Ndị Ọzọ Aka Inweta Nkasi Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nyere Ndị Ọzọ Aka Inweta Nkasi Obi
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ṅomie Jehova Site n’Inwe Ezi Nchegbu Maka Ndị Ọzọ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Jiri Broshuọ Kpọsaa Ozi Ọma Alaeze Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Jiri Broshọ Bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! Na-amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Broshuọ Ọhụrụ A Ga-enyefe!
    Ozi Alaeze Anyi—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 7/97 p. 4

Nyere Ndị Ọzọ Aka Inweta Nkasi Obi

1 Ike ịnụ banyere ọdachi, agha, mpụ, na nhụjuanya agwụwo ọtụtụ ndị. Nkasi obi, ọ bụ ezie na ọ dị ụkọ n’ụzọ pụtara ìhè n’akụkọ nke taa, bụ n’ezie ihe dị ihe a kpọrọ mmadụ mkpa. Ịkasi obi pụtara “inye ume na olileanya” na “ibelata iru újú ma ọ bụ nsogbu” onye ọzọ. Dị ka Ndịàmà Jehova, a kwadebere anyị isi n’ụzọ dị otú a nyere ndị mmadụ aka. (2 Kọr. 1:3, 4) Broshuọ anyị ndị dabeere na Bible ndị anyị ga na-enyefe na July na August nwere ozi eziokwu ndị na-akasi obi. (Rom 15:4) Ndị a bụ aro ụfọdụ maka iche ha n’ihu mmadụ n’ọnọdụ dịgasị iche iche:

2 Akụkọ ọjọọ pụrụ ime ka e nwee ohere ịgba àmà na iwetara ndị ọzọ nkasi obi, ikekwe site na gị ikwu ihe yiri nke a:

◼ “Mgbe ihe ndị dị otú ahụ mere, ụfọdụ na-eche ma Chineke ọ̀ dị n’ezie, ọ bụrụkwa na ọ dị, ma ọ̀ na-eche banyere anyị. Gịnị ka i chere? [Nye ohere maka nzaghachi.] Otu ụzọ isi chọpụta ma Chineke ọ̀ dị bụ itinye otu ụkpụrụ a nwapụtaworo n’ọrụ.” Gụọ Ndị Hibru 3:4. Kọwapụta ihe ndị ọzọ gbara anyị gburugburu ndị o doro anya na ha ga-enwe onye mere ha. Mgbe ahụ gaa n’ihu: “Enwere m otu broshuọ nke m ma ga-abụrụ gị ihe nkasi obi. A kpọrọ ya Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? [Gụpụta ajụjụ ndị dị n’ihu akwụkwọ ya.] O nwere ihe àmà doro anya ọ bụghị nanị na Chineke dị kamakwa na n’isi nso ọ ga-eweta ọnọdụ nile na-ezighị ezi ndị anyị na-eche ihu taa ná njedebe. Nke a pụrụ ịbụ nke gị n’ụtụ ₦15.” Mee ndokwa ịlaghachi.

3 Ná nletaghachi, ị pụrụ ikwu, sị:

◼ “Anyị nọ na-ekwu banyere ihe àmà nke ịdị adị Chineke mgbe m hapụụrụ gị broshuọ ahụ bụ́ Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? Ikekwe ị hụrụ isi ihe a na peji nke 7. [Gosi ihe osise ahụ ma chịkọta paragraf nke 15.] Nke a bụ nanị otu ihe atụ na-egosi na Chineke nke na-eche banyere mmadụ aghaghị ịdị adị n’ezie. [Gụpụta paragraf nke 27 na peji nke 9.] Ọmụmụ ihe onwe onye nke Bible enyeworo m aka ịnagide nsogbu ndị a na-enwe kwa ụbọchị ná ndụ n’ihi na ọ na-ekwu ihe bụ echiche Chineke n’okwu dị iche iche.” Kwuo ka i gosi otú e si amụ ihe.

4 Site n’iji broshuọ bụ́ “Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?” ị pụrụ ịkọwa onwe gị ma kwuo, sị:

◼ “Eji m ozi dị mkpa nke a kọwara na broshuọ a, bụ́ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya? wee na-akpọtụrụ gị.” Gụpụta paragraf nke mbụ na peji nke 4 na broshuọ ahụ. Jụọ onye nwe ụlọ ihe o chere, nyekwa ohere maka nzaghachi. “Bible, n’Aịsaịa 45:18, na-egosi na e bu anyị n’uche wee kee ụwa.” [Gụọ.] Mgbe ahụ, kọwaa nzube nke broshuọ ahụ, ma nyefee otu n’ụtụ ₦15.

5 N’ọkpụkpọ na-esochi, ị pụrụ ịnwale ụzọ njekwuru a iji malite ọmụmụ ihe:

◼ “Ọ ga-amasị m ikwukwu okwu ná mkparịta ụka ikpeazụ anyị site n’ịkọwa onye pụrụ ịgwa anyị nzube nke ndụ. [Kọwaa n’okwu nke aka gị paragraf nke 1 na nke 2 na peji nke 6 nke broshuọ Nzube nke Ndụ.] Mkpughe 4:11 na-akọwa na Jehova Chineke bụ Onye Okike anyị. [Gụọ.] N’ezie ọ ghaghị inwe ihe mere o ji kee anyị. Ndị chọworo ịmata ihe ọ bụ amụwo Okwu Chineke e dere ede, bụ́ Bible. Ọ ga-amasị m inye gị ohere ahụ.” Kọwaa otú e si eduzi usoro ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu anyị ma mee ndokwa ịmalite ọmụmụ ihe ahụ.

6 Ụzọ njekwuru a dị mma pụrụ ịkasi ndị onye ha hụrụ n’anya nwụnahụworo obi:

◼ “Ana m eje ozi ọha na eze maka ndị nile onye ha hụrụ n’anya nwụnahụworo. Ebe nke a pụrụ ịbụ otu n’ime ihe ndị sikarịsịrị ike onye ọ bụla n’ime anyị ga-anagide mgbe ọ bụla, a kwadebewo broshuọ a, bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. O nyeworo ọtụtụ nde mmadụ aka. Ọ ga-amasị m igosi gị ihe o kwuru banyere otu nkwa na-akpali akpali Jisọs Kraịst kwere. [Gụpụta paragraf nke ise na peji nke 26, tinyere Jọn 5:21, 28, 29.] Rịba ihe osise a dị na peji nke 29 ama nke na-egosi ihe ndekọ Oziọma ahụ nke Jisọs ịkpọlite Lazarọs n’ọnwụ n’ezie. Obi ga-adị m ụtọ ịhapụrụ gị broshuọ a na-akasi obi n’ụtụ ₦15.”

7 Mgbe ị laghachiri, ị pụrụ igosighachi ihe osise ahụ dị na peji nke 29 na broshuọ ahụ bụ́ “Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ” ma kwuo, sị:

◼ “Cheta nkwurịta okwu anyị banyere mkpọlite Kraịst kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ. [Gụpụta okwu nkọwa ihe osise dị na peji nke 28, ma tụlee ihe dị n’isiokwu nta bụ́ “Ò Mere Eme n’Ezie?” dị na peji nke 27] Ọ bụrụ na ọ na-agụsi obi gị agụụ ike ikweta na ị pụrụ ịhụ onye a hụrụ n’anya nwụrụ anwụ anya ọzọ, ka m nyere gị aka inwe olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ.” Kwuo ka i duziere ya ọmụmụ Bible ebe obibi.

8 Ka anyị mee ihe nile anyị nwere ike ime n’ọnwa ndị dị n’ihu iṅomi Jisọs site ‘n’ịkasi ndị nile na-eru újú obi.’—Aịsa. 61:2.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya