Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/97 p. 3
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Tinyesie Mgbalị Ike n’Ịgụ Ihe
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ikwu Okwu Otú I Si Ekwu Okwu
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ikwu Okwu n’Ụzọ Na-aga Were Were n’Ọnụ
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Ịkwadebe Okwu Onye Mmụta Maka Ụlọ Akwụkwọ
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 7/97 p. 3

Igbe Ajụjụ

◼ Gịnị ka e kwesịrị iburu n’uche banyere ịgụpụta paragraf ná nzukọ?

A na-eji ihe dị ukwuu n’oge e kenyere maka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ agụpụta paragraf. Nke a pụtara na nwanna nwoke e kenyere dị ka onye na-agụ ihe nwere ibu ọrụ dị arọ dị ka onye nkụzi. Ọ ghaghị ịgụ ihe n’ụzọ ‘a ga-amata isi ihe’ dị n’ihe ọgụgụ ahụ ka ọ ghara ịbụ nanị na ndị na-ege ntị ghọtara ya kamakwa na a ga-akwali ha ime ihe. (Neh. 8:8) N’ihi ya, ọ dị onye ahụ na-agụ ihe mkpa ịkwadebe nke ọma maka ihe omume ya. (1 Tim. 4:13; lee ihe ọmụmụ nke 6 n’Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ.) Ndị a bụ ụfọdụ ihe ndị dị mkpa maka ịgụ ihe bara uru n’ihu ọha.

Mesie Echiche Okwu Ike n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị: Buru ụzọ chọpụta okwu ma ọ bụ nkebi okwu ndị ọ dị mkpa ka e mesie ike iji wee nye nghọta ziri ezi.

Kpọpụta Okwu n’Ụzọ Ziri Ezi: Mkpọpụta okwu kwesịrị ekwesị na nke doro anya dị mkpa ma ọ bụrụ na ndị na-ege ntị ga-aghọta okwu ndị pụtara ná mbipụta ahụ. Chọọ okwu ndị a na-amaghị ma ọ bụ ndị a na-adịghị ejikarị eme ihe n’akwụkwọ ọkọwa okwu, ma ọ bụ gee ntị na kaseti Society.

Jiri Olu Dara Ụda na Ikpo Ọkụ Kwuo Okwu: Ikwusi okwu ike n’ụzọ na-ekpo ọkụ na-eme ka e nwee mmasị, na-akpali mmetụta uche, na-akwalikwa onye na-ege ntị.

Na-ekpo Ọkụ ma Na-ekwu Okwu n’Ụzọ Mkparịta Ụka: Ikwu okwu otú mmadụ si ekwu na okwu ịga were were n’ọnụ na-agakọ. Site n’ime nkwadebe na ịmụgharị ihe, onye ahụ na-agụ ihe pụrụ ịtụsara ahụ, ihe ọ ga-arụpụtakwa ga na-adọrọ adọrọ kama ịbụ nanị n’otu olu na nke na-agwụ ike.—Hab. 2:2.

Gụọ Ihe ahụ Dị Ka E Si Bie Ya: A na-agụpụtakarị nkọwa ala ala peji nakwa ihe ọmụma dị n’ime akara ngebichi ma ọ bụ braket ma ọ bụrụ na ha na-eme ka ihe ahụ e biri ebi doo anya. Nanị ebe dị iche bụ ntụaka ndị na-akọwa nanị ebe e si nweta ihe ọmụma. E kwesịrị ịgụpụta nkọwa ala ala peji mgbe e zoro aka na ya n’ime paragraf, na-ekwu tupu a gụpụta ya, sị: “Nkọwa ala ala peji na-agụ . . .” Mgbe a gụsịrị ya, maliteghachi n’ebe fọrọ na paragraf ahụ.

Mgbe a gụrụ ọgụgụ ihe n’ihu ọha nke ọma, ọ bụ otu n’ime ụzọ ndị dị mkpa anyị pụrụ isi ‘zie ndị ọzọ idebe ihe nile e nyere n’iwu’ site n’aka Onye Ozizi Ukwu anyị.—Mat. 28:20.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya