Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs
Mgbe Jisọs nọ n’elu ala, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kpee ekpere maka Alaeze Chineke: “Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:9, 10) O kwukwara okwu mgbe mgbe banyere “ozi ọma nke alaeze ahụ.” (Matiu 4:23) N’eziokwu, o kwuru okwu banyere Alaeze ahụ karịa otú o kwuru banyere ihe ọ bụla ọzọ. N’ihi gịnị? N’ihi na Alaeze ahụ bụ ngwá ọrụ nke Chineke ga-eji mee ihe ịgwọta nsogbu nile ndị na-eme ka ndụ sie oké ike taa. N’isi nso a, site n’Alaeze ahụ, Chineke ga-akwụsị agha nile, agụụ, nrịrịa, na imempụ, ọ ga-ewetakwa ịdị n’otu na udo.
Ọ̀ ga-amasị gị ibi n’ime ụwa nke dị otú ahụ? Ọ bụrụ otú a, ị kwesịrị ịgụ akwụkwọ nta nke a. N’ime ya, ị ga-amụta na Alaeze ahụ bụ ọchịchị dị adị n’ezie, ma ọ ka ọchịchị ọ bụla chịworo agbụrụ mmadụ mgbe ọ bụla mma. Ị ga-ahụkwa ụzọ na-enye obi ụtọ nke Chineke si jiri nwayọọ nwayọọ kọwaara ndị ohu ya nzube ya nile gbasara Alaeze ahụ. Tụkwasị na nke a, ị ga-ahụkwa ụzọ Alaeze ahụ pụrụ isi nyere gị aka ọbụna taa.
N’eziokwu, ị pụrụ ịghọ onye Alaeze Chineke na-achị ugbu a. Ma tupu ị họrọ ime nke a, ọ ga-adị gị mkpa ịmụtakwu ihe banyere ya. Ya mere, anyị na-agba gị ume inyocha akwụkwọ nta nke a. Ihe nile ọ ga-agwa gị banyere Alaeze ahụ sitere na Bible.
Mbụ, ka anyị hụ ihe mere Alaeze Chineke ji dị anyị mkpa nke ukwuu.
Ná mmalite akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, Chineke mere mmadụ ka o zuo okè, wee tinye ya n’ime paradaịs. N’oge ahụ mkpa maka Alaeze ahụ adịghị.
Otú ọ dị, Adam na Iv, nna na nne anyị mbụ, gere Setan, bụ́ mmụọ ozi na-enupụ isi ntị. Ọ ghaara ha ọtụtụ ụgha banyere Chineke, meekwa ka ha nupụkwara Chineke isi. Ya mere ha kwesịrị ịnwụ anwụ, n’ihi na “ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.”—Ndị Rom 6:23.
Mmadụ nke na-ezughị okè, bụ́ onye mmehie apụghị ịmụta ụmụ ndị zuru okè. Ya mere, a mụrụ ụmụ Adam nile dị ka ndị na-ezughị okè, ndị na-eme mmehie, ndị na-anwụ anwụ.—Ndị Rom 5:12.
Bido mgbe ahụ gaa n’ihu, Alaeze Chineke dịrị ụmụ mmadụ mkpa iji nyere ha aka inwere onwe ha pụọ n’ọbụbụ ọnụ nke mmehie na ọnwụ. Alaeze ahụ ga-agọpụkwa aha Chineke pụọ n’ụgha nile Setan ghara megide ya.
Jehova Chineke kwere nkwa na a ga-amụ otu “mkpụrụ” (ma ọ bụ nwa) pụrụ iche iji napụta agbụrụ mmadụ ná mmehie. (Jenesis 3:15) “Mkpụrụ” a gaje ịbụ Eze nke Alaeze Chineke.
Ònye ka ọ ga-abụ?
Ihe dị ka 2,000 afọ ka Adam mehiesịrị, e nwere otu nwoke kwesịrị ntụkwasị obi nke ukwuu onye aha ya bụ Abraham. Jehova gwara Abraham ka ọ kwapụ n’obodo nke aka ya jee biri n’ụlọ ikwuu n’ala Palestine.
Abraham mere ihe nile Jehova sịrị ya mee, tinyere otu ihe sigburu onwe ya n’ike. Jehova gwara ya ka ọ chụọ Aisak nwa ya n’àjà n’elu ebe ịchụ àjà.
N’ezie, Jehova achọghị ka e jiri mmadụ chụọrọ ya àjà. Kama ọ chọrọrịị ịmata ókè Abraham hụruru ya n’anya. Ọ fọrọ nnọọ nke nta ka Abraham gbuo Aisak mgbe Jehova gbochiri ya.
N’ihi oké okwukwe nke Abraham nwere, Jehova kwere nkwa inye ụmụ ya ala Palestine, sịkwa na Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-esite n’usoro ezinụlọ ya na nke nwa ya bụ Aisak.—Jenesis 22:17, 18; 26:4, 5.
Aisak mụrụ ụmụ ejima, bụ́ Ịsọ na Jekọb. Jehova sịrị na Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-esite na Jekọb.—Jenesis 28:13-15.
Jekọb, onye Jehova kpọkwara Israel, mụtara ụmụ nwoke iri na abụọ, ha nile mesịkwara mụtachaa ụmụ. Ya mere ụmụ Abraham malitere ịmụba.—Jenesis 46:8-27.
Mgbe ụnwụ ọjọọ dara n’akụkụ ebe ahụ, Jekọb na ezinụlọ ya kwagara n’Ijipt mgbe Fero, onye na-achị Ijipt kpọrọ ha.—Jenesis 45:16-20.
N’Ijipt, e kpughere na Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa gaje isite n’osuso ọmụmụ nwa Jekọb, bụ́ Juda.—Jenesis 49:10.
N’ikpeazụ, Jekọb nwụrụ, ụmụ ya wee mụbaa n’ọnụ ọgụgụ ruo mgbe ha hara ka otu mba. Mgbe ahụ ndị Ijipt malitere ịtụ ha egwu, wee mee ka ha bụrụ ohu.—Ọpụpụ 1:7-14.
N’ikpeazụ, Jehova zigara Moses, nwoke kwesịrị ntụkwasị obi nke ukwuu, ịrịọ ka Fero nke oge ahụ kwe ka ụmụ Israel nwere onwe ha.—Ọpụpụ 6:10, 11.
Fero ekweghị, ya mere, Jehova tiri ndị Ijipt ihe otiti iri. Dị ka ihe otiti nke ikpeazụ, o zigara mmụọ ozi nke ọnwụ igbu ụmụ nwoke nile e buru ụzọ mụọ nke Ijipt.—Ọpụpụ, isi 7 ruo 12.
Chineke gwara ndị Israel na ọ bụrụ na ha ga-egbu nwa atụrụ maka nri anyasị ha, teekwa ụfọdụ n’ime ọbara ya n’awara ụzọ ha, mmụọ ozi nke ọnwụ ga-agabiga ụlọ ha nile. Ya mere, a zọpụtara ụmụ e buru ụzọ mụọ nke ndị Israel.—Ọpụpụ 12:1-35.
N’ihi nke a, Fero nyere ụmụ Israel iwu isi n’Ijipt pụọ. Ma emesịa, ọ gbanwere obi ya, wee chụsoo ha n’azụ ịkpọghachi ha.
Jehova megheere ụmụ Israel ụzọ mgbapụ n’etiti Osimiri Uhie. Ma mgbe Fero na usuu ndị agha ya nwara iso ha, mmiri gbagburu ha. —Ọpụpụ 15:5-21.
Jehova duuru ụmụ Israel ruo n’otu ugwu a na-akpọ Sainai nke dị n’ọzara. N’ebe ahụ, o nyere ha Iwu ya, wee sị na ọ bụrụ na ha edebe ya, ha ga-aghọ alaeze ndị nchụaja na mba dị nsọ. Otú a, mgbe oge ruru, ụmụ Israel nwetara ohere nke ịbụ akụkụ dị mkpa nke Alaeze Chineke.—Ọpụpụ 19:6; 24:3-8.
Mgbe ndị Israel nọsịrị n’Ugwu Sainai ruo ihe dị ka otu afọ, Jehova duuru ha gawa n’ụzọ Palestine, bụ́ ala ahụ nke o kwere Abraham, bụ́ nna ha ochie ná nkwa.
Na Palestine, Chineke mesịrị kwere ka ndị eze na-achị ndị Israel. Mgbe ahụ, Chineke nwere alaeze n’elu ala.
Eze nke abụọ nke Israel bụ Devid, onye si n’usoro ọmụmụ Juda. Devid meriri ndị iro Israel nile n’agha, o mekwara Jerusalem isi obodo nke mba ahụ.
Ihe ndị mere n’oge Devid na-achị gosiri na ọ bụrụhaala na Jehova akwadoo eze ọ bụla, ọ dịghị onye ọchịchị elu ala pụrụ imeri ya.
Jehova kwuru na Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa ga-abụ otu n’ime ndị sitere n’usoro ọmụmụ Devid.—1 Ihe Emere 17:7, 11, 14.
Solomon, nwa Devid, chịrị mgbe Devid chịsịrị. Ọ bụ eze nwere amamihe, ihe gakwaara Israel nke ọma mgbe ọ na-achị.
Solomon wukwaara Jehova ụlọ nsọ mara mma na Jerusalem. Ọnọdụ ndị dị n’Israel mgbe Solomon na-achị na-egosi anyị ngọzi ụfọdụ nke Alaeze Chineke nke na-abịa abịa ga-ewetara agbụrụ mmadụ.—1 Ndị Eze 4:24, 25.
Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime ndị eze ndị so Solomon n’azụ bụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi.
Ma mgbe ndị si n’osuso ọmụmụ Devid ka nọ na-achị na Jerusalem, Jehova ji onye amụma ya bụ Aisaia kwuo banyere otu Nwa Devid a ga-amụ n’ọdịnihu, onye gaje ịchị ụwa nile n’ikwesị ntụkwasị obi. Nke a ga-abụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa.—Aisaia 9:6, 7.
Aisaia onye amụma buru amụma na ọchịchị Ya ga-adị ebube ọbụna karịa nke Solomon.—Aisaia, isi 11 na 65.
Ugbu a, karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ndị ohu Chineke nọrọ na-eche onye Mkpụrụ ahụ ga-abụ.
Ma, tupu Mkpụrụ ahụ abịa, ndị eze Israel ghọrọ ndị ọjọọ nke ukwuu nke na, na 607 T.O.A., Jehova kwere ka ndị Babilọn merie mba ahụ, a dọkwaara ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ahụ laa Babilọn. Ma Chineke echezọbeghị nkwa ya. Mkpụrụ ahụ ka ga-apụtakwa site n’eriri Devid.—Ezikiel 21:25-27.
Ihe mere Israel gosiri na ọ bụ ezie na eze bụ mmadụ onye nwere amamihe, kwesịkwa ntụkwasị obi pụrụ iweta ọtụtụ abamuru, abamuru ndị a bụ ihe a kpaara ókè. Ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-anwụ anwụ, ndị nnọchi anya ha pụkwara ịbụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Gịnị bụ ihe ngwọta ya? Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa.
N’ikpeazụ, mgbe ọtụtụ puku afọ gasịrị, Mkpụrụ ahụ pụtara. Ònye ka ọ bụ?
Otu mmụọ ozi nke si n’ebe Chineke nọ nyere nwa agbọghọ Israel na-alụbeghị di aha ya bụ Meri azịza ya. Ọ gwara ya na ọ gaje ịmụta nwa nwoke onye aha ya ga-abụ Jisọs. Nke a bụ ihe mmụọ ozi ahụ kwuru:
“Nwa nwoke ahụ ga-abụ onye ukwu, a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye kachasị ihe nile elu; [Jehova] Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nna ya Devid, ọ ga-abụkwa eze.”—Luk 1:32, 33.
Ya mere, ọ bụ Jisọs gaje ịbụ Mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa, n’ikpeazụkwa, Eze nke Alaeze Chineke. Ma n’ihi gịnị ka Jisọs ji dị iche ná ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi, ndị dịrị ndụ tupu ọ bịa?
A mụrụ Jisọs site n’ọrụ ebube. Nne ya bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, o nweghịkwa nna ọ bụla bụ mmadụ. Jisọs adịworịị ndụ mbụ n’eluigwe, mmụọ nsọ Chineke ma ọ bụ ihe ọrụ ya, bufere ndụ Jisọs site n’eluigwe baa n’ime akpa nwa Meri. N’ihi nke a, o ketaghị mmehie Adam. Ná ndụ ya nile, Jisọs emeghị mmehie.—1 Pita 2:22.
Mgbe ọ gbara iri afọ atọ, e mere Jisọs baptism.
Ọ kọọrọ ndị mmadụ maka Alaeze Chineke, wee mesịa kọwapụta onwe ya dị ka Eze nke Alaeze ahụ.—Matiu 4:23; 21:4-11.
Ọ rụkwara ọtụtụ ọrụ ebube.
Ọ gwọrọ ndị ọrịa.—Matiu 9:35.
O si n’ụzọ ọrụ ebube nye ndị agụụ na-agụ ihe oriri.—Matiu 14:14-22.
Ọ kpọlitere ọbụna ndị nwụrụ anwụ.—Jọn 11:38-44.
Ọrụ ebube ndị ahụ na-egosi ụdị ihe ndị Jisọs ga-emere agbụrụ mmadụ dị ka Eze nke Alaeze Chineke.
Ị̀ chetara otú Eze Devid siri mee Jerusalem isi obodo nke alaeze ya? Jisọs kọwara na Alaeze Chineke agaghị abụ n’elu ala, kama n’eluigwe. (Jọn 18:36) Ọ bụ ya mere e ji akpọ Alaeze ahụ “Jerusalem nke dị n’eluigwe.”—Ndị Hibru 12:22, 28.
Jisọs kọwapụtara iwu nile nke ndị Alaeze ahụ ga-achị ga na-edebe. Iwu ndị a dị ugbu a n’ime Bible. Iwu ndị kachasị mkpa bụ na ụmụ mmadụ kwesịrị ịhụ Chineke n’anya, hụkwa ibe ha n’anya.—Matiu 22:37-39.
Jisọs kpughekwara na ọ bụghị nanị ya ga-achị n’Alaeze ya. A ga-enwe mmadụ ndị a họpụtara ije n’eluigwe wee soro ya chịa n’ebe ahụ. (Luk 12:32; Jọn 14:3) Òle ka ha ga-adị? Mkpughe 14:1 na-aza: 144,000.
Ọ bụrụ na nanị 144,000 ga-eje eluigwe isoro Jisọs chịa, gịnị ka ihe fọdụrụ nke ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ ile anya ya?
Bible na-asị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.
A na-akpọ ndị ahụ ga-ebi n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi “atụrụ ọzọ.”—Jọn 10:16.
Ya mere, olileanya abụọ dị. E nwere 144,000 ndị Jehova Chineke kpọrọ ịbịa n’eluigwe iso Jisọs Kraist chịa. Ma ọtụtụ nde ndị ọzọ nwere olileanya e ji n’aka nke ịdị ndụ n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi dị ka ndị Alaeze ya na-achị.—Mkpughe 5:10.
Setan kpọrọ Jisọs asị, megidekwa ya. Ka Jisọs kwusasịrị ozi ọma afọ atọ na ọkara, Setan mere ka e jide ya, gbuokwa ya site n’ịkpọgide ya n’elu osisi. N’ihi gịnị ka Chineke ji kwe ka nke a mee?
Cheta na n’ihi ịbụ ndị sitere n’Adam, anyị nile na-eme mmehie, kwesịkwa ịnwụ anwụ.—Ndị Rom 6:23.
Chetakwa na n’ihi ụzọ ọrụ ebube nke e si mụọ Jisọs, ọ bụ onye zuru okè, o kwesịghịkwa ịnwụ anwụ. Otú ọ dị, Chineke hapụrụ Setan ka o ‘chifịa Jisọs n’ikiri ụkwụ,’ ka o gbuo ya. Ma Chineke kulitere ya ná ndụ ọzọ dị ka mmụọ na-apụghị ịnwụ anwụ. Ebe ọ ka rukwara eru maka ndụ mmadụ zuru okè, ọ pụrụ iji nke a mee ihe ugbu a ịgbapụta anyị bụ mmadụ ná mmehie.—Jenesis 3:15; Ndị Rom 5:12, 21; Matiu 20:28.
Iji nyere anyị aka ịghọta nke ọma ihe àjà Jisọs pụtara, Bible na-ekwu banyere ya site n’ihe atụ amụma dị iche iche.
Dị ka ihe atụ, ị̀ chetara otú Jehova si gwa Abraham ka o jiri nwa ya chụọ àjà, dị ka ule nke ịhụnanya ya?
Nke a bụ ihe atụ amụma nke àjà Jisọs. O gosiri otú ịhụnanya Jehova maka agbụrụ mmadụ si dị ukwuu nke na o kwere ka Ọkpara ya, bụ́ Jisọs nwụọrọ anyị ọnwụ ka anyị wee nwee ndụ.—Jọn 3:16.
Ị̀ chetara otú Jehova si napụta ụmụ Israel n’Ijipt, zọpụtakwa ụmụ ha e buru ụzọ mụọ site n’ime ka mmụọ ozi nke ọnwụ gabiga ha?—Ọpụpụ 12:12, 13.
Nke a bụrịị ihe atụ amụma. Dị ka ọbara nwa atụrụ ahụ pụtara ndụ nye ụmụ nile e buru ụzọ mụọ nke ndị Israel, ọbara Jisọs a wụsịrị pụtara ndụ nye ndị kweere na ya. Ọzọ, otú ihe ndị mere n’abalị ahụ si pụta inwere onwe nye ndị Israel ahụ, ọnwụ Jisọs wetaara ihe a kpọrọ mmadụ inwere onwe pụọ ná mmehie na ọnwụ.
Ọ bụ ya mere e ji akpọ Jisọs “Nwa atụrụ Chineke nke na-ebupụ mmehie nke ụwa.”—Jọn 1:29.
Otú ọ dị, mgbe Jisọs nọ n’ụwa, ọ chikọtakwara ụmụazụ, nyekwa ha ọzụzụ iji na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ, ọbụna mgbe ọ nwụsịrị.—Matiu 10:5; Luk 10:1.
Ndị a bụ ụmụ mmadụ mbụ ndị Chineke họpụtara iso Jisọs chịa n’Alaeze ya.—Luk 12:32.
Ị̀ chetara na Chineke kwere ndị Juu ahụ nkwa na ọ bụrụ na ha edebe Iwu ya, na ha ga-abụ “alaeze ndị nchụaja”? Ugbu a, ha nwere ohere nke ịbụ akụkụ nke Alaeze Chineke, jekwaa ozi dị ka ndị nchụaja nke eluigwe ma ọ bụrụ na ha ga-anabata Jisọs. Ma ihe ka ọtụtụ n’ime ha jụrụ Jisọs.
Ya mere, bido mgbe ahụ gaa n’ihu, ndị Juu abụghịkwa mba Chineke họpụtara ọzọ; Palestine abụghịkwa Ala Nkwa ahụ.—Matiu 21:43; 23:37, 38.
Site n’oge Jisọs ruo taa, Jehova nọ na-achịkọta ndị a, bụ́ ndị ga-eso Jisọs chịa n’eluigwe. A ka nwere puku ole na ole n’ime ha ndị nọ ndụ n’elu ala taa. Anyị na-akpọ ha ihe fọdụrụ e tere mmanụ.—Mkpughe 12:17.
Ugbu a, ị malitela ịhụ ihe Alaeze Chineke bụ. Ọ bụ ọchịchị dị n’eluigwe, Eze ya bụ Jisọs Kraist, 144,000 mmadụ ndị sitere n’elu ala ga-esonyere ya. Ọ ga-achị agbụrụ mmadụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’elu ala, ọ ga-enwekwa ike iweta udo n’elu ala.
Mgbe ọ nwụsịrị, e si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Jisọs, ọ gakwara n’eluigwe. N’ebe ahụ, o cheere ka Chineke kwuo mgbe oge ga-eru ka ọ malite ịchị achị dị ka Eze nke Alaeze Chineke. (Abụ Ọma 110:1) Olee mgbe nke ahụ ga-abụ?
Mgbe ụfọdụ, Jehova na-ezigara ndị mmadụ nrọ dị iche iche iji wee kọọrọ ha ihe ndị gbasara Alaeze ya.
N’oge Daniel, Jehova zigaara Nebukadneza, bụ́ eze Babilọn, nrọ dị otú ahụ. Ọ bụ nke otu osisi buru oké ibu.—Daniel 4:10-37.
E gbuturu osisi ahụ, kekwaa ógwè mkpọrọgwụ ya agbụ ruo afọ asaa.
Osisi ahụ nọchiri anya Nebukadneza. Dị nnọọ ka e si kee ógwè mkpọrọgwụ ahụ agbụ ruo afọ asaa, ara wịrị Nebukadneza ruo afọ asaa. E mesịrị nyeghachi ya isi izu okè ya.
Ihe ndị a nile bụ ihe atụ amụma. Nebukadneza sere onyinyo ịchị isi Jehova nke zuru ụwa nile. Na mbụ, ndị chịrị ọchịchị a bụ ndị sitere n’usoro ọmụmụ Eze Devid na Jerusalem. Mgbe Babilọn meriri Jerusalem na 607 T.O.A., a kwụsịrị usoro ndị eze ahụ. Ọ dịkwaghị mgbe a ga-enwe eze ọzọ n’usoro ezinụlọ Devid “ruo mgbe ọ ga-abịa, bụ́ onye o ruru aka.” (Ezikiel 21:27) Onye ahụ bụ Jisọs Kraist.
Ogologo oge ha aṅaa ka ọ ga-ewe site na 607 T.O.A. ruo mgbe Jisọs ga-amalite ịchị achị? Afọ asaa nke amụma. Ya bụ 2,520 afọ. (Mkpughe 12:6, 14) Ya mere 2,520 afọ site na 607 T.O.A. na-eweta anyị na 1914 O.A.
Ya mere, Jisọs malitere ịchị achị n’eluigwe na 1914. Gịnị ka nke ahụ pụtara?
Bible gwara anyị site n’otu ọhụ nke Jọn onye ozi hụrụ.
Ọ hụrụ ka otu nwanyị nke nọ n’eluigwe mụpụtara otu nwa nwoke.—Mkpughe 12:1-12.
Nwanyị ahụ sere onyinyo nzukọ Chineke nke eluigwe, nke ndị mmụọ ozi nile nọ n’eluigwe, bụ́ ndị ohu Chineke mezuru. Nwa nwoke ahụ sere onyinyo Alaeze Chineke. A “mụrụ” nke a na 1914.
Olee ihe ọzọ merenụ? Ihe mbụ Jisọs mere dị ka Eze bụ isi n’eluigwe chụpụ Setan, na ndị mmụọ ozi ahụ so ya nupụ isi, chụda ha n’elu ala.—Mkpughe 12:9.
Bible na-agwa anyị ihe si na ya pụta: “Ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bi n’ime ha. Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri, n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.”—Mkpughe 12:12.
Ya mere, mgbe Jisọs malitere ịchị achị n’eluigwe, ndị iro ya rụsiwere ọrụ ike n’elu ala. Dị ka Bible buru n’amụma, ọ malitere ịchị achị n’etiti ndị iro ya.—Abụ Ọma 110:1, 2.
Gịnị ka nke a gaje ịpụtara ihe a kpọrọ mmadụ?
Jisọs gwara anyị: agha dị iche iche, ụkọ nri, nrịrịa, na ala ọma jijiji.—Matiu 24:7, 8; Luk 21:10, 11.
Anyị ahụla ka ihe ndị a na-eme kemgbe 1914, nke bụ ihe ọzọ mere anyị ji mata na Alaeze ahụ malitere ịchị mgbe ahụ.
A ga-enwekwa ‘mkpagbu nke mba dị iche iche, n’amaghị ụzọ mgbapụ mgbe ndị mmadụ na-atụbọ site n’egwu.’ (Luk 21:25, 26) Anyị ahụkwala nke ahụ, kemgbe 1914.
Pọl onye ozi kwukwara na ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, . . . ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, . . . ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha.”—2 Timoti 3:1-5.
Ugbu a, ị marala ihe mere ndụ ji sie oké ike taa. Setan nọ na-arụsi ọrụ ike. Ma Alaeze Chineke nọkwa na-arụsi ọrụ ike.
Ngwa ngwa mgbe 1914 gasịrị, ndị fọdụrụ n’ime ndị ahụ nwere olileanya nke iso Jisọs chịa achịa n’eluigwe malitere izisa ozi ọma na e guzobewo Alaeze ahụ. Ọrụ a agbasazuwo n’elu ala nile ugbu a, dị ka Jisọs sịrị na ọ ga-agbasa.—Matiu 24:14.
Gịnị bụ nzube nke ọrụ nkwusa nke a?
Mbụ, ọ bụ iji kọọrọ ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke.
Nke abụọ, ọ bụ iji nyere ndị mmadụ aka ikpebi ma ha chọrọ ịbụ ndị Alaeze ahụ ga-achị.
Jisọs sịrị na n’ime oge anyị, na a ga-ekewa ihe a kpọrọ mmadụ ịbụ ndị yiri atụrụ na ndị yiri ewu.—Matiu 25:31-46.
Ndị bụ “atụrụ” ga-abụ ndị hụrụ ya na ụmụnna ya n’anya. Ndị bụ “ewu” ga-abụ ndị na-emeghị otú ahụ.
Ndị bụ “atụrụ” ga-enweta ndụ ebighị ebi, ma ndị bụ “ewu” agaghị enweta.
A na-arụzu ọrụ nkewa nke a site ná nkwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ.
Nke a bụ otu amụma nke Aisaia onye amụma buru.
“Ọ ga-erukwa n’ikpeazụ nke ụbọchị ndị a, na ugwu nke ụlọ Jehova ga na-eguzosi ike n’elu ugwu nile, a ga-ebulikwa ya elu karị ugwu nta nile; mba nile ga-eruba n’ime ya dị ka osimiri.”—Aisaia 2:2.
Ihe a kpọrọ mmadụ nọ n’ime “ikpeazụ nke ụbọchị ndị a” ugbu a.
‘E buliwo’ “ụlọ” nke ofufe Jehova elu karịa okpukpe ụgha nile.
“Ọtụtụ ndị dị iche iche ga-ejekwa, sị, Bịanụ, ka anyị rịgoruo ugwu Jehova, ruo ụlọ Chineke nke Jekọb; ọ ga-ezikwa anyị ụzọ ya ụfọdụ, anyị ga-ejekwa ije n’okporo ụzọ ya nile.”—Aisaia 2:3.
Ya mere, ọtụtụ ndị si ná mba nile na-abịa ife Jehova ofufe, na-akpọkwa ndị ọzọ òkù ịbịa sonyere ha. Ha na-amụta ịkpa àgwà n’ụzọ Jehova chọrọ.
“Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.”—Aisaia 2:4.
Ndị ahụ na-efe Jehova dị n’otu, bụrụkwa ndị udo.
Ihe si n’ọrụ a nke Alaeze Chineke pụta bụ na ugbu a, e nwere ihe karịrị nde mmadụ atọ n’ụwa nile, bụ́ ndị Alaeze ahụ na-achị.
A chịkọtara ha gburugburu ihe fọdụrụ ahụ, ndị fọdụrụ n’ime ndị ahụ nwere olileanya nke ije n’eluigwe, isoro Kraist chịa achịa.
Ha na-anata nri ime mmụọ site ná nzukọ Chineke.—Matiu 24:45-47.
Ha bụ òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke ndị Kraist, ndị hụrụ onwe ha n’anya n’ezie.—Jọn 13:35.
Ha nwere udo nke uche, olileanya maka ọdịnihu.—Ndị Filipai 4:7.
N’oge na-adịghị anya, a ga-ekwusazuworị ozi ọma ahụ. A ga-achịkọtazuwo “atụrụ” ahụ. Mgbe ahụ gịnị ka Alaeze ahụ ga-eme?
Ị̀ chetara na Eze Devid ahụ kwesịrị ntụkwasị obi meriri ndị iro nile nke ndị Chineke? Otú ahụ ka Eze, bụ́ Jisọs ga-emekwa.
N’otu mgbe, Eze Nebukadneza rọrọ nrọ banyere otu ihe oyiyi buru ibu nke bụ ihe atụ nke alaeze ụwa nile site n’oge ya ruo n’oge nke anyị.
Mgbe ahụ, ọ hụrụ otu nkume nke e si n’oké ugwu wapụta, o tipịakwara ihe oyiyi ahụ. Nkume ahụ nọchiri anya Alaeze Chineke.
Nke a pụtara mbibi nke ajọ usoro ihe nke dị ugbu a.—Daniel 2:44.
Ndị a bụ ihe ụfọdụ ndị Alaeze ahụ ga-ekpu ihu.
Okpukpe ụgha ga-apụ n’anya dị ka nkume igwe nri nke a tụnyere n’ime osimiri.—Mkpughe 18:21.
Ọ bụ ya mere e ji na-agba ndị nile hụrụ Chineke n’anya ume ka ha si n’okpukpe ụgha pụta UGBU A.—Mkpughe 18:4.
Ọzọ, Eze bụ Jisọs ‘ga-etipịa mba nile, ọ ga-ejikwa mkpanaka ígwè zụọ ha dị ka atụrụ.’—Mkpughe 19:15.
N’ihi nke a, Ndịàmà Jehova, ọ bụ ezie na ha na-akwụ ụtụ isi ha, na-erubekwara iwu nke ala ha isi, ha adịghị etinye onwe ha n’ime ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
N’ikpeazụ, a ga-atụba Setan n’onwe ya, bụ “dragọn” ukwu ahụ, n’ime abyss.—Mkpughe 20:2, 3.
Ọ bụ nanị “atụrụ” ndị ahụ, ndị doro onwe ha n’okpuru Jisọs dị ka Eze, ga-alanarị mkpagbu nke a.—Matiu 25:31-34, 41, 46.
Jọn onye ozi hụrụ ọhụ nke “atụrụ” ahụ ndị ga-alanarị mkpagbu ahụ.
“M wee hụ, ma lee, oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta, na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ na n’ihu nwa atụrụ ahụ, e gbokwasịworo ha uwe mwụda dị ọcha, igu nkwụ dịkwa n’aka ha.”—Mkpughe 7:9.
Ọ bụ ndị nile zaghachiri nke ọma ná nkwusa nke ozi ọma ahụ mejupụtara “oké ìgwè mmadụ” ahụ.
Ha ‘si n’oké mkpagbu ahụ pụta.’—Mkpughe 7:14.
“Igu nkwụ” ndị ahụ gosiri na ha nabatara Jisọs dị ka Eze ha.
Oyiyi ha yi “uwe mwụda dị ọcha” gosiri na ha nwere okwukwe n’àjà Jisọs.
“Nwa atụrụ” ahụ bụ Jisọs Kraist.
Olee ngọzi ndị ha ga-enweta mgbe ahụ? Ị̀ chetara obi ụtọ dị n’Israel n’oge Eze Solomon kwesịrị ntụkwasị obi na-achị? Nke a nyere ihe atụ dị nta nke obi ụtọ ga-adị n’elu ala n’okpuru Eze bụ Jisọs.
A ga-enwe udo a na-ahụ anya n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ na n’etiti ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ, dị nnọọ ka Aisaia buru n’amụma.—Abụ Ọma 46:9; Aisaia 11:6-9.
Dị ka Jisọs gwọrọ ndị ọrịa mgbe ọ nọ n’elu ala, otú ahụ ka ọ ga-ewepụrụ agbụrụ mmadụ nile nrịrịa.—Aisaia 33:24.
Dị ka o si nye ìgwè mmadụ nri, otú ahụ ka ọ ga-ewepụrụ agbụrụ mmadụ nile ụkọ nri.—Abụ Ọma 72:16.
Dị ka o si kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, otú ahụ ka ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ndị na-enweghị ohere zuru ezu ido onwe ha n’okpuru Alaeze Chineke.—Jọn 5:28, 29.
Nwayọọ nwayọọ, ọ ga-eweghachi ụmụ mmadụ n’izu okè ahụ Adam tụfuru.
Nke ahụ ọ́ bụghị ọdịnihu magburu onwe ya? Ị̀ ga-achọ ịhụ ya? Ọ bụrụ otú a, rụọ ọrụ ka i wee doo onwe gị ugbu a n’okpuru Alaeze Chineke, ghọkwaa otu n’ime “atụrụ” ndị ahụ.
Mụọ Bible, wee mara Jehova Chineke na Jisọs Kraist.—Jọn 17:3.
Soro ndị ọzọ bụkwa ndị nọ n’okpuru Alaeze ahụ na-akpakọrịta.—Ndị Hibru 10:25.
Mụta iwu nile nke Alaeze ahụ, na-edebekwa ha.—Aisaia 2:3, 4.
Rara onwe gị nye ife Jehova ofufe, ka e mekwaa gị baptism.—Matiu 28:19, 20.
Zere ihe ọjọọ, ndị dị ka izu ohi, ịgha ụgha, omume rụrụ arụ, na ịṅụbiga mmanya ókè, bụ́ ihe ndị na-adịghị atọ Jehova Chineke ụtọ.—1 Ndị Kọrint 6:9-11.
Na-ekere òkè n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ.—Matiu 24:14.
Mgbe ahụ, site n’enyemaka Chineke, ị ga-ahụ ka e weghachiri Paradaịs ahụ nke Adam tụfuuru ụmụ ya, ị ga-ahụkwa ka e mezuru nkwa nke a: “M wee nụ oké olu ka ọ na-esi n’ocheeze ahụ daa, sị, Lee, ụlọ ikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke ya, Chineke onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.
[Chaatị dị na peeji nke 20]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
607 T.O.A. 1914 O.A.
T.O.A. | O.A.
500 1,000 1,500 2,000 2,520
[Foto ndị dị na peeji nke 11]
Abraham
Aisak
Jekọb
Juda
Devid
[Foto dị na peeji nke 14]
144,000
[Foto ndị dị na peeji nke 16]
Adam
Jisọs