Otú A Ga-esi Jiri Akwụkwọ “Ịhụnanya Chineke” Na-eduzi Ọmụmụ Baịbụl
1. Gịnị mere e ji bipụta akwụkwọ “Ịhụnanya Chineke”?
1 Obi tọrọ anyị nnọọ ụtọ mgbe anyị nwetara akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke” ná mgbakọ distrikti “Ndị Mmụọ Chineke Na-edu.” Dị ka e kwuru ná mgbakọ ahụ, e bipụtaghị akwụkwọ a ka anyị jiri ya na-akụzi ozizi Baịbụl ndị bụ́ isi, kama ọ bụ ka o nyere anyị aka ịmata àgwà ndị Jehova chọrọ ka anyị na-akpa ma na-eme ha. Anyị agaghị enye ndị mmadụ akwụkwọ a mgbe anyị nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ.
2. Olee otú a ga-esi jiri akwụkwọ a mụwara mmadụ ihe, oleekwa ndị a ga-eji ya na-amụrụ ihe?
2 Akwụkwọ a ga-abụ akwụkwọ nke abụọ a anyị na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl ga-amụ ma anyị mụchaa akwụkwọ Bible Na-akụzi. Cheta na mmadụ niile abụghị otu ma a bịa n’ịghọta na ime ihe Baịbụl na-akụzi. Anyị kwesịrị ịhụ na ihe anyị mụrụ bụ ókè onye ahụ ga-aghọtaru. Hụ na ọ ghọtara ihe unu mụrụ nke ọma. Ọ dịchaghị mkpa ka e jiri akwụkwọ a malite ịmụrụ mmadụ Baịbụl ma ọ bụrụ na anyị na onye ahụ amụọla akwụkwọ anyị dị iche iche n’oge gara aga ma ọ naghị abịa ọmụmụ ihe anyị, ọ naghịkwa egosi na ya dị njikere ịgbanwe ndụ ya ma mewe ihe ọ na-amụta na Baịbụl.
3. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị na mmadụ na-amụ akwụkwọ Fee Chineke Ofufe?
3 Ọ bụrụ na gị na mmadụ na-amụ akwụkwọ Fee Chineke Ofufe ugbu a, ya abụrụkwa na ọ fọrọ naanị isiokwu ole na ole ka unu mụchaa ya, i nwere ike ikpebi ka unu mụchapụ ya, ma gwazie onye ahụ ị na-amụrụ ihe ka ọ gụọ akwụkwọ “Ịhụnanya Chineke” n’onwe ya. Ma ọ bụghị ya, ọ ga-akacha mma ma unu gafere n’akwụkwọ ọhụrụ ahụ ma malite ya n’isi. Dị ka ọ dị n’akwụkwọ Bible Na-akụzi, ọ bụghị iwu na unu ga-amụ isiokwu ndị ọzọ ahụ dị n’azụ azụ akwụkwọ ahụ.
4. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na onye anyị na-amụrụ ihe emee baptizim tupu anyị amụchaa akwụkwọ Bible Na-akụzi na akwụkwọ “Ịhụnanya Chineke”?
4 Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ ihe emee baptizim tupu unu amụchaa akwụkwọ abụọ ahụ, unu kwesịrị ịhụ na unu gakwara n’ihu n’ọmụmụ ihe unu ruo mgbe unu mụchara akwụkwọ “Ịhụnanya Chineke.” Ọ bụ eziokwu na onye ahụ emeela baptizim, ị ka nwekwara ike ịgụrụ awa i ji mụọrọ ya ihe, gụọkwa nletaghachi na ọmụmụ Baịbụl ndị ị gaara ya n’ọnwa. Onye nkwusa ọzọ gị na ya so gaa ozi nwekwara ike ịgụrụ awa.
5. Olee otú anyị nwere ike isi jiri akwụkwọ “Ịhụnanya Chineke” nyere ndị nkwusa na-adịghị ejekwa ozi ọma aka?
5 Ọ bụrụ na otu n’ime ndị Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ gị agwa gị ka ị mụọrọ onye na-adịghị ejekwa ozi ọma ihe, e nwere ike ịgwa gị isiokwu ndị gị na onye ahụ ga-amụ n’akwụkwọ “Ịhụnanya Chineke.” Ọ dịghị mkpa ka anyị na onye ahụ mụọ ihe ọtụtụ ugboro. Akwụkwọ ọhụrụ a bụ nnọọ onyinye mara mma e nyere anyị, bụ́ nke e wepụtara ka o nyere anyị aka ịnọgide “n’ịhụnanya Chineke”!—Jud 21.