Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na March 16
IZU NA-AMALITE NA MARCH 16
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
lv isi nke 2 ¶12-21, igbe dị na peeji nke 24
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 43-46
Nke 1: Jenesis 44:1-17
Nke 2: Ike Jizọs Nwere n’Ebe Ndị Mmụọ Ọjọọ Nọ (lr isi nke 10)
Nke 3: A Na-akpọ Ike Ndụ nke Mmadụ na nke Anụmanụ Mmụọ (td-IB 27B)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa March.
Nkeji 10: E Ji Aha Jehova Ama Onye Ọ Bụ. Okwu a ga-eji ịnụ ọkụ n’obi kwuo nke ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 274, paragraf nke 1-5.
Nkeji 10: Ahụmahụ ndị e nwetara n’ozi ọma. Mee ka ọgbakọ mara ebe unu kesaruru traktị ahụ bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? n’ókèala unu. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwere mgbe ha na-ekesa traktị ahụ ma ọ bụ mgbe ha ji ya malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl. I nwere ike ịgwa ndị nkwusa ka ha jiri otu ahụmahụ ma ọ bụ abụọ tọrọ ụtọ mee ihe ngosi.
Nkeji 10: “Otú A Ga-esi Jiri Akwụkwọ “Ịhụnanya Chineke” Na-eduzi Ọmụmụ Baịbụl.” Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.