Kwadebe nke Ọma Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs
Ọ bụ nnọọ ihe na-enye ọṅụ, bụrụkwa ihe ùgwù ka ndị na-eso ụzọ Kraịst kwadebe nke ọma maka abalị ahụ anyị ga-echeta ọnwụ Jizọs Kraịst! (Luk 22:19) Olee ihe ndị anyị kwesịrị ime iji kwadebe maka Ncheta Ọnwụ Jizọs?
◼ Oge na Ebe A Ga-eme Ya: Onye ọ bụla kwesịrị ịghọta nke ọma oge na ebe a ga-anọ echeta ọnwụ Jizọs. Ọ bụrụ na ọ bụghị naanị ọgbakọ unu ga-anọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mee ya, ọ dị mkpa ka unu bịa n’oge ma haziekwa otú unu ga-esi pụọ, ebe ọ bụ na oge unu nwere tupu ọgbakọ nke ọzọ amalite ebughị ibu. E kwesịrị ịhụ na ndị mmadụ akwụchighị ụzọ e si abata nakwa n’ebe a na-adọba ụgbọala.
◼ Akwụkwọ Ịkpọ Òkù: Ndị nkwusa niile hà nwere akwụkwọ ịkpọ òkù ha ga-ekesa, hà makwa ihe e dere na ya? Ị̀ mụọla ihe ị ga-ekwu mgbe i na-enye mmadụ akwụkwọ ịkpọ òkù a? Olee ndị ị ga-enye ya? E kwesịrị ịhụ na e kechara akwụkwọ ịkpọ òkù niile e nwetara.
◼ Ibute Ndị Ga-abịa: O nwere ike ịdị mkpa ka e jiri ụgbọala gaa bute ụfọdụ ndị nwere mmasị nakwa ụmụnna anyị, ma ọ bụ nyere ha aka n’ụzọ ndị ọzọ. Olee ndokwa ndị e mere iji nyere ndị a aka?
◼ Achịcha na Mmanya: E kwesịrị ịhụ na e bugharịghị achịcha na mmanya ma ọ bụrụ na anyanwụ adabeghị. E kwesịrị ime ndokwa ibujere onye ọ bụla so ná ndị e tere mmanụ ahụ́ na-adịghị, nke na-enweghị ike ịbịa, achịcha na mmanya ahụ. E kwesịkwara ịhụ na e nwetara ụdị achịcha na mmanya kwesịrị ekwesị.—Lee Ụlọ Nche February 15, 2003, peeji nke 14-15, paragraf nke 14, 17.
◼ Ụlọ Nzukọ Alaeze: E kwesịrị ihichasị ụlọ nzukọ a ga-anọ eme ya nke ọma tupu oge eruo. E kwesịrị iweta efere, iko, tebụl na ákwà tebụl kwesịrị ekwesị n’ụlọ nzukọ a ga-anọ mee ya ma hazie ha tupu oge eruo. Ọ bụrụ na ọ bụghị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka unu ga-anọ eme ya, hụnụ na ígwè okwu e nwere na-arụ ọrụ nke ọma ka mmadụ niile bịaranụ nwee ike ịnụ ihe ọkà okwu na-ekwu. E kwesịrị ịhọpụta ndị atendantị na ndị ga-ebugharị achịcha na mmanya tupu oge eruo, gwa ha ihe bụ ọrụ ha, otú ha kwesịrị isi bugharịa ya, nakwa mkpa ọ dị iji ejiji dị mma n’anya.
Ma ọgbakọ ma onye nkwusa ọ bụla kwesịrị ịkwadebe nke ọma maka Ncheta Ọnwụ Jizọs Kraịst a, bụ́ oge dị oké mkpa. N’eziokwu, Jehova ga-agọzi ndị niile na-egosi na ha nwere nnọọ ekele maka ihe niile Jehova si n’àjà Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya bụ́ Jizọs Kraịst, nye ụmụ mmadụ.