Ihe Ndị A Ga-echeta Banyere Ncheta Ọnwụ Jizọs
Ndị okenye kwesịrị ilebara ihe ndị na-esonụ anya ka ha na-akwado maka Ncheta Ọnwụ Jizọs:
◼ Jidenụ n’aka na a gaghị ebugharị achịcha na mmanya ma ọ bụrụ na anyanwụ adabeghị.
◼ E kwesịrị inweta ụdị achịcha na mmanya kwesịrị ekwesị, kwadebekwa ha.—Lee Ụlọ Nche February 15, 2003, peeji nke 14-15.
◼ E kwesịrị iweta efere, iko, tebụl na ákwà tebụl kwesịrị ekwesị n’ụlọ nzukọ a ga-anọ mee ya ma hazie ha tupu oge eruo.
◼ E kwesịrị ihichasị Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ebe ọ bụla ọzọ a ga-enwe nzukọ a nke ọma tupu oge eruo.
◼ E kwesịrị ịhọpụta ndị atendantị na ndị ga-ebugharị achịcha na mmanya ahụ ma gwa ha tupu oge eruo ihe bụ́ ọrụ ha, usoro kwesịrị ekwesị ha ga-agbaso, na mkpa ọ dị iji ejiji dị mma n’anya.
◼ E kwesịrị ime ndokwa ibujere onye ọ bụla so ná ndị e tere mmanụ na-adịkwaghị ike, nke na-enweghị ike ịbịa, ihe nnọchianya ndị ahụ.
◼ Mgbe e mere ndokwa ka ihe karịrị otu ọgbakọ jiri otu Ụlọ Nzukọ Alaeze mee ihe, ọgbakọ ndị a kwesịrị ịrụkọ ọrụ ọnụ iji hụ na ndị mmadụ akwụchighị n’ụzọ e si abanye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, n’okporo ụzọ, nakwa n’ebe a na-adọba ụgbọala.
◼ Ọ bụrụ na e mere ya n’ebe ọzọ, jidenụ n’aka na e nwere ígwè okwu dị mma ka mmadụ niile bịaranụ nwee ike ịnụ ihe ọkà okwu na-ekwu.