Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na March 23
IZU NA-AMALITE NA MARCH 23
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
lv isi nke 3 ¶1-7, igbe dị na peeji nke 29
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 47-50
Nke 1: Jenesis 48:1-16
Nke 2: Ànyị Kwesịrị Ịtụ Ekwensu Egwu?
Nke 3: Enyemaka Site n’Aka Ndị Mmụọ Ozi Chineke (lr isi nke 11)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Kwadebe maka inyefe Ụlọ Nche April 1 na Teta! April—June. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Mgbe ị kọwatụchara ihe dị na magazin ndị ahụ ná mkpirikpi, jụọ ndị na-ege ntị isiokwu ha ga-achọ ikwu banyere ha mgbe ha na-enyefe ndị bi n’ókèala unu magazin ndị ahụ nakwa ihe mere ha ji họrọ isiokwu ahụ. Olee ajụjụ ndị ha ga-ajụ na amaokwu Baịbụl ndị ha ga-agụ iji mee ndị mmadụ ka ha nwee mmasị n’isiokwu ndị ahụ? Mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nyefee magazin nke ọ bụla. N’otu n’ime ihe ngosi ahụ, gosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl mgbe a bịaara ya nletaghachi.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Gosi na Ị Na-akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù Site n’Ịṅa Ha Ntị nke Ọma na Ịtụle Ihe Onye Nwe Ụlọ Na-eche. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 186-187. Mee ihe ngosi ebe onye nkwusa ga-eji ntụziaka ndị e nyere ebe a kwusaara mmadụ ozi ọma. O mechaa, jụọ ndị na-ege ntị ihe ha chere mere onye nwe ụlọ ji gee onye nkwusa ahụ ntị.