Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/97 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka January

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka January
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite January 6
  • Izu Na-amalite January 13
  • Izu Na-amalite January 20
  • Izu Na-amalite January 27
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 1/97 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka January

Izu Na-amalite January 6

Abụ 6 (4)

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo okwu n’akụkọ ozi ubi September maka mba a na ọgbakọ unu. Tụlee Igbe Ajụjụ.

15 min: Oge Inweta Kaadị Advance Medical Directive/Release Ọhụrụ. Onye okenye ruru eru atụlee mkpa ọ dị idejupụta kaadị ahụ n’ụzọ zuru ezu ma na-eji ya mgbe nile. Kaadị a na-ekwu ọnụ gị ma ọ bụrụ na i nweghị ike ikwuchitere onwe gị n’ọnọdụ mberede. (Tụlee Ilu 22:3.) Ọ dị mkpa idejupụta kaadị ọhụrụ kwa afọ iji nye nkwupụta ọhụrụ n’ọjụjụ nke ọbara, ebe ọ bụ na ndị dọkịta ụfọdụ na ndị ọzọ azọrọwo na kaadị ndị nọfere otu afọ nwere ike ghara igosipụta nkwenye mmadụ nwere n’oge ahụ. Mgbe nzukọ gasịrị, a ga-enye ndị nkwusa nile e mere baptism kaadị Advance Medical Directive/Release, ndị nwekwara ụmụaka a na-emebeghị baptism ga-anata otu Identity Card maka nwatakịrị nke ọ bụla. Kọwaa na a gaghị edejupụta kaadị ndị ahụ n’abalị a. E kwesịrị iji nlezianya dejupụta ha n’ụlọ, ma a GAGHỊ abịanye aka na ha. A ga-eme mbịanye aka, ịgba akaebe, na idenye akara ụbọchị na kaadị nile mgbe e mechisịrị Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nke na-esonụ, n’okpuru nlekọta nke onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ. Ọ ga-eme nchọpụta iji hụ na ndị nile e kenyere n’ìgwè ya nwetara kaadị, nweekwa enyemaka dị mkpa. Ndị na-abịanye aka dị ka ndị akaebe kwesịrị iji anya ha hụ ka onye ji kaadị ahụ bịanyere aka na kaadị ahụ. Ndị nduzi/ndị okenye ga-enyere onye ọ bụla na-abịaghị n’oge ahụ aka ná Nzukọ Ije Ozi nke na-esonụ ruo mgbe ndị nkwusa nile e mere baptism dejupụtasịrị kaadị ha nke ọma, bịanyekwa aka na ha. (Tụleghachi akwụkwọ ozi October 15, 1991.) Site n’iji okwu ndị sitere na kaadị a mee ihe n’ikwekọ n’ọnọdụ na nkwenye ha, ndị nkwusa a na-emebeghị baptism pụrụ idepụta ntụziaka nke ha iji mee ihe maka onwe ha na ụmụ ha.

15 min: “Ndị Ruru Eru na Ndị A Kwadebere Izi Ndị Ọzọ Ihe.” (Paragraf nke 1-6) Kwuo okwu dị mkpirikpi na paragraf nke 1-2, na-emesi ike mkpa ọ dị anyị inwe obi ike na site n’enyemaka Jehova anyị pụrụ izi ndị ọzọ ihe n’ụzọ dị irè. Mee ka ìgwè abụọ nke ndị nkwusa na ndị nwe ụlọ mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị dị na paragraf nke 3-6, na-eme ka ìgwè nke ọ bụla gosi ụzọ isi mee mkpọtụrụ mbụ na nletaghachi.

Abụ 14 (6) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 13

Abụ 16 (58)

7 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Mee ka isi ihe ụfọdụ a pụrụ iji kwuo okwu na magazin ndị ọhụrụ pụta ìhè. Tụọ aro banyere otú anyị pụrụ isi kọwaa onwe anyị mgbe anyị na-agakwuru ndị mmadụ iji gbaa àmà mberede. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ka ha kọọ okwu mmeghe ha jiworo mee ihe mgbe ha na-agwa ndị ọzọ okwu n’ụlọ ahịa, n’okporo ámá, n’ogige ntụrụndụ, n’ụgbọ njem ọha na eze, na ebe ndị ọzọ. Kọwapụta ndokwa ije ozi ubi maka ngwụsị izu.

10 min: “Ndị Ruru Eru na Ndị A Kwadebere Izi Ndị Ọzọ Ihe.” (Paragraf nke 7-9) Kọọ ahụmahụ banyere ime nletaghachi ndị dị na 1995 Yearbook, peji nke 45, na-emesi ike mkpa ọ dị isochi mmasị ọ bụla e gosiri. Mee ka onye nkwusa nweworo ahụmahụ mee ihe ngosi nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị dị na paragraf nke 7-8. Ọ bụ ezie na a na-ebu ụzọ enyefe akwụkwọ ndị ọzọ, anyị kwesịrị iche mgbalị anyị ihu n’imesị na-eduzi ọmụmụ ihe n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Gbaa mmadụ nile ume idokwa oge ụfọdụ n’izu na-abịanụ iji mee nletaghachi.

13 min: “Usoro Ọgwụgwọ Ọzọ Na-adịghị Achọ Ọbara.” Onye okenye ruru eru ga-eme ya. Gụpụta paragraf nile. Kwusie okwu ike n’ịdị mkpa nke paragraf nke 3 na nke 4 na mkpa ọ dị ịkpọtụrụ ndị okenye mgbe ọbara ghọrọ ihe iseokwu n’ịgwọ ọrịa.

15 min: “Ichebe Ụmụ Gị Pụọ n’Iji Ọbara Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi.” Onye okenye ekwuo okwu na paragraf nke 1-10. Mee ka echiche dị ná nkwubi okwu ahụ bụ́ na e kwesịghị ile okwukwe ndị mụrụ ụmụ kwere ka dibịa gwọọ nwa ha n’ọnọdụ ndị ahụ e kwuru na paragraf nke 5-7 anya dị ka mmebi okwukwe.

Abụ 15 (119) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 20

Abụ 21 (1)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: “A Ga-azọpụta Mmadụ Nile.” Ajụjụ na azịza. Kpọọ ndị na-ege ntị òkù ka ha kọọ ná mkpirikpi ụfọdụ ahụmahụ na-egosi otú ha si nweta nzaghachi dị mma site ná ndị sitere n’ọnọdụ dị iche iche.

20 min: “Ichebe Ụmụ Gị Pụọ n’Iji Ọbara Eme Ihe n’Ụzọ Na-ezighị Ezi.” Ntụle ajụjụ na azịza nke paragraf nke 11-20. Mesie ya ike na ndị mụrụ ụmụ ibu ụzọ mee nkwadebe n’inwetara ụmụ ha nlekọta ahụ ike na-abụkarị isi ihe dị n’inwe ike izere mmịnye ọbara.

Abụ 23 (93) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 27

Abụ 20 (57)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

18 min: “Anyị ‘Na-ekwusa Okwu’ Ahụ.” Ajụjụ na azịza. Gụnye okwu ụfọdụ na-egosi ihe mere anyị ji enwe ekele dị omimi banyere abamuru nke Okwu Chineke.—Lee Teta! nke March 22, 1984 (Bekee), peji nke 9-11.

17 min: Tụleghachi Akwụkwọ A Ga-enyefe na February. Kọwapụta ihe ndị na-akpali mmasị dị n’akwụkwọ ndị ahụ, dị ka: (1) Isiakwụkwọ ndị na-akpali akpali, (2) ihe osise ndị nwere àgwà mara mma, na (3) ajụjụ e bipụtara ebipụta ndị na-akpali mmasị. N’ikwekọ n’ihe omume nzukọ nke bu ụzọ, gbaa ume iji akụkụ akwụkwọ nsọ a họọrọ nke ọma mee ihe n’iche ihe n’ihu mmadụ. Mee otu ihe ngosi dị mkpirikpi ma ọ bụ abụọ. Chetara mmadụ nile ka ha nweta akwụkwọ ndị a ga-eji eme ihe n’izu a.

Abụ 26 (9) na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya