Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/97 p. 1-2
  • Anyị ‘Na-ekwusa Okwu’ Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyị ‘Na-ekwusa Okwu’ Ahụ
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Kwusaa Okwu Chineke”
    Bụkuo Jehova Abụ
  • Kwusaa Okwu Chineke
    Jiri Ọṅụ Bụkuo Jehova Abụ
  • Olee Otú E Si Na-ekwusa Ozi Ọma?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Iṅomi Chineke Nke Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 1/97 p. 1-2

Anyị ‘Na-ekwusa Okwu’ Ahụ

1 N’ikwekọ ná nkọwa Bible nyere “mgbe ikpeazụ” ahụ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ taa nwere nanị “ụdị nke nsọpụrụ Chineke.” (2 Tim. 3:1, 5) Nke a bụ n’ihi na ndị ndú okpukpe adawo n’inye ìgwè atụrụ ha ezi nduzi ime mmụọ. Ndị ụkọchukwu Krisendọm adịghị akwado Bible. Ha nwere mmasị karị n’ịdị na-ekwughachi ozizi na-enweghị isi nke ndị ọkà ihe ọmụma na ndị ọkà mmụta okpukpe ma ọ bụ ịkwado okwu metụtara ọha na eze na ndọrọ ndọrọ ọchịchị kama ikwusa Okwu Chineke. Ọtụtụ ndị ndú okpukpe ekweghị na Bible. Ha na-agbachikarị nkịtị n’ikpere arụsị nke ndị òtù ha kama ịrapagidesi ike n’ozizi doro anya nke Bible. Ihe ka ukwuu ná ndị ụkọchukwu anaghịdị eji aha onwe onye nke Chineke eme ihe, ha adịghịkwa emegide iwepụ ya n’ime nsụgharị Bible ọgbara ọhụrụ.

2 Dị ka ọ bụ eziokwu banyere ndị ndú okpukpe n’ụbọchị Jisọs, ndị ụkọchukwu nke taa na-eme nkwusa n’efu. (Mat. 15:8, 9) Ọ bụ nnọọ dị ka Emọs onye amụma buru n’amụma. E nwere ‘oké ụnwụ, ọ bụghị oké ụnwụ nke nri, ọ bụghịkwa akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ nke ịnụ okwu nile nke Jehova.’ (Emọs 8:11) Karịa ihe ọ bụla ọzọ, nri ime mmụọ nke dị n’Okwu Chineke dị ndị mmadụ mkpa.

3 Ụzọ Isi Gboo Mkpa Ime Mmụọ nke Ndị Mmadụ: Pọl gbara Timoti ume ịrapara ‘n’ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nke pụrụ ime ka [mmadụ] bụrụ onye amamihe ịnata nzọpụta,’ n’ihi ya kwa o nyesiri ya iwu ike ‘ikwusa okwu’ ahụ gwa ndị ọzọ. (2 Tim. 3:14, 15; 4:2) Dị ka Ndịàmà Jehova, anyị aghaghị ịrapara n’ihe Bible na-akụzi mgbe anyị na-eme nkwusa, si otú a na-eṅomi Onye Nlereanya anyị, bụ́ Jisọs, onye kwuru, sị: “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke Onye zitere m.” (Jọn 7:16) Anyị na-eji Okwu Chineke emere ihe ndabere maka ihe anyị na-ezi n’ihi na anyị matara na o nwere amamihe Chineke, anyị chọkwara ka ndị mmadụ mara isi iyi nke ihe ọmụma anyị so ha na-ekerịta.—1 Kọr. 2:4-7.

4 Ndị mmadụ aghaghị ibu ụzọ nụ eziokwu si na Bible iji mụta banyere Jehova ma nwee okwukwe n’ebe ọ nọ. Pọl dere n’ụzọ ezi uche dị na ya, sị: “Hà ga-esi aṅaa kwere n’Onye ahụ ha aka-anụghị okwu Ya? ma hà ga-esi aṅaa nụ ma onye na-ekwusa anọghị?” (Rom 10:14) Site n’ikwusa Okwu Chineke, anyị na-enyere ndị ọzọ aka inweta okwukwe site n’ezi ihe ọmụma. Ihe ọmụma dị otú ahụ pụrụ ma na-agbanwe ndụ ndị mmadụ ịka mma. Onye England na-ede akwụkwọ bụ́ Charles Dickens dere banyere Bible, sị: “Ọ bụ akwụkwọ kasị mma dịtụworo ma ọ bụ nke ga-adị n’ụwa, n’ihi na ọ na-akụziri gị ihe mmụta ndị kasị mma a pụrụ iji duzie mmadụ ọ bụla e kere eke nke na-agbalị ịdị na-ekwu eziokwu ma na-ekwesị ntụkwasị obi.”

5 Ndị agụụ eziokwu ime mmụọ na-agụ na-abịa mata na ikike nke Okwu Chineke na-akwado ya. Laa azụ na 1913, e nyere Frederick W. Franz, dị ka nwa okorobịa nọ na kọleji, akwụkwọ nta bụ́ Where Are the Dead? Mgbe o ji oké mmasị gụsịa azịza Bible nye ajụjụ a, o kwupụtara, sị: “Nke a bụ eziokwu ahụ.” Ọtụtụ nde ndị na-achọ eziokwu abịawo na-eche otú ahụ. Ka anyị nọgide jiri ịdị uchu na ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa Okwu ahụ, sikwa otú a na-ekere òkè n’ọṅụ nke ịnụ ka ndị ọzọ na-asị: “Nke a bụ eziokwu ahụ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya