A Ga-azọpụta Mmadụ Nile
1 Jehova chọrọ “ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Tim. 2:4) Ọ bụ ezie na ihe nketa, nzụlite, na gburugburu ebe obibi na-emetụta ndị mmadụ ruo n’ókè ụfọdụ, ha nweere onwe ha ime nhọrọ, ha pụkwara ịhọrọ n’otu n’otu otú ha ga-esi jiri ndụ ha mee ihe. Ha pụrụ ime ezi ihe wee dị ndụ, ma ọ bụ ha pụrụ ime ihe ọjọọ wee laa n’iyi. (Mat. 7:13, 14) Olee otú nghọta a si emetụta otú anyị si ele ndị anyị na-eji ozi ọma Alaeze ahụ ejekwuru anya?
2 Anyị ekwesịghị iwere ya na mmasị mmadụ na-enwe n’eziokwu ahụ bụ nke ihe ndị dị ka mba ma ọ bụ ọdịbendị mmadụ si ma ọ bụ ọkwá ọha na eze na-ekpebi. Eziokwu ahụ pụrụ ịmasị ndị na-agụghị ma ọ bụ ndị gụrụ oké akwụkwọ, ndị tinyere aka ná nchụso ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ndị ọkachamara, ndị na-ekweghị na Chineke, ndị na-amaghị ma Chineke ọ̀ dị, na ọbụnadị ndị ajọ omume a ma ama. Ndị si ná nzụlite na ọkwá ọha na eze nile agbanwewo ụzọ ndụ ha mbụ ma na-elepụ anya ugbu a maka ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke. (Ilu 11:19) Ya mere, anyị ekwesịghị ịla azụ n’ijiri ozi Alaeze ahụ jekwuru ndị si n’ọnọdụ nile ná ndụ.
3 Tụlee Ihe Atụ Ndị A: Otu nwoke emewo atụmatụ igbu onye kuchiri nne ya ma o gbughị ya. Ka e mesịrị o kpebiri igbu onwe ya ma o melighị ya. Mgbe ọ gasịrị mkpọrọ n’ihi izu ohi na ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ, alụmdi na nwunye ya tisara. Taa onye a na-akpata ihe e ji ebi ndụ n’ụzọ kwụ ọtọ ma na-enwe alụmdi na nwunye obi ụtọ nakwa mmekọrịta dị mma ya na onye kuchiri nne ya. Gịnị kpatara mgbanwe ahụ? O soro Ndịàmà Jehova mụọ Bible ma tinye ihe ọ mụtara n’ọrụ. Jehova eleghị ya anya dị ka onye a na-apụghị ịgbapụta.
4 Ọmụma a ma otu nwa agbọghọ ama dị ka onye na-eme ihe nkiri TV ewetaraghị ya obi ụtọ. Ma ebe o nweworo mmasị n’omume ọma nke Ndịàmà, ọ nakweere ọmụmụ Bible, n’oge na-adịghịkwa anya ọ nọ na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta banyere ozi ọma Alaeze ahụ. A matara ya ebe nile ọ gara n’ozi ụlọ n’ụlọ, ma o ji obi ụtọ kọwaa na ya chọrọ ka a mara ya dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova kama ịbụ dị ka onye na-eme ihe nkiri.
5 Mgbe otu Onyeàmà mere ndokwa iduziri otu onye tụrụ ụtụ Ụlọ Nche ọmụmụ Bible, otu onye agbata obi nụrụ ya wee bịa ọmụmụ ihe ahụ. Onye agbata obi ahụ matara eziokwu ahụ ozugbo bụ́ nke ọ nọworo na-achọ! Ya na di ya kagburu iwu ịgba alụkwaghịm e nyeworo ha ma mee udo. Ọ bamiri abami n’ịgụ kpakpando ma soro n’otu òtù mgbaasị, ma ọ tụfuru akwụkwọ ndị dara ọnụ na ihe nile ọzọ o nwere metụtara ofufe ndị mmụọ ọjọọ n’egbughị oge. N’oge na-adịghị anya ọ malitere ịga nzukọ na ịgwa ndị ikwu na ndị enyi banyere okwukwe ọhụrụ ya. Ugbu a ọ na-eji ịnụ ọkụ n’obi agbara ndị ọzọ àmà.
6 Anyị ekwesịghị ibu ụzọ kpee onye ọ bụla ikpe. Kama nke ahụ, ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi soro ndị mmadụ kerịta ozi ọma ahụ n’ebe nile. Anyị nwere ihe nile mere anyị ga-eji nwee obi ike na Jehova, bụ́ onye “na-ele obi,” ga-aghọ “Onye nzọpụta mmadụ nile.”—1 Sam. 16:7; 1 Tim. 4:10.