Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Gịnị ka m kwesịrị ịma banyere ịṅụ sịga?
Legodị anya n’ihe ndị e dere n’okpuru ebe a ma kanye ✔ n’igbe nke ọ bụla kwuru otú ọ dị gị.
□ Achọrọ m ịma ihe m na-amaghị
□ Achọrọ m ịkwụsị ichegbu onwe m
□ Achọrọ m ịdị ka ibe m
□ Achọghị m ibu ibu
Ọ BỤRỤ na o nwere igbe nke ị kanyere ihe na ya, ọ pụtara na o nwere ihe jikọrọ gị na ndị na-eto eto ibe gị ndị na-aṅụ sịga ma ọ bụ ndị chetụrụla echiche ịṅụ ya.a Dị ka ihe atụ:
Ịma ihe ndị ị na-amaghị. “Anọ m na-eche otú ịṅụ sịga na-adị, n’ihi ya, otu ụbọchị, anaara m otu nwa agbọghọ n’ụlọ akwụkwọ anyị sịga o nyere m ma zoro ezoro ṅụọ ya.”—Tracy.
Ịkwụsị ichegbu onwe gị na ịdị ka ibe gị. “Ụmụ akwụkwọ ibe m na-asịkarị, ‘Ahụ́ m chọrọ sịga.’ Ha ṅụchaa, ha asị, ‘Ehee! Ahụ́ eruola m ala ugbu a!’ N’ihi ya, e nwee ihe na-echegbu m, mụ achọwa ịṅụ sịga.”—Nikki.
Ị chọghị ibu ibu. “Ụfọdụ ụmụ agbọghọ na-aṅụ sịga ka ha ghara ibu ibu. Ha weere na ọ kaara ha mfe ịṅụ sịga karịa iri nri ndị ga-eme ka ha ghara ibu ibu!”—Samantha.
Ma tupu i kpebie na ị ga-ebido ṅụwa sịga ma ọ bụ tupu i were sịga ọzọ ị chọrọ ịṅụ, cheretụgodị ma chebara ya echiche. Adịla ka azụ̀ gara na-atụrụ nri dị na nkò e ji egbute azụ̀. Ọ bụ eziokwu na azụ̀ ahụ nwere ike iri nri ahụ, ma nke ahụ ga-ata isi ya! Kama ime ka azụ̀ ahụ, mee ihe Baịbụl kwuru ma gosi na “ikike iche echiche” gị na-arụ ọrụ nke ọma. (2 Pita 3:1) Zaa ajụjụ ndị a dị n’okpuru ebe a.
Gịnị Ka Ị Ma Banyere Ịṅụ Sịga?
Dee eziokwu ma ọ bụ ụgha na nke ọ bụla n’ahịrịokwu a.
a. ․․․ Ịṅụ sịga ga-eme ka m kwụsị iche oké echiche.
b. ․․․ Anwụrụ ọkụ m ga-elo ga-adị obere.
ch. ․․․ O nweghị ihe sịga ga-eme m ruokwa mgbe m mere agadi.
d. ․․․ Ịṅụ sịga ga-eme ka ndị na-abụghị ụmụ nwoke ibe m ma ọ bụ ndị na-abụghị ụmụ nwaanyị ibe m nwewe mmasị n’ebe m nọ.
e. ․․․ Sịga m na-aṅụ enweghị onye ọzọ ọ na-akpatara nsogbu.
f. ․․․ Ma m̀ na-aṅụ sịga ma ọ̀ bụ na m anaghị aṅụ, ọ naghị ewe Chineke iwe.
Azịza
a. Ịṅụ sịga ga-eme ka m kwụsị iche oké echiche.—Ụgha. Ọ bụ eziokwu na ịṅụ sịga na-eme ka nsogbu ịkwụsị ịṅụ sịga na-akpatara mmadụ kwụsịtụ, ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtala na nikotin, bụ́ ihe na-adị na sịga, na-eme ka mmadụ chegbuwekwuo onwe ya.
b. Anwụrụ ọkụ m ga-elo ga-adị obere.—Ụgha. Nchọpụta ụfọdụ e mere gosiri na e kee anwụrụ ọkụ sịga na-aba onye na-aṅụ sịga n’ọnụ ụzọ iri, ihe karịrị ụzọ asatọ na-abanye ya n’ahụ́.
ch. O nweghị ihe sịga ga-eme m ruokwa mgbe m mere agadi.—Ụgha. Ọ bụ eziokwu na ka mmadụ na-aṅụkwu sịga ka nsogbu ndị ọ na-akpatara ya na-aka njọ, a na-enwekwa nsogbu ụfọdụ onye ṅụrụ sịga na-enwe ozugbo ọ ṅụrụ ya. Otu sịga ụfọdụ ndị ṅụrụ nwere ike ime ka ịṅụ sịga rie ha ahụ́. Sịga na-eme ka ikuku na-abanye n’akpa ume mmadụ dị obere, o nwekwara ike ime ka onye ahụ na-akwa ụkwara mgbe ọ bụla. Akpụkpọ ahụ́ onye ahụ ga-adị ka nke onye kara nká. Ịṅụ sịga na-eme ka ihe mmadụ ji bụrụ nwoke ma ọ bụ ihe o ji bụrụ nwaanyị ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma, na-emekwa ka obi na-amapụkarị onye ahụ, nakwa ka obi na-ajọkarị ya njọ.
d. Ịṅụ sịga ga-eme ka ndị na-abụghị ụmụ nwoke ibe m ma ọ bụ ndị na-abụghị ụmụ nwaanyị ibe m nwewe mmasị n’ebe m nọ.—Ụgha. Otu onye na-eme nchọpụta, aha ya bụ Lloyd Johnston, chọpụtara na ‘ọtụtụ ụmụ okorobịa anaghị enwe mmasị n’ụmụ agbọghọ ndị na-aṅụ sịga karịa otú ha na-enwe ná ndị nke na-anaghị aṅụ. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị ụmụ agbọghọ.’
e. Sịga m na-aṅụ enweghị onye ọzọ ọ na-akpatara nsogbu.—Ụgha. Anwụrụ ọkụ sịga ndị ọzọ na-aṅụ na-egbu ọtụtụ puku ndị na-anaghị aṅụ sịga kwa afọ; ọ ga-emerụ ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị ahụ́.
f. Ma m̀ na-aṅụ sịga ma ọ̀ bụ na m anaghị aṅụ, ọ naghị ewe Chineke iwe.—Ụgha. Ndị niile chọrọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ ga-ezere “mmerụ niile nke anụ ahụ́.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) O doro anya na sịga na-emerụ ma ọ bụ na-emebi ahụ́ mmadụ. Ọ bụrụ na i ji sịga na-emebi ahụ́ gị, na-akpatara onwe gị na ndị ọzọ nsogbu, i nweghị ike ịbụ enyi Chineke.—Matiu 22:39; Ndị Galeshia 5:19-21.
Otú Ị Ga-esi Jụ Ya
Gịnịzi ka ị ga-eme ma mmadụ nye gị sịga ka ị ṅụọ? Ikwu ihe dị ka, “Mba, anaghị m aṅụ sịga,” ga-aka eme ka onye ahụ hapụ gị. Ọ bụrụ na onye ahụ esiwe ọnwụ ma ọ bụdị chịwa gị ọchị, cheta na ọ bụ gị ka ọ dị n’aka ikpebi ihe ị ga-eme. I nwere ike ịgwa ya, sị:
● “Achọpụtara m na ịṅụ sịga na-akpatara mmadụ nsogbu, mụ ekpebie na m gaghị aṅụ sịga.”
● “Achọwabeghị m ịnwụ, o nwere ihe ndị dị mkpa m ka chọrọ iji ndụ m eme.”
I nwere ike ịchọpụta na obi gị bụ ihe kacha agwa gị ṅụọ sịga, otú ahụ ọ dị ndị toro eto anyị kwuru okwu ha ná mmalite isiokwu a. Ya bụrụ otú ahụ, i nwere ike imeri nsogbu a ma i chebara ajụjụ ndị a echiche:
● Ò nwedịrị uru ịṅụ sịga ga-abara m? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mụ ebido ịṅụ sịga n’ihi na achọrọ m ka mụ na ndị na-aṅụ sịga dị ná mma, mụ na ha ànyị ga-adị ná mma ma o nwee ihe ndị ọzọ ha na-eme mụnwa na-anaghị eme? Ndị m chọdịrị ka mụ na ha dịrị ná mma hà bụ ndị ga-ahụ ka m na-eme ihe ga-egbu m, ha agbachi nkịtị?
● Ego ole ka ịṅụ sịga ga na-efu m? Olee ọrịa ndị o nwere ike ịkpatara m? Ọ̀ ga-eme ka ndị ọzọ ghara ịna-akwanyere m ùgwù?
● Obi ọ̀ ga-adị m ụtọ ma ịṅụ sịga mee ka mụ na Chineke gharazie ịdị ná mma?
Ya bụrụkwanụ na ịṅụ sịga eriela gị ahụ́. Olee otú ị ga-esi akwụsị ya?
Otú Ị Ga-esi Akwụsị Ya
1. Gwa onwe gị na ị chọrọ ịkwụsị ya. Jiri akwụkwọ dee ihe mere i ji chọọ ịkwụsị ya, na-agụgharịkwa ihe ndị ahụ i dere mgbe niile. Otu ezigbo ihe mere ị ga-eji chọọ ịkwụsị ya bụ na ị chọrọ ịdị ọcha n’anya Chineke.—Ndị Rom 12:1; Ndị Efesọs 4:17-19.
2. Gwa ndị ọzọ ka ha nyere gị aka. Ọ bụrụ na ị na-aṅụ sịga na nzuzo, ugbu a ka ọ dị mkpa ka ị kọọrọ ya ndị ga-enyere gị aka ịkwụsị ya. Gwa ndị ị na-anaghị achọ ka ha hụ gị ebe ị na-aṅụ sịga na ị chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga, gwakwa ha na ị chọrọ ka ha nyere gị aka. Ọ bụrụ na ị chọrọ ife Chineke, rịọ ya ka o nyere gị aka ịkwụsị ya.—1 Jọn 5:14.
3. Kpebie ụbọchị ị ga-akwụsị ya. Gwa onwe gị na ị ga-akwụsị ya ma izu abụọ ma ọ bụ ihe na-erughị ya gafee. Gazie na kalenda gị kanye ihe n’ụbọchị i kpebiri na ị ga-akwụsị ya. Gwa ndị ezinụlọ unu na ndị enyi gị na ị ga-akwụsị ịṅụ sịga n’ụbọchị ahụ.
4. Chọọ sịga ndị fọrọnụ ma tụfuo ha. Tupu ụbọchị ahụ i kpebiri ịkwụsị ịṅụ sịga eruo, chọgharịa nke ọma ma è nwere sịga i dowere n’ime ụlọ gị, n’ụgbọala gị, nakwa n’akpa uwe gị. Tụfuo ha niile, tụfuokwa ihe i ji amụnye sịga ọkụ nakwa ihe i ji etinye ntụ sịga.
5. Mata otú ị ga-esi die nsogbu ịkwụsị ịṅụ sịga ga-akpatara gị. Na-aṅụ nnukwu mmiri ma ọ bụ juus, wepụtakwuokwa oge na-ehi ụra. Buru n’obi na nsogbu ndị ị ga-enwe agaghị adịte aka, ma uru ị ga-erite ga-adịte aka!
6. Zere ihe ndị nwere ike ime ka sịga gụwa gị. Agala ebe ndị ga-eme ka sịga gụwa gị, zerekwa ihe ndị ga-eme ka ọ gụwa gị. Ọ ga-adịkwa mma ma ị kwụsị iso ndị na-aṅụ sịga na-akpa.—Ilu 13:20.
7. Achọla ihe ị ga-ekogide aka na-aṅụ sịga. Aghọla onwe gị aghụghọ, sị, “Ka m kpụrụtụ anwụrụ ọkụ ya naanị otu ugbo.” Ime ụdị ihe ahụ na-emekarị ka onye kwụsịrịla ịṅụ sịga bidokwa ịṅụ sịga.—Jeremaya 17:9.
Ekwela Ka A Ghọgbuo Gị
Ndị na-emepụta sịga na emefu ọtụtụ ijeri dọla kwa afọ iji kpọsaa ngwa ahịa ha. Nke a na-egosi na ha ma na ịkpọsa ngwa ahịa ahụ ga-eme ka ọtụtụ ndị na-eto eto bido ṅụwa sịga ma ṅụrụ ya ruo mgbe ha ghọrọ agadi.
Ekwela ka ndị na-emepụta sịga na-eri ego gị. Ọ̀ dịnụ mma ka i kwe ka ha rata gị? Ma hanwa ma ndị ọgbọ gị, ndị na-aṅụ sịga, enweghị nke na-echere gị echiche ọma. Kama ige ha ntị, gee ntị na ndụmọdụ Chineke nyere na Baịbụl ma “baara onwe gị uru.”—Aịzaya 48:17.
Ị gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.watchtower.org/ype ị ga-ahụ ihe ndị ọzọ a tụlerela n’isiokwu a bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụ eziokwu na isiokwu a kwuru banyere ndị na-aṅụ sịga, nsogbu ndị e kwuru na ndị na-aṅụ sịga na-enwe gbasakwara ndị na-ata ahịhịa anwụrụ ma ọ bụ na-akpọ ụtaba.
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 11]
IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU
“Mmadụ jụọ m ihe mere na anaghị m aṅụ sịga, ihe m na-aza ya bụ, ‘Achọghị m ihe ga-eme ka akpa ume m jiwe oji, achọghịkwa m ịnwụchu ọnwụ.’”
“Mmadụ nye m sịga ka m ṅụọ, ihe m na-asị ya bụ, ‘Mba.’ Ọ bụrụ na onye ahụ enyewe m nsogbu, ihe m na-agwa ya bụ, ‘Ọ̀ bụ na enweghịzi m ikike ikpebiri onwe m ihe m ga-eme? Oge agaala mgbe a na-amanye mmadụ ka o mee ihe ọ na-achọghị ime!’”
[Foto]
Benjamin
Heather
[Igbe dị na peeji nke 12]
● Ị̀ MAARA?
Ahịhịa anwụrụ na ụtaba nwere nikotin karịa sịga. Ha kakwa sịga nwee ihe ndị na-akpatara mmadụ ọrịa kansa akpịrị na ọrịa kansa ọnụ.
[Igbe dị na peeji nke 12]
IHE Ị GA-AJỤ NDỊ MỤRỤ Gị
Ọ bụrụ na i jikere ejikere, ọ ga-adịrị gị mfe ịma ihe ị ga-eme ma ndị ọgbọ gị nyewe gị nsogbu ka i mee ihe ọjọọ. Ọ́ gaghị adị mma ma ị gwa ndị mụrụ gị ka gị na ha mụgharịa ihe ị ga-aza onye nyere gị sịga ka ị ṅụọ? Gwa mama gị ma ọ bụ papa gị ka o mee ka ọ̀ bụ otu nwa akwụkwọ ibe gị, bụ́ onye na-enyekarị gị nsogbu ka ị ṅụọ sịga. Ebe i nwere ike ịchọta ihe ị ga-aza bụ n’igbe bụ́, “Ihe M Ga-eme ma Ndị Ọgbọ M Nyewe M Nsogbu,” nke dị na peeji nke 132 na 133 n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2.
[Foto dị na peeji nke 12]
Onye na-aṅụ sịga dị ka azụ̀ gara na-atụrụ nri dị na nkò e ji egbute azụ̀. Sịga ahụ ga-akpatara ya ezigbo nsogbu