Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 5/14 p. 14-15
  • Ịkpa Ókè Agbụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịkpa Ókè Agbụrụ
  • Teta!—2014
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ebee ka agbụrụ dị iche iche si?
  • È nwere agbụrụ ka ibe ya?
  • È nwere mgbe a ga-akwụsị ịkpa ókè agbụrụ?
  • Agbụrụ Niile Hà Ga-emecha Hara?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Anyị Niile Bụ Otu Ezinụlọ
    Teta!—2010
  • Gịnị Banyere Ịkpa Nganga n’Ihi Agbụrụ?
    Teta!—1998
  • Baịbụl Ọ̀ Kagburu Mmadụ Ịlụ Onye Agbụrụ Ọzọ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2014
g 5/14 p. 14-15
Onye isi ojii na onye ọcha

IHE BAỊBỤL KWURU

Ịkpa Ókè Agbụrụ

Ebee ka agbụrụ dị iche iche si?

“Adam gụrụ nwunye ya Iv, n’ihi na ọ ga-aghọ nne nke onye ọ bụla dị ndụ.”—Jenesis 3:20.

IHE NDỊ ỌKACHAMARA NA-EKWU

Ngalaba òtù UN a na-akpọ UNESCO kwuru na mmadụ niile si otu ebe nakwa na ọ bụ otu nna mụrụ ha niile.

IHE BAỊBỤL KWURU

Chineke kere otu nwoke na otu nwaanyị. Aha ha bụ Adam na Iv. Ọ sịrị ha: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu.” (Jenesis 1:28) Ihe a Baịbụl kwuru na-egosi na ọ bụ Adam na Iv bụ nne na nna anyị mbụ. Ka ọtụtụ afọ gachara, Chineke ji iju mmiri mebie ụwa. Naanị mmadụ asatọ ka iju mmiri ahụ na-egbughị. Ha bụ Noa na nwunye ya na ụmụ ha nakwa ndị nwunye ha. Baịbụl kwuru na ọ bụ ụmụ Noa mụziri mmadụ niile.—Jenesis 9:18, 19.

È nwere agbụrụ ka ibe ya?

“[Chineke sitere] n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum.”—Ọrụ Ndịozi 17:26.

IHE ỤFỌDỤ NDỊ KWURU

Ihe dị ka narị afọ asatọ gara aga, e nwere ndị malitere ikwu na agbụrụ ha ka ndị nke ọzọ. Dị ka ihe atụ, ndị Nazi kwuru na otú e si kee ha mere ka ha ka agbụrụ ndị ọzọ. Ma, ndị UNESCO kwukwara na ebe ọ bụ na mmadụ niile si otu ebe, e nweghị agbụrụ ka ibe ya.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ọrụ Ndịozi isi iri amaokwu iri atọ na anọ na iri atọ na ise kwuru, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” N’ihi ya, e nweghị onye kwesịrị ịna-ekwu na e nwere agbụrụ ka ibe ya.

Ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya gosikwara na anyị ekwesịghị ịna-eche na agbụrụ anyị ka agbụrụ ọzọ. Ọ sịrị: “Unu niile bụ ụmụnna.” (Matiu 23:8) Ọ rịọkwara Chineke ka ndị na-eso ụzọ ya ghara ịna-akpa ókè kama ka ha “dị n’otu.”—Jọn 17:20-23; 1 Ndị Kọrịnt 1:10.

È nwere mgbe a ga-akwụsị ịkpa ókè agbụrụ?

‘N’oge ikpeazụ, a ga-eme ka ugwu nke ụlọ Jehova guzosie ike, mba niile ga-enubakwa n’ime ya.’—Aịzaya 2:2.

IHE ỤFỌDỤ NDỊ CHERE

Otú ndị mmadụ si emesi ndị na-abụghị ndị agbụrụ ha ike na-eme ka ọtụtụ ndị na-ekwu na mbọ niile ndị ọchịchị na-agba ka ndị mmadụ ghara ịna-akpa ókè agbụrụ enweghị isi. Ụfọdụ ndị na-ekwukwa na o nweghị mgbe a ga-akwụsị ịkpa ókè agbụrụ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Chineke agaghị agbachi ndị mmadụ nkịtị ka ha nọgide na-akpa ókè agbụrụ. Kama n’Alaeze ya, “ndị si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile” ga-adị n’otu, na-efekwa ya. Ha ga-ahụkwa ibe ha n’anya. (Mkpughe 7:9) Alaeze Chineke abụghị ihe dị mmadụ n’obi. Kama, ọ bụ ọchịchị Chineke ga-eji gbanwee ụwa a, bụ́ ebe ọ chọrọ ka ndị mmadụ biri n’akpaghị ókè agbụrụ.a

a Ị chọọ ịgụkwu banyere ya, gụọ isi nke atọ n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova biri ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya