Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g17 nke 6 p. 8-9
  • Kụziere Ụmụ Gị Ịdị Umeala n’Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kụziere Ụmụ Gị Ịdị Umeala n’Obi
  • Teta!—2017
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI ESI IKE
  • IHE I KWESỊRỊ ỊMA
  • IHE I NWERE IKE IME
  • Kụziere Nwa Gị Ịdị Umeala n’Obi
    Teta!—2019
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Yikwasị Ịdị Umeala n’Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Zụlite Ezi Ịdị Umeala n’Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Kụziere Nwa Gị Ịna-edi Ihe
    Teta!—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2017
g17 nke 6 p. 8-9
Ebe otu nwata nwoke nọ na-atụ anya ka mama ya na-emere ya ihe niile

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Kụziere Ụmụ Gị Ịdị Umeala n’Obi

IHE MERE O JI ESI IKE

  • Nwa gị nwoke na-akpa àgwà gosiri na ọ dị mpako n’agbanyeghị na ọ ka dị naanị afọ iri.

  • Ọ chọrọ ka onye ọ bụla na-akwanyere ya ùgwù.

‘I nwere ike ị na-asị, oleedị ihe na-eme nwa a? M chọrọ ka obi na-adị ya mma, ma, ọ bụghị ka o chewe na ya ka ndị ọzọ mma.’

Ma, è nwere ike ịkụziri nwata ịdị umeala n’obi n’emeghị ka o chewe na o nweghị ihe ya dị mma ya?

Ebe otu nwata nwaanyị nọ ka eze nwaanyị, nne na nna ya a na-akpọrọ ya isi ala

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

N’oge ndị na-adịchabeghị anya, a gbara ndị nne na nna ume ka ha na-emere ụmụ ha ihe ọ bụla ha chọrọ ma na-aja ha mma mgbe niile, ọ bụrụgodị na o nweghị ihe ha mere e kwesịrị iji jaa ha mma. A gwakwara ha ka ha ghara inye ụmụ ha ntaramahụhụ ma ọ bụ dọọ ha aka ná ntị. Ha kwuru na ọ bụrụ na a na-apa ụmụaka apa otú ahụ, ọ ga-eme ka ha too bụrụ ndị obi na-adị ụtọ mgbe niile. Ma, olee ihe ụdị ọzụzụ a kpatarala? Akwụkwọ aha ya bụ Generation Me kwuru, sị: “Kama ime ka obi na-adị ụmụaka mma, ụdị ọzụzụ a emeela ka isi na-ebu ha, ha abụrụkwa ndị na-eche naanị gbasara onwe ha.”

Ọtụtụ n’ime ụmụaka ndị ahụ a na-ajakarị mma n’enweghị isi na ọdụ, na-etolite ghọọ ndị ọ na-esiri ike ịma ihe ha ga-eme ma ihe agaghị otú ha tụrụ anya ya, ma ọ bụkwanụ ma a katọọ ha. Ebe ọ bụ na a kụziiri ha ịna-achọ naanị ọdịmma nke onwe ha, ọ na-esiri ha ike ha na ndị ọzọ ịnọgide na-adị ná mma. Nke a akpatarala ọtụtụ n’ime ha nchekasị na ịda mba n’obi.

Ihe na-eme ka ụmụaka bụrụ ndị obi na-adị mma ma ha too abụghị ịna-eto ha mgbe niile, kama ọ bụ hanwa ime ihe ndị bara uru. Ịbụ onye onwe ya juru afọ naanị ezughị. Ha kwesịrị ileru anya ala mụọ ihe ha chọrọ ime ma jiri aka ha na-eme ya ruo mgbe ha mụtara ya nke ọma. (Ilu 22:29) Ha kwesịkwara ịna-achọ ọdịmma ndị ọzọ. (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Iji melie ihe ndị a, ha kwesịrị ịdị umeala n’obi.

IHE I NWERE IKE IME

Jaa ha mma mgbe o kwesịrị ka a jaa ha mma. Ọ bụrụ na nwa gị nwaanyị e mee nke ọma n’ule, jaa ya mma. Ọ daa n’ule, a sịla na ọ bụ onye nkụzi ya kpatara ya. Kama ime otú ahụ, nyere ya aka ka o mee nke ọma n’oge ọzọ. Jaa ya mma naanị mgbe o mere ihe dị mma. Ọ ga-eme ka ọ mụta ịdị umeala n’obi.

Dọọ nwa gị aka ná ntị mgbe o kwesịrị. Nke a apụtaghị na ị ga na-aba mba n’ihe ọ bụla nwa gị mejọrọ. (Ndị Kọlọsi 3:21) Ma, baara ya mba ma ọ kpaa àgwà ọjọọ. Ma i meghị otú ahụ́, àgwà ọjọọ ga-amara ya ahụ́.

Ọ̀ bụrụkwanụ na ị chọpụta na nwa gị nwoke na-etukarị ọnụ? Ị gba ya nkịtị nwere ike ime ka ọ dịrị mpako, meekwa ka ndị mmadụ na-eze ya eze. N’ihi ya, mee ka ọ mata na itu ọnụ abụghị ezigbo àgwà nakwa na o nwere ike ime ka a kparịwa ya. (Ilu 27:2) Meekwa ka ọ mara na onye maara ihe anaghị eji ihe ndị ọ ga-emeli na-etu ọnụ. I si otú a jiri ịhụnanya na-agbazi nwa gị, ọ ga-eme ka o jiri obi ụtọ mụta ịdị umeala n’obi.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Matiu 23:12.

Kwadebe nwa gị maka ihe isi ike ndị dị ná ndụ a. Imere nwatakịrị ihe ọ bụla ọ chọrọ nwere ike ime ka o chee na ọ bụ ihe ruuru ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na nwa gị chọrọ ka ị zụtara ya ihe ị na-agaghị azụtali, mee ka ọ mata uru ọ bara mmadụ ikowe akpa ya ebe aka ya ga-eru. Ọ bụrụ na e nwere ihe mere iji kagbuo mkpapụ unu chọrọ ime maka ntụrụndụ, i nwere ike ime ka ọ mata na ọ bụghị mgbe niile ka ihe na-agacha otú a tụrụ anya ya. Kọwakwara ya ihe ndị ị na-eme ma ihe dawa ájá ájá otú ahụ. Kama ị na-apa ụmụ gị apa, i kwesịrị ịkwadebe ha maka ihe isi ike ndị ha ga-ezute ma ha too.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 29:21.

Kụziere nwa gị ịna-emesapụ aka. Mee ka nwa gị ghọta na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ Ndịozi 20:35) Olee otú ị ga-esi eme ya? Gị na nwa gị nwere ike ide aha ndị chọrọ ka e nyere ha aka gaa ahịa, buga ha ebe ha na-aga, ma ọ bụ rụziere ihe. Gị na ya soro ma ị gawa imere ha ihe ndị ahụ. Mee ka nwa gị hụ na ọ na-atọ gị ụtọ inyere ndị ọzọ aka. Ihe a bụ otú kacha mma ị ga-esi kụziere nwa gị ịdị umeala n’obi, ya bụ, ịna-eme ya eme.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Luk 6:38.

Ị chọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ ga-enyere nwa gị aka, gaa na jw.org/ig gụọ isiokwu bụ́ “Otú Ị Ga-esi Kụziere Ụmụ Gị Ka Ha Na-emere Ndị Ọzọ Ihe Ọma.”

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • “Onye ọ bụla nke na-ebuli onwe ya elu, a ga-eweda ya ala, onye ọ bụla nke na-eweda onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.”—Matiu 23:12.

  • “Ọ bụrụ na mmadụ na-azụtọ onye na-ejere ya ozi malite n’oge ọ bụ nwata, mgbe o mere okenye, ọ ga-aghọ onye na-enweghị ekele.”—Ilu 29:21.

  • “Na-enyenụ ihe.”—Luk 6:38.

NA-EWERE NA NDỊ ỌZỌ KA UNU

Baịbụl kwuru, sị: “Ghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu, na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”—Ndị Filipaị 2:3, 4.

Nwatakịrị ọ bụla e si otú a zụọ ga-amata na e nwere ihe ndị ọzọ ji ka ya. Ịdị umeala n’obi ga-eme ka nwa gị ghara ịmụta omume mpako juru n’ụwa taa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya