Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g19 nke 2 p. 6-7
  • Kụziere Nwa Gị Ịdị Umeala n’Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kụziere Nwa Gị Ịdị Umeala n’Obi
  • Teta!—2019
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • GỊNỊ BỤ ỊDỊ UMEALA N’OBI?
  • GỊNỊ MERE ỊDỊ UMEALA N’OBI JI DỊ MKPA?
  • OTÚ Ị GA-ESI AKỤZIRI NWA GỊ ỊDỊ UMEALA N’OBI
  • Zụlite Ezi Ịdị Umeala n’Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Yikwasị Ịdị Umeala n’Obi?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Jehova Ji Ndị Ohu Ya Dị Umeala n’Obi Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Kụziere Ụmụ Gị Ịdị Umeala n’Obi
    Teta!—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2019
g19 nke 2 p. 6-7
Ebe nwatakịrị na-ekpofu unyi

IHE NKE 2

Kụziere Nwa Gị Ịdị Umeala N’obi

GỊNỊ BỤ ỊDỊ UMEALA N’OBI?

Onye dị umeala n’obi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Ọ naghị adị mpako ma ọ bụ na-atụ anya ka ndị ọzọ were ya ka onye pụrụ iche. Kama, onye dị umeala n’obi na-achọ ịma banyere ndị ọzọ, dịkwa njikere ịmụta ihe n’aka ha.

Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-eche na onye dị umeala n’obi esighị ike. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ịdị umeala n’obi na-eme ka mmadụ mara ebe ọ na-anaghị emeta na ihe ọ na-agaghị emeli.

GỊNỊ MERE ỊDỊ UMEALA N’OBI JI DỊ MKPA?

  • Ọ na-eme ka mmadụ na ibe ya na-adị ná mma. Otu akwụkwọ aha ya bụ The Narcissism Epidemic kwuru, sị: “Ọ na-aka adịrị ndị dị umeala n’obi mfe imeta ndị enyi.” O kwukwara na ọ na-aka adịrị ha “mfe iso ndị ọzọ na-emekọrịta ihe.”

  • Ịdị umeala n’obi ga-abara nwa gị uru n’ọdịnihu. Nwa gị mụta ịdị umeala n’obi, ọ ga-abara ya uru ma ugbu a ma n’ọdịnihu, dị ka ihe atụ, ma ọ chọwa ọrụ. Dr. Leonard Sax kwuru, sị: “Ọ ga-esi ike onye na-eto eto onwe ya na-ebu isi ime nke ọma ma ọ gaa ịchọ ọrụ. Ma, onye ọ ga-aka adịrị mfe inweta ọrụ bụ onye nke na-ege onye na-ewe ya n’ọrụ ntị.”a

OTÚ Ị GA-ESI AKỤZIRI NWA GỊ ỊDỊ UMEALA N’OBI

Nyere nwa gị aka ka ọ ghara ịna-eche na ya ka ndị ọzọ mma.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na ọ dị ihe ya bụ mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụ, ọ na-aghọgbu obi ya.”—Ndị Galeshia 6:3.

  • Agwala nwa gị na ọ ga-emeli ihe niile. Ọ bụrụ na ị na-agwa nwa gị, sị: “Ị ga-enweta ihe niile ị chọrọ ná ndụ,” nakwa “Ị ga-abụli ihe ọ bụla ị chọrọ ịbụ” ma ọ bụ ihe yiri ha, o nwere ike ime ka ọ na-agba mbọ. Ma ọtụtụ mgbe, ihe anaghị agacha otú ahụ. Ihe ga-aka agaziri ha ma ha na-agba mbọ, na-achọkwa ihe aka ha ga-eru.

  • Na-agwa nwa gị ihe mere i ji jaa ya mma. Naanị ịgwa nwa gị na ọ na-agbalị agaghị eme ka ọ dị umeala n’obi. Gwa ya ihe mere i ji jaa ya mma.

  • Ekwela ka nwa gị na-anọ n’Ịntanet akparịta ụka mgbe niile. Ndị mmadụ na-anọkarị n’ebe ahụ eto onwe ha, ekwu gbasara nkà ndị ha nwere na ihe ndị ha merela. Ihe ndị a anaghị eme ka mmadụ dị umeala n’obi.

  • Gbaa nwa gị ume ka ọ na-arịọ mgbaghara ozugbo o mejọrọ. Nwa gị mejọọ ihe, nyere ya aka ịmata ebe o mejọrọ na ikweta na o mejọrọ.

Kụziere nwa gị ikele ndị meere ya ihe ọma.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Gosikwanụ na unu bụ ndị nwere ekele.”—Ndị Kọlọsi 3:15.

  • Ikele Chineke maka ihe ndị o kere. Ụmụaka kwesịrị ịmụta ịna-ekele Chineke maka ihe niile o kere nakwa na ihe ndị ahụ mere ka anyị dị ndụ. Ikuku, mmiri na ihe oriri dị anyị mkpa. Jiri ihe ndị a kụziere ha ka ha na-enwe obi ụtọ ma na-ekele Chineke maka ihe ndị dị ịtụnanya o kere.

  • Iji ndị ọzọ akpọrọ ihe. Mee ka nwa gị ghọta na e nwere ihe ndị ọzọ ji kara ya mma, nakwa na o kwesịghị imewere ha anyaụfụ, kama, na o nwere ike isi n’aka ha mụta ihe.

  • Ikele ndị ọzọ. Kụziere nwa gị ịna-asị “i meela.” Ọ bụghị naanị ikwu ya ekwu, kama ka o gosi na o si ya n’obi. Ikele ndị ọzọ na-enyere anyị aka ịdị umeala n’obi.

Kụziere ụmụ gị na imere ndị ọzọ ihe ọma na-aba uru.

IHE BAỊBỤL KWURU: “N’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu, na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”—Ndị Filipaị 2:3, 4.

  • Kenye nwa gị ihe ọ ga na-arụ n’ụlọ. Ọ bụrụ na o nweghị ihe i kenyere nwa gị ka ọ na-arụ n’ụlọ, ọ ga-eme ka o chewe na ya dị ezigbo mkpa nke na ya ekwesịghị ịrụ ọrụ dị n’ụlọ. Mee ka ọ mata na o kwesịrị ibu ụzọ rụọ ọrụ ndị dị n’ụlọ tupu ya agawa igwu egwu. Gwa ya uru ọrụ ndị ahụ na-abara ndị ọzọ, nakwa na ndị ọzọ ga-eji ya kpọrọ ihe n’ihi na ọ na-arụ ọrụ ya.

  • Mee ka nwa gị ghọta na ọ dị mma imere ndị ọzọ ihe. Ọ bụ ya ga-akacha eme ka nwatakịrị na-akpa àgwà ọma ma o too. N’ihi ya, gbaa ya ume ka ọ na-achọpụta ndị e kwesịrị inyere aka. Gị na ya kparịta ihe o nwere ike imere ha. Nwa gị meere mmadụ ihe, jaa ya mma ma na-akwado ya.

a O si n’akwụkwọ bụ́ The Collapse of Parenting.

Ebe nwatakịrị na-ekpofu unyi

BIDO UGBU A KỤZIWERE NWA GỊ IHE

Ọ bụrụ na nwatakịrị amụta ịna-arụ obere ọrụ ndị dị n’ụlọ, ya na ndị ọzọ ga na-arụkọ ọrụ nke ọma ma o too

Na-eme Ihe Ndị Ị Na-akụziri Nwa Gị

  • M̀ na-eme ka ụmụ m mara na e nwekwara mgbe m na-achọ ka ndị ọzọ nyere m aka?

  • M̀ na-ekwu okwu ọma banyere ndị ọzọ ka m̀ na-ekwu ihe ndị na-egosi na ha abaghị uru?

  • Ụmụ m hà na-achọpụta na ọ na-atọ m ụtọ imere ndị ọzọ ihe ọma?

Ihe Anyị Mere . . .

“Nwa anyị nwaanyị gwara anyị banyere nwa klas ha na-anaghị akpaso ndị ọzọ àgwà ọma, ya emee ka ndị ọzọ na-agbara ya ọsọ. M gwara ya ka o chee banyere nsogbu ndị ọ ga-abụ na ọ na-enwe n’ụlọ  ha. A sị kwuwe, ọ bụghị mmadụ niile ka ihe dịịrị mma. Ihe a mere ka nwa anyị mata na ya akaghị ndị ọzọ mma. Ọ bụ naanị na o nwere ike ịbụ na ihe dịịrị ya mma karịa hanwa.”—Karen.

“Anyị na-agwa ụmụ anyị ka obi na-atọ ha ụtọ n’ihi ihe ha na-amụta n’ụlọ akwụkwọ, ka ha na-eme ike ha ma ghara iji onwe ha na-atụnyere ndị ọzọ, nakwa na anyịnwa agaghị eji ha na-atụnyere ndị ọzọ.”—Marianna.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya