Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g23 nke 1 p. 15
  • Chineke Kwere Nkwa na Ụwa Anyị A Ga-adịgide

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Kwere Nkwa na Ụwa Anyị A Ga-adịgide
  • Teta!—2023
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onyinye Ga-adịru Mgbe Ebighị Ebi nke Onye Okike Anyị Nyere Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Isiokwu Ndị Dị na Teta! A
    Teta!—2023
  • Ndị Mmadụ Hà Ga-emebiru Ụwa A Otú Ọ Na-agaghịzi Ekwe Mmekwata?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • À Ga-ebibi Ụwa?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2023
g23 nke 1 p. 15
Ọdọ mmiri ugwu na oké ọhịa gbara gburugburu.

Oleh_Slobodeniuk/E+ via Getty Images

Chineke Kwere Nkwa na Ụwa Anyị A Ga-adịgide

“E kesiri ụwa anyị a ike karịa otú anyị chere.”

Ọ bụ ihe a ka ndị na-eme nchọpụta si ná mba dị iche iche kwubiri mgbe ha mechara nchọpụta gbasara otú ụwa si na-ekpo oké ọkụ. Ọ bụrụ na i kweere na Chineke, Onye ihe banyere ụmụ mmadụ na-emetụ n’obi, ihe a ndị sayensị kwuru nwere ike ime ka i cheta otú Chineke si kee ụwa anyị a ka o jiri aka ya na-edozi onwe ya.

Ma, n’ihi otú ndị mmadụ mebirurula ụwa a, ọ gaghịzi ejili aka ya dozie ihe niile e mebiri na ya. Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na Chineke ga-eme ihe maka ya?

Lee amaokwu Baịbụl ndị dị n’igbe dị na peeji a. Ha na-eme ka obi sie anyị ike na ụwa anyị a ga-adịgide, dịkwa mma karịa otú ọ dị ugbu a.

  • Ọ bụ Chineke kere ụwa anyị a. “Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.”​—Jenesis 1:1

  • Chineke sịrị na ọ bụ ya nwe ụwa anyị a. “Ọ bụ Jehovaa nwe ụwa na ihe niile dị n’ime ya.​—Abụ Ọma 24:1

  • Chineke kere ụwa anyị a ka ọ dịgide. “Ọ tọsiri ntọala ụwa ike. A gaghị ebupụli ya ebupụ ruo mgbe niile ebighị ebi.” ​—Abụ Ọma 104:5

  • Chineke kwere nkwa na a ga na-enwe ihe ndị dị ndụ n’ụwa a ruo mgbe ebighị ebi. ‘Ezi Chineke, Onye kere ụwa, ekeghị ya na nkịtị, kama o kere ya ka ndị mmadụ biri na ya.​—Aịzaya 45:18

  • Chineke kwere nkwa na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ n’ụwa a ruo mgbe ebighị ebi. “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.​—Abụ Ọma 37:29

Chineke kere ụwa a otú ụmụ mmadụ ga-enwe ike ibi na ya n’emebighị ihe ndị dị na ya. Baịbụl kwuru na mgbe oge a kara aka ruru, Jehova Chineke ga-eme ka mbibi ndị mmadụ na-ebibi ụwa n’ihi anyaukwu kwụsị​—Mkpughe 11:18

Baịbụl kwere nkwa na n’oge ahụ, Chinke ga-eme ka ụwa anyị a bụrụ ọmarịcha paradaịs nakwa na ọ ga-asaghe aka ya “were ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.​—Abụ Ọma 145:16

a Jehova bụ ezigbo aha Chineke​—Abụ Ọma 83:18.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya