Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 11
  • Eke na Egwurugwu Mbụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eke na Egwurugwu Mbụ
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Chebere Mmadụ Asatọ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Mmiri Ebibie Otu Ụwa—Ọ̀ Ga-eme Ọzọ?
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Akụkọ Noa na Iju Mmiri ahụ—Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo Nkịtị?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ịdọ Aka Ná Ntị Site n’Ihe Ndị Mere n’Oge Gara Aga
    Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 11
Eke na egwurugwu mbụ pụtara n’eluigwe, ụgbọ Noa kwụsịrị n’ala akọrọ

AKỤKỌ NKE 11

Eke na Egwurugwu Mbụ

Ị̀ MA ihe mbụ Noa mere mgbe ya na ezinụlọ ya si n’ụgbọ ahụ pụta? Ọ chụụrụ Chineke àjà, ma ọ bụ nye ya onyinye. Ị pụrụ ịhụ ka ọ na-eme nke a na foto dị n’okpuru ebe a. Noa ji ụmụ anụmanụ a chụọrọ Chineke àjà iji kelee ya maka ịzọpụta ya na ezinụlọ ya n’oké iju mmiri ahụ.

Ì chere na onyinye ahụ dị Jehova mma? Ee, ọ dị ya. Ọ gwakwara Noa na ya agaghị eji iju mmiri bibie ụwa ọzọ.

Ebe Noa na ndị ezinụlọ ya na-enye Jehova onyinye ha ji kelee ya

Ọ dịghị anya, ala niile wee kọọ, Noa na ezinụlọ ya wee malite ndụ ọhụrụ mgbe ha pụtasịrị n’ụgbọ ahụ. Chineke gọziri ha wee sị ha: ‘Unu ga-amụ ọtụtụ ụmụ. Unu ga-abakwa ụba ruo mgbe mmadụ ga-ebizu n’ala niile.’

Ma, mgbe ndị mmadụ ga-emesị nụ banyere oké iju mmiri ahụ, ha pụrụ ịtụ egwu na a ga-enwe iju mmiri yiri ya ọzọ. N’ihi ya, Chineke nyere ihe ga na-echetara ndị mmadụ nkwa o kwere nke bụ́ na ya agaghị eme ka iju mmiri rikpuo ụwa ọzọ. Ị̀ ma ihe o wepụtara iji na-echetara ha? Ọ bụ eke na egwurugwu.

A na-ahụkarị ya na mbara igwe n’oge anyanwụ na-amụ mgbe mmiri zosịrị. Ha pụrụ inwe ọtụtụ àgwà mara mma. Ị̀ hụtụla otu? Ị̀ na-ahụ nke dị na foto a?

Chineke wee sị: ‘Ana m ekwe nkwa na iju mmiri agaghị ebibi mmadụ niile na anụmanụ niile ọzọ. M na-etinye eke na egwurugwu m n’igwe ojii. Mgbe ọ pụtara, m ga-ahụ ya wee cheta nkwa nke a mụ onwe m kwere.’

Ya mere, mgbe ị na-ahụ eke na egwurugwu, gịnị ka ọ na-echetara gị? Ọ bụ nkwa ahụ Chineke kwere na ya agaghị eji oké iju mmiri ebibi ụwa ọzọ.

Jenesis 8:18-22; 9:9-17.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya