Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 6 p. 20-p. 21 para. 5
  • Chineke Chebere Mmadụ Asatọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Chebere Mmadụ Asatọ
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụgbọ Noa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Oké Iju Mmiri Ahụ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Noa Ewuo Ụgbọ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • E Chebere “Ya na Mmadụ Asaa Ndị Ọzọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 6 p. 20-p. 21 para. 5
Ebe ụgbọ ahụ na-ese n’elu ka mmiri na-ezo

ISI NKE 6

Chineke Chebere Mmadụ Asatọ

Ebe ụgbọ ahụ na-ese n’elu ka mmiri na-ezo

Noa na ezinụlọ ya na ụmụ anụmanụ banyere n’ụgbọ ahụ. Mgbe ha banyechara, Jehova mechiri ọnụ ụzọ ụgbọ ahụ, mmiri amalite izo. Mmiri ahụ zogidere nke na ụgbọ ahụ malitere ise n’elu ya. Mmiri ahụ mechara tojuo ebe niile n’ụwa. Ndị niile na-eme ihe ọjọọ nwụrụ n’ihi na ha anọghị n’ụgbọ ahụ. Ma, e nweghị ihe mere Noa na ezinụlọ ya. Obi tọgburu ha atọgbu maka na ha rubeere Jehova isi.

Mmiri ahụ zoro abalị iri anọ, ehihie na abalị, ma kwụsị. Ọ malitere iji nwayọọ nwayọọ na-ata. N’ikpeazụ, mmiri ahụ busara ụgbọ ahụ n’elu ugwu. Noa na ezinụlọ ya esighị n’ụgbọ ahụ pụta ozugbo n’ihi na mmiri ahụ atachabeghị.

Mmiri ahụ ji nwayọọ nwayọọ tachaa. Noa na ezinụlọ ya nọrọ n’ụgbọ ahụ ihe karịrị otu afọ. Jehova gwaziri ha ka ha si n’ụgbọ ahụ pụta ma biri n’ụwa a na-enweghịzi ndị ọjọọ na ya. Ha kelere Jehova nke ukwuu maka na ọ zọpụtara ha. Otú ha si kelee ya bụ na ha chụụrụ ya àjà.

Eke na egwurugwu

Obi tọrọ Jehova ụtọ maka àjà a ha chụụrụ ya. O kwere ha nkwa na ya agaghị eji mmiri bibie ihe niile dị n’ụwa ọzọ. Jehova mere ka eke na egwurugwu mbụ pụta na mbara ígwé iji gosi na ya ga-emezu nkwa a. Ị̀ hụtụla eke na egwurugwu?

Jehova gwaziri Noa na ndị ezinụlọ ya ka ha mụọ ụmụ ma ju ụwa.

“Noa banyere n’ụgbọ, [ndị mmadụ] amaghịkwa ruo mgbe Iju Mmiri ahụ bịara kpochapụ ha niile.”​—Matiu 24:38, 39

Ajụjụ: Gịnị mere mgbe Jehova mechichara ọnụ ụzọ ụgbọ ahụ? Olee ihe eke na egwurugwu kwesịrị ichetara anyị?

Jenesis 7:1–9:17

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya