Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 9
  • Noa Ewuo Ụgbọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Noa Ewuo Ụgbọ
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụgbọ Noa
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • O “So Ezi Chineke Jee Ije”
    Ṅomie Okwukwe Ha
  • O “So Ezi Chineke Jee Ije”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Mmadụ Nile Pụrụ Ịmụta Ihe na Vidio Bụ́ Noah—He Walked With God
    Ozi Alaeze Anyi—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 9
Ebe Noa na ndị ezinụlọ ya na-akpọbata ụmụ anụmanụ, ma na-eweba ihe ndị ha ga-eri, n’ime ụgbọ ahụ

AKỤKỌ NKE 9

Noa Ewuo Ụgbọ

NOA nwere otu nwunye na ụmụ nwoke atọ. Aha ụmụ ya bụ Shem, Ham na Jefet. Nwa ya nke ọ bụla nwekwara nwunye. N’ihi ya, e nwere mmadụ asatọ n’ezinụlọ Noa.

Chineke mere ka Noa mee ihe dị ịtụnanya. Ọ gwara ya ka o wuo otu ụgbọ buru ibu. Ọ ha ka ụgbọ mmiri, ma o yiri ogologo nnukwu igbe. Chineke wee, sị: ‘Mee ka ọ dị okpukpu abụọ n’ịdị elu, ị ga-ekebisịkwa ime ya ekebisị.’ Nkebi ndị ahụ bụ maka Noa na ezinụlọ ya na anụmanụ na nri ndị ha ga-eri.

Chineke gwakwara Noa ka o dozie ụgbọ ahụ ka mmiri ghara ịba n’ime ya. Chineke sịrị ya: ‘M ga-eweta oké iju mmiri ibibi ụwa niile. Onye na-anọghị n’ime ụgbọ ahụ ga-anwụ.’

Noa na ụmụ ya gere Jehova ntị, wee malite iwu ụgbọ ahụ. Ma ndị ọzọ chịrị ha ọchị. Ha nọgidere na-eme ihe ọjọọ ha na-eme. Ha ekweghị ihe Noa kwuru mgbe ọ gwara ha ihe Chineke gaje ime.

Ebe ndị mmadụ na-achị Noa ọchị mgbe ọ na-agwa ha na Chineke chọrọ iji mmiri bibie ụwa

Owuwu ụgbọ ahụ were ogologo oge, n’ihi na o buru ezigbo ibu. E wusịrị ya mgbe ọtụtụ afọ gasịrị. Chineke gwaziri Noa ka ọ kpọba anụ niile n’ime ụgbọ ahụ. Chineke sịrị ka a kpọba ụdị anụ ụfọdụ abụọ abụọ, ma oké ma nne. Ma, ọ sịrị ka a kpọba ụdị anụ ndị ọzọ asaa asaa. Chineke gwakwara Noa ka ọ nwụbata nnụnụ dị iche iche. Noa mere nnọọ ihe Chineke kwuru.

E mesịa, Noa na ezinụlọ ya banyere n’ụgbọ ahụ. Chineke wee mechie ụgbọ ahụ. Noa na ezinụlọ ya nọ n’ime ya na-echere. Were ya na i so ha nọrọ n’ime ụgbọ ahụ wee na-echere. Iju mmiri ahụ ọ̀ ga-abịa dị ka Chineke kwuru?

Jenesis 6:9-22; 7:1-9.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya