Mmadụ Nile Pụrụ Ịmụta Ihe na Vidio Bụ́ Noah—He Walked With God
Gụọ ma ọ bụ tụleghachi Jenesis 6:1 ruo Jenesis 9:19. Mgbe ahụ kirie vidio Noah, ma chee banyere otú ị ga-esi zaa ajụjụ ndị a: (1) Olee otú ụwa dị n’oge Noa, oleekwa otú o si bịa dịrị otú ahụ? (2) Gịnị mere Noa ji pụọ nnọọ iche, olee ọrụ Chineke nyere ya ka ọ rụọ, n’ihi gịnịkwa? (3) Olee ebe e wuru ụgbọ ahụ ma eleghị anya, ogologo oge ha aṅaa ka o were, oleekwa ókè o bururu ibu? (4) E wezụga iwu ụgbọ ahụ, oleekwa ihe ọzọ Noa na ezinụlọ ya na-aghaghị ime? (5) Olee ọnọdụ i chere na e nwere n’ime ụgbọ ahụ mgbe e mechiri ọnụ ụzọ ya? (6) Olee otú ọ gaara adị gị mgbe ị lanarịsịrị Iju Mmiri ahụ? (7) Olee ihe anyị na-ahụ site n’oge ruo n’oge bụ́ nke na-echetara anyị Iju Mmiri ahụ, gịnịkwa ka ọ pụtara? (8) Gịnị ka ihe ndekọ Bible banyere Noa kụziwooro gị banyere gị onwe gị, ezinụlọ gị, na ọrụ Chineke nyere anyị ịrụ? (9) Olee ajụjụ ndị ị chọrọ ịjụ Noa na ezinụlọ ya mgbe i zutere ha na Paradaịs? (10) Atụmatụ dị aṅaa ka anyị na-eme maka iji vidio Noah mee ihe ugbu a?