Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite February 11
Abụ nke 6
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Gbaa mmadụ nile ume ịgụ ma ọ bụ ịtụleghachi Jenesis 6:1 ruo Jenesis 9:19 na ikiri vidio bụ́ Noah—He Walked With God iji kwadebe maka ịtụle ya ná Nzukọ Ije Ozi n’izu February 18.
20 min: “Kwusaa Okwu Chineke n’Ụzọ Zuru Ezu.”a (Paragraf nke 1-13) Nke onyeisi oche ndị nlekọta ga-ekwu. Ntụle na-ekpo ọkụ nke ihe anyị chọrọ ịrụzu na March nakwa n’ọnwa ndị ọzọ. Onye ọ bụla kwesịrị iji kalenda dị n’ihe ntinye a hazie usoro ihe omume dị mma maka ikere òkè n’ozi ruo n’ókè kwere mee na March. Gbaa ndị nile pụrụ ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ahụ ume ime otú ahụ. Mgbe ị na-atụle paragraf nke 7-8, gwa ndị rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ n’oge Ememe Ncheta gara aga ka ha kwuo ụgwọ ọrụ ndị ha nwetara. Maa ọkwa na a pụrụ inweta akwụkwọ ndejupụta maka ịsụ ụzọ inyeaka mgbe e mechiri nzukọ a.
13 min: Tụlee “Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche.” Kwuo mgbe ọzọ a ga-enwe ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, gbaakwa mmadụ nile ume ịnọ ya maka usoro ihe omume ahụ dum. Gbaa ndị nkwusa ume ịkpọ ndị ọhụrụ nwere mmasị na ndị ha na-amụrụ Bible òkù.
Abụ nke 49 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite February 18
Abụ nke 95
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: “Mmadụ Nile Pụrụ Ịmụta Ihe na Vidio Bụ́ Noah—He Walked With God.” Malite ozugbo isoro ndị na-ege ntị tụlee vidio Noah, na-eji nanị ajụjụ ndị dị n’igbe nke dị na peeji a eme ihe. N’April anyị ga-atụle vidio bụ́ Young People Ask—How Can I Make Real Friends? N’ọnọdụ ya, tụlee “Ị̀ Na-ele Ndị Na-eme Ihe Ike Anya Dị Ka Chineke Si Ele Ha?” Nke sitere n’Ụlọ Nche nke April 15, 2000, peeji nke 26-29.
20 min: “Kwusaa Okwu Chineke n’Ụzọ Zuru Ezu.”b (Paragraf nke 14-23) Nke onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. Tụleghachi atụmatụ ndị pụrụ iche a na-eme n’ọgbakọ maka ọrụ ka ukwuu na March. Kọwapụta usoro ihe omume nile nke nzukọ maka ozi ubi bụ́ nke e mere atụmatụ ya maka ọnwa ahụ. Lekwasị anya n’ime ka ndị na-adịghị ejekwa ozi maliteghachi ije ozi nakwa n’inyere ụmụaka na ndị a na-amụrụ Bible aka iru eru dị ka ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim. Kpọpụta aha ndị tinyere akwụkwọ ịsụ ụzọ na March, gbaakwa ndị ọzọ ume iji ekpere chebara isonyere ha echiche.
Abụ nke 215 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite February 25
Abụ nke 174
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Mee ihe ngosi abụọ dị nkenke nke ụzọ iche magazin n’ihu mmadụ—a ga-eji Ụlọ Nche nke March 1 mee otu ma jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ sitere na Teta! nke March 8 mee nke ọzọ. Mee ka otu onye ntorobịa mee otu n’ime ha. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka February.
30 min: “Ị̀ Na-etinye Ihe Ị Mụtara ná Mgbakọ Distrikti ‘Ndị Na-ezi Okwu Chineke’ n’Ọrụ?” Ntụle ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke usoro ihe omume mgbakọ, bụ́ nke onye nduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga-eduzi. Mgbe i jisịrị otu minit kwuo okwu mmeghe, jiri minit 8-10 tụlee usoro ihe omume nke ụbọchị nke ọ bụla. Kọwapụta ná mkpirikpi isi ihe ndị dị n’okpuru isiokwu nta nke ọ bụla, gwazie ndị na-ege ntị ka ha kwuo (1) mgbalị ha meworo iji tinye ntụziaka ahụ n’ọrụ, (2) uru ha riteworo site n’ime otú ahụ, na (3) ihe ọzọ ha chere dị mkpa ka ha mee. Jiri ajụjụ ndị na-akpali iche echiche mee ihe iji kpalie ntụle na-ekpo ọkụ. Nyere mmadụ nile aka ịghọta mkpa ọ dị itinye ihe ha mụtara n’ọrụ.
Abụ nke 151 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite March 4
Abụ nke 207
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
12 min: “Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ.” Jụọ ndị nkwusa otú akụkụ a nke Ozi Alaeze Anyị siworo nyere ha aka ịkwadebe nke ọma ijikọta isiokwu dị iche iche na ihe ọjọọ ndị na-eme n’oge a dị oké egwu. Ahụmahụ ndị dị aṅaa ka ụfọdụ ndị nweworo n’iwetara ndị mmadụ nkasi obi nakwa n’inyere ha aka ịchọta azịza ndị dabeere na Bible nye ajụjụ ndị na-enye ha nsogbu? N’ihe ngosi abụọ dị nkenke, gosi ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke February 15 nakwa Teta! nke March 8 na-eji ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ sitere na ya.
12 min: Jiri Akwụkwọ Ihe Ọmụma Malite Ọmụmụ Ihe. Na March, anyị ga-achọ itinye mgbalị pụrụ iche iji malite ọmụmụ Bible ebe obibi. Kọọ n’ụzọ dị nkenke ahụmahụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke December 2000, peeji nke 3, paragraf nke 8. Ọ bụrụ na ọ dị onye malitere ọmụmụ ihe n’oge na-adịbeghị anya n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, mee ihe ngosi nke otú o si mee ya. Chetara mmadụ nile “Aro Dị Iche Iche Maka Ụzọ Isi Na-eche Akwụkwọ Ihe Ọmụma n’Ihu Mmadụ,” bụ́ nke dị n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2002. N’iji akwụkwọ ahụ mee ihe, mee ihe ngosi nke otu n’ime aro ndị dị na peeji nke 6 nke ihe ntinye ahụ n’okpuru “Ịkpọ Okwu Aha.”
16 min: “Gịnị Mere A Ga-eji Nọgide Na-eme Nkwusa?”c Mechie site n’ịgba otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ ajụjụ ọnụ bụ́ onye/ndị nọgideworo na-eme nkwusa ruo ọtụtụ afọ. Mee ka ha kọọ ihe mere ha ji nọgide n’ọrụ a na otú o siworo baara ha uru.
Abụ nke 223 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.