Ị̀ Na-etinye Ihe Ị Mụtara ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Na-ezi Okwu Chineke” n’Ọrụ?
1 Onye ọ bụla gara mgbakọ distrikti gara aga pụrụ ịhụ na ndị Jehova chọrọ ịrụzu ọrụ e nyere ha ịbụ ndị na-ezi Okwu Chineke. (Mat. 28:19, 20) Mgbe ị laghachiri n’ebe obibi gị, isi ihe ndị dị aṅaa nke ntụziaka ndị e nyere ka i kpebisiri ike itinye n’ọrụ ná ndụ gị nakwa n’ozi ubi?
2 Akwụkwọ Nsọ E Dere n’Ike Mmụọ Nsọ Bara Uru Iji Zie Ihe: Isiokwu nke ụbọchị mbụ mere ka 2 Timoti 3:16 pụta ìhè. Okwu bụ́ isi gosiri na iji bụrụ “Ndị A Kwadebere n’Ụzọ Zuru Ezu Dị Ka Ndị Na-ezi Okwu Chineke,” anyị aghaghị iji Okwu Chineke kpọrọ ihe nke ukwuu, na-akwanyere ya ùgwù karịa echiche ma ọ bụ ọdịnala ọ bụla nke mmadụ, na-ejikwa ya eme ihe mgbe nile. Anyị aghaghịkwa ịdị na-ekpe ekpere kwa ụbọchị ka mmụọ nsọ nyere anyị aka n’ozi anyị ma mee ihe iji zụlite mkpụrụ ya bụ́ isi—ịhụnanya. Anyị kwesịkwara ikwe ka nzukọ elu ala nke Jehova zụọ anyị dị ka ndị ozi site ná nzukọ nile nke ọgbakọ.
3 Usoro isiokwu nke Friday, bụ́ “Izi Onwe Anyị Ihe Mgbe Anyị Na-ezi Ndị Ọzọ,” kọwara na anyị aghaghị ịbụ ndị kwesịrị nṅomi (1) n’ịgbaso iwu Chineke n’akụkụ nile nke omume ọma Ndị Kraịst, (2) n’ịnọgide na-enwe àgwà nke ịmụchi ihe anya, nakwa (3) n’iwepụ àgwà na ọnọdụ obi na nke uche ndị Ekwensu pụrụ iji mee ihe. Ọzọkwa, anyị mụtara ụzọ ndị dị irè anyị pụrụ isi chebe ezinụlọ anyị pụọ n’ihe otiti ụwa nke ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. A gbara ndị nne na nna ume isetịpụ ihe nlereanya site n’izere ọbụna igwu anya n’ihe nkiri ndị na-egosi ebe a na-enwe mmekọahụ nakwa ka ha na-enyoba anya iji mara otú ụmụ ha si eji Internet eme ihe nakwa otú ha si ekiri telivishọn. Olee isi ihe ndị sitere n’usoro ihe omume Friday ndị ị maliteworo itinye n’ọrụ?
4 Okwu ikpeazụ nke ụbọchị ahụ mere ka anyị kpebisikwuo ike iji ìhè Jehova na-akpọrọ ihe, ịnọrọ òtù ndị e tere mmanụ na-ekwesị ntụkwasị obi nke Chineke nso, na ịtụnye ụtụ n’udo nke ndị Jehova. Ị̀ gụwo akwụkwọ ahụ e wepụtara ọhụrụ bụ́ Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II?
5 Ndị Ruru Eru nke Ọma Izi Ndị Ọzọ Ihe: Akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke isiokwu ụbọchị nke abụọ dabeere na ya bụ 2 Timoti 2:2. Ka ị na-ege ntị n’usoro isiokwu nke ụtụtụ Saturday, ị̀ rịbara ama aro banyere ụzọ isi (1) chọpụta ndị kwesịrị ekwesị, (2) zụlite mmasị ha, ma (3) zie ha ka ha debe ihe nile Kraịst nyere n’iwu? Ị̀ na-etinye ihe ị mụtara n’ọrụ—igosi ndị nwe ụlọ ma ọ dịkarịa ala otu isi ihe site n’Akwụkwọ Nsọ na ịtọ ntọala maka nleta n’ọdịnihu?
6 Usoro ihe omume nke ehihie mere ka mkpa iṅomi Onye Ozizi Ukwu ahụ, bụ́ Jizọs, dị pụta ìhè. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ị na-agbalị ịdịkwu ka ya? Site n’ihe ị mụtara n’usoro isiokwu nke abụọ nke ụbọchị ahụ, olee otú i chere ị pụrụ isi “Rite Uru n’Ụzọ Ka Zuo Ezuo Site ná Mmụta Ọchịchị Chineke”? Aro ndị dị aṅaa ka i tinyeworo n’ọrụ iji mụbaa ogologo oge ị na-etinyeru uche n’ihe n’oge ọmụmụ ihe onwe onye na nzukọ ọgbakọ?
7 Obi abụọ adịghị ya na akwụkwọ ga-abịa n’ọdịnihu bụ́ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ga-enyere anyị aka ito eto n’ikike anyị dị ka ndị ọkà okwu nakwa dị ka ndị na-ezi Okwu Chineke. A ga-elekwasịkwu anya na nkà okwu ndị e ji mara ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi n’oge Bible. Ihe ọmụmụ nke ọ bụla n’akwụkwọ ọgụgụ ọhụrụ ahụ nwere igbe ndị na-egosi ná nkenke ihe dị mkpa ka anyị mee, ihe mere o ji dị mkpa, na otú anyị ga-esi eme ya. O nwekwara ihe omume ndị dị irè. Ụmụnna nwanyị ga-enwe ọnọdụ okwu 29 ha ga-esi na ha họrọ n’oge ha na-eme ihe omume ha. Ka oge na-aga, a ga-eme mgbanwe ndị ahụ a mara ọkwa ha n’ụzọ e si enwe ụlọ akwụkwọ ahụ. Ì nwere usoro ihe omume dị mma nke ịmụ ihe na ime nkwadebe iji rite uru n’ụzọ zuru ezu kwa izu site n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke?
8 Bụrụnụ Ndị Ozizi n’Ihi Oge: Ndị Hibru 5:12 doziri uche ndị na-ege ntị maka Sunday. Usoro isiokwu nke ụtụtụ, bụ́ “Amụma Malakaị Na-akwadebe Anyị Maka Ụbọchị Jehova,” gbara anyị ume inye Chineke ihe kasị nnọọ mma anyị nwere nakwa ịkpọ ụdị nile nke aghụghọ asị ka anyị wee nwee ike ịlanarị ụbọchị dị ukwuu, dịkwa egwu, nke Jehova. Ihe nkiri, bụ́ “Kwanyere Ịbụisi Jehova Ùgwù,” gosiri n’ụzọ dị irè otú mpako, oké ọchịchọ, ekworo, na iguzosi ike n’ihe hiere ụzọ nke Kora nke oge ochie na ndị ibe ya si duga ha n’omume nnupụisi megide Jehova n’onwe ya. Okwu sochiri ya lekwasịrị anya ná mkpa e nwere n’oge a nke ido onwe onye n’okpuru ịbụisi Chineke n’ime ezinụlọ nakwa n’ọgbakọ. Okwu ihu ọha, bụ́ “Olee Ndị Na-akụziri Mba Nile Eziokwu Ahụ?,” nyere ihe àmà na-egosi na Ndịàmà Jehova na-eme otú ahụ, n’adịghị ka Krisendọm, bụ́ nke na-azọrọ nanị na ọ na-akụzi eziokwu Bible.
9 N’ụzọ doro anya, Jehova na-azụ anyị ịbụ ndị ozizi ka mma nke Okwu ya. Ka anyị tinye ihe anyị mụtara n’ọrụ, ‘na-elezi onwe anyị nakwa ozizi anyị anya mgbe nile, ka anyị wee zọpụta ma onwe anyị ma ndị na-ege anyị ntị.’—1 Tim. 4:16.