Ihe Mere Ị Pụrụ Iji Tụkwasị Bible Obi
Ụfọdụ ndị na-asị na a pụghị ịtụkwasị Bible obi, ọtụtụ ndị anakwerewokwa echiche ha. N’ihi nke a, ọtụtụ ndị taa na-eleghara ihe Bible na-ekwu anya dị ka ihe a na-apụghị ịtụkwasị obi.
N’aka nke ọzọ, ihe Jisọs Kraịst kwuru n’ekpere o kpegaara Chineke na-eme ka e nwee ntụkwasị obi: “Okwu Gị bụ eziokwu.” Bible n’onwe ya na-ekwukwa na ya si n’obi Chineke pụta.—Jọn 17:17; 2 Timoti 3:16.
Gịnị ka i chere banyere nke a? È nwere ezi ihe mere a ga-eji tụkwasị Bible obi? Ka è nwere n’ezie ihe àmà na-egosi na a pụghị ịtụkwasị Bible obi, na ọ na-emegide onwe ya ma ghara inwe nkwekọ?
Ọ̀ Na-emegide Onwe Ya?
Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị pụrụ ikwu na Bible na-emegide onwe ya, ọ̀ dịtụwo onye gosiri gị otu ihe atụ bụ ezie? Ọ dịbeghị otu nke anyị hụrụ ga-abụ eziokwu ma e nyochasịa ya. N’eziokwu, ọ pụrụ iyi ka è nwere ihe ndị ha na ibe ha na-ekwekọghị n’ihe ụfọdụ e dekọrọ na Bible. Ma ihe bụ́ nsogbu na-abụkarị amaghị ihe ndị merenụ na ọnọdụ ndị dị n’oge ahụ.
Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị pụrụ izo aka n’ihe ha chere na ọ bụ ihe ya na ibe ya na-ekwekọghị na Bible, na-ajụ, sị: ‘Olee ebe Ken lụtara nwunye ya?’ Ihe ha na-eche bụ na Ken na Ebel bụ nanị ụmụ Adam na Iv mụtara. Ma echiche ahụ na-adabere ná nghọtahie nke ihe Bible na-ekwu. Bible na-akọwa na Adam ‘mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.’ (Jenesis 5:4) Ya mere, Ken lụrụ otu n’ime ụmụnne ya ndị nwanyị, ma ọ bụ ikekwe nwa nwanne ya.
Mgbe mgbe, ndị nkatọ na-achọ nanị ihe ndị ha na ibe ha na-ekwekọghị, n’ihi ya ha pụkwara ikwu, sị: ‘Onye so dee Bible bụ́ Matiu na-ekwu na otu onye ọchịagha bịakwutere Jisọs ịrịọta ya ihe, ebe Luk na-ekwu na o zigara ndị nnọchiteanya ịrịọ ihe ahụ. Olee nke bụ eziokwu?’ (Matiu 8:5, 6; Luk 7:2, 3) Ma nke a ọ̀ bụ ihe ya na ibe ya na-ekwekọghị n’ezie?
Mgbe e kwuru na ọ bụ onye ziri ndị mmadụ ka ha mee ihe ma ọ bụ rụọ ọrụ rụrụ ihe ahụ n’ezie, onye nwere ezi uche adịghị ekwu na o kwekọghị ekwekọ. Dị ka ihe atụ, ị̀ na-ewere ya na akụkọ na-ekwu na onyeisi obodo rụrụ okporo ụzọ bụ ụgha, ọ bụ ezie na ọ bụ ndị injinịa na ndị ọrụ ya rụrụ ụzọ ahụ n’ezie? Ọ dịghị ma ọlị! N’ụzọ yiri nke ahụ, ọ bụghị ihe ya na ibe ya na-ekwekọghị ma ọ bụrụ na Matiu asị na ọchịagha ahụ rịọrọ Jisọs ihe ma ya abụrụ na e nwere ndị nnọchiteanya e si n’ọnụ ha rịọ arịrịọ ahụ, dị ka Luk dere.
Ka a na-amatakwu ihe ndị merenụ, ihe ndị yiri ka ha na ibe ha ekwekọghị na Bible na-apụ n’anya.
Akụkọ Ihe Mere Eme na Sayensị
Ọ dị mgbe e nwere obi abụọ n’ọtụtụ ebe banyere izi ezi nke Bible ma a bịa n’akụkọ ihe mere eme. Dị ka ihe atụ, ndị nkatọ rụrụ ụka banyere ịdị adị nke ndị a kpọrọ aha ha na Bible, ndị dị ka Eze Sagọn nke Asiria, Belshaza nke Babilọn, na gọvanọ onye Rom bụ́ Pọntịọs Paịlet. Ma nchọpụta ndị e mere n’oge na-adịbeghị anya akwadowo ihe ndekọ Bible n’otu n’otu. Ya mere, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Moshe Pearlman dere, sị: “Na mberede, ndị na-arụ eziokwu ụka bụ́ ndị rụrụ ụka banyere ọbụna ịbụ eziokwu nke akụkọ ihe mere eme ndị dị n’Agba Ochie malitere ịgbanwe echiche ha.”
Ọ bụrụ na anyị ga-atụkwasị Bible obi, ọ ghaghịkwa ịbụ eziokwu n’ihe ndị metụtara sayensị. Ọ̀ dị otụ́ ahụ? N’oge na-adịbeghị anya, ndị ọkà mmụta sayensị, n’ikwugide Bible, kwuru na eluigwe na ala enweghị mmalite. Otú ọ dị, na nso nso a onye na-enyocha mbara igwe bụ́ Robert Jastrow kọwapụtara ihe ọmụma ka ọhụrụ nke na-agbagha nke a, na-akọwa, sị: “Ugbu a, anyị na-ahụ otú ihe àmà e nwetara na mbara igwe si na-akwado echiche Bible banyere mmalite nke ụwa. Nkọwa zuru ezu ha nyere dịgasị iche, ma isi ihe ndị a na-ahụ na mbara igwe na ihe ndekọ Bible dị na Genesis bụ otu ihe.”—Jenesis 1:1.
Ụmụ mmadụ agbanwewokwa echiche ha banyere ọdịdị ụwa. “Njem nchọpụta ndị e mere,” ka The World Book Encyclopedia na-akọwa, “gosiri na ụwa dị gburugburu, ọ dịghị mbadamba dị ka ọtụtụ ndị kwenyererịị.” Ma ihe Bible kwuru ziri ezi eri mgbe! Ihe karịrị afọ 2,000 tupu e mee njem ndị ahụ, Bible kwuru n’Aịsaịa 40:22, sị: “Ọ bụ Onye ahụ Nke na-anọdụ n’elu gburugburu ụwa” (ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche), ma ọ bụ dị ka nsụgharị ndị ọzọ na-ekwu, “okirikiri nke ụwa” (Douay), “ụwa nke dị gburugburu.” (Moffatt)
Ya mere, ka ụmụ mmadụ na-amụtakwu ihe, otú a ka ihe àmà ndị na-egosi na a pụru ịtụkwasị Bible obi na-abawanye ụba. Onye bụbu onyeisi nke Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie nke Britain bụ́ Sir Frederic Kenyon dere, sị: “Ihe ndị e nwetawororịị na-akwado ihe okwukwe nwere ike ime ka a mata, na ihe ọmụma ndị a na-enwetakwu na-akwadosi Bible ike.”
Ịkọ Ọdịnihu
Ma, ànyị pụrụ n’ezie ịtụkwasị ihe Bible na-ekwu banyere ọdịnihu obi, gụnyere nkwa ọ na-ekwe maka ‘eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ nke ezi omume’? (2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4) N’oge gara aga, ruo ókè hà aṅaa ka Bible gosiri na a pụrụ ịtụkwasị ya obi? Ọtụtụ ugboro, amụma ndị e buru ọbụna ọtụtụ narị afọ tupu ha emee emezuchawo n’ụzọ zuru ezu!
Dị ka ihe atụ, Bible buru amụma na a ga-akwatu Babilọn dị ike n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 200 tupu o mee. N’eziokwu, a kpọrọ ndị Midia aha, bụ́ ndị ha na ndị Peasia jikọrọ aka, dị ka ndị ga-emeri ha. Ọ bụkwa ezie na a mụbedịghị Saịrọs bụ́ eze ndị Peasia n’oge ahụ, Bible buru amụma na ọ ga-ebute ụzọ ná mmeri ahụ. O kwuru na a ghaghị ime ka mmiri ahụ na-echebe Babilọn, bụ́ osimiri Yufretis, ‘takọsịa,’ nakwa na ‘a gaghị emechi ọnụ ụzọ ámá [Babilọn].’—Jeremaịa 50:38; Aịsaịa 13:17-19; 44:27–45:1.
Ihe ndị a a kpọtụrụ aha n’otu n’otu mezuchara, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Herodotus si kọọ. Ọzọkwa, Bible buru amụma na Babilọn ga-emesị ghọọ mkpọmkpọ ebe nke na-enweghị onye bi na ya. Nke ahụ bụkwa kpọmkwem ihe merenụ. Taa Babilọn bụ ikpo ihe e bibiri ebibi. (Aịsaịa 13:20-22; Jeremaịa 51:37, 41-43) Bible jupụtakwara n’amụma ndị ọzọ mezuworo n’ụzọ dị ịrịba ama.
Ma gịnị ka Bible buru n’amụma banyere usoro ihe nke ụwa dị ugbu a? Ọ na-ekwu, sị: “Mgbe ikpeazụ nke ụwa a ga-abụ oge nsogbu. Ndị mmadụ agaghị ahụ ihe ọzọ n’anya ma e wezụga ego na onwe ha; ha ga-abụ ndị mpako, ndị na-etu ọnụ, na ndị nwere ọnụ ọjọọ; ha agaghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, ndị na-adịghị enwe ekele, ndị na-adịghị akpa àgwà ọma, ndị na-enweghị obi mmadụ . . . Ha ga-abụ ndị na-edebe ihe ụtọ n’ọnọdụ Chineke, ndị na-egosipụta n’ọdịdị a na-ahụ anya na ha ji okpukpe kpọrọ ihe, ma àgwà ha na-egosi na nke a abụghị eziokwu.”—2 Timoti 3:1-5, The New English Bible.
N’ezie, anyị na-ahụ mmezu nke a n’oge a! Ma Bible bukwara ihe ndị a n’amụma banyere “mgbe ikpeazụ nke ụwa a,” sị: “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ụnwụ . . . ga-adịkwa.” Ọzọkwa, “oké ala ọma jijiji ga-adịkwa, . . . ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.”—Matiu 24:7; Luk 21:11.
N’eziokwu, amụma Bible dị iche iche na-emezu taa! Gịnịkwanụ banyere nkwa ndị ka ga-emezu emezu, dị ka: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi,” nakwa, “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè . . . ha agaghị amụtakwa agha ọzọ”?—Abụ Ọma 37:29; Aịsaịa 2:4.
‘Ihe ọma dị otú ahụ apụghị nnọọ ime eme,’ ka ụfọdụ pụrụ ikwu. Ma n’ezie, ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji nwee obi abụọ n’ihe ọ bụla Onye Okike anyị kwere ná nkwa. A pụrụ ịtụkwasị Okwu ya obi! (Taịtọs 1:2) Site n’inyochakwu ihe àmà e nwere, nke a ga-edokwu gị anya karị.
Ọ gwụlakwa ma e gosiri nsụgharị ọzọ, nhota Bible nile sitere na Bible Nsọ nke Union Version, na-asụpe okwu nile n’ụdị e ji eme ihe n’oge a.
[Ihe e dere n’ụdị pụrụ iche na peeji nke 4]
“Ihe ndị e nwetawororịị na-akwado ihe okwukwe nwere ike ime ka a mata, na ihe ọmụma ndị a na-enwetakwu na-akwadosi Bible ike”