Olee Otú Ozizi Atọ n’Ime Otu Si Malite?
UGBU A, ị pụrụ ịjụ, sị: ‘Ọ bụrụ na Atọ n’Ime Otu abụghị ozizi Bible, olee otú o si ghọọ ozizi ndị Krisendọm?’ Ọtụtụ na-eche na e chepụtara ya ná Nzukọ Nicaea nke 325 O.A.
Otú ọ dị, nke ahụ ezichaghị ezi. Kansụl Nicaea kwuru n’ezie na Kraịst na Chineke nwere otu ụdịdị ahụ, bụ́ nke guzobere ntọala maka ọkà mmụta okpukpe nke Atọ n’Ime Otu nke e mesịrị nwee n’ọdịnihu. Ma o guzobeghị Atọ n’Ime Otu, n’ihi na ná nzukọ ahụ, e kwughị okwu ọ bụla banyere mmụọ nsọ dị ka onye nke atọ nke Chiatọ.
Ihe Constantine Mere Na Nicaea
ERI ọtụtụ afọ, e nwewo mmegide dị ukwuu n’ihe metụtara Bible banyere echiche ahụ ka na-ebilite ebilite nke bụ na Jisọs bụ Chineke. Iji gbalịa idozi esemokwu ahụ, onye ọchịchị Rom bụ́ Constantine kpọrọ ndị bishọp nile òkù na Nicaea. Ihe dị ka 300, bụ́ akụkụ dị nta nke ọnụ ọgụgụ ha nile bịara n’ezie.
Constantine abụghị onye Kraịst. A sị na e mesịrị tọghata ya n’ọdịnihu ná ndụ ya, ma emeghị ya baptism ruo mgbe ọ na-achọ ịnwụ. Banyere ya, Henry Chadwick kwuru n’akwụkwọ bụ The Early Church, sị: “Dị ka nna ya, Constantine fere Anyanwụ nke A Na-emerighị Emeri; . . . e kwesịghị ịkọwa ntọghata ya dị ka ahụmahụ ime mmụọ nke amara Chineke . . . Ọ bụ ihe metụtara agha. Ọ dịghị mgbe ọ bụla o ji nwee ezi nghọta doro anya banyere ozizi ndị Kraịst, ma o doro ya anya na inweta mmeri n’agha dabeere n’onyinye nke Chineke ndị Kristian.”
Olee ihe onye ọchịchị nke a a na-emeghị baptism mere na Kansụl Nicaea? Akwụkwọ bụ Encyclopædia Britannica na-akọ, sị: “Constantine n’onwe ya bụ onye isi oche, na-eduzi ihe nile na-aga ná mkparịta ụka ahụ, ma jirikwa aka ya wepụta . . . ụkpụrụ ahụ dị oké mkpa nke na-akọwa njikọ dị n’etiti Kraịst na Chineke n’ụkpụrụ okwukwe ahụ bụ́ nke nzukọ ahụ wepụtara, ‘ya na Nna ahụ nwere otu ụdịdị’ . . . N’ihi oké egwu ha na-atụ onye ọchịchị ahụ, ndị bishọp ahụ nile ma e wezụga mmadụ abụọ nanị binyere aka n’ụkpụrụ okwukwe ahụ, bụ́ nke megidere echiche nke ọtụtụ n’ime ha n’ụzọ dị ukwuu.”
Ya mere, ihe Constantine mere pụtara ìhè. Mgbe ọnwa abụọ nke oké nrụrịta ụka okpukpe gasịrị, onye ọgọ mmụọ nke a bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị tinyere aka ma mee mkpebi n’ụzọ kwadoro ndị na-asị na Jisọs bụ Chineke. Ma ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ezie, ọ bụghị n’ihi ihe ọ bụla na-emesi obi ike bụ́ nke a chọtara na Bible. Akwụkwọ bụ A Short History of Christian Doctrine kwuru, sị: “N’ụzọ bụ isi, Constantine enweghị nghọta ọ bụla ma ọlị banyere ajụjụ ndị ahụ a na-ajụ n’ọkà mmụta okpukpe Grik.” Nanị ihe ọ ghọtara bụ na nkewa okpukpe bụ ihe iyi egwu n’ebe alaeze ya dị, ọ chọkwara ime ka ókèala ebe ọ na-achị siwanye ike.
Otú ọ dị, ọ dịghị otu n’ime ndị bishọp ahụ na Nicaea nke kwadoro Atọ n’Ime Otu. Nanị ihe ha kpebiri bụ ụdịdị nke Jisọs, ọ bụghịkwa ihe bụ ọrụ nke mmụọ nsọ ahụ. Ọ bụrụ na Atọ n’Ime Otu bụ ozizi Bible n’ụzọ doro anya, ọ̀ bụ na ha agaraghị ewelite okwu banyere ya n’oge ahụ?
Ihe Ọzọ nke Weere Ọnọdụ
MGBE kansụl Nicaea gasịrị, nrụrịta ụka n’isiokwu ahụ nọgidere ruo ọtụtụ iri afọ. Ọbụna na n’otu oge e mesịrị nakwere ndị kwere na Jisọs na Chineke ahaghị nhata. Ma ka oge na-aga, Eze Theodosius mere mkpebi megide ha. O guzobere ụkpụrụ okwukwe ahụ nke Kansụl Nicaea ịbụ ụkpụrụ nke ọchịchị ya, ma kpọkọta Kansụl nke Constantinople na 381 O.A. iji mee ka ụkpụrụ ahụ doo anya.
Kansụl ahụ kwere ka e debe mmụọ nsọ na Chineke na Kraịst n’otu ọkwá. Na nke mbụ ya, Atọ n’Ime Otu nke ndị Krisendọm malitere ịpụta ìhè.
Ma, ọbụna mgbe Kansụl nke Constantinople gasịrị, Atọ n’Ime Otu aghọghị ụkpụrụ okwukwe nke a nabatara ebe nile. Ọtụtụ ndị guzogidere ya ma si otú a kpatara onwe ha mmegide jọgburu onwe ya. Ọ bụ nanị na narị afọ ndị sochiri ka a haziri Atọ n’Ime Otu iso na ụkpụrụ okwukwe ndị a nabataworo. Akwụkwọ ahụ bụ The Encyclopedia Americana na-ekwu, sị: “Ntolite zuru ezu nke ozizi Atọ n’Ime Otu weere ọnọdụ n’ebe Ọdịda Anyanwụ, n’Usoro Ọkà Ihe Ọmụma nke Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya, bụ́ mgbe e nyere nkọwa na-adabere n’ọkà ihe ọmụma na ọkà mmụta akparamagwa.”
Ụkpụrụ Okwukwe Athanasius
E NYERE Atọ n’Ime Otu nkọwa zuru ezu n’Ụkpụrụ Okwukwe Athanasius. Athanasius bụ onye ndú okpukpe nke kwadoro Constantine na Nicaea. Ụkpụrụ okwukwe ahụ nke e ji aha ya mee na-ekwu, sị: “Anyị na-efe otu Chineke dị n’Atọ n’Ime Otu . . . Nna ahụ bụ Chineke, Ọkpara ahụ bụ Chineke, Mmụọ Nsọ ahụ bụkwa Chineke; ma ha abụghị chi atọ, kama otu Chineke.”
Otú ọ dị, ndị mmụta maara ihe mere nke ọma kwetara na ọ bụghị Athanasius chepụtara ụkpụrụ okwukwe ahụ. Akwụkwọ bụ The New Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Chọọchị ndị ebe Ọwụwa Anyanwụ amataghị ụkpụrụ okwukwe ahụ ruokwa narị afọ nke iri na abụọ. Malite na narị afọ nke iri na asaa, ndị mmụta kwekọrịtara na ọ bụghị Athanasius (onye nwụrụ na 373) dere Ụkpụrụ Okwukwe Athanasius ahụ kama, e dere ya ma eleghị anya n’ebe ndịda France n’oge narị afọ nke ise. . . . O yikarịrị ka ụkpụrụ okwukwe ahụ o nwere mmetụta n’ụzọ bụ isi n’ebe ndịda France na Spain na narị afọ nke isii na nke asaa. E ji ya mee ihe n’usoro ofufe ndị chọọchị na Germany na narị afọ nke itoolu nakwa na Rom ka oge na-aga.”
Ya mere o were ọtụtụ narị afọ site n’oge Kraịst ka Atọ n’Ime Otu wee ghọọ ihe a nabatara ebe nile na Krisendọm. N’ihe ndị a nile kwa, gịnị duziri mkpebi ndị e mere? Ọ̀ bụ Okwu Chineke, ka ọ̀ bụ ihe ndị metụtara ndị ndú okpukpe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị? N’akwụkwọ ahụ bụ Origin and Evolution of Religion, E. W. Hopkins na-aza, sị: “Nkọwa ikpeazụ a nakweere banyere Atọ n’Ime Otu bụ n’ụzọ bụ isi ihe metụtara ndọro ndọrọ ọchịchị nke chọọchị.”
E Buru Amụma Banyere Ndapụ n’Ezi Ofufe
AKỤKỌ nke a na-eme ihere nke Atọ n’Ime Otu dabara nnọọ n’ihe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya buru n’amụma na ọ ga-esochi oge ha. Ha kwuru na a ga-enwe ndapụ n’ezi ofufe, izi ihe dị iche, mwezụga n’ezi ofufe ruo mgbe Kraịst ga-alọghachi, bụ́ mgbe a ga-eweghachi ezi ofufe tupu ụbọchị Chineke ga-ebibi usoro ihe dị ugbu a.
Banyere “ụbọchị” ahụ, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ọ gaghị adị, ma ọ bụrụ na mwezụga ahụ ebughị ụzọ bịa, e wee kpughee onye ahụ na-emebi iwu.” (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3, 7) Ka oge na-aga, o buru amụma, sị: “Mgbe m lasịrị, agụ jọgburu onwe ha ga-awakwasị unu ma ghara inwe obi ebere n’ebe ìgwè atụrụ ahụ nọ. Ọbụna n’etiti unu a ga-enwe ndị ikom ga-apụta na-eji egbugbere ọnụ a gwagburu agwagbu kwuo eziokwu ahụ iji mee ka ndị na-eso ụzọ soo ha.” (Ọrụ 20:29, 30, JB) Ndị ọzọ bụkwa ndị na-eso ụzọ Jisọs dekwara banyere ndapụ nke a site n’ezi ofufe na òtù ya “na-emebi iwu” nke ndị ndú okpukpe.—Dị ka ihe atụ, lee 2 Pita 2:1; 1 Jọn 4:1-3; Jud 3, 4.
Pọl dekwara, sị: “Oge ahụ aghaghị ịbịa mgbe, kama inwe afọ ojuju n’ihi ezi ozizi, ndị mmadụ ga na-achọsi ihe ọhụrụ ike, na-akpọkọtara onwe ha ọtụtụ ndị nkụzi n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ha chọrọ; mgbe ahụkwa, kama ige ntị n’eziokwu ahụ, ha ga-echigharịkwuru akụkọ ifo.”—2 Timoti 4:3, 4, JB.
Jisọs n’onwe ya kọwara ihe na-akwado ndapụ dị otú a site n’ezi ofufe. O kwuru na ya akụwo ezi mkpụrụ kama na onye iro, bụ́ Setan, ga-akụjupụta ahịhịa n’ubi ahụ. Ya mere, ka ọka ahụ na-eme mpulite ndị mbụ ya, ahịhịa ahụ tolitekwara. Otú a, a ga-atụ anya isi n’ezi Iso Ụzọ Kraịst dapụ ruo n’oge owuwe ihe ubi, mgbe Kraịst ga-eme ka ihe guzozie. (Matiu 13:24-43) Akwụkwọ bụ The Encyclopedia Americana na-ekwu, sị: “Ozizi Atọ n’Ime Otu nke narị afọ nke anọ egosipụtaghị nkụzi ndị Kraịst oge gboo banyere ọdịdị nke Chineke kpọmkwem n’ụzọ ziri ezi; kama nke ahụ, ọ bụ mwezụga pụọ ná nkụzi nke a.” Mgbe ahụ, n’ebee ka mwezụga nke a malitere?—1 Timoti 1:6.
Gịnị Kpaliri Ya
N’OGOLOGO oge nile nke ụwa mgbe ochie, laa azụ n’oge dị anya dị ka oge ndị Babilọn, ofufe nke chi ndị ọgọ mmụọ, bụ́ ndị dị atọ atọ jupụtara n’ebe nile. Mmetụta dị otú ahụ jupụtakwara n’Ijipt, Gris, na Rom na narị afọ ndị bu ụzọ, n’oge Kraịst nakwa mgbe ọ gasịrị. Mgbe ndị ozi nwụsịkwara, nkwenkwe ndị dị otú a nke ndị ọgọ mmụọ malitere ịbata n’Iso Ụzọ Kraịst.
Onye ọkà n’akụkọ ihe mere eme bụ Will Durant kwuru, sị: “Iso Ụzọ Kraịst ebibighị ikpere arụsị; ọ nabatara ya. . . . E si n’Ijipt weta echiche nke atọ n’ime otu dị nsọ.” N’akwụkwọ ahụ bụ Egyptian Religion, Siegfried Morenz kwuru, sị: “Atọ n’ime otu bụ isi ihe nke e ji mara ndị ọkà mmụta okpukpe Ijipt . . . A na-ejikọ chi atọ ma na-emeso ha dị ka otu, na-agwa ha okwu dị ka otu. N’ụzọ dị otú a, ikike nke mmụọ na-achị okpukpe ndị Ijipt na-egosi njikọ dị kpọmkwem n’etiti ya na ọkà mmụta okpukpe ndị Kristian.”
Otú a, n’Alexandria, Ijipt, ndị chọọchị nke mgwụsị narị afọ nke atọ na mmalite narị afọ nke anọ, dị ka Athanasius, gosipụtara mmetụta nke a ka ha na-echepụta echiche ndị dujere n’Atọ n’Ime Otu. Mmetụta ha gbasapụrụ, nke mere na Morenz na-ewere “ọkà mmụta okpukpe nke Alexandria dị ka ihe njikọ nke dị n’etiti ihe nketa okpukpe ndị Ijipt na Iso Ụzọ Kraịst.”
N’okwu mmalite nke akwụkwọ Edward Gibbon bụ History of Christianity, anyị na-agụ, sị: “Ọ bụrụ na Iso Ụzọ Kraịst meriri Ikpere Arụsị, n’otu aka ahụ, ọ bụkwa eziokwu na Ikpere Arụsị merụrụ Iso Ụzọ Kraịst. Ezi nghọta nke ndị Kraịst mbụ nwere banyere Ịdị Adị nke Chineke . . . bụ nke Chọọchị ndị Rom gbanwere ịbụ nkwenkwe a na-apụghị ịghọta aghọta nke atọ n’ime otu. Ọtụtụ n’ime nkwe nkwe ndị na-ekpere arụsị, bụ́ nke ndị Ijipt guzobere, nke Plato chọkwara mma, bụ ndị e jigidere dị ka ndị kwesịrị ka e kwere na ha.”
Akwụkwọ bụ A Dictionary of Religious Knowledge sịrị na ọtụtụ ndị na-asị na Atọ n’Ime Otu “bụ ngwagbu nke a gbazitere site n’okpukpe ndị ọgọ mmụọ, ma webata ya n’okwukwe ndị Kraịst.” Akwụkwọ ahụ bụ The Paganism in Our Christianity na-ekwukwa, sị: “Mmalite nke [Atọ n’Ime Otu] sitere kpam kpam n’ikpere arụsị.”
Ọ bụ nke a mere na n’akwụkwọ ahụ bụ Encyclopædia of Religion and Ethics, James Hastings dere, sị: “N’okpukpe ndị India, dị ka ihe atụ, anyị na-ahụ òtù chi atọ nke Brahmā, Siva, na Viṣṇu; n’okpukpe nke ndị Ijipt, anyị na-ahụkwa òtù chi atọ nke Osiris, Isis, na Horus . . . Ọ bụghịkwa nanị n’okpukpe ndị oge ochie ka anyị na-ahụ na e lere Chineke anya dị ka Atọ n’Ime Otu. Mmadụ na-echetaghachi karịsịa, echiche Ọhụrụ nke Plato banyere Ịdị Adị nke Onye Kasị Elu,” bụ́ nke “a nọchitere anya ya n’ụzọ atọ.” Gịnị jikọrọ onye ọkà ihe ọmụma Grik ahụ bụ Plato Atọ n’Ime Otu?
Ozizi Plato
ECHERE na Plato dịrị ndụ na 428 ruo 347 tupu Kraịst. Ebe ọ bụ eziokwu na ọ kụzighị Atọ n’Ime Otu n’ụdịdị nke ọ dị na ya ugbu a, ọkà ihe ọmụma ya dị iche iche meghere ụzọ maka ya. Ka oge na-aga, usoro ihe omume nke ọkà ihe ọmụma ndị gụnyere nkwenkwe n’ihe ndị dị atọ atọ bilitere, echiche ndị Plato nwere banyere Chineke na ihe ndị e kere eke nwekwara mmetụta ná ndị a.
Akwụkwọ e dere n’asụsụ French, bụ́ Nouveau Dictionnaire Universel (Akwụkwọ Ọkọwa Okwu Ọhurụ nke Elu na Ala) kwuru banyere mmetụta Plato, sị: “Atọ n’ime otu nke Plato, nke bụ nanị nhazigharị nke atọ n’ime otu ndị dịbu adị laa azụ n’oge gboo, yiri ka ọ bụ atọ n’ime otu dabeere n’ọkà ihe ọmụma kwesịrị ekwesị nke ihe ndị e si na ha mụta ihe atọ bụ isi ma ọ bụ ndị dị ka chi bụ́ nke chọọchị dị iche iche nke ndị Kristian na-akụzi. . . . Echiche onye ọkà ihe ọmụma Grik nke a nwere banyere Chineke atọ n’ime otu . . . bụ nke a pụrụ ịhụ n’okpukpe [ikpere arụsị] nile nke oge ochie.”
Akwụkwọ bụ The New Schaff-Herzog Encyclopedia of Religious Knowledge na-egosi mmetụta nke onye ọkà ihe ọmụma Grik nke a nwere, sị: “Ozizi dị iche iche banyere Logos ahụ na Atọ n’Ime Otu nwetara ụdịdị ha site ná ndị Nna Grik, bụ́ ndị . . . ọkà ihe ọmụma Plato nwere oké mmetụta n’ụzọ pụtara ìhè ma ọ bụ n’ụzọ na-apụtaghị ìhè n’ebe ha nọ . . . A pụghị ịgọnarị na ihe na-ezighị ezi na na mmerụ si otú a gbebata na Chọọchị.”
Akwụkwọ bụ The Church of the First Three Centuries na-asị: “Ozizi nke Atọ n’Ime Otu bụ nke bịara nke nta nke nta nakwa mgbe oge gasịrị; . . . mmalite ya sitere kpam kpam n’ebe dị iche pụọ n’Akwụkwọ nsọ ndị Juu na nke ndị Kristian; . . . o tolitere, e wee webata ya n’Iso Ụzọ Kraịst, site n’aka ndị Nna ahụ na-agbaso echiche Plato.”
Ná ngwụsị nke narị afo nke atọ O.A., “Iso Ụzọ Kraịst” na ọkà ihe ọmụma ọhụrụ nke Plato ghọrọ ndị e jikọrọ ọnụ n’ụzọ a na-apụghị ịtọsa atọsa. Dị ka Adolf Harnack kwuru n’akwụkwọ bụ Outlines of the History of Dogma, ozizi chọọchị ghọrọ nke “gbagidesiri mkpọrọgwụ ike n’usoro omenala ndị Grik oge ochie [echiche ikpere arụsị nke ndị Grik]. Ya mere ọ ghọrọ ihe omimi nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị Kristian.”
Chọọchị sịrị na ozizi ndị ọhụrụ o nwere dabeere na Bible. Ma Harnack na-asị: “N’eziokwu, o mere ka echiche nke omenala ndị Grik zie ezi n’etiti ya, bụ́ echiche dị iche iche nke nkwenkwe na-enweghị isi na omenala nke usoro ofufe dị omimi nke ndị na-ekpere arụsị.”
N’akwụkwọ bụ A Statement of Reasons, Andrews Norton na-ekwu banyere Atọ n’Ime Otu, sị: “Anyị pụrụ inyocha ebe ozizi nke a malitere ma chọpụta na o siteghị n’ihe e kpugheere ndị Kraịst, kama ọ bụ n’ọkà ihe ọmụma Plato . . . Atọ n’Ime Otu abụghị ozizi nke Kraịst na Ndị Ozi ya, kama ọ bụ akụkọ efu nke ndị mesịrị ghọọ ndị na-agbaso ozizi Plato.”
Otú a, na narị afọ nke anọ O.A., ndapụ n’ezi ofufe ahụ nke Jisọs na ndị ozi ya buru n’amụma pụtara ìhè nke ọma. Mmalite nke Atọ n’Ime Otu bụ nnọọ otu ihe àmà e nwere banyere nke a. Chọọchị ndị ahụ si n’ezi ofufe dapụ malitekwara ịnabata echiche ndị ọzọ nke ndị na-ekpere arụsị, dị ka ọkụ ala mmụọ, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, na ikpere arụsị. N’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, Krisendọm abanyewo n’oge ọchịchịrị ahụ e buru n’amụma, bụrụ nke òtù ndị ndú okpukpe na-etowanye eto nke “onye ahụ na-emebi iwu” budaworo n’okpuru onwe ya.—2 Ndị Tesalọnaịka 2:3, 7.
N’Ihi Gịnị Ka Ndị Amụma Chineke Na-ejighị Kụzie Ya?
N’IHI gịnị ka ọ na-ejighị dị onye amụma Chineke kụziiri ndị ya banyere Atọ n’Ime Otu eri ọtụtụ puku afọ gara aga? Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ọ̀ bụ na Jisọs agaraghị eji ikike o nwere dị ka Onye Ozizi Ukwu mee ihe iji mee ka Atọ n’Ime Otu ahụ doo ndị na-eso ụzọ ya anya? Chineke ọ̀ ga-eji ike mmụọ nsọ ya mee ka e dee ọtụtụ narị peji nke Akwụkwọ nsọ ma ghara iji nke ọ bụla n’ihe ntụziaka ndị a mee ihe iji kụzie Atọ n’Ime Otu ma a sị na ọ bụ “ozizi bụ isi” nke okwukwe?
Ndị Kraịst hà ga-ekwere na ọtụtụ narị afọ mgbe oge Kraịst gasịrị, mgbe e jisịrị ike mmụọ nsọ dee Bible, na Chineke ga-akwado nchepụta nke ozizi ndị ohu ya na-amaghị eri ọtụtụ puku afọ gara aga, ozizi nke bụ “ihe omimi a na-apụghị ịghọta aghọta” nke “karịrị nghọta mmadụ,” ozizi nke e kwetara na ọ malitere site n’aka ndị ọgọ mmụọ ma bụrụkwa “n’ókè ka ukwuu, ihe sitere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke chọọchị”?
Àmà nke akụkọ ihe mere eme gbara doro anya: Ozizi Atọ n’Ime Otu bụ mwezụga pụọ n’ihe bụ eziokwu, ọ bụkwa isi na ya dapụ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]
‘Ozizi Atọ n’Ime Otu narị afọ nke anọ bụ mwezuga pụọ n’ozizi ndị Kraịst oge gboo.’—The Encyclopedia Americana
Igbe dị na peeji nke 9]
“Usoro Ịdị Atọ Atọ nke Chi Ukwu Ndị ahụ”
Ọtụtụ narị afọ tupu oge Kraịst, e nwere usoro dị atọ atọ, ma ọ bụ atọ n’ime otu nke chi dị iche iche na Babilọn na Asiria oge ochie. Akwụkwọ French bụ “Larousse Encyclopedia of Mythology” kwuru banyere otu n’ime usoro chi atọ ndị ahụ n’ókèala Mesopotamia ahụ, sị: “E kewara elu na ala gaa ná nkebi atọ bụ́ nke nke ọ bụla n’ime ya ghọrọ ókèala ọchịchị nke otu chi. Òkè nke chi Anu bụ mbara igwe. E nyere Enlil ụwa. Ea ghọrọ onye ọchịchị nke mmiri. E jikọọ ha ọnụ, ha ghọrọ usoro ịdị atọ atọ nke Chi Ukwu ndị ahụ.”
Igbe dị na peeji nke 12]
Atọ n’Ime Otu nke Hindu
Akwụkwọ ahụ bụ “The Symbolism of Hindu Gods and Rituals” na-ekwu banyere atọ n’ime otu ndị Hindu nke dịrị adị ọtụtụ narị afọ tupu Kraịst, sị: “Siva bụ otu n’ime chi ndị ahụ nke Atọ n’Ime Otu. A sịrị na ọ bụ chi nke mbibi. Chi abụọ ndị ọzọ bụ Brahma, bụ́ chi nke okike na Vishnu, bụ́ chi nke nlekọta. . . . Iji gosipụta na usoro atọ ndị a bụ otu ihe ahụ, e jikọtara chi atọ ndị ahụ n’otu ụdị.”—Nke A. Parthasarathy, Bombay bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 8]
“N’ụzọ bụ isi, Constantine enweghị nghọta ọ bụla ma ọlị banyere ajụjụ ndị ahụ a na-ajụ n’ọkà mmụta okpukpe Grik.”—A Short History of Christian Doctrine
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
1. Ijipt. Chi atọ nke Horus, Osiris, Isis, puku afọ nke abụọ T.O.A.
2. Babilọn. Chi atọ nke Ishtar, Sin, Shamash, puku afọ nke abụọ T.O.A.
3. Palmyra. Chi atọ nke chi ọnwa, Onye isi nke Eluigwe chi anyanwụ, ihe dị ka narị afọ mbụ O.A.
4. India. Chi atọ nke chi ndị Hindu, ihe dị ka narị afọ nke asaa O.A.
5. Kampuchea. Chi atọ nke chi ndị Buddha, ihe dị ka narị afọ nke iri na abụọ O.A.
6. Norway. Atọ n’Ime Otu (Nna, Ọkpara, mmụọ nsọ), ihe dị ka narị afọ nke iri na atọ O.A.
7. France. Atọ n’Ime Otu ihe dị ka narị afọ nke iri na anọ O.A.
8. Italy. Atọ n’Ime Otu nke ihe dị ka narị afọ nke iri na ise O.A.
9. Germany. Atọ n’Ime Otu nke ihe dị ka narị afọ nke iri na itoolu O.A.
10. Germany. Atọ n’Ime Otu narị afọ nke iri abụọ O.A.