Isi 84
Ibu Ọrụ nke Ịbụ Onye Na-eso Ụzọ
MGBE ọ hapụsịrị ụlọ nke onye Farisii ahụ a ma ama, onye na-aghaghị ịbụworị onye òtù nke Sanhedrin, Jisọs gara n’ihu ije Jerusalem. Ọtụtụ ìgwè mmadụ na-eso ya n’azụ. Ma gịnị bụ nzube ha? Gịnị ka ọ gụnyere n’ezie ịbụ ezi onye na-eso ụzọ ya?
Ka ha nọ na-eme njem ahụ, Jisọs tụgharịrị chee ìgwè mmadụ ahụ ihu, ma eleghị anya kwuo ihe nwụrụ ha ibubo n’ahụ mgbe ọ sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute m, ma ọ kpọghị nna nke ya asị, ya na nne nke ya, na nwunye nke ya, na ụmụ nke ya, na ụmụnne ndị ikom nke ya, na ụmụnne ndị inyom nke ya, ee, ndụ nke aka ya kwa, ọ pụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.”
Gịnị ka Jisọs bu n’uche? Jisọs adịghị ekwu n’ebe a na ndị na-eso ụzọ ya ga-akpọ ndị ikwu ha asị n’ụzọ nkịtị. Kama nke ahụ, ha aghaghị ịkpọ ha asị n’echiche nke ịhụ ha n’anya n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ala karịa ka ha hụrụ ya onwe ya. E kwuru banyere nna ochie Jisọs bụ Jekọb na ọ ‘kpọrọ Lia asị’ ma hụ Rachel n’anya, nke pụtara na a hụrụ Lia n’anya n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ala karịa ka a hụrụ nwanne ya nwanyị bụ Rachel.
Tụleekwa na Jisọs sịrị na onye na-eso ụzọ kwesịrị ịkpọ mkpụrụ obi ma ọbụ “ndụ nke aka ya” asị. Ọzọkwa, ihe Jisọs na-ekwu bụ na ezi onye na-eso ụzọ aghaghị ịhụ Ya n’anya ọbụna karịa ka ọ hụrụ ndụ nke onwe ya. Jisọs si otú a na-eme ka o doo anya na ịghọ onye na-eso ụzọ ya bụ ibu ọrụ siri ike. Ọ bụghị ihe mmadụ ga-anakwere n’ebughị ụzọ chee echiche dị omimi.
Ihe isi ike na mkpagbu na-abịakwa site n’ịbụ onye na-eso ụzọ Jisọs, dị ka ọ gara n’ihu ime ka ọ pụta ìhè, sị: “Onye ọ bụla nke na-adịghị ebu osisi ịta ahụhụ ya wee na-eso m n’azụ, apụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.” (NW) Otú a, ezi onye na-eso ụzọ ya aghaghị ịdị njikere ịnata ụdị ibu ọrụ nkọcha ndị Jisọs natara, ọbụna na-agụnye ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, ịnwụ n’aka ndị iro Chineke, bụ́ nke Jisọs gaje ime n’oge na-adịghị anya.
N’ihi nke a, ịbụ onye na-eso ụzọ Kraịst bụ okwu nke ìgwè mmadụ na-eso ya ga-eji ezi nlezianya tụlee. Jisọs mesiri eziokwu nke a ike site n’otu ihe atụ. Ọ na-asị, “N’ihi na ònye n’ime unu, nke na-achọ iwu ụlọ elu, na-ebughị ụzọ nọdụ ala gụọ ego ọ ga-ewe, ma ò nwere ego ọ ga-eji rụzuo ya? Ka ndị nile ndị na-ahụ ya wee ghara ịmalite ime ya ihe ọchị ma eleghị anya, mgbe ọ tọsịrị ntọala ya, ma o nweghị ike iwuzu ya, sị, Nwoke a malitere iwu ụlọ, ma o nweghị ike ịrụzu ya.”
Ya mere ihe Jisọs na-eme ka ọ pụta ìhè nye ìgwè mmadụ ahụ na-eso ya bụ na tupu ha na-aghọ ndị na-eso ụzọ ya, ha kwesịrị ikpebisi ike na ha ga-enwe ike imezu ihe ndị ọ gụnyere, ọbụna dị ka nwoke nke chọrọ iwu ụlọ elu na-ebu ụzọ jide n’aka tupu ọ malite na ya nwere ihe ga-ezu iji rụzuo ya. N’inyekwa ihe atụ ọzọ, Jisọs gara n’ihu, sị:
“Ma ọ bụ olee eze, mgbe ọ na-aga ibu agha megide eze ibe ya, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbaa izu ma ọ̀ pụrụ ịchị [puku ndị agha iri] zute onye chị [puku ndị agha iri abụọ] bịa imegide ya? Ma ọ bụrụ na ọ pụghị, mgbe onye ahụ nọ n’ebe dị anya ugbu a, o ziga ndị ozi, rịọ ihe ga-eweta udo.”
Mgbe ahụ, Jisọs mere ka isi ihe dị n’ihe atụ ndị a pụta ìhè na-asị: “Ya mere otú a, onye ọ bụla n’ime unu nke na-agbakụtaghị ihe nile o nwere azụ, ọ pụghị ịbụ onye na-eso ụzọ m.” Nke ahụ ka ìgwè mmadụ ahụ na-eso ya, nakwa onye ọ bụla ọzọ nke matara ihe banyere Jisọs na-aghaghị ịdị njikere ime. Ha aghaghị ịdị njikere iji ihe nile ha nwere chụọ àjà—ihe nile bụ nke ha, tinyere ndụ n’onwe ya—ka ha wee bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ị̀ dị njikere ime nke a?
Jisọs gara n’ihu ikwu sị, “Ya mere, nnú dị mma.” N’Ozizi Elu Ugwu ya, o kwuru na ndị na-eso ụzọ ya bụ “nnú nke ụwa,” nke pụtara na ha nwere mmetụta na-echebe ndụ n’ebe ụmụ mmadụ nọ, ọbụna dị ka nnú nkịtị na-echebe ihe. Jisọs kwubiri sị, “Ma a sị na ọbụna nnú atụfuwo ụtọ ya, à ga-eji gịnị mee ya ka ọ dị ụtọ? O kwesịghị ala ma ọ bụ ebe a na-ekpofu nsị́ anụ: ha na-atụpụ ya n’èzí. Onye nwere ntị ịnụ ihe, ya nụ.”
Ya mere Jisọs na-egosi na ọbụna ndị ahụ bụworo ndị na-eso ụzọ ya ruo ogologo oge ekwesịghị ịda mbà ná mkpebi ha ịnọgide. Ọ bụrụ na ha emee otú a, ha ga-abụ ndị na-abakwaghị uru, ihe ịkwa emo nye ụwa nke a, ndị na-ekwesịghịkwa ịnọ n’ihu Chineke, n’ezie, ndị na-ewetara Chineke ihe ihere. N’ihi nke a, dị ka nnú nke na-enwekwaghị ike, nke e metọworo emetọ, a ga-atụpụ ha n’èzí, ee, bibie ha. Luk 14:25-35; Jenesis 29:30-33; Matiu 5:13.
▪ Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ‘ịkpọ ndị ikwu na onwe onye asị’?
▪ Ihe atụ abụọ dị aṅaa ka Jisọs na-enye, gịnịkwa ka ha pụtara?
▪ Gịnị bụ isi ihe dị n’okwu mmechi Jisọs kwuru banyere nnú?