Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • dg akụkụ 7 p. 14-17
  • Gịnị Bụ Ihe Siworo ná Nnupụisi Pụta?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Ihe Siworo ná Nnupụisi Pụta?
  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọnọdụ nke E Nwere Taa
  • Ihe Oge Gosipụtaworo
  • Ọhụhụ Chineke Hụrụ Ihe Ka Dị n’Ọdịnihu Dị Anya
  • Nkwere Chineke Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị Na-eru Ọgwụgwụ Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • N’ihi Gịnị Ka E Ji Nwee Oké Nhụjuanya na Ikpe Na-ezighị Ezi?
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • Ahụhụ Nile Ga-akwụsị n’Isi Nso!
    Ahụhụ Nile Ga-akwụsị n’Isi Nso!
  • Ihe Mere Chineke Jiworo Kwere ka Ahụhụ Dịrị
    Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
dg akụkụ 7 p. 14-17

Akụkụ nke 7

Gịnị Bụ Ihe Siworo ná Nnupụisi Pụta?

1-3. Olee otu oge siworo gosi na Jehova mere ihe ziri ezi?

BANYERE ihe iseokwu nke iru eru Chineke ịchị achị, gịnị siworo n’ọtụtụ narị afọ ndị a gara aga nke ọchịchị mmadụ n’adabereghị n’ebe Chineke nọ pụta? Ụmụ mmadụ hà gosiwo onwe ha ịbụ ezi ndị ọchịchị karịa Chineke? Ọ bụrụ na anyị e jiri ihe ndekọ nke mmeso ọjọọ mmadụ na-emeso mmadụ ibe ya kpee ya, ọ dịghị ma ọlị.

2 Mgbe nne na nna mbụ anyị jụrụ ọchịchị Chineke, ọdachi sochiri. Ha wetaara onwe ha na ezinụlọ nile nke mmadụ ndị si na ha pụta ahụhụ. Ọ dịghịkwa onye ha ga-ata ụta ma ọ bụghị onwe ha. Okwu Chineke na-asị: “Ha ebibiwo onwe ha, ọ bụghị nke ụmụ ya ka ọrụ nke dị n’ahụ bụ.”​—⁠Deuterọnọmi 32:⁠5.

3 Akụkọ ihe mere eme egosiwo izi ezi nke ịdọ aka ná ntị Chineke n’ebe Adam na Iv nọ na ọ bụrụ na ha esi n’okpuru ihe ndị Chineke na-enye wezụga onwe ha, ha ga-adabanye n’ọnọdụ dị njọ ma mesịa nwụọ. (Jenesis 2:17; 3:19) Ha pụrụ n’ezie n’okpuru ọchịchị Chineke, ka oge na-agakwa, ha dabara n’ọnọdụ dị njọ n’ezie ma nwụọ.

4. N’ihi gịnị ka e ji mụọ anyị nile n’ezughị okè, bụrụ ndị na-arịa ọrịa, na-anwụkwa anwụ?

4 Ihe mesịrị mee ndị nile ha mụrụ bụ dị ka Ndị Rom 5:⁠12 kọwara: “Mmehie si n’aka otu mmadụ [Adam, bụ́ onye isi ezinụlọ nke mmadụ] baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile.” Ya mere mgbe nne na nna mbụ anyị nupụrụ isi megide nlekọta nke Chineke, ha ghọrọ ndị mmehie na-ezughị okè. N’ikwekọ n’iwu nke ụkpụrụ ebumpụta ụwa, ezughị okè nke si na nke a pụta bụ nanị ihe ha nwere ike ibufere ụmụ ha. Ọ bụ ya mere e ji mụọ anyị nile dị ka ndị na-ezughị okè, ndị na-arịa ọrịa, na-anwụkwa anwụ.

5, 6. Gịnị ka akụkọ ihe mere eme gosiworo banyere mgbalị mmadụ iweta ezi udo na ọganihu?

5 Ọtụtụ narị afọ agafewo. Alaeze ukwu dị iche iche ebilitewo ma dakpọọ. A nwalewo ụdị ọchịchị ọ bụla a pụrụ ichepụta. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe na-akpata egwu anọgidewo na-abịakwasị ezinụlọ nke mmadụ. Mgbe puku afọ isii gasịrị, mmadụ ga-eche na ụmụ mmadụ ga-enweworị ọganihu ruo n’ókè nke iguzobe udo, ikpe ziri ezi, na ihe ịga nke ọma n’ụwa nile nakwa na ka ọ na-erula ugbu a, ha gaara amụtaworị nke ọma, ezi uru ndị dị n’inwe obi ọma, obi ebere, na inyerịta nkwado.

6 Otú ọ dị, ihe na-eme eme bụ nnọọ ihe megidere nke ahụ. Ọ dịghị ụdị ọchịchị ọ bụla e chepụtaworo nke wetaworo ezi udo na ihe ịga nke ọma nye mmadụ nile. N’ime nanị narị afọ nke 20 nke a, anyị ahụwo ogbugbu nke ọtụtụ nde ndị mmadụ n’oge Oké Mgbukpọ na mgbupịa nke ihe karịrị 100 nde n’agha dị iche iche. N’oge anyị, a tawo ọtụtụ ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ oké ahụhụ, gbuo ha, tụọkwa ha mkpọrọ n’ihi àgwà nke ekweghị ka onye ọzọ nọrọ na ịdị iche n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Ọnọdụ nke E Nwere Taa

7. Olee otú a pụrụ isi kọwaa ọnọdụ nke ezinụlọ ihe a kpọrọ mmadụ taa?

7 Tụkwasịkwa, tụlee ọnọdụ nke ezinụlọ ihe a kpọrọ mmadụ taa. Imempụ na ime ihe ike jupụtara ebe nile. Iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi gbasara ebe nile. Ọrịa mmekọahụ jupụtara n’ebe ọ bụla. Ọrịa ahụ dị oké egwu, bụ́ AIDS na-emetụta ọtụtụ nde ndị mmadụ. Ọtụtụ iri nde ndị mmadụ na-anwụ n’ihi agụụ ma ọ bụ ọrịa kwa afọ, ebe ọnụ ọgụgụ dị nta nwere akụ na ụba ebe ọ dị ukwuu. Ụmụ mmadụ na-emetọ ma na-ezu ụwa ohi. Ndụ ezinụlọ na ụkpụrụ omume na-adakpọ ebe nile. N’ezie, ndụ a na-ebi taa na-egosipụta ọchịchị dị njọ nke ‘chi nke ụwa nke a,’ bụ́ Setan. Ụwa nke ọ bụ onye isi ya dị obi ọjọọ, taa obi mmiri, ma rụọ arụ n’ebe ọ dị ukwuu.​—⁠2 Ndị Kọrịnt 4:⁠4.

8. N’ihi gịnị ka anyị na-apụghị iji kpọọ ihe ụmụ mmadụ rụpụtaworo ezi ọganihu?

8 Chineke enyewo oge zuru ezu ka ụmụ mmadụ rute n’ókè kasị elu nke ọganihu ha ná mmụta sayensị na n’ihe nkịtị anya na-ahụ. Ma ọ̀ bụ ezi ọganihu mgbe e ji égbè ndị na-awụpụ mgbọ awụpụ, ngwa agha tank, ụgbọ elu ndị na-atụ bọmbụ, na akụ ụta nuklia dị iche iche dochie anya ụta na akụ? Ọ̀ bụ ọganihu ebe ụmụ mmadụ pụrụ ịga na mbara igwe ma ha apụghị ibikọ ọnụ n’udo n’elu ala? Ọ̀ bụ ọganihu mgbe ụmụ mmadụ na-atụ egwu ịga n’okporo ámá n’abalị, ma ọ bụ ọbụna n’oge ehihie n’ebe ụfọdụ?

Ihe Oge Gosipụtaworo

9, 10. (a) Gịnị ka ọtụtụ narị afọ ndị gara aga nke oge gosiworo n’ụzọ pụtara ìhè? (b) N’ihi gịnị ka Chineke na-agaghị eji wepụ inwe onwe ime mkpebi?

9 Ihe nnwale nke oge eri ọtụtụ narị afọ gosiworo bụ na ọ bụghị ihe kwere omume bụ́ ụmụ mmadụ inwe ihe ịga nke ọma n’iduzi nzọụkwụ ha n’anọghị n’okpuru ọchịchị Chineke. Ọ bụ ihe na-ekweghị omume ha ime otú ahụ dịkwa ka ọ na-agaghị ekwe omume ịnọ n’erighị ihe, n’aṅụghị ihe ọṅụṅụ, na n’ekughị ume. Ihe àmà ahụ pụtara ìhè: E mere anyị ịdabere ná nduzi nke Onye Okike anyị dịkwa nnọọ ka e kere anyị ịdabere ná nri, mmiri, na ikuku.

10 Site n’ikwe ka mmebi iwu dịrị, Chineke egosipụtawo ruo mgbe nile, ihe mwute ndị na-esi n’iji nnwere onwe ime mkpebi mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi apụta. Inwe onwe ime mkpebi bụkwa ụdị onyinye dị oké ọnụ ahịa nke na kama ịnapụ ya ụmụ mmadụ, Chineke ekwewo ka ha hụ ihe iji ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi pụtara. Okwu Chineke na-ekwu eziokwu mgbe ọ sịrị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzozie.” Ọ na-ekwukwa eziokwu mgbe ọ sịrị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.”​—⁠Jeremaịa 10:23; Eklisiastis 8:⁠9.

11. Ọ̀ dịwo ụdị ọ bụla nke ọchịchị mmadụ nke kpochapụworo ahụhụ?

11 Nkwere Chineke kwere ka ọchịchị mmadụ dịrị ruo puku afọ isii na-egosipụta nnọọ nke ọma na mmadụ apụghị ịkwụsị ahụhụ. Ọ dịtụbeghị mgbe ọ bụla o mere otú ahụ. Dị ka ihe atụ, n’oge ya, Eze Solomọn nke Israel, n’amamihe ya, akụ, na ike ya nile, apụghị idozi nhụjuanya nke sitere n’ọchịchị mmadụ. (Eklisiastis 4:​1-⁠3) N’ụzọ yiri nke ahụ, n’oge anyị ndị ndú ụwa, ọbụna n’agbanyeghị ọganihu ndị kasị ọhụrụ nke nkà na ụzụ, enweghị ike ikpochapụ ahụhụ. Nke kakwa njọ, akụkọ ihe mere eme egosiwo na ụmụ mmadụ ndị na-adabereghị n’ọchịchị Chineke emewo ka ahụhụ kawanye njọ kama ikpochapụ ya.

Ọhụhụ Chineke Hụrụ Ihe Ka Dị n’Ọdịnihu Dị Anya

12-14. Olee uru na-adịte aka ndị na-abịa n’ihi nkwere Chineke kwere ka ahụhụ dịrị?

12 Nkwere Chineke kwere ka ahụhụ dịrị abụrụwo ihe mgbu nye anyị. Ma ọ hụwo ihe ka dị n’ọdịnihu dị anya, na-amata ezi ihe ndị ga-emesị pụta. Ihe Chineke hụtara ga-abara ihe ndị e kere eke uru, ọ bụghị nanị ruo afọ ole na ole ma ọ bụ puku afọ ole na ole, kama ruo ọtụtụ nde afọ, ee, ruo mgbe nile ebighị ebi.

13 Ọ bụrụ na e nwee ọnọdụ ọzọ n’ọdịnihu ka otu onye ji inwe onwe ya ime mkpebi na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma ọ bụ weta ihe ịrụ ụka banyere ụzọ Chineke si eme ihe, ọ gaghị adị mkpa inye ya ohere iji nwalee echiche ya. Ebe ọ bụ na o nyewo ndị nnupụisi ọtụtụ puku afọ, Chineke eguzobewo ụkpụrụ kwekọrọ n’iwu nke a pụrụ iji mee ihe ruo mgbe nile ebighị ebi n’ebe ọ bụla n’eluigwe na ala.

14 N’ihi na Jehova ekwerewo ka mmebi iwu na ahụhụ dịrị n’oge a, ọ ga-abụworị na egosipụtawo ya nke ọma na ọ dịghị ihe ọ bụla na-ekwekọghị n’echiche ya nke ga-enwe ọganihu. Ọ ga-abụworị na egosiwo otú ịrụ ụka ọ bụla na-adịghị ya na ọ dịghị nchepụta ọ bụla nke mmadụ ma ọ bụ ndị mmụọ e kere eke nke na-adabereghị n’ebe Chineke nọ nke ga-eweta uru ndị na-adịgide adịgide. N’ihi nke a, Chineke ga-ezi nnọọ ezi n’ịzọpịa onye nnupụisi ọ bụla ngwa ngwa. “Ndị nile na-emebi iwu ka ọ ga-ekpochapụ.”​—⁠Abụ Ọma 145:20; Ndị Rom 3:⁠4.

[Foto dị na peeji nke 15]

Mgbe nne na nna mbụ anyị họrọsịịrị ịpụ n’okpuru Chineke, ha mesịrị kaa nká ma nwụọ

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Ọchịchị mmadụ n’adabereghị na Chineke egosiwo onwe ya ịbụ ihe ọdachi

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto nke U.S. Coast Guard

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya