ISI NKE ITOOLU
Ezinụlọ Ndị Nwere Nanị Nne Ma Ọ Bụ Nna Pụrụ Ịga nke Ọma!
1-3. Gịnị dubaworo ná mmụba nke ọnụ ọgụgụ ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna, oleekwa otú o si emetụta ndị nọ na ha?
AKPỌWO ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna “ụdị ezinụlọ kasị amụba” na United States. Ọnọdụ ahụ bụ otu ihe ahụ n’ọtụtụ ala ndị ọzọ. Ọnụ ọgụgụ dị elu nke ịgba alụkwaghịm, mgbapụ, nkewa, na ịmụ nwa a kwatara n’iko enwewo ọtụtụ ihe ha kpataara ọtụtụ nde ndị nne na nna na ụmụaka.
2 “Abụ m nwanyị di ya nwụrụ nke dị 28 afọ nke nwere ụmụ abụọ,” ka otu nne nanị ya na-azụ ụmụ dere. “Enwere m oké ịda mbà n’obi n’ihi na achọghị m ịzụlite ụmụ m n’enweghị nna. O yiri ka ọ dịghịdị onye chọrọ ịma ihe na-eme m. Ụmụ m na-ahụ ka m na-ebe ákwá mgbe mgbe, ọ na-emetụtakwa ha.” E wezụga ịgbaso mmetụta ndị dị ka iwe, obi amamikpe, na owu ọmụma mgba, ihe ka ukwuu ná ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ na-eche ihe ịma aka nke ma inwe ọrụ n’èzí ezinụlọ ma ịrụ ọrụ ndị a na-arụ n’ụlọ ihu. Otu sịrị: “Ịbụ nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ dị ka ịbụ onye na-atụligharị ọtụtụ ihe n’ikuku. Mgbe ọnwa isii nke mmụgharị gasịrị, i mesịwo nwee ike ịtụligharị bọl anọ n’otu mgbe. Ma ngwa ngwa i nwere ike ime nke ahụ, mmadụ na-atụrụ gị bọl nke ọhụrụ!”
3 Ndị na-eto eto nọ n’ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna na-enwekarị ihe ndị ha na-agbaso mgba. Ọ pụrụ ịdị ha mkpa iguzogide mmetụta uche ndị siri ike ngwa ngwa ọpụpụ mberede ma ọ bụ ọnwụ nne ma ọ bụ nna gasịrị. Nye ọtụtụ ndị ntorobịa, anọghị ya nke nne ma ọ bụ nna yiri ka ọ na-enwe ajọ mmetụta dị ukwuu.
4. Olee otú anyị si mara na Jehova na-eche banyere ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna?
4 Ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna dịrị n’oge Bible. Akwụkwọ Nsọ kpọtụrụ aha ugboro ugboro “nwa mgbei” na “nwanyị di ya nwụrụ.” (Ọpụpụ 22:22; Deuterọnọmi 24:19-21; Job 31:16-22) Jehova Chineke elefurughị ọnọdụ ha anya. Ọbụ abụ ahụ kpọrọ Chineke “Nna nke ụmụ mgbei, na onye ikpe nke ndị inyom di ha nwụrụ.” (Abụ Ọma 68:5) Ee, Jehova nwere otu nchegbu ahụ maka ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna taa! N’ezie, Okwu ya na-enye ụkpụrụ ndị pụrụ inyere ha aka ịga nke ọma.
ỊMỤTA USORO IME IHE EZINỤLỌ
5. Olee nsogbu ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ na-aghaghị iche ihu ná mmalite?
5 Tụlee ọrụ nke ilekọta ezinụlọ. “E nwere ọtụtụ oge ọ ga-adị gị ka ya nwee nwoke nọ n’ụlọ,” ka otu nwanyị a gbara alụkwaghịm kwetara, “dị ka mgbe ụgbọ ala gị malitere ime mkpọtụ, ị maghịkwa ebe ha sitere.” Ndị ikom a ka gbara alụkwaghịm ma ọ bụ ndị nwunye ha nwụrụ ọhụrụ pụrụ n’otu aka ahụ inwe ijuanya n’ihi ọtụtụ ọrụ ụlọ ndị ha na-aghaghị ịrụ ugbu a. Nye ụmụaka, mkpaghasị nke ebe obibi na-atụkwasị ihe ná mmetụta nke akwụsighị ike na anọghị ná nchebe.
Ụmụ, na-ekwenyerenụ nne ma ọ bụ nna unu nanị ya na-azụ unu
6, 7. (a) Olee ihe nlereanya ọma “nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma” nke Ilu setịpụrụ? (b) Olee otú ịdị uchu n’ibu ọrụ dị iche iche nke ezinụlọ si enye aka n’ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna?
6 Gịnị pụrụ inye aka? Rịba ama ihe atụ “nwanyị nke na-ejide onwe ya nke ọma” setịpụrụ bụ́ nke a kọwara n’Ilu 31:10-31. Ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ndị ọ na-arụzu dị ịrịba ama—ịzụta ihe, ire ihe, ịdụ ákwà, isi nri, itinye ego n’okwu ala, ịkọ ugbo, na ilekọta azụmahịa. Olee ihe na-enyere ya aka? Ọ dị uchu, na-arụru ọrụ n’abalị ma na-eteta ụra n’oge iji malite ọrụ ya. Ọ hazikwara onwe ya nke ọma, na-ekenye ndị ọzọ ọrụ ụfọdụ ma na-eji aka ya elekọta ndị ọzọ. Ka a sịkwa ihe mere o ji nweta ịja mma!
7 Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ, na-etinye uche n’ibu ọrụ ndị i nwere n’ụlọ. Nweta afọ ojuju n’ọrụ dị otú ahụ, n’ihi na nke a na-eme ihe dị ukwuu iji tinye ihe n’obi ụtọ ụmụ gị. Otú ọ dị, atụmatụ na nhazi dị mma dị mkpa. Bible na-asị: “Echiche [“atụmatụ,” NW] nile nke onye dị nkọ na-eduba nanị n’uru.” (Ilu 21:5) Otu nna nanị ya na-azụ ụmụ kwetara, sị: “M na-agbalị ịhapụ iche banyere nri ruo mgbe agụụ gụwara m.” Ma nri ndị e mere atụmatụ ha yiri ka ha na-aka edozi ahụ ma na-adọrọ akpịrị karịa ndị a kwadebere oké ngwa ngwa. Ọ pụkwara ịdị gị mkpa ịmụta iji aka gị eme ihe n’ụzọ ndị ọhụrụ. Site n’ijekwuru ndị enyi maara ihe, akwụkwọ ndị na-akụzi nkà, na ndị ọkachamara na-enye aka, ụfọdụ ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ enwewo ike ịhụ maka ite ágbá, ọrụ okporo mmiri, na idozi obere ihe ndị mebiri n’ụgbọ ala.
8. Olee otú ụmụ ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ pụrụ isi nye aka n’ụlọ?
8 Ọ̀ dị mma ịrịọ ụmụaka ka ha nye aka? Otu nne nanị ya na-azụ ụmụ chere, sị: “Ị ga-achọ ịkwụ ụgwọ anọghị ya nke onye nke ọzọ site n’ime ka ọ dịrị ụmụaka mfe.” Nke ahụ pụrụ ikwe nghọta ma ikekwe ọ bụghị mgbe nile maka ọdịmma kasịnụ nke nwatakịrị. E kenyere ndị ntorobịa na-atụ egwu Chineke n’oge Bible ọrụ ndị kwesịrị ekwesị. (Jenesis 37:2; Abụ nke Abụ 1:6) Ya mere, n’agbanyeghị ịdị na-akpachara anya ka ị ghara ibogbu ụmụ gị, ọ ga-abụrụ gị ihe amamihe ikenye ha ọrụ ndị dị ka ilekọta arịa nri na idebe ọnụ ụlọ ha ọcha. Gịnị ma unu rụkọọ ọrụ ụfọdụ ọnụ? Nke a pụrụ ịdị nnọọ ụtọ.
IHE ỊMA AKA NKE ỊKPATA IHE E JI EBI OBI
Wepụta oge dị ka o kwere omume iso ụmụ gị nọkọọ
9. N’ihi gịnị ka ndị nne nanị ha na-azụ ụmụ ji echekarị ihe isi ike nke ego ihu?
9 Ọ na-esiri ihe ka ọnụ ọgụgụ ná ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ ike igbo mkpa ego ha, ndị nne na-alụbeghị di bụ́ ndị ka na-eto eto na-enwekarịkwa ihe isi ike karịsịa.a N’ala ebe e nwere enyemaka ọha na eze, ọ pụrụ ịbụrụ ha ihe amamihe iji ya eme ihe, ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo mgbe ha pụrụ inweta ọrụ. Bible na-ekwe ka ndị Kraịst jiri ndokwa ndị dị otú ahụ mee ihe mgbe ọ dị mkpa. (Ndị Rom 13:1, 6) Ndị di ha nwụrụ na ndị a gbara alụkwaghịm na-eche ihe ịma aka ndị yiri nke ahụ ihu. Ọtụtụ ndị, n’ịbụ ndị a manyere ịbanyeghachi n’ìgwè ndị ọrụ mgbe ọtụtụ afọ nke idozi ụlọ gasịworo, pụrụ ọtụtụ mgbe inweta nanị ọrụ a na-akwụ ụgwọ dị ala. Ọtụtụ na-agbalị ime ka ọnọdụ ha ka mma site n’idenye aha n’usoro ihe omume ọzụzụ ọrụ ma ọ bụ agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ ndị na-ewe oge dị mkpirikpi.
10. Olee otú nne nanị ya na-azụ ụmụ pụrụ isi kọwaara ụmụ ya ihe mere ọ na-aghaghị iji chọta ọrụ ego?
10 Ya atụla gị n’anya ma ọ bụrụ na ụmụ gị enweghị obi ụtọ mgbe ị na-achọ ọrụ, enwekwala obi amamikpe. Kama nke ahụ, kọwaara ha ihe mere ị na-aghaghị iji rụọ ọrụ, nyekwara ha aka ịghọta na Jehova chọrọ n’aka gị igbo mkpa ha. (1 Timoti 5:8) Mgbe oge na-aga, ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ụmụaka na-ahazi onwe ha. Otú ọ dị, gbalịa iwepụta oge soro ha nọkọọ dị ka nhazi gị juru n’ihe omume nyere ohere ya. Nlekọta ịhụnanya dị otú ahụ pụkwara inye aka ibelata mmetụta nke ịkpa ókè ọ bụla ezinụlọ gị pụrụ inwe n’ụzọ ego.—Ilu 15:16, 17.
ÒNYE NA-ELEKỌTA ONYE?
Ọgbakọ adịghị eleghara “ndị inyom di ha nwụrụ” na “ụmụ mgbei” anya
11, 12. Olee ịkpa ókè ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ na-aghaghị idebe, oleekwa ụzọ ha pụrụ isi mee nke ahụ?
11 Ọ bụ ihe dị otú a tụrụ anya ya ka ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ na-anọ ụmụ ha nso nke ukwuu, ma a ghaghị ịkpachara anya ka a ghara imebi ókè Chineke kpara n’etiti ndị nne na nna na ụmụaka. Dị ka ihe atụ, oké ihe isi ike pụrụ ibilite ma ọ bụrụ na nne nanị ya na-azụ ụmụ atụọ anya n’aka nwa ya nwoke iweghara ibu ọrụ nke nwoke nwe ụlọ ma ọ bụ mesoo nwa ya nwanyị dị ka onye ọ na-agwa ihe nzuzo, jiri nsogbu onwe onye na-ebogbu nwata nwanyị ahụ. Ime otú ahụ ekwesịghị ekwesị, na-akpata nrụgide, ma eleghị anya na-agbagwojukwa nwa ahụ anya.
12 Mesie ụmụ gị obi ike na gị, dị ka nne ma ọ bụ nna, ga-elekọta ha—ọ bụghị ha ga-elekọta gị. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 12:14.) Mgbe ụfọdụ, okwu ndụmọdụ ma ọ bụ nkwado ụfọdụ pụrụ ịdị gị mkpa. Chọọ ya n’aka ndị okenye ndị Kraịst ma ọ bụ ma eleghị anya n’aka ndị inyom tozuru okè bụ́ ndị Kraịst, ọ bụghị site n’aka ụmụntakịrị gị.—Taịtọs 2:3.
ỊNỌGIDE NA-ADỌ AKA NÁ NTỊ
13. Olee nsogbu metụtara ịdọ aka ná ntị bụ́ nke nne nanị ya na-azụ ụmụ pụrụ iche ihu?
13 Nwoke nwere ike ọ gaghị enwekebe ihe isi ike n’ịbụ onye e ji kpọrọ ihe dị ka onye na-adọ aka ná ntị, ma nwanyị pụrụ inwe nsogbu n’akụkụ nke a. Otu nne nanị ya na-azụ ụmụ na-ekwu, sị: “Ụmụ m ndị ikom kwara ahụ ụmụ nwoke na olu ụmụ nwoke. Mgbe ụfọdụ ọ na-esi ike ịhapụ ịda ka onye na-ejichaghị ihe n’aka ma ọ bụ na-adịghị ike n’ịbụ onye e ji tụnyere ha.” Ọzọkwa, ị ka pụrụ ịdị na-eru újú maka ọnwụ nke di ma ọ bụ nwunye gị bụ́ onye ị hụrụ n’anya, ma ọ bụ ma eleghị anya ị pụrụ ịdị na-enwe obi amamikpe ma ọ bụ iwe n’ihi nkewa alụmdi na nwunye. Ọ bụrụ na gị na di ma ọ bụ nwunye gị na-ekerịta ụmụ, ị pụrụ ịtụ egwu na nwa gị ga-ahọrọ ịdị na-anọnyere di ma ọ bụ nwunye gị mbụ. Ọnọdụ ndị dị otú ahụ pụrụ ime ka o sie ike ịdọ aka ná ntị guzoziri eguzozi.
14. Olee otú ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ pụrụ isi nọgide na-enwe echiche ziri ezi banyere ịdọ aka ná ntị?
14 Bible na-asị na “nwata nke a na-ahapụ n’onwe ya na-eme ka ihere mee nne ya.” (Ilu 29:15) I nwere nkwado Jehova Chineke n’ime na itinye iwu ezinụlọ n’ọrụ, ya mere ekwela ka obi amamikpe, ịkwa ụta, ma ọ bụ egwu rikpuo gị. (Ilu 1:8) Ya adịla mgbe i mebiri ụkpụrụ Bible. (Ilu 13:24) Gbalịa inwe ezi uche, na-anọgide n’ihe, na-akwụsikwa ike. Mgbe oge na-aga, ihe ka ọnụ ọgụgụ n’ụmụaka ga-azaghachi. Otú ọ bụla o si dị, ị ga-achọ ichebara mmetụta ụmụ gị na-enwe echiche. Otu nna nanị ya na-azụ ụmụ na-ekwu, sị: “A ghaghị iji nghọta tigwaa ịdọ aka ná ntị m n’ihi nkụda mmụọ nke ọnwụ nne ha. M na-ekwunyere ha okwu n’ohere ọ bụla. Anyị na-enwe ‘oge ịnọ nso’ mgbe anyị na-akwadebe nri abalị. Ọ bụ mgbe ahụ ka ha na-agwa m ihe nzuzo n’ezie.”
15. Gịnị ka nne ma ọ bụ nna a gbara alụkwaghịm kwesịrị izere mgbe ọ na-ekwu banyere di ma ọ bụ nwunye ya mbụ?
15 Ọ bụrụ na a gbara gị alụkwaghịm, ọ dịghị ezi ihe a na-arụzu site n’iwetu ùgwù maka di ma ọ bụ nwunye gị mbụ ala. Égbè ọnụ nne na nna na-abụrụ ụmụaka ihe mgbu, ọ ga-emesịkwa belata nkwanye ùgwù ha maka unu abụọ. N’ihi ya, zere ikwu okwu iwe dị ka: “Ị dị nnọọ ka papa gị!” N’agbanyeghị ihe mgbu ọ bụla di ma ọ bụ nwunye gị mbụ kpatawooro gị, ọ ka bụkwa nne ma ọ bụ nna nwa gị, bụ́ onye ịhụnanya, nlekọta, na ọzụzụ nke ma nne ma nna dị mkpa.b
16. Olee ndokwa ihe ime mmụọ dị iche iche kwesịrị ịbụ akụkụ dị mgbe nile n’ịdọ aka ná ntị n’ime ezinụlọ nwere nanị nne ma ọ bụ nna?
16 Dị ka a tụlere n’isiakwụkwọ ndị bu ụzọ, ịdọ aka ná ntị na-agụnye ọzụzụ na izi ihe, ọ bụghị nanị inye ahụhụ. A pụrụ igbochi ọtụtụ nsogbu site n’usoro ihe omume dị mma nke ọzụzụ ime mmụọ. (Ndị Filipaị 3:16) Ịgachi nzukọ ndị Kraịst anya dị mkpa. (Ndị Hibru 10:24, 25) Otú ahụ ka ọ dị inwe ọmụmụ Bible ezinụlọ kwa izu. N’eziokwu, ọ dịghị mfe ịhụ na ọmụmụ ihe ahụ na-aga n’ihu. “Mgbe ọrụ ụbọchị gasịrị, ị na-achọ n’ezie ịtụsara ahụ,” ka otu nne uche ya dị n’ọrụ na-ekwu. “Ma m na-akwadebe onwe m n’uche iso nwa m nwanyị mụọ ihe, na-amara na ọ bụ ihe dị mkpa ka e mee. Ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị na-atọ ya nnọọ ụtọ!”
17. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site ná nzụlite ọma nke onye ibe Pọl bụ́ Timoti?
17 Ihe àmà na-egosi na onye ibe Pọl onyeozi bụ́ Timoti bụ onye nne ya na nne ya ochie nyere ọzụzụ ya n’ụkpụrụ Bible—ma o yighị ka ọ bụ nna ya. Ka o sina dị, lee aha onye Kraịst pụtara ìhè Timoti ghọrọ! (Ọrụ 16:1, 2; 2 Timoti 1:5; 3:14, 15) Ị pụrụ n’otu aka ahụ ile anya ịmị mkpụrụ ọma ka ị na-agbalịsi ike ịzụlite ụmụ gị “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.”—Ndị Efesọs 6:4.
IMERI N’ỌGỤ MEGIDE OWU ỌMỤMA
18, 19. (a) Olee otú owu ọmụma pụrụ isi gosipụta onwe ya nye nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ? (b) Olee ndụmọdụ a na-enye iji nye aka ịchịkwa agụụ anụ ahụ?
18 Otu onye nanị ya na-azụ ụmụ mara ọsụ sị: “Mgbe m latara ụlọ ma kirie ụlọ ahụ tọgbọ chakoo, karịsịakwa mgbe ụmụ m lakpuworo ụra, owu na-amalite nnọọ ịma m.” Ee, ọtụtụ mgbe owu ọmụma bụ nsogbu kasị ukwuu nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ na-eche ihu. Ọ bụ ihe kwekọrọ n’okike inwe agụụ maka mkpakọrịta na-ekpo ọkụ na ịnọ nso nke alụmdi na nwunye. Ma mmadụ ò kwesịrị ịgbalị ịgwọta nsogbu nke a n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu? N’ụbọchị Pọl onyeozi, ụmụ agbọghọ ụfọdụ di ha nwụrụ kwere ka “mkpali mmekọahụ ha [nọchie] ụzọ n’etiti ha na Kraịst.” (1 Timoti 5:11, 12, NW) Ikwere ka agụụ ndị nke anụ ahụ kpuchie ihe mmasị ime mmụọ dị iche iche ga-abụ ihe mbibi.—1 Timoti 5:6.
19 Otu nwoke bụ́ onye Kraịst kwuru, sị: “Mkpali mmekọahụ na-adị nnọọ ike, ma ị pụrụ ịchịkwali ha. Mgbe echiche batara gị n’uche, ị ghaghị ịhapụ ịtụkwasị uche na ya. Ị ghaghị iwepụ ya. Ọ na-enyekwa aka iche banyere nwa gị.” Okwu Chineke na-adụ ọdụ, sị: ‘Meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ banyere agụụ ịkwa iko nwụọ.’ (Ndị Kọlọsi 3:5) Ọ bụrụ na ị na-anwa ime ka agụụ gị maka nri nwụọ, ị̀ ga-agụ magazin ndị na-egosi foto nri ndị na-atọ ụtọ, ka ị̀ ga-eso ndị na-akọ mgbe nile banyere nri na-akpakọrịta? Ị gaghị! Otu ihe ahụ bụ eziokwu banyere agụụ nile nke anụ ahụ.
20. (a) Olee ihe ize ndụ na-echere ndị so ndị na-ekweghị ekwe eme mbedo? (b) Olee otú ndị na-anọghị n’alụmdi na nwunye ma na narị afọ mbụ ma taa siworo lụso owu ọmụma ọgụ?
20 Ndị Kraịst ụfọdụ esorowo ndị na-ekweghị ekwe mee mbedo. (1 Ndị Kọrint 7:39) Nke ahụ ọ̀ gwọrọ nsogbu ha? Ee e. Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst a gbara alụkwaghịm dọrọ aka ná ntị, sị: “E nwere otu ihe ka ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye njọ nke ukwuu. Ọ bụ ịlụ onye na-ekwesịghị ekwesị!” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị Kraịst di ha nwụrụ na narị afọ mbụ nwere oge dị iche iche owu mara ha, ma ndị nke maara ihe tinyere onwe ha n’ọrụ ‘n’ile ndị ọbịa anya nke ọma, ịsa ụkwụ ndị nsọ, na igbo mkpa ndị a na-akpagbu.’ (1 Timoti 5:10) Ndị Kraịst taa kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị chereworo ọtụtụ afọ iji chọta onye na-atụ egwu Chineke ha ga-alụ etinyewokwa onwe ha n’ọrụ n’otu aka ahụ. Otu nwanyị bụ́ onye Kraịst nke di ya nwụrụ nke gbara 68 afọ malitere ileta ndị ọzọ di ha nwụrụ mgbe ọ bụla owu na-ama ya. Ọ sịrị: “Achọpụtara m na site n’ime nleta ndị a, na-ahụ maka ọrụ ndị m nwere n’ụlọ ma na-elekọta ọnọdụ ime mmụọ m enweghị m oge owu ịma m.” Ịkụziri ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke bụ ọrụ ọma bara oké uru.—Matiu 28:19, 20.
21. N’ụzọ dị aṅaa ka ekpere na mkpakọrịta ọma pụrụ isi nye aka imeri owu ọmụma?
21 N’eziokwu, e nweghị ọgwụgwọ ọrụ ebube maka owu ọmụma. Ma a pụrụ iji ume sitere n’aka Jehova nagide ya. Ume dị otú ahụ na-abịa mgbe onye Kraịst “na-anọgidekwa n’arịrịọ ya na ekpere ya abalị na ehihie.” (1 Timoti 5:5) Arịrịọ bụ ikpe ire site n’obi, ee, ịrịọ maka enyemaka, ma eleghị anya na-eji ibe ákwá siri ike na anya mmiri. (Tụlee Ndị Hibru 5:7.) Ịwụpụrụ Jehova obi gị “abalị na ehihie” pụrụ n’ezie inye aka. Ọzọkwa, mkpakọrịta na-ewuli elu pụrụ ime ihe dị ukwuu iwepụ ịtọgbọ chakoo nke owu ọmụma. Site ná mkpakọrịta dị mma, mmadụ pụrụ inweta “okwu ọma” nke agbamume a kọwara n’Ilu 12:25.
22. Ntụle dịgasị aṅaa ga-enye aka mgbe mmetụta nke owu ọmụma bilitere site n’oge ruo n’oge?
22 Ọ bụrụ na mmetụta nke owu ọmụma ebilite site n’oge ruo n’oge—dị ka o yikarịrị ka ha ga-eme—cheta na ọ dịghị onye ụwa zuuru okè. N’ezie, ‘òtù ụmụnna gị ndị nọ n’ụwa’ na-ata ahụhụ n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ọzọ. (1 Pita 5:9) Zere ịtụkwasị uche n’ihe gara aga. (Eklisiastis 7:10) Tụlee uru ndị ị na-enwe. Karịsịa ihe nile, kpebisie ike ijigide nguzosi ike gị n’ezi ihe na ime ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11.
ỤZỌ NDỊ ỌZỌ PỤRỤ ISI NYE AKA
23. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị Kraịst ọzọ nwere n’ebe ndị nne na nna nanị ha na-azụ ụmụ n’ime ọgbakọ nọ?
23 Nkwado na enyemaka ndị Kraịst ibe gị bara oké uru. Jemes 1:27 na-asị: “Okpukpe Chineke nke dị ọcha nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, bụ nke a, ileta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha.” Ee, a chọrọ n’aka ndị Kraịst inyere ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna aka. Olee ụzọ ụfọdụ dị irè a pụrụ isi mee nke a?
24. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka a pụrụ isi nyere ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna bụ́ ndị nwere mkpa aka?
24 A pụrụ inye enyemaka ihe onwunwe. Bible na-asị: “Onye ọ bụla nke nwere ihe ụwa nke a o ji biri, nke hụkwara nwanna ya ka ọ nọ ná mkpa, o wee mechigide ya obi ebere ya, ịhụnanya Chineke si aṅaa dịgide n’ime ya?” (1 Jọn 3:17) Okwu Grik mbụ maka “hụkwara” pụtara, ọ bụghị nanị ilepere ihe anya, kama ịma ụma legide ihe anya. Nke a na-egosi na onye Kraịst dị obi ọma pụrụ ibu ụzọ mata nke ọma ọnọdụ na mkpa ezinụlọ. Ma eleghị anya ha nọ ná mkpa ego. Ụfọdụ pụrụ inwe mkpa enyemaka n’idozigasị ihe n’ụlọ. Ma ọ bụ ọ pụrụ nnọọ ịmasị ha ịbụ ndị a kpọrọ òkù maka nri ma ọ bụ nnọkọ oriri na ọṅụṅụ.
25. Olee otú ndị Kraịst ọzọ pụrụ isi gosi ọmịiko n’ebe ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ nọ?
25 Tụkwasịkwa, 1 Pita 3:8 na-asị: “Nwekọọnụ otu uche, unu nile, werenụ obi sorịta onwe unu hụkọọ ahụhụ, bụrụnụ ndị na-ahụ ụmụnna unu n’anya, ndị nwere obi ọmịiko.” Otu nne nanị ya na-azụ ụmụ nke nwere ụmụ isii sịrị: “O siwo ike, mgbe ụfọdụkwa ọ na-anyịgbu m. Otú ọ dị, site n’oge ruo n’oge otu n’ime ụmụnna nwoke ma ọ bụ nwanyị ga-agwa m: ‘Joan, ị na-arụ ọrụ dị mma. Ọ gaje inye gị ụgwọ ọrụ.’ Nanị ịmata na ndị ọzọ na-eche banyere gị nakwa na ị dị ha n’obi na-enye aka nke ukwuu.” Agadi ndị inyom bụ́ ndị Kraịst pụrụ ịdị irè karịsịa n’inyere ụmụ agbọghọ bụ́ nne nanị ha na-azụ ụmụ aka, na-aṅa ha ntị mgbe ha nwere nsogbu ndị ọ pụrụ isiri ha ike isoro nwoke tụlee.
26. Olee otú ndị ikom tozuru okè bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi nyere ụmụ mgbei aka?
26 Ndị ikom bụ́ ndị Kraịst pụrụ inye aka n’ụzọ ndị ọzọ. Nwoke ahụ bụ onye ezi omume bụ́ Job sịrị: “M mere . . . ka ọ wepụga onwe ya, [bụ́] nwa mgbei, bụ́ onye na-enweghị onye na-enyere ya aka.” (Job 29:12) Ụfọdụ ndị ikom bụ́ ndị Kraịst taa n’otu aka ahụ na-enwe mmasị dị mma n’ụmụ mgbei ma na-egosi ezigbote “ịhụnanya sitere n’obi ọcha,” n’ebughị ihe ọ bụla n’uche. (1 Timoti 1:5) N’elefurughị ezinụlọ aka ha anya, ha pụrụ mgbe mgbe idokwa ịkpọrọ ndị na-eto eto dị otú ahụ rụọ ọrụ n’ozi ndị Kraịst, nweekwa ike ịkpọ ha òkù isonye n’ọmụmụ ihe ezinụlọ ma ọ bụ ná ntụrụndụ. Obi ọma dị otú ahụ pụrụ nnọọ ime ka nwa mgbei wepụga onwe ya pụọ n’ụzọ ọjọọ.
27. Nkwado dị aṅaa ka ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ pụrụ iji n’aka?
27 Ma, n’ikpeazụ, ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ aghaghị ‘ibu ibu nke aka ha’ n’ibu ọrụ. (Ndị Galetia 6:5) Ka o sina dị, ha pụrụ inweta ịhụnanya nke ụmụnna nwoke na nwanyị bụ́ ndị Kraịst na nke Jehova Chineke n’onwe ya. Bible na-ekwu banyere ya, sị: “Nwa mgbei na nwanyị di ya nwụrụ ka Ọ na-eme ka ha guzo ọtọ.” (Abụ Ọma 146:9) Site ná nkwado ịhụnanya Ya, ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna pụrụ inwe ihe ịga nke ọma!
a Ọ bụrụ na onye Kraịst na-eto eto atụrụ ime n’ihi omume rụrụ arụ, ọ dịghị ụzọ ọgbakọ ndị Kraịst si anabata ihe o meworo. Ma ọ bụrụ na o chegharịrị, ndị okenye ọgbakọ na ndị ọzọ n’ọgbakọ pụrụ ịchọ inyere ya aka.
b Anyị adịghị ekwu banyere ọnọdụ ebe nwatakịrị pụrụ inwe mkpa ka e chebe ya pụọ n’aka nne ma ọ bụ nna na-emetọ ya. Ọzọ, ọ bụrụ na onye nke ọzọ agbalịa ibelata ikike nke gị, ma eleghị anya na-eburu n’uche ịrụgide ụmụaka ahụ ịhapụ gị, ọ pụrụ ịdị mma ka ị kọọrọ ndị enyi nweworo ahụmahụ, dị ka ndị okenye n’ọgbakọ ndị Kraịst, iji nweta okwu ndụmọdụ banyere ụzọ isi chee ọnọdụ ahụ ihu.