Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • rq ihe ọmụmụ 2 p. 4-5
  • Ònye Bụ Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Bụ Chineke?
  • Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • È Kwesịrị Iji Ihe Oyiyi Efe Chineke?
    Teta!—2008
  • Eziokwu Banyere Chineke na Kraịst
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Ònye Bụ Chineke?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Ònye Bụ Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
rq ihe ọmụmụ 2 p. 4-5

Ihe Ọmụmụ nke 2

Ònye Bụ Chineke?

Ònye bụ ezi Chineke ahụ, gịnịkwa bụ aha ya? (1, 2)

Ụdị ahụ dị aṅaa ka o nwere? (3)

Gịnị bụ àgwà ya ndị pụtara ìhè? (4)

Ànyị kwesịrị iji onyinyo na ihe oyiyi fee ya ofufe? (5)

Olee ụzọ abụọ anyị pụrụ isi mụta banyere Chineke? (6)

1. Ndị mmadụ na-efe ọtụtụ ihe ofufe. Ma Bible na-agwa anyị na e nwere nanị otu EZI Chineke. O kere ihe nile dị n’eluigwe na n’elu ala. N’ihi na o nyere anyị ndụ, nanị ya bụ Onye anyị kwesịrị ife ofufe.—1 Ndị Kọrint 8:5, 6; Mkpughe 4:11.

2. Chineke nwere ọtụtụ utu aha ma nwee nanị otu aha. Aha ahụ bụ JEHOVA. N’ihe ka n’ọtụtụ Bible, e wepụwo aha Chineke ma jiri utu aha bụ ONYENWE ANYỊ ma ọ bụ CHINEKE dochie ya. Ma mgbe e dere Bible, aha ahụ bụ́ Jehova pụtara n’ime ya ihe dị ka 7,000 ugboro!—Ọpụpụ 3:15; Abụ Ọma 83:18.

3. Jehova nwere ahụ, ma ọ dịghị ka nke anyị. “Chineke bụ Mmụọ,” ka Bible na-ekwu. (Jọn 4:24) Mmụọ bụ ọdịdị nke ndụ nke dị elu nke ukwuu karịa nke anyị. Ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke hụworo Chineke anya mgbe ọ bụla. Jehova bi n’eluigwe, ma ọ pụrụ ịhụ ihe nile. (Abụ Ọma 11:4, 5; Jọn 1:18) Ma, gịnị bụ mmụọ nsọ? Ọ bụghị onye dị ka Chineke. Kama nke ahụ, ọ bụ ike ọrụ Chineke.—Abụ Ọma 104:30.

4. Bible na-ekpughe ụdị onye Jehova bụ nye anyị. Ọ na-egosi na àgwà ya ndị pụtara ìhè bụ ịhụnanya, ikpe ziri ezi, amamihe, na ike. (Deuterọnọmi 32:4; Job 12:13; Aịsaịa 40:26; 1 Jọn 4:8) Bible na-agwa anyị na ọ dịkwa obi ebere, obi ọma, na-agbaghara mmehie, na-emesapụ aka, nweekwa ndidi. Anyị, dị ka ụmụ na-erube isi, kwesịrị ịgbalị iṅomi ya.—Ndị Efesọs 5:1, 2.

5. Ànyị kwesịrị ịkpọ isiala ma ọ bụ kpee ekpere nye onyinyo, ihe osise, ma ọ bụ ihe oyiyi dị iche iche n’ofufe anyị? Ee e! (Ọpụpụ 20:4, 5) Jehova sịrị na anyị aghaghị ife nanị ya ofufe. Ọ gaghị esoro onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ kerịta otuto ya. Onyinyo enweghị ike ọ bụla inyere anyị aka.—Abụ Ọma 115:4-8; Aịsaịa 42:8.

6. Olee otú ị pụrụ isi mara Chineke nke ọma karị? Otu ụzọ bụ site n’ikiri ihe ndị o keworo na ichemi echiche banye­re ihe ndị ha na-agwa anyị. Ihe okike Chineke na-egosi anyị na o nwere ike na amamihe dị ukwuu. Anyị na-ahụ ịhụnanya ya n’ihe nile o meworo. (Abụ Ọma 19:1-6; Ndị Rom 1:20) Ụzọ ọzọ anyị pụrụ isi mụta banyere Chineke bụ site n’ịmụ Bible. N’ime ya ọ na-agwa anyị ọtụtụ ihe karị banyere ụdị Chineke ọ bụ. Ọ na-agwakwa anyị banyere nzube ya na ihe ọ chọrọ ka anyị mee.—Emọs 3:7; 2 Timoti 3:16, 17.

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Anyị na-amụta banyere Chineke site n’ihe okike na site na Bible

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya