Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • gf ihe ọmụmụ 6 p. 10-11
  • Paradaịs dị nso!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Paradaịs dị nso!
  • Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndụ Ka Mma—N’isi Nso!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Olee Mgbe Ụwa Ga-aghọ Paradaịs?
    Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi
  • Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-achịwa Ụwa?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!
gf ihe ọmụmụ 6 p. 10-11

IHE ỌMỤMỤ NKE 6

Paradaịs Dị Nso!

Ihe ọjọọ ndị na-eme ugbu a n’ụwa na-egosi na Paradaịs dị nso. Bible kwuru na anyị ga-ahụ oge ndị dị oké egwu kpọmkwem tupu Paradaịs abịa. Anyị na-ebi n’oge ndị dị otú ahụ ugbu a! Lee ụfọdụ n’ime ihe ndị Bible kwuru na ha ga-eme:

Ụgbọelu ndị e ji eje agha

Oké agha dị iche iche. “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ.” (Matiu 24:7) Amụma a emezuwo. Kemgbe afọ 1914, a lụwo agha ụwa abụọ na ọtụtụ agha ndị dị nta karị. Ọtụtụ nde mmadụ anwụọla na ha.

Ọrịa nke zuru ebe nile. “Ajọ ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” (Luk 21:11) Nke a ò mezuwo? Ee. Ọrịa cancer, ọrịa obi, ụkwara nta, ịba, ọrịa AIDS, na ọrịa ndị ọzọ egbuwo ọtụtụ nde mmadụ.

Ebe ndị mmadụ na-arịa ọrịa, ebe agụ na-agụ ndị mmadụ

Ụkọ nri. Gbaa ụwa gburugburu e nwere ndị na-enweghị ihe oriri zuuru ha iri. Kwa afọ, ọtụtụ nde mmadụ na-anwụ n’ihi agụụ. Nke a bụ ihe àmà ọzọ na-egosi na Paradaịs ga-abịa n’isi nso. Bible na-ekwu, sị: “Oké ụnwụ dị iche iche ga-adị.”—Mak 13:8.

Ala ọma jijiji. “Ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” (Matiu 24:7) Nke a emezuwokwa n’oge anyị. Ihe karịrị otu nde mmadụ anwụọla n’ala ọma jijiji kemgbe 1914.

Ebe otu nwoke tụgidere otu nwaanyị egbe

Ndị ajọ mmadụ. Ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-ahụ ego n’anya” na “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya.” Ha ga-abụ “ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.” Ụmụaka ga-abụ “ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha.” (2 Timoti 3:1-5) Ọ̀ bụ na i kweghị na e nwere ọtụtụ ndị dị otú ahụ taa? Ha adịghị asọpụrụ Chineke, ha na-enyekwa ndị na-agbalị ịmụ banyere Chineke nsogbu.

Mpụ. ‘Mmebi iwu ga-abakwa ụba.’ (Matiu 24:12) Ikekwe ị ga-ekweta na mpụ adịla njọ karịa otú ọ dị ọtụtụ afọ gara aga. N’ebe nile, ndị mmadụ nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e zuru ohi, ndị a ghọgburu, ma ọ bụ merụọ ahụ.

Ihe ndị a nile na-egosi na Alaeze Chineke dị nso. Bible na-ekwu, sị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-apụta, maranụ na alaeze Chineke dị nso.” (Luk 21:31) Gịnị bụ Alaeze Chineke? Ọ bụ ọchịchị eluigwe nke Chineke nke ga-eweta Paradaịs n’ụwa a. Alaeze Chineke ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ.—Daniel 2:44.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya