Ole Ndị Ka Ha Bụ?
Ọ BỤ ọchịchọ Ndịàmà Jehova ka ị marakwuo ndị ha bụ nke ọma. Ọ pụrụ ịbụ na i zutewo ha dị ka ndị agbata obi na ndị ọrụ ibe gị ma ọ bụ n’ihe omume ndị ọzọ a na-eme kwa ụbọchị. Ọ pụrụ ịbụ na ị hụwo ha n’okporo ámá ka ha na-enye ndị na-agafe n’ụzọ magazin ha. Ma ọ bụ, ọ pụrụ ịbụ na gị na ha ekwurịtawo okwu ná mkpirikpi n’ọnụ ụzọ gị.
N’eziokwu, Ndịàmà Jehova nwere mmasị n’ebe ị nọ na n’ọdịmma gị. Ha chọrọ ịbụ ndị enyi gị na ịkọkwuru gị ihe banyere onwe ha, nkwenkwe ha, nzukọ ha, na ihe ha na-eche banyere ndị mmadụ na ụwa nke anyị nile bi n’ime ya. Iji mezuo nke a, ha akwadebewo broshuọ a maka gị.
N’ọtụtụ ụzọ, Ndịàmà Jehova dị ka ndị ọ bụla ọzọ. Ha nwere nsogbu ndị a na na-enwekarị—nke akụ̀ na ụba, nke anụ ahụ, na nke mmetụta uche. Ha na-emehie ihe mgbe ụfọdụ, n’ihi na ha abụghị ndị zuru okè, mmụọ nsọ adịghị agwa ha okwu, ha abụghịkwa ndị na-apụghị imehie emehie. Ma ha na-agbalị ịmụta ihe site n’ahụmahụ ha ma jiri ịdị uchu na-amụ Bible iji mee mgbanwe ndị dị mkpa. Ha ararawo onwe ha nye Chineke ime uche ya, ha na-etinyekwa ike ha nile n’imezu nraranye a. Ha na-achọ nduzi site n’Okwu Chineke na mmụọ nsọ ya n’ihe nile ha na-eme.
Ọ dị ha oké mkpa ka nkwenkwe ha dabere na Bible ọ bụghị n’ịkọ nkọ efu nke ụmụ mmadụ ma ọ bụ n’ụkpụrụ okwukwe okpukpe. Ha na-enwe mmetụta yiri nke Pọl onyeozi mgbe o kwupụtara echiche ya site n’ike mmụọ nsọ, sị: “Ka ọ pụta ìhè na Chineke bụ Onye eziokwu, ma mmadụ nile n’otu n’otu bụ ndị ụgha.” (Ndị Rom 3:4, Bible Nsọ nke Union Versiona) Mgbe a bịara n’ihe ndị e ziri dị ka eziokwu Bible, Ndịàmà kwadosiri ike ihe ndị Beria mere mgbe ha nụrụ nkwusa Pọl onyeozi: “Ha weere obi dị ọkụ nile nara okwu ahụ nke ọma, na-enyocha ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, ma ihe ndị a [ha] dị otú a.” (Ọrụ 17:11) Ndịàmà Jehova kweere na e kwesịrị isi otú a nyochaa ozizi okpukpe nile ma ha kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ nke sitere n’ike mmụọ nsọ, ma ọ bụ ha kụziri ha ma ọ bụ ndị ọzọ. Ha na-akpọ gị òkù—na-agba gị ume—ime nke a ná nkwurịta okwu gị na ha.
Site na nke a, o doro anya na Ndịàmà Jehova kweere na Bible, dị ka Okwu Chineke. Ha na-ewere akwụkwọ 66 dị n’ime ya dị ka ndị sitere n’ike mmụọ nsọ, ziekwa ezie n’akụkọ ihe mere eme ha. Ha na-ezo aka n’ihe a na-akpọkarị Agba Ọhụrụ dị ka Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ha na-akpọkwa Agba Ochie Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ha na-adabere na ha abụọ, n’Akwụkwọ Nsọ Grik na nke Hibru, ha na-ewerekwa ha dị ka e si dee ha ọ gwụla ebe o doro anya na ihe ndị e kwuru ma ọ bụ ọnọdụ a nọ kwuo okwu na-egosi na ha bụ ihe atụ. Ha na-aghọta na ọtụtụ amụma ndị dị na Bible emezuwo, ndị ọzọ nọ na-emezu, ma ndị ọzọ ka na-echere mmezu ha.
AHA HA
Ọ̀ bụ Ndịàmà Jehova? Ee, ọ bụ ihe ha na-akpọ onwe ha. Ọ bụ aha na-akọwa mmadụ, na-egosi na ha na-agba àmà banyere Jehova, ịbụ Chineke ya, na nzube ya. “Chineke,” “Onyenwe anyị,” na “Onye Okike” bụ utu aha—dị ka “President,” “Eze,” na “Ọchịagha” bụ—ụmụ mmadụ ndị a ma ama pụkwara ịza ha. Ma “Jehova” bụ aha aka ma na-ezo aka n’ebe Chineke pụrụ ime ihe nile na Onye Okike nke eluigwe na ala nọ. E gosiri nke a n’Abụ Ọma 83:18, dị ka nsụgharị King James nke Bible si kwuo: “Ka ndị mmadụ wee mara na gị onwe gị, nanị onye aha ya bụ JEHOVA, bụ onye kasị elu n’elu ụwa nile.”
Aha ahụ bụ́ Jehova (ma ọ bụ Yahweh, dị ka nke Jerusalem Bible nke Roman Katọlik na ndị ọkà mmụta ụfọdụ ka nwee mmasị na ya) pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 7,000 n’Akwụkwọ Nsọ Hibru mbụ. Ihe ka ọtụtụ na Bible edeghị ya otú ahụ kama ha ji “Chineke” ma ọ bụ “Onyenwe anyị” dochie anya ya. Otú ọ dị, ọbụna n’ime Bible ndị a, ọtụtụ mgbe mmadụ pụrụ ịhụ ebe ihe odide mbụ nke Hibru ji Jehova mee ihe n’ihi na n’ebe ndị ahụ, e ji mkpụrụ akwụkwọ ukwu ndị buru ibu na mkpụrụ akwụkwọ ukwu ndị dị ntakịrị dee okwu nnọchianya ndị ahụ, otú a: CHINEKE, ONYENWE ANYỊ. Ọtụtụ nsụgharị nke oge a na-eji aha ahụ bụ́ Jehova ma ọ bụ Yahweh eme ihe. N’ihi ya, New World Translation na-agụ n’Aịsaịa 42:8, sị: “Abụ m Jehova. Nke ahụ bụ aha m.”
Ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ Ndịàmà Jehova si na ya nweta aha ha dị n’isi nke 43 nke Aịsaịa. N’ebe ahụ, e weere ụwa dị ka ụlọikpe: A kpọrọ chi nke mba dị iche iche òkù ka ha kpọta ndị akaebe ha iji kwado nzọrọ ha na-eme banyere ime ezi omume, ma ọ bụkwanụ ka ha nụrụ olu ndị àmà na-akwado Jehova ma kweta ihe bụ́ eziokwu. Jehova kwupụtara n’ebe ahụ gwa ndị ya, sị: “Unu onwe unu bụ ndị àmà m, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, na ohu m nke M họpụtara: ka unu wee mara, kwere m, ghọta na Mụ onwe m bụ Onye ahụ: ọ dịghị chi ọzọ e buru Mụ onwe m ụzọ kpụọ, ọ dịghịkwa nke ga-eso m n’azụ. Mụ onwe m, ọbụna Mụ onwe m, bụ Jehova; ọ dịghịkwa onye nzọpụta dị ma ọ bụghị nanị m.”—Aịsaịa 43:10, 11, American Standard Version.
Jehova Chineke nwere ndị àmà n’ụwa n’ọtụtụ puku afọ gaferenụ tupu a mụọ Jisọs. Mgbe Ndị Hibru isi 11 gosipụtasịrị aha ndị ụfọdụ nwere okwukwe, Ndị Hibru isi 12 na-ekwu, sị: “Ya mere ka anyị onwe anyị, ebe anyị nwere oké ìgwè ndị àmà dị otú a ndị gbara anyị gburugburu dị ka igwe ojii, ka anyị tụpụkwa ibu nile ọ bụla, ya na mmehie ahụ nke na-arapara anyị n’ahụ nke ukwuu, ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.” Jisọs nọ n’ihu Pọntịọs Paịlet kwuo, sị: “A mụwo Mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka M wee gbaara eziokwu àmà.” A na-akpọ ya “Onyeàmà ahụ Nke kwesịrị ntụkwasị obi, Nke bụkwa Onye eziokwu.” (Jọn 18:37; Mkpughe 3:14) Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-anata ike, mgbe Mmụọ Nsọ ga-abịakwasịworịị unu: unu ga-abụkwa ndị àmà m n’ime Jerusalem, na n’ime Judịa na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.”—Ọrụ 1:8.
N’ihi ya, ihe dị ka mmadụ 6,000,000 taa, bụ́ ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Jehova sitere n’aka Kraịst Jisọs n’ihe karịrị ala 230 na-eche na ha kwesịrị ekwesị ịkpọ onwe ha Ndịàmà Jehova.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nhota Bible nile e mere na broshuọ a sitere na nsụgharị a, na-asụpe okwu nile n’ụdị e ji eme ihe n’oge a, ọ gwụlakwa ma e gosiri nsụgharị ọzọ. N’ebe e dere NW ka ọ na-eso nhota okwu, ọ na-egosi na nsụgharị ahụ sitere na New World Translation of the Holy Scriptures—With References nke dị n’asụsụ Bekee.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
Ha raara onwe ha nye Chineke ime uche ya
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
Ha kweere na Bible bụ Okwu Chineke
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
Aha ahụ dị ka e si kpọọ ya n’ụlọikpe
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
Ihe dị ka Ndịàmà dị 6,000,000 n’ihe karịrị ala 230
[Foto dị na peeji nke 3]
Ha nwere mmasị n’ebe ị nọ
[Foto dị na peeji nke 4]
Aha aka Chineke n’asụsụ Hibru oge ochie