Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jt p. 12-14
  • Gịnị Ka Ha Kweere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka Ha Kweere?
  • Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Eziokwu Ndị Na-amasị Anyị Ịkụziri Ndị Ọzọ
    Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
  • Nkebi nke Mbụ: Ihe Ndị Kraịst Kweere
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ozi Anyị Na-aghaghị Ịkpọsa
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?
jt p. 12-14

Gịnị Ka Ha Kweere?

NDỊÀMÀ JEHOVA kweere na Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, Onye Okike nke eluigwe na ụwa. Ọdịdị nke ihe ndị dị ebube e mere n’ụzọ dị mgbagwoju anya dị n’eluigwe na n’ụwa nke gbara anyị gburugburu na-egosi n’ụzọ ezi uche dị na ya na Onye Okike kasị nwee ọgụgụ isi ma dị ike mere ha nile. Dị nnọọ ka ọrụ ndị ikom na ndị inyom na-egosi àgwà ha, otú ahụ ka ndị nke Jehova Chineke na-egosi àgwà ya. Bible na-agwa anyị na “ihe Ya anya na-ahụghị site n’okike ụwa ka a na-ahụ nke ọma, ebe a na-aghọta ha site n’ihe nile e kere eke.” Ọzọkwa, n’ekwughị okwu, “eluigwe na-akọ nsọpụrụ Chineke.”—Ndị Rom 1:20; Abụ Ọma 19:1-4

Ndị mmadụ adịghị akpụ ite ma ọ bụ mepụta telivishọn na kọmputa n’enweghị nzube ha ji mee ha. Ụwa na ihe ọkụkụ na ụmụ anụmanụ e kere eke ndị dị n’ime ya dị nnọọ ebube karị. Ọdịdị nke ahụ mmadụ na puku ijeri mkpụrụ ndụ dị n’ime ya karịrị nghọta anyị—ọbụna ụbụrụ, nke anyị ji eche echiche bụ ihe dị ebube n’ụzọ karịrị nghọta! Ọ bụrụ na ụmụ mmadụ nwere nzube ha ji emepụta ihe ndị ahụ dị ntakịrị ná ntụnyere, bụ́ ndị ha mepụtara, n’ezie, Jehova Chineke nwere nzube o ji kee ihe ndị dị egwu o kere! Ilu 16:4 na-ekwu na “Jehova kpụrụ ihe nile n’ihi Onwe ya.”

Jehova nwere nzube o ji kee ụwa, dị ka ọ gwara di na nwunye mbụ ahụ, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa . . . , nweekwanụ ike n’ahụ azụ̀ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.” (Jenesis 1:28) N’ihi na ha nupụrụ isi, di na nwunye a ejighị ezinụlọ ezi omume mejupụta ụwa, bụ́ ndị ga-eji ịhụnanya lekọta ụwa na ihe ọkụkụ na ụmụ anụmanụ ndị dị n’ime ya. Ma ọdịda ha dara emebighị nzube Jehova. Ọtụtụ puku afọ mgbe e mesịrị, e dere, sị: “Chineke: Onye kpụworo ụwa, mee ya . . . , ọ bụghị ihe tọgbọrọ n’efu ka O kere ya.” Ọ bụ “ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.” A gaghị ebibi ya, kama “ụwa na-adịru mgbe ebighị ebi.” (Aịsaịa 45:18; Eklisiastis 1:4, The New English Bible) A ga-emezu nzube Jehova banyere ụwa, ọ sịrị: “Ndụmọdụ m ga-eguzosi ike, ọ bụkwa ihe nile nke na-atọ m ụtọ ka M ga-eme.”—Aịsaịa 46:10.

N’ihi ya, Ndịàmà Jehova kweere na ụwa ga-adịru mgbe ebighị ebi nakwa na mmadụ nile, ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị ga-eme ihe kwekọrọ ná nzube Jehova maka ụwa e mere ka ọ maa mma, nke mmadụ ga-ebijupụta, pụrụ ibi na ya ruo mgbe ebighị ebi. Ihe nile a kpọrọ mmadụ ketara ezughị okè site n’aka Adam na Iv, n’ihi ya kwa, ha bụ ndị mmehie. (Ndị Rom 5:12) Bible na-agwa anyị, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.” “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ndị Rom 6:23; Eklisiastis 9:5; Ezikiel 18:4, 20) Mgbe ahụ, olee otú ha pụrụ isi dị ndụ ọzọ iji kere òkè ná ngọzi ndị ahụ ga-abịa n’ụwa? Ọ bụ nanị site n’àjà mgbapụta nke Kraịst Jisọs, n’ihi na ọ sịrị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” “Ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya, ha ga-apụtakwa.”—Jọn 5:28, 29; 11:25; Matiu 20:28.

Olee otú nke a ga-esi mee? A kọwara ya ‘n’ozi ọma nke alaeze ahụ,’ nke Jisọs malitere ikwusa mgbe ọ nọ n’ụwa. (Matiu 4:17-23) Ma taa, Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma ahụ n’ụzọ pụrụ iche.

[Chaatị dị na peeji nke 13]

IHE NDỊÀMÀ JEHOVA KWEERE

Nkwenkwe Ihe Ndabere Akwụkwọ Nsọ

Bible bụ Okwu Chineke, 2 Tim. 3:16, 17; 2 Pita 1:20, 21;

ọ bụkwa eziokwu Jọn 17:17

A pụrụ ịdabere na Bible Mat. 15:3; Kọl. 2:8

karịa n’ọdịnala

Aha Chineke bụ Jehova Abụ Ọma 83:18; Aịsa. 26:4; 42:8;

Ọpụ. 6:3

Kraịst bụ Ọkpara Chineke, Mat. 3:17; Jọn 8:42; 14:28; 20:17;

ọ dịkwa ala karịa Ya 1 Kọr. 11:3; 15:28

Kraịst bụ ihe mbụ Chineke Kọl. 1:15; Mkpu. 3:14

kere

Kraịst nwụrụ n’elu osisi, Gal. 3:13; Ọrụ 5:30

ọ bụghị n’elu obe

A kwụrụ ndụ mmadụ nke Kraịst Mat. 20:28; 1 Tim. 2:5, 6;

dị ka ihe mgbapụta maka 1 Pita 2:24

ụmụ mmadụ na-erube isi

Otu àjà Kraịst chụrụ zuru Rom 6:10; Hib. 9:25-28

A kpọlitere Kraịst n’ọnwụ 1 Pita 3:18; Rom 6:9;

dị ka onye bụ́ mmụọ nke Mkpu. 1:17, 18

na-adịghị anwụ anwụ

Ọnụnọ Kraịst bụ ná mmụọ Jọn 14:19; Mat. 24:3; 2 Kọr. 5:16;

Abụ Ọma 110:1, 2

Anyị nọ ugbu a ‘n’oge Mat. 24:3-14; 2 Tim. 3:1-5;

ọgwụgwụ’ Luk 17:26-30

Alaeze nke dị n’okpuru Aịsa. 9:6, 7; 11:1-5;

Kraịst ga-achị ụwa Dan. 7:13, 14; Mat. 6:10

n’ezi omume na n’udo

Alaeze ahụ ga-eweta ọnọdụ Abụ Ọma 72:1-4; Mkpu. 7:9, 10,

ibi ndụ dị mma n’ụwa 13-17; 21:3, 4

Ọ dịghị mgbe a ga-ebibi ụwa Ekli. 1:4; Aịsa. 45:18;

ma ọ bụ mee ka ọ tọgbọrọ Abụ Ọma 78:69

n’efu

Chineke ga-ebibi usoro ihe dị Mkpu. 16:14, 16; Zef. 3:8;

ugbu a n’agha Ha-Magedọn Dan. 2:44; Aịsa. 34:2; 55:10, 11

A ga-ebibi ndị ajọ omume ruo Mat. 25:41-46; 2 Tesa. 1:6-9

mgbe ebighị ebi

Ndị Chineke nwapụtara Jọn 3:16; 10:27, 28; 17:3;

ga-enweta ndụ ebighị ebi Mak 10:29, 30

E nwere nanị otu ụzọ nke Mat. 7:13, 14; Efe. 4:4, 5

na-eduga ná ndụ

Ọnwụ ụmụ mmadụ bụ n’ihi Rom 5:12; 6:23

mmehie Adam

Mkpụrụ obi mmadụ na-akwụsị Ezik. 18:4; Ekli. 9:10;

ịdị ndụ mgbe mmadụ nwụrụ Abụ Ọma. 6:5;146:4; Jọn 11:11-14

Hel bụ ili nkịtị nke ihe a Job 14:13, Dy; Mkpu. 20:13, 14,

kpọrọ mmadụ AV (etiti peeji)

Olileanya dịịrị ndị nwụrụ 1 Kọr. 15:20-22; Jọn 5:28, 29;

anwụ bụ mbilite n’ọnwụ 11:25, 26

Ọnwụ sitere n’aka Adam 1 Kọr. 15:26, 54; Mkpu. 21:4;

ga-akwụsị Aịsa. 25:8

Nanị ìgwè atụrụ nta dị Luk 12:32; Mkpu. 14:1, 3;

144,000 ga-aga eluigwe 1 Kọr. 15:40-53; Mkpu. 5:9, 10

ma soro Kraịst chịa

A na-amụ 144,000 ahụ ọzọ dị 1 Pita 1:23; Jọn 3:3; Mkpu. 7:3, 4

ka ụmụ ime mmụọ nke Chineke

E so Israel ime mmụọ gbaa Jer. 31:31; Hib. 8:10-13

ọgbụgba ndụ ọhụrụ

E wukwasịrị nzukọ Kraịst Efe. 2:20; Aịsa. 28:16;

n’elu ya onwe ya Mat. 21:42

Nanị Jehova ka a ga-ekpegara Jọn 14:6, 13, 14; 1 Tim. 2:5

ekpere site na Kraịst

E kwesịghị iji ihe oyiyi Ọpụ. 20:4, 5; Lev. 26:1;

na-efe ofufe 1 Kọr. 10:14; Abụ Ọma 115:4-8

A ghaghị izere mgbaasị Deut. 18:10-12; Gal. 5:19-21;

Lev. 19:31

Setan bụ onye ọchịchị a 1 Jọn 5:19; 2 Kọr. 4:4;

na-adịghị ahụ anya nke ụwa Jọn 12:31

Onye Kraịst ekwesịghị ikere 2 Kọr. 6:14-17; 11:13-15;

òkè ọ bụla n’ihe omume Gal. 5:9; Deut. 7:1-5

ngwakọta ofufe

Onye Kraịst kwesịrị ịnọpụ Jes. 4:4; 1 Jọn 2:15;

iche n’ụwa Jọn 15:19; 17:16

Rubere iwu ụmụ mmadụ isi bụ́ Mat. 22:20, 21; 1 Pita 2:12; 4:15

ndị na-emegideghị iwu Chineke

Isi n’ọnụ ma ọ bụ n’akwara Jen. 9:3, 4; Lev. 17:14;

mịnye ọbara n’ahụ Ọrụ 15:28, 29

na-emegide iwu Chineke

A ghaghị irube isi n’iwu 1 Kọr. 6:9, 10; Hib. 13:4;

Bible banyere omume 1 Tim. 3:2; Ilu 5:1-23

Nanị ndị Israel ka e nyere Deut. 5:15; Ọpụ. 31:13; Rom 10:4;

iwu idebe ụbọchị izu ike, Gal. 4:9, 10; Kọl. 2:16, 17

o sokwa Iwu Mosis kwụsị

Òtù ndị ụkọchukwu na utu aha Mat. 23:8-12; 20:25-27;

pụrụ iche ekwesịghị ekwesị Job 32:21, 22

Mmadụ arịpụtaghị arịpụta Aịsa. 45:12; Jen. 1:27; Mat. 19:4

kama e kere ya eke

Kraịst setịpụrụ ihe 1 Pita 2:21; Hib. 10:7;

nlereanya a na-aghaghị Jọn 4:34; 6:38

ịgbaso n’ijere Chineke ozi

Ime baptism site n’imikpu Mak 1:9, 10; Jọn 3:23;

kpam kpam n’ime mmiri Ọrụ 19:4, 5

na-egosipụta nraranye

Ndị Kraịst ji obi ụtọ Rom 10:10; Hib. 13:15;

na-agba akaebe n’ihu ọha Aịsa. 43:10-12

maka eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ

[Foto dị na peeji nke 12]

ỤWA . . . nke Jehova kere . . . nke mmadụ na-elekọta . . . nke a ga-ebi na ya ruo mgbe ebighị ebi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya