Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ip-2 isi 13 p. 180-193
  • “Tienụ Mkpu Ọṅụ n’Otu”!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Tienụ Mkpu Ọṅụ n’Otu”!
  • Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Yiri Ike Gị Dị Ka Uwe, Gị Zaịọn”!
  • “Ndị M Ga-amara Aha M”
  • “Onye Na-ezisa Ozi Ọma”
  • ‘Ndị Nche Gị Eweliwo Olu Ha’
  • Ihe A Chọrọ Ka E Mee Ngwa Ngwa
  • “Aha Ọhụrụ”
    Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
  • Ime Ka A Mata Ụdị Onye Ozi Bụ nke Ọma Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ije Ozi Dị Ka Ndị Ozi nke Udo Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Aịsaịa—Akụkụ nke Abụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II
ip-2 isi 13 p. 180-193

Isi nke Iri na Atọ

“Tienụ Mkpu Ọṅụ n’Otu”!

Aịsaịa 52:1-12

1. N’ihi gịnị ka okwu amụma ndị dị n’Aịsaịa isi 52 ji bụrụ ihe na-enye ọṅụ, mmezu abụọ dịkwa aṅaa ka ha nwere?

NTỌHAPỤ! Ọ̀ dị atụmanya pụrụ inye ndị a dọọrọ n’agha ọṅụ karịa nke ahụ? Ebe isiokwu gbara ọkpụrụkpụ nke dị n’akwụkwọ Aịsaịa bụ ntọhapụ na mweghachi, ọ bụghị ihe ijuanya na e wezụga Abụ Ọma, akwụkwọ Bible a kwuru okwu banyere ọṅụ karịa akwụkwọ Bible ọ bụla ọzọ. Aịsaịa isi 52 karịsịa na-akọwa ihe mere ndị Chineke ga-eji ṅụrịa ọṅụ. E mezuru okwu amụma ndị dị na ya n’ahụ Jerusalem na 537 T.O.A. Ha nwekwara mmezu ka ukwuu nke na-emetụta “Jerusalem nke dị n’elu,” bụ́ nzukọ eluigwe Jehova nke ndị mmụọ e kere eke, bụ́ nke a na-akọwa mgbe ụfọdụ dị ka nne na nwunye.—Ndị Galetia 4:26; Mkpughe 12:1.

“Yiri Ike Gị Dị Ka Uwe, Gị Zaịọn”!

2. Olee mgbe Zaịọn tetara, oleekwa otú nke a si mee?

2 Jehova, site n’ọnụ Aịsaịa, gwara obodo Ọ hụrụ n’anya, bụ́ Zaịọn, sị: “Teta, teta, yiri ike gị dị ka uwe, gị Zaịọn; yiri uwe gị nile mara mma, gị Jerusalem, bụ́ obodo nsọ: n’ihi na onye na-ebighị úgwù na onye rụrụ arụ agaghị abatakwa n’ime gị ọzọ site n’ugbu a. Rurupụ onwe gị, si n’ájá pụta; bilie, nọdụ ala, Jerusalem; tọpụ onwe gị agbụ dị n’olu gị, gị ada Zaịọn a dọtara n’agha.” (Aịsaịa 52:1, 2) N’ihi na ndị bi n’ime ya akpasuwo Jehova iwe, Jerusalem atọgbọrọwo n’efu ruo afọ 70. (2 Ndị Eze 24:4; 2 Ihe E Mere 36:15-21; Jeremaịa 25:8-11; Daniel 9:2) Ugbu a, oge eruwo ka o si n’ogologo oge nke ịnọ n’arụghị ọrụ ọ nọ bilie ma yiri uwe mara mma nke nnwere onwe. Jehova akpaliwo obi Saịrọs ịtọhapụ “ada Zaịọn a dọtara n’agha” ka ndị bibu na Jerusalem na ụmụ ha nwee ike isi na Babilọn pụọ, laghachi Jerusalem, ma weghachi ezi ofufe. Ọ dịghị ndị a na-ebighị úgwù na ndị na-adịghị ọcha a ga-ahụ na Jerusalem.—Ezra 1:1-4.

3. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kpọọ ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ “ada Zaịọn,” n’echiche dịkwa aṅaa ka a tọhapụrụ ha?

3 Ihe ndị a Aịsaịa kwuru nwekwara mmezu n’ọgbakọ ndị Kraịst. A pụrụ ịkọwa ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ dị ka “ada Zaịọn” nke oge a, ebe “Jerusalem nke dị n’elu” bụ nne ha.a Ebe e meworo ka ha nwere onwe ha pụọ ná nkụzi nke ndị na-ekpere arụsị na n’ozizi nke ndị si n’ezi ofufe dapụ, ndị e tere mmanụ aghaghị ịnọgide na-adị ọcha n’ihu Jehova, ee e, ọ bụghị site n’ịbụ ndị e biri úgwù n’anụ ahụ, kama site n’ịbụ ndị e biri úgwù n’obi ha. (Jeremaịa 31:33; Ndị Rom 2:25-29) Nke a na-agụnye ịnọgide na-adị ọcha n’ụzọ ime mmụọ, n’uche, na n’omume, n’ihu Jehova.—1 Ndị Kọrint 7:19; Ndị Efesọs 2:3.

4. Ọ bụ ezie na ọ dịtụbeghị mgbe “Jerusalem nke dị n’elu” nupụụrụ Jehova isi, ahụmahụ dịgasị aṅaa nke ndị nnọchianya ya nọ n’ụwa nwere yiri nke ndị ahụ bi na Jerusalem n’oge ochie?

4 N’eziokwu, ọ dịbeghị mgbe “Jerusalem nke dị n’elu” nupụụrụ Jehova isi. Otú ọ dị, n’oge Agha Ụwa Mbụ, ndị nnọchiteanya ya nọ n’ụwa—ndị Kraịst e tere mmanụ—mebiri iwu Jehova n’amaghị ama n’ihi na ha aghọtaghị nke ọma ihe ezi nnọpụiche nke ndị Kraịst pụtara. N’ịbụ ndị na-enwekwaghị ihu ọma Chineke, “Babilọn Ukwuu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, dọọrọ ha n’agha n’ụzọ ime mmụọ. (Mkpughe 17:5) Ọnọdụ ha nke ịnọ n’ohu ruru n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu na June 1918 mgbe a tụrụ mmadụ asatọ bụ́ ndị ọrụ nke Watch Tower Society mkpọrọ n’ihi ebubo ụgha, nke na-agụnye ịgba izu mmegide. N’oge ahụ, ọrụ nkwusa ozi ọma ahụ a haziri ahazi fọrọ nke nta ka ọ kwụsị. Otú ọ dị, na 1919, a kpọrọ òkù dara ụda maka ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ. Ndị Kraịst e tere mmanụ malitere ikewapụ onwe ha kpam kpam n’ebe adịghị ọcha omume na nke ime mmụọ nke Babilọn Ukwu ahụ dị. Ha si n’ájá nke ndọrọ n’agha bilie, “Jerusalem nke dị n’elu” bịakwara maa mma dị ka “obodo nsọ” bụ́ ebe a na-adịghị ekwe ka adịghị ọcha ime mmụọ dịrị n’ime ya.

5. N’ihi gịnị ka Jehova ji nwee ikike zuru ezu ịgbapụta ndị ya n’akwụghị ndị ji ha ụgwọ iti aka n’obi ọ bụla?

5 Ma na 537 T.O.A. ma na 1919 O.A., Jehova nwere ikike zuru ezu ịtọhapụ ndị ya. Aịsaịa na-akọwa, sị: “Otú a ka Jehova sịrị, N’efu ka e rere unu; ọ bụghịkwa ego ka a ga-eji gbapụta unu.” (Aịsaịa 52:3) Ma Babilọn oge ochie ma Babilọn Ukwu ahụ adịghị nke kwụrụ ụgwọ ọ bụla mgbe ha kpọọrọ ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ dị ka ndị ohu. Ebe ọ na-adịghị azụmahịa ọ bụla metụtara ego e nwere, Jehova ka bụ Onye Nwe ndị ya nke iwu kwadoro. Ò kwesịrị icheworị na ọ dị onye ya ji ụgwọ? Ọ dịghị ma ọlị. N’ọnọdụ abụọ ahụ, Jehova pụrụ, n’ụzọ ziri ezi, ịgbapụta ndị na-efe ya ofufe n’akwụghị ndị kpụụrụ ha ụgwọ iti aka n’obi ọ bụla.—Aịsaịa 45:13.

6. Ihe mmụta dịgasị aṅaa sitere n’akụkọ ihe mere eme ka ndị iro Jehova jụrụ ịṅa ntị na ya?

6 Ndị iro Jehova amụtabeghị ihe ọ bụla site n’akụkọ ihe mere eme. Anyị na-agụ, sị: “Otú a ka Onyenwe anyị Jehova sịrị, Ọ bụ Ijipt ka ndị m rịdaruru na mbụ ịnọ n’ebe ahụ dị ka ọbịa: Asiria kwa, n’efu ka o megburu ha.” (Aịsaịa 52:4) Fero nke Ijipt ji ndị Israel mere ohu, bụ́ ndị a kpọrọ òkù ka ha bịa biri n’ala ya dị ka ndị ọbịa. Ma Jehova mere ka mmiri rie Fero na usuu ndị agha ya n’Oké Osimiri Uhie. (Ọpụpụ 1:11-14; 14:27, 28) Mgbe Eze Senakerib nke Asiria yiri Jerusalem egwu, mmụọ ozi Jehova gburu mmadụ 185,000 n’ime ndị agha nke eze ahụ. (Aịsaịa 37:33-37) N’otu aka ahụ, ma Babilọn oge ochie ma Babilọn Ukwu ahụ adịghị nke pụrụ ịgbanahụ ihe ndị ga-esi n’imegbu ndị Chineke pụta.

“Ndị M Ga-amara Aha M”

7. Mmetụta dị aṅaa ka ndọrọ a dọọrọ ndị Jehova n’agha nweworo n’aha ya?

7 Ọnụnọ ndị Jehova nọ ná ndọrọ n’agha nwere mmetụta n’aha ya, dị ka amụma ahụ na-egosi: “Ugbu a, gịnị ka M nwere ebe a, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), na e wepụwo ndị m n’efu? ndị na-achị ha na-akwasi ákwá ike, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), ọ bụkwa mgbe nile n’ogologo ụbọchị nile ka a na-elelị aha m. N’ihi nke a ka ndị m ga-amara aha m: n’ihi nke a ka ha ga-amara n’ụbọchị ahụ na Mụ onwe m bụ Onye ahụ Nke na-ekwu okwu; leekwa m.” (Aịsaịa 52:5, 6) Olee ihe gbasara Jehova n’ọnọdụ ahụ? Olee ihe gbasara ya na Israel ịbụ ohu na Babilọn? Jehova aghaghị ime ihe n’ihi na Babilọn adọrọwo ndị ya n’agha, ha etiwokwa mkpu ọṅụ n’ihi mmeri ha meriri ha. Ụdị itu ọnụ ahụ emewo ka Babilọn mesoo aha Jehova n’ụzọ enweghị nkwanye ùgwù. (Ezikiel 36:20, 21) Ọ ghọtaghị na ntọgbọrọ n’efu nke Jerusalem bụ n’ihi iwe Jehova megide ndị ya. Kama nke ahụ, Babilọn weere ojiji o ji ndị Juu mere ohu dị ka ihe àmà na-egosi na Chineke ha adịghị ike. Ọbụna Belshaza bụ́ onye so bụrụ eze Babilọn kwara Jehova emo site n’iji arịa ndị si n’ụlọ nsọ Ya mee ihe n’oge ọ na-eri otu oriri iji sọpụrụ chi dị iche iche nke Babilọn.—Daniel 5:1-4.

8. Olee otú e siworo mesoo aha Jehova kemgbe ndị ozi nwụsịrị?

8 Olee otú ihe a nile si metụta “Jerusalem nke dị n’elu”? Kemgbe ndapụ n’ezi ofufe gbanyere mkpọrọgwụ n’etiti ndị sị na ha bụ ndị Kraịst, a pụrụ ịsị na “a na-ekwulu aha Chineke n’etiti ndị mba ọzọ n’ihi [ndị ahụ].” (Ndị Rom 2:24; Ọrụ 20:29, 30) Na nke ahụkwa, ndị Juu mesịrị malite izere iji aha Chineke na-eme ihe n’ihi nkwenkwe ụgha. N’oge na-adịghị anya mgbe ndị ozi nwụsịrị, ndị Kraịst si n’ezi ofufe dapụ mere otu ihe ahụ wee kwụsị iji aha aka nke Chineke na-eme ihe. Ndapụ n’ezi ofufe ahụ kpatara ntolite nke Krisendọm, akụkụ bụ́ isi nke Babilọn Ukwu ahụ. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3, 7; Mkpughe 17:5) Omume rụrụ arụ gabigara ókè nke Krisendọm na ikpe ọmụma ọbara o ji anyaike na-ewetara onwe ya ewetaworo aha Jehova nkọcha.—2 Pita 2:1, 2.

9, 10. Nghọta dị aṅaa miri emi karị banyere ụkpụrụ Jehova na aha ya ka ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ n’oge a bịaworo nwee?

9 Mgbe Saịrọs Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst, tọhapụrụ ndị ha na Chineke nọ n’ọgbụgba ndụ ná ndọrọ n’agha nke Babilọn Ukwu ahụ na 1919, ha bịara ghọta nke ọma karị ihe ndị Jehova chọrọ. Ha ewezụgaworị n’etiti onwe ha ọtụtụ ozizi Krisendọm ndị malitere n’ikpere arụsị nke dị tupu oge ndị Kraịst, dị ka Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, na mmekpa ahụ ebighị ebi n’ime hel na-ere ọkụ. Ugbu a, ha malitere iwepụsị n’etiti onwe ha ihe nile fọdụrụ ná mmetụta nke Babilọn. Ha bịakwara ghọta mkpa ọ dị ịnọgide na-anọpụ iche kpam kpam n’ihe omume nke òtù dị iche iche nke ụwa a. Ha chọrọ ọbụna ido onwe ha ọcha pụọ n’ikpe ọmụma ọbara ọ bụla nke pụrụ ịmawo ụfọdụ n’ime ha.

10 Ndị ohu Chineke nke oge a bịakwara ghọta n’ụzọ miri emi karị mkpa aha Jehova dị. Na 1931, ha nakweere aha bụ́ Ndịàmà Jehova, si otú a na-ekwupụta n’ihu ọha na ha na-akwado Jehova na aha ya. Ọzọkwa, site ná mbipụta nke New World Translation kemgbe 1950, Ndịàmà Jehova eweghachiwo aha Chineke n’ebe o kwesịrị ịdị na Bible. Ee, ha abịawo jiri aha Jehova kpọrọ ihe ma na-eme ka a mara ya ruo n’ebe nile ụwa sọtụrụ.

“Onye Na-ezisa Ozi Ọma”

11. N’ihi gịnị ka mkpu bụ́ “Chineke gị bụ eze!” ji kwesị ekwesị n’ihi ihe ndị mere na 537 T.O.A.?

11 Ugbu a, a dọọrọ uche anyị gaghachi na Zaịọn mgbe ọ ka tọgbọrọ n’efu. Otu onye ozi ji ozi ọma bịa: “Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ nke onye na-ezisa ozi ọma, bụ́ onye na-eme ka a nụrụ okwu udo, onye na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe, onye na-eme ka a nụrụ okwu nzọpụta; onye na-asị Zaịọn, Chineke gị bụ eze!” (Aịsaịa 52:7) Na 537 T.O.A., olee otú a pụrụ isi kwuo na Chineke Zaịọn aghọwo Eze? Ọ̀ bụ na Jehova abụghị Eze mgbe nile? N’ezie, ọ bụ “Eze mgbe ebighị ebi”! (Mkpughe 15:3, NW) Ma mkpu ahụ bụ́ “Chineke gị bụ eze!” kwesịrị ekwesị n’ihi na ọdịda nke Babilọn nakwa okwu ahụ eze kwupụtara ka e wughachi ụlọukwu ahụ dị na Jerusalem ma weghachi ofufe dị ọcha n’ebe ahụ bụ ngosipụta ọhụrụ nke ọbụbụeze Jehova.—Abụ Ọma 97:1.

12. Ònye butere ụzọ ‘n’izisa ozi ọma,’ n’ụzọ dịkwa aṅaa?

12 N’oge Aịsaịa, ọ dịghị otu onye ma ọ bụ ìgwè mmadụ a maara dị ka “onye na-ezisa ozi ọma.” Otú ọ dị, taa, a maara onye bụ́ onye na-ezisa ozi ọma. Jisọs Kraịst bụ onye ozi udo kasịnụ nke Jehova. Mgbe ọ nọ n’ụwa, o kwusara ozi ọma ahụ bụ́ na a ga-enwe ntọhapụ pụọ ná mmetụta nile nke mmehie e ketara site n’aka Adam, gụnyere ọrịa na ọnwụ. (Matiu 9:35) Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya nke ịnụ ọkụ n’obi n’ikwusa ozi ọma a nke ezi ihe, jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ na-akụziri ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke. (Matiu 5:1, 2; Mak 6:34; Luk 19:1-10; Jọn 4:5-26) Ndị na-eso ụzọ ya gbasokwara ihe nlereanya ya.

13. (a) Olee otú Pọl onyeozi si mee ka ihe okwu bụ́ “Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ nke onye na-ezisa ozi ọma,” pụtara sakwuo mbara? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ụkwụ nke ndị ozi ahụ ‘mara mma’?

13 N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, Pọl onyeozi hotara ihe e kwuru n’Aịsaịa 52:7 iji mesie ike ịdị mkpa nke ọrụ ikwusa ozi ọma ahụ. Ọ jụrụ ọtụtụ ajụjụ ndị na-akpali iche echiche, gụnyere ‘Olee otú ndị mmadụ ga-esi nụ ma onye na-ekwusa anọghị?’ O kwuziri, sị: “Dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu, bụ́ ụkwụ ndị na-ezisa ozi ọma nke ezi ihe!” (Ndị Rom 10:14, 15) Pọl si otú a mee ka ihe Aịsaịa 52:7 pụtara sakwuo mbara, na-eji okwu na-egosi ihe karịrị otu nke bụ́ “ndị” eme ihe kama iji ụdị na-egosi otu ihe nke bụ́ “onye,” bụ́ nke dị n’ihe odide mbụ nke Aịsaịa. N’iṅomi Jisọs Kraịst, ndị Kraịst nile bụ ndị ozi nke ozi ọma nke udo. Olee otú ụkwụ ha si “maa mma”? Aịsaịa na-ekwu dị ka a ga-asị na onye na-akpọsa ozi si n’ugwu ndị dị nso nke Juda na-abịa Jerusalem. Ọ gaghị ekwe omume ịnọ n’ebe dị anya hụ ụkwụ onye ozi ahụ. Kama nke ahụ, n’ebe a, ebe e lekwasịrị anya bụ n’onye ozi ahụ, ụkwụ ahụ ana-anọchite anya onye ozi ahụ n’onwe ya. Dị nnọọ ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya dị mma nkiri nye ndị dị nwayọọ n’obi na narị afọ mbụ, Ndịàmà nke oge a bụ ndị dị mma nkiri nye ndị dị umeala n’obi ndị na-aṅa ntị n’ozi ahụ na-azọpụta ndụ bụ́ ozi ọma ahụ.

14. Olee otú Jehova siworo ghọọ Eze n’oge a, kemgbe ole mgbekwa ka a kpọsaworo nke a nye ihe a kpọrọ mmadụ?

14 Kemgbe ole mgbe n’oge a ka a nọworo na-anụ mkpu bụ́ “Chineke gị bụ eze!”? Kemgbe 1919. N’afọ ahụ, n’otu mgbakọ e nwere na Cedar Point, Ohio, J. F. Rutherford, bụ́ onyeisi oche nke Watch Tower Society n’oge ahụ, ji okwu nke isiokwu ya bụ́ “Okwu A Na-agwa Ndị Na-arụkọ Ọrụ Ọnụ” kpalie ndị na-ege ya ntị. Okwu ahụ, nke dabeere n’Aịsaịa 52:7 nakwa ná Mkpughe 15:2, gbara ndị nile nọ n’ebe ahụ ume ịmalite ọrụ nkwusa ahụ. N’ihi ya, a malitere ịhụ ‘ụkwụ ndị mara mma’ “n’elu ugwu” dị iche iche. Ná mbụ, ndị Kraịst e tere mmanụ, e mesịakwa ndị enyi ha bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ, ji ịnụ ọkụ n’obi pụọ ikwusa ozi ọma bụ́ na Jehova aghọwo Eze. (Jọn 10:16) Olee otú Jehova siworo ghọọ Eze? O gosipụtaghachiri ọbụbụeze ya na 1914 mgbe o chiri Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, Eze n’Alaeze eluigwe ahụ e guzobere ọhụrụ. Jehova gosipụtakwara ọbụbụeze ya ọzọ na 1919 mgbe ọ tọhapụrụ “Israel nke Chineke” na Babilọn Ukwu ahụ.—Ndị Galetia 6:16; Abụ Ọma 47:8; Mkpughe 11:15, 17; 19:6.

‘Ndị Nche Gị Eweliwo Olu Ha’

15. Olee ndị bụ “ndị nche” ahụ weliri olu ha na 537 T.O.A.?

15 Mkpu bụ́ “Chineke gị bụ eze!” ọ̀ na-eme ka e nwee mmeghachi omume? Ee. Aịsaịa na-ede, sị: “Nụrụ olu ndị nche gị! ha eweliwo olu ha, n’otu ka ha na-etikọ mkpu ọṅụ; n’ihi na anya na anya ka ha ga-ahụ mgbe Jehova na-alaghachikwute Zaịọn.” (Aịsaịa 52:8) Ọ dịghị ndị nche nkịtị nọ na Jerusalem na 537 T.O.A. iji nabata ndị mbụ si n’ije biri n’ala ọzọ lọta. Obodo ahụ atọgbọwo chakoo ruo afọ 70. (Jeremaịa 25:11, 12) N’ihi ya, “ndị nche” ahụ weliri olu ha aghaghị ịbụ ndị Israel ahụ bu ụzọ nụ ozi banyere mweghachi nke Zaịọn, ndị ọ ghọkwara ọrụ ha izi ụmụ Zaịọn ndị ọzọ ozi ahụ. Mgbe ha hụrụ ka Jehova nyefere Babilọn n’aka Saịrọs na 539 T.O.A., ndị nche ahụ enweghị obi abụọ ọ bụla na Jehova na-atọhapụ ndị ya. Ndị nche ahụ na ndị na-aza òkù ha anọgidewo na-eti mkpu ọṅụ n’otu, na-eme ka ndị ọzọ nụrụ ozi ọma ahụ.

16. Ònye ka ndị nche ahụ na-ahụ “anya na anya,” ọ bụkwa n’echiche dị aṅaa?

16 Ndị nche ahụ mụ anya na Jehova malitere inwe mmekọrịta onwe onye chiri anya, na-ahụ ya “anya na anya,” ma ọ bụ ihu na ihu, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. (Ọnụ Ọgụgụ 14:14) Mkpakọrịta chiri anya nke ha na Jehova nakwa nke ha na ibe ha na-emesi ịdị n’otu ha ike nakwa otú ozi ha si bụrụ nke na-enye ọṅụ.—1 Ndị Kọrint 1:10.

17, 18. (a) Olee otú òtù onye nche nke oge a siworo welie olu ya? (b) N’echiche dị aṅaa ka òtù onye nche ahụ kpọworo òkù n’otu?

17 Ná mmezu nke oge a, òtù onye nche ahụ, bụ́ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” na-eweli olu ya, ọ bụghị nanị nye ndị nọrọwooro anọrọ ná nzukọ Chineke a na-ahụ anya kamakwa nye ndị nọ n’èzí. (Matiu 24:45-47) A kpọrọ òkù na 1919 ka a chịkọta ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ, na 1922 kwa, e mesiri òkù ahụ ike ná mgbakọ e nwere na Cedar Point, Ohio, site n’arịrịọ bụ́ “kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na alaeze ya.” Kemgbe 1935, e chewo ihu n’ịchịkọta oké ìgwè mmadụ ahụ nke ndị yiri atụrụ. (Mkpughe 7:9, 10) N’afọ ndị na-adịbeghị anya, mkpọsa nke ọbụbụeze Jehova amụbawo. N’ụzọ dị aṅaa? N’afọ 2000, ihe dị ka nde mmadụ isii nọ na-ekere òkè n’ịkọsa ọbụbụeze Jehova n’ihe karịrị ala na ókèala 230. Ọzọkwa, ngwá ọrụ bụ́ isi nke òtù onye nche ahụ ji eme ihe, bụ́ Ụlọ Nche, na-akpọsa ozi ahụ na-enye ọṅụ n’ihe karịrị asụsụ 130.

18 Ikere òkè n’ọrụ dị otú ahụ nke na-eme ka a dị n’otu na-achọ ịdị umeala n’obi na ịhụnanya ụmụnna. Ka òkù ahụ wee na-arụpụta ihe, ndị nile so na-akpọ ya aghaghị ịdị na-ezisa otu ozi ahụ, nke bụ́ banyere aha Jehova, ihe mgbapụta o nyere, amamihe ya, ịhụnanya ya, na Alaeze ya. Ka ndị Kraịst n’ụwa nile nọ na-arụkọ ọrụ ọnụ, a na-eme ka ihe nkekọ onwe onye nke dị n’agbata ha na Jehova siwanye ike iji na-akpọsakọta ozi obi ụtọ ahụ ọnụ.

19. (a) Olee otú “mkpọmkpọ ebe nke Jerusalem” si malite ịṅụrị ọṅụ? (b) N’echiche dị aṅaa ka Jehova ‘gbabaworo ogwe aka ya ọtọ’?

19 Ka ndị Chineke ji ọṅụ na-eti mkpu, ọbụna ebe ha nọ yiri ka ọ na-aṅụrị ọṅụ. Amụma ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Tiwaanụ mkpu ọṅụ, tienụ mkpu ọṅụ n’otu, unu mkpọmkpọ ebe nke Jerusalem: n’ihi na Jehova akasiwo ndị Ya obi, Ọ gbapụtawo Jerusalem. Jehova agbabawo ogwe aka Ya dị nsọ ọtọ n’anya mba nile; nsọtụ nile nke ụwa wee hụ nzọpụta nke Chineke anyị.” (Aịsaịa 52:9, 10) Mgbe ndị ahụ si Babilọn na-alọta lọtara, ebe ndị ahụ yiri ka ha na-eru újú n’ime Jerusalem ahụ e bibiri ebibi nwere ihu ọchị n’ihi na a pụrụ iweghachi ofufe dị ọcha nke Jehova ugbu a. (Aịsaịa 35:1, 2) N’ụzọ doro anya, aka Jehova dị na nke a. Ọ ‘gbabawo ogwe aka ya dị nsọ ọtọ,’ dị ka a ga-asị na ọ na-afụ aka uwe ya afụ iji rụọ ọrụ ịzọpụta ndị ya.—Ezra 1:2, 3.

20. Gịnị ka Jehova ịgbaba ogwe aka ya dị nsọ ọtọ rụpụtaworo, gịnị ka ọ ka ga-arụpụta n’oge a?

20 Na “mgbe ikpeazụ” a, Jehova agbabawo ogwe aka ya dị nsọ ọtọ iji tụtee ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ, bụ́ ‘ndị àmà abụọ’ ahụ e hotara n’akwụkwọ Mkpughe. (2 Timoti 3:1; Mkpughe 11:3, 7-13) Kemgbe 1919, a kpọbatawo ndị a na paradaịs ime mmụọ, bụ́ ógbè ime mmụọ nke ha na ọtụtụ nde ndị enyi ha, bụ́ atụrụ ọzọ ahụ nọ na ya ugbu a. N’ikpeazụ, Jehova ga-agbaba ogwe aka ya dị nsọ ọtọ iji wetara ndị ya nzọpụta na “Ha–Magedọn.” (Mkpughe 16:14, 16) Mgbe ahụ, “nsọtụ nile nke ụwa [aghaghị ịhụ] nzọpụta nke Chineke anyị.”

Ihe A Chọrọ Ka E Mee Ngwa Ngwa

21. (a) Gịnị ka a chọrọ n’aka ndị “na-ebu ihe dị iche iche nke Jehova”? (b) N’ihi gịnị ka ọ na-enweghị ihe mere ndị Juu si na Babilọn na-ala ga-eji maa jijiji?

21 Ndị si na Babilọn pụọ ịlaghachi na Jerusalem nwere ihe a chọrọ ha n’aka imezu. Aịsaịa na-ede, sị: “Wezụganụ onwe unu, wezụganụ onwe unu, sinụ n’ebe ahụ pụọ, unu emetụla ihe rụrụ arụ: sinụ n’etiti ya pụọ: dịnụ ọcha, unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke Jehova. N’ihi na ọ bụghị ná ngwa ka unu ga-apụ, ọ bụghịkwa ná mgbalaga ka unu ga-eje: n’ihi na Onye na-aga n’ihu unu bụ Jehova; ọzọ, Onye na-aga n’azụ unu bụ Chineke Israel.” (Aịsaịa 52:11, 12) Ndị Israel ahụ na-ala ala aghaghị ịhapụ na Babilọn ihe ọ bụla ofufe ụgha nke Babilọn merụworo. Ebe ha na-ebu ihe dị iche iche nke Jehova ndị sitere n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem, ha aghaghị ịdị ọcha, ọ bụghị nanị n’elu ahụ, n’ụzọ imezu iwu, kama n’ụzọ bụ́ isi, n’ime obi ha. (2 Ndị Eze 24:11-13; Ezra 1:7) Ọzọkwa, Jehova na-aga n’ihu ha, ya mere ọ dịghị mkpa ka ha maa jijiji, ma ọ bụkwanụ gbaa ọsọ n’ọkụ n’ọkụ dị ka a ga-asị na ndị ọ na-agụ agụụ ịkwafu ọbara na-achụsi ha ike. Chineke nke Israel na-aga n’azụ ha.—Ezra 8:21-23.

22. Olee otú Pọl si mesie mkpa ịdị ọcha dị n’etiti ndị Kraịst e tere mmanụ ike?

22 Ihe Aịsaịa kwuru banyere ịdị ọcha nwere mmezu bụ́ isi n’ahụ ụmụ nke “Jerusalem nke dị n’elu.” Mgbe Pọl dụrụ ndị Kraịst nọ na Kọrint ọdụ ka ha na ndị na-ekweghị ekwe ghara ikekọta onwe ha, o hotara ihe e kwuru n’Aịsaịa 52:11, sị: “N’ihi nke a sinụ n’etiti ha pụta, guzokwanụ iche, ka Onyenwe anyị kwuru, unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka.” (2 Ndị Kọrint 6:14-17) Dị nnọọ ka ndị Israel ahụ bụ́ ndị si Babilọn na-ala, ndị Kraịst aghaghị izere ofufe ụgha nke Babilọn kpam kpam.

23. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ndị ohu Jehova taa si agbalị idebe onwe ha ọcha?

23 Nke a bụ eziokwu karịsịa banyere ụmụazụ Jisọs Kraịst e tere mmanụ ndị si na Babilọn Ukwu ahụ gbapụ na 1919. Ha ji nwayọọ nwayọọ wepụ n’etiti onwe ha ihe nile metụtara ofufe ụgha. (Aịsaịa 8:19, 20; Ndị Rom 15:4) Ha matakwukwara mkpa ọ dị ịdị ọcha n’omume. Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova anọwo mgbe nile na-enwe ụkpụrụ omume dị elu, na 1952, Ụlọ Nche nwere isiokwu ndị mesiri ike mkpa ọ dị ịdọ ndị na-eme omume rụrụ arụ aka ná ntị iji debe ọgbakọ ọcha. Ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ na-enyekwara onye ahụ mere ihe ọjọọ aka ịghọta mkpa ọ dị inwe nchegharị sitere n’obi.—1 Ndị Kọrint 5:6, 7, 9-13; 2 Ndị Kọrint 7:8-10; 2 Jọn 10, 11.

24. (a) N’oge a, gịnị bụ “ihe dị iche iche nke Jehova”? (b) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst taa ji nwee obi ike na Jehova ga-anọgide na-aga n’ihu ha na n’azụ ha?

24 Ndị Kraịst e tere mmanụ na oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ kpebisiri ike ịghara imetụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha n’ụzọ ime mmụọ aka. Nsacha a sachara ha na ịdị ọcha ha na-eme ka ha ruo eruo ịghọ ndị na-ebu “ihe dị iche iche nke Jehova”—ndokwa dị oké ọnụ ahịa ndị Chineke na-eme maka ije ozi dị nsọ n’ozi ụlọ n’ụlọ na nke ọmụmụ Bible na ụdị ọrụ ndị ọzọ nke ndị Kraịst. Site n’ịnọgide na-abụ ndị dị ọcha, ndị Chineke taa pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-anọgide na-aga n’ihu ha nakwa n’azụ ha. Dị ka ndị Chineke dị ọcha, ha nwere ọtụtụ ihe mere ha ga-eji ‘tikọọ mkpu ọṅụ’!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Lee isi 15 nke akwụkwọ a maka ntụle sara mbara karị nke njikọ dị n’agbata “Jerusalem nke dị n’elu” na ụmụ ya e tere mmanụ, nọ n’ụwa.

[Foto dị na peeji nke 183]

A ga-atọhapụ Zaịọn ná ndọrọ n’agha

[Foto dị na peeji nke 186]

Malite na 1919, a hụwakwala ọzọ, ‘ụkwụ mara mma’ “n’elu ugwu” dị iche iche

[Foto dị na peeji nke 189]

Ndịàmà Jehova na-ekwu otu ihe ahụ

[Foto dị na peeji nke 192]

Ndị na-ebu “ihe dị iche iche nke Jehova” aghaghị ịdị ọcha n’omume na n’ụzọ ime mmụọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya