Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 11 p. 118-p. 120 para. 5
  • Jiri Mmetụta Kwuo Okwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Mmetụta Kwuo Okwu
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Mmetụta Kwuo Okwu
    Na-agbalịsi Ike n’Ịgụ Ihe na n’Izi Ihe
  • Kwere Ka Njide Onwe Onye Gị Na-adị Ma Na-aba Ụba
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Na-achịkwa Mmetụta M?
    Teta!—2005
  • Na-egosi na Ihe Gbasara Ndị Ọzọ Na-emetụ Gị n’Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 11 p. 118-p. 120 para. 5

IHE ỌMỤMỤ NKE 11

Jiri Mmetụta Kwuo Okwu

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Kwuo okwu n’ụzọ na-egosi mmetụta uche ndị i nwere, nke kwekọkwara n’ihe ị na-ekwu.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Ọ dị mkpa ma ọ bụrụ na ị ga-eru n’obi ndị na-ege ntị.

MMETỤTA uche bụ akụkụ gbara ọkpụrụkpụ nke ndụ mmadụ. Mgbe mmadụ na-egosipụta mmetụta uche ya, ọ na-ekpughe ihe dị ya n’obi, ụdị mmadụ ọ bụ n’ime, otú o si ele ọnọdụ dị iche iche na ndị mmadụ anya. N’ihi ahụmahụ ọjọọ ha nweworo ná ndụ—mgbe ụfọdụkwa n’ihi mmetụta ebe ha si nwere n’ahụ́ ha—ọtụtụ ndị na-ezochi mmetụta uche ha. Ma Jehova na-agba anyị ume ịzụlite àgwà ndị dị mma n’ụdị mmadụ anyị bụ n’ime, mgbe ahụkwa na-egosipụta ihe anyị bụ n’ime n’ụzọ kwesịrị ekwesị.—Rom 12:10; 1 Tesa. 2:7, 8.

Mgbe anyị na-ekwu okwu, okwu ndị anyị ji eme ihe pụrụ igosipụta mmetụta uche anyị n’ụzọ ziri ezi. Ma, ọ bụrụ na anyị ejighị mmetụta ya na ya kwekọrọ kwuo okwu, ndị na-anụ ihe anyị na-ekwu ga-enwe obi abụọ ma ò sikwa anyị n’obi. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na e ji mmetụta kwesịrị ekwesị kwuo okwu, okwu anyị nwere ike ịma mma ma dị nro n’ụzọ nwere ike imetụ ndị na-anụ ya n’obi.

Igosi Mmetụta Ịhụnanya. A na-ejikọtakarị mmetụta ịhụananya na ichebara ndị mmadụ echiche. N’ihi ya, mgbe anyị na-ekwu banyere àgwà ọma dị iche iche Jehova nwere nakwa mgbe anyị na-ekwupụta ekele anyị maka ịdị mma Jehova, ụda olu anyị kwesịrị igosi ịhụnanya. (Aịsa. 63:7-9) Mgbe anyị na-agwakwa ụmụ mmadụ ibe anyị okwu, otú anyị si ekwu okwu kwesịkwara igosi mmetụta ịhụnanya na-adọrọ adọrọ.

Otu onye ekpenta bịakwutere Jizọs ma rịọ ya ka ọ gwọọ ya. Cheedị echiche ihe bụ́ ụda olu Jizọs mgbe ọ na-asị: “Achọrọ m. Ka e mee ka ị dị ọcha.” (Mak 1:40, 41) Jirikwa anya nke uche gị lee ka otu nwanyị nke nwere oruru ọbara kemgbe afọ 12 ji nwayọọ si n’azụ bịakwute Jizọs ma metụ ọnụ ọnụ uwe elu ya aka. Ozugbo ọ ghọtara na a chọpụtara ihe o mere, nwanyị ahụ pụtara daa n’ụkwụ Jizọs, na-ama jijiji, wee kwupụta n’ihu mmadụ nile ihe mere ya jiri metụ uwe ya aka na otú e siworo gwọta ya. Cheedị echiche otú Jizọs si gwa ya, sị: “Nwa m nwanyị, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma; gawara onwe gị n’udo.” (Luk 8:42-48) Mmetụta ọmịiko Jizọs gosiri n’oge ndị ahụ na-emetụ anyị n’obi ruo taa.

Dị ka Jizọs, mgbe anyị nwere ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ nakwa mgbe anyị chọrọ inyere ha aka n’ezie, ọ na-apụta ìhè n’ụzọ anyị si agwa ha okwu. Ngosipụta dị otú ahụ nke ọmịiko na-esite n’obi, ọ dịghị agafe ókè. Mmetụta ịhụnanya anyị pụrụ ime ka ndị mmadụ meghachi omume n’ụzọ dị nnọọ iche. Ihe ka ọtụtụ n’ime ihe ndị anyị na-ekwu n’ozi ubi na-achọ ka e jiri ikpo ọkụ kwuo ha, karịsịa mgbe anyị na-akparịta ụka, na-enye agbamume, na-enye ndụmọdụ, ma na-egosi ọmịiko.

Ọ bụrụ na i nwere mmetụta ịhụnanya n’ebe ndị ọzọ nọ, gosi ya n’ihu gị. Mgbe ị na-egosipụta ịhụnanya, a na-adọta ndị na-ege gị ntị n’ebe ị nọ dị ka e si adọta ndị mmadụ ịga n’ebe ọkụ dị n’abalị oyi na-atụ. Ọ bụrụ na ịhụnanya apụtaghị ìhè n’ihu gị, ndị na-ege gị ntị nwere ike ha agaghị ekweta na i nwere mmasị n’ebe ha nọ n’ezie. A dịghị egosipụta ịhụnanya nanị iji mezuo iwu—ọ ghaghị isite n’obi.

Mmetụta ịhụnanya kwesịkwara ịpụta ìhè n’olu okwu gị. Ọ bụrụ na i nwere ụda olu na-ada ike ike ma gbakaaa agbaka, ọ pụrụ isiri gị ike igosi mmetụta ịhụnanya n’okwu gị. Ma ka oge na-aga nakwa site n’itinyesi mgbalị ike, ị pụrụ ime ya. Otu ihe nke pụrụ inye aka, ma a bịa n’ụzọ isi mee ya, bụ icheta na okwu ndị a na-ekwubiri ngwa ngwa na-eme ka okwu bụrụ nke na-adịghị ụtọ ná ntị. Mụta ikwurucha ụda okwu ndị dị ala karị n’isi. Nke a ga-enye aka ime ka okwu gị na-egosi mmetụta ịhụnanya.

Otú ọ dị, ebe mmasị gị dị mkpa ọbụna karị. Ọ bụrụ na uche gị dị n’ezie n’ebe ndị ị na-agwa okwu nọ, ọ bụrụkwa na i nwere ezi mmasị ikwu ihe pụrụ ịbara ha uru, mmetụta dị otú ahụ ga-apụta ìhè n’ụzọ i si ekwu okwu.

Okwu e kwuru n’ụzọ na-ekpo ọkụ na-akpali akpali, ma mmetụta ịhụnanya dịkwa mkpa. Ọ dịghị ezu mgbe nile bụ anyị ịkpali mmadụ iji uche ya kweta n’ihe; anyị aghaghịkwa ịkpali obi ya.

Igosipụta Ụdị Mmetụta Ndị Ọzọ. Onye nọ na-ahụju anya nwere ike igosipụta mmetụta uche ndị dị ka nchegbu, egwu, na ịda mbà n’obi. Ọṅụ bụ mmetụta uche kwesịrị ịpụta ìhè karịsịa ná ndụ anyị, nke anyị ga na-egosipụta ngwa ngwa mgbe anyị na-agwa ndị ọzọ okwu. N’aka nke ọzọ, ọ dị mkpa igbochi ụfọdụ mmetụta uche. Ha ekwekọghị n’àgwà Ndị Kraịst. (Efe. 4:31, 32; Fil. 4:4) Okwu anyị họọrọ iji mee ihe, ụda olu anyị, na otú anyị si ekwusi okwu ike, ọdịdị ihu anyị, na mmegharị ahụ́ anyị pụrụ igosipụta ụdị mmetụta uche dị iche iche.

Bible na-akọ banyere ụdị mmetụta uche dị iche iche nke ụmụ mmadụ na-egosipụta. Mgbe ụfọdụ ọ kpọtụrụ mmetụta uche dị iche iche nanị aha. N’oge ndị ọzọ, ọ na-akọ ihe ndị merenụ ma ọ bụ hota okwu ndị e kwuru bụ́ ndị na-ekpughe mmetụta uche dị iche iche. Mgbe ị na-agụpụta ihe ndị dị otú ahụ, ọ ga-enwe mmetụta ka ukwuu, ma n’ahụ́ gị ma n’ahụ́ ndị na-ege ntị, ma ọ bụrụ na ụda olu gị na-egosi mmetụta ndị ahụ. Iji mee nke ahụ, ọ dị gị mkpa itinye onwe gị n’ọnọdụ nke ndị ahụ ị na-agụ maka ha. Otú ọ dị, okwu abụghị ime ihe ngosi, ya mere kpachara anya ka ị ghara imebiga ihe ókè. Mee ka ebe ndị ahụ ị na-agụ bamie abami n’uche ndị na-ege ntị.

Nke Kwekọrọ n’Ihe Omume. Dị ka ọ dị n’ihe banyere ịnụ ọkụ n’obi, mmetụta ịhụnanya i tinyere n’ihe ị na-ekwu nakwa mmetụta ndị ọzọ ị na-egosi na-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’ihe ị na-ekwu.

Sapeta Matiu 11:28-30, rịbakwa ama ihe ọ na-ekwu. Mgbe ahụ gụọ nkatọ Jizọs katọrọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, dị ka e dekọrọ na Matiu isi 23. Anyị apụghị iche n’echiche na Jizọs kwuru okwu amamikpe ndị a n’ụzọ mmetụta na-adịghị na ha.

Olee ụdị mmetụta i chere na ihe ndekọ dị ka nke ahụ dị na Jenesis isi 44 chọrọ, nke bụ́ banyere arịrịọ Juda rịọrọ maka nwanne ya nwoke bụ́ Benjamin? Rịba ama mmetụta uche e gosipụtara Je 44 n’amaokwu nke 13, ihe e gosiri Je 44 n’amaokwu nke 16 banyere mmetụta Juda nwere banyere ihe kpatara ọdachi ahụ, na otú Josef n’onwe ya si meghachi omume, dị ka e kwuru na Jenesis 45:1.

N’ụzọ dị otú a, ma ànyị na-agụ ihe ma ànyị na-ekwu okwu, iji mee nke ahụ n’ụzọ dị irè anyị aghaghị iche echiche, ọ bụghị nanị banyere mkpụrụ okwu na echiche dị iche iche, kamakwa banyere mmetụta ya na ha kwesịrị ịgakọ.

ỤZỌ ISI GOSIPỤTA YA

  • Kama ịdị na-echegbubiga onwe gị ókè banyere okwu ndị i ji eme ihe, lekwasị anya n’ọchịchọ gị inyere ndị na-ege gị ntị aka.

  • Ma ụda olu gị ma ọdịdị ihu gị kwesịrị igosi mmetụta ọ bụla dabara adaba n’ihe omume gị.

  • Mụta ihe site n’iji nlezianya na-eleru ndị ọzọ na-eji mmetụta ekwu okwu anya.

IHE OMUME: Gụpụta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-esonụ, jirikwa mmetụta kwekọrọ n’ebe ị na-agụ mee ihe: Matiu 20:29-34; Luk 15:11-32.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya