ISI NKE 31
Ebe A Ga-enweta Nkasi Obi
Ọ̀ DỊTỤWO mgbe ọ bụla ị na-enweghị obi ụtọ, mgbe ọ bụ nanị gị nọ?— Ọ̀ dịtụwo mgbe ị na-adị na-eche ma ọ̀ dị onye ọ bụla hụrụ gị n’anya?— Ọ na-eme ụmụaka ụfọdụ. Ma Chineke na-ekwe nkwa, sị: ‘Mụ onwe m agaghị echezọ gị.’ (Aịsaịa 49:15) Nke ahụ ọ́ bụghị ihe magburu onwe ya iche n’echiche?— Ee, Jehova Chineke hụrụ anyị n’anya n’ezie!
Olee otú i chere obi dị obere atụrụ a furu efu?
Otu onye so dee Bible sịrị: “Nna m na nne m ahapụwo m, ma Jehova ga-ekubata m.” (Abụ Ọma 27:10) Ịmata nke ahụ pụrụ ịbụ ezigbo ihe nkasi obi nye anyị, ọ́ bụghị ya?— Ee, Jehova na-agwa anyị, sị: ‘Atụla egwu, gị ka M nọnyeere: . . . M ga-enyere gị aka.’—Aịsaịa 41:10.
Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, Jehova na-ekwe ka Setan wetara anyị nsogbu. Jehova ọbụna na-ekwe ka Setan lee ndị ohu Ya ule. N’otu oge, Ekwensu mere ka Jizọs taa ahụhụ nke ukwuu nke na Jizọs tikuru Jehova, sị: “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiworo gbahapụ m?” (Matiu 27:46) Ọ bụ ezie na Jizọs nọ na-ata ahụhụ, ọ ka maara na Jehova hụrụ ya n’anya. (Jọn 10:17) Ma, Jizọs makwaara na Chineke na-ekwe ka Setan lee ndị ohu Ya ule na ọ na-ekwekwa ka Setan mee ka ha taa ahụhụ. N’isiakwụkwọ ọzọ, anyị ga-akọwa ihe mere Chineke ji ekwe ka Setan na-eme nke a.
Mgbe anyị bụ ụmụaka, ọ na-esi ike mgbe ụfọdụ ka anyị ghara ịtụ ụjọ. Dị ka ihe atụ, ọ̀ dịtụla mgbe i furu?— Ụjọ ọ̀ tụrụ gị?— Ụjọ na-atụ ọtụtụ ụmụaka. N’otu oge, Onye Ozizi Ukwu ahụ kọrọ otu akụkọ banyere ihe ifu efu. Ma, ọ bụghị nwatakịrị furu. Ọ bụ atụrụ.
N’ụzọ ụfọdụ, i yiri atụrụ. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ dị mma, atụrụ anaghị ebu oké ibu ma ọ bụ esi ike. Ha chọkwara onye ga na-elekọta ha ma na-echebe ha. A na-akpọ onye na-elekọta atụrụ onye ọzụzụ atụrụ.
N’akụkọ ya, Jizọs kọrọ banyere otu onye ọzụzụ atụrụ nke nwere otu narị atụrụ. Ma, otu n’ime atụrụ ya furu. O nwere ike ịbụ na atụrụ ahụ chọrọ ịhụ ihe dị n’akụkụ nke ọzọ nke otu ugwu. Ma, n’oge na-adịghị anya, atụrụ ahụ kpafuru site n’ebe ndị nke ọzọ nọ. Cheedị echiche otú ọ dị atụrụ ahụ mgbe o legharịrị anya wee hụ na ọ bụ nanị ya nọ?—
Gịnị ka onye ọzụzụ atụrụ ahụ ga-eme mgbe ọ matara na otu atụrụ ahụ na-efu efu? Ọ̀ ga-asị na ọ bụ atụrụ ahụ kpatara ya, n’ihi ya, na ya agaghị enye onwe ya nsogbu ije chọwa ya? Ka ọ̀ ga-ahapụ atụrụ 99 ahụ n’ebe ọ na-adịghị ihe ga-eme ha gaa chọwa nanị otu ahụ? Ò kwesịrị ịta ahụhụ ahụ nile n’ihi otu atụrụ?— Ọ bụrụ na ọ bụ gị bụ atụrụ ahụ furu efu, ị̀ ga-achọ ka onye ọzụzụ atụrụ ahụ chọwa gị?—
Ònye dị ka onye ọzụzụ atụrụ ahụ nke napụtara atụrụ ya?
Onye ọzụzụ atụrụ ahụ hụrụ atụrụ ya nile n’anya nke ukwuu, ọbụna nke ahụ furu efu. Ya mere, ọ gara chọwa nke ahụ na-efu efu. Chee echiche ụdị obi ụtọ atụrụ ahụ furu efu na-aghaghị inweworị mgbe ọ hụrụ onye ọzụzụ atụrụ ahụ ka ọ na-abịa! Jizọs kwukwara na onye ọzụzụ atụrụ ahụ ṅụrịrị ọṅụ na ya achọtawo atụrụ ya. Ọ ṅụrịrị ọṅụ maka atụrụ ahụ karịa otú ọ ṅụrịrị maka atụrụ 99 ahụ na-efughị efu. Ònyezi dị ka onye ọzụzụ atụrụ ahụ Jizọs kọrọ akụkọ maka ya? Ònye na-elekọta anyị otú onye ọzụzụ atụrụ ahụ si lekọta atụrụ ya?— Jizọs sịrị na Nna ya nke nọ n’eluigwe na-elekọta anyị otú ahụ. Ọ bụkwa Jehova bụ Nna ya.
Jehova Chineke bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu nke ndị ya. Ọ hụrụ ndị nile na-ejere ya ozi n’anya, gụnyere ụmụaka dị ka gị. Ọ chọghị ka onye ọ bụla n’ime anyị merụọ ahụ́ ma ọ bụ ka anyị nwụọ. N’ezie, ọ bụ nnọọ ihe na-emesi obi ike ịmata na ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi nke ukwuu otú ahụ!—Matiu 18:12-14.
Jehova ọ̀ bụ onye dị adị n’ezie nye gị dị ka nna gị ma ọ bụ onye ọzọ dị adị nye gị?
Ì kwere n’ezie na Jehova Chineke?— Ọ̀ bụ onye dị adị n’ezie nye gị?— Ọ bụ eziokwu na anyị apụghị ịhụ Jehova anya. Ọ bụ n’ihi na ọ bụ Mmụọ. O nwere ahụ́ nke anyị na-apụghị ịhụ anya. Ma ọ bụ onye dị adị n’ezie, ọ pụkwara ịhụ anyị. Ọ ma mgbe anyị chọrọ enyemaka. Anyị pụkwara ịgwa ya okwu n’ekpere, otú anyị na-agwa onye ọzọ nọ n’ụwa okwu. Jehova chọrọ ka anyị na-eme nke a.
Ya mere, ọ bụrụ na ọ dị mgbe ọ bụla ị na-enweghị obi ụtọ ma ọ bụ nọrọ nanị gị, gịnị ka i kwesịrị ime?— Gwa Jehova okwu. Bịaruo ya nso, ọ ga-akasịkwa gị obi ma nyere gị aka. Cheta na Jehova hụrụ gị n’anya, ọbụna mgbe ị na-eche na ọ bụ nanị gị nọ. Ka anyị weta Bible anyị. N’ebe a n’Abụ Ọma nke 23, a gwara anyị, malite n’amaokwu nke 1, sị: “Jehova bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ; ọ dịghị ihe kọrọ m. N’ebe ịta nri nke ahịhịa ndụ ka Ọ na-eme ka m makpuru: n’akụkụ mmiri nke izu ike ka Ọ na-edu m nwayọọ.”
Rịba ama ihe onye dere ya kwukwasịrị, n’amaokwu nke 4: “A sị na ejee m ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwụ, m gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọ bụla; n’ihi na Gị onwe gị nọnyeere m: ndele Gị na mkpanaka Gị, ha onwe ha na-akasi m obi.” Nke a bụ mmetụta ndị mmadụ na-enwe mgbe ọ bụ Jehova bụ Chineke ha. Ha na-enweta nkasi obi mgbe ha nọ ná nsogbu. Ọ̀ na-adị gị otú ahụ?—
Dị ka onye ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya si elekọta ìgwè atụrụ ya, otú a ka Jehova si elekọta ndị ya nke ọma. Ọ na-egosi ha ụzọ ziri ezi ha ga-eso, ha na-ejikwa obi ụtọ na-eso ya. Ọbụna mgbe nsogbu gbara ha gburugburu, ọ dịghị mkpa ka ha tụọ egwu. Onye ọzụzụ atụrụ na-eji ndele ya ma ọ bụ mkpanaka ya echebe atụrụ ya pụọ n’aka anụ ọhịa ndị pụrụ imerụ ha ahụ́. Bible kọrọ otú onye ọzụzụ atụrụ ahụ na-eto eto, bụ́ Devid, si chebe atụrụ ya pụọ n’aka ọdụm na anụ ọhịa bea. (1 Samuel 17:34-36) Ndị Chineke makwaara na Jehova ga-echebekwa ha. Ha pụrụ inwe obi iru ala n’ihi na Chineke nọnyeere ha.
Dị ka onye ọzụzụ atụrụ nke na-echebe atụrụ ya, ònye pụrụ inyere anyị aka mgbe anyị nọ ná nsogbu?
Jehova hụrụ atụrụ ya n’anya n’ezie, ọ na-elekọtakwa ha n’ụzọ dị nro. Bible na-ekwu, sị: ‘Dị ka onye ọzụzụ atụrụ ka ọ ga na-edu atụrụ ya. Ọ ga-eji aka ya chịkọta ndị dị ntakịrị.’— Aịsaịa 40:11.
Ọ́ dịghị enye gị obi ụtọ ịmata na Jehova dị otú ahụ?— Ị̀ chọrọ ịbụ otu n’ime atụrụ ya?— Atụrụ na-ege ntị n’olu onye ọzụzụ atụrụ ha. Ha na-anọ ya nso. Ị̀ na-ege Jehova ntị?— Ị̀ na-anọ ya nso?— Ya bụrụ otú ahụ, ọ dịghị mkpa ka ị tụọ egwu ma ọlị. Jehova ga-anọnyere gị.
Jehova na-eji ịhụnanya na-elekọta ndị na-ejere ya ozi. Ka anyị gụkọọ ihe Bible kwuru banyere nke a ọnụ n’Abụ Ọma 37:25; 55:22; nakwa na Luk 12:29-31.