AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JỌN 9-10
Jizọs Na-elekọta Atụrụ Ya
Ihe na-eme ka onye ọzụzụ atụrụ na atụrụ ya dịrị ná mma bụ na ha maara ibe ha, tụkwasịkwa ibe ha obi. Jizọs, Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ ma atụrụ ya nke ọ bụla. Ọ ma mkpa ha, mara ebe ndị ha na-anaghị emecha nke ọma, marakwa ebe ha na-eme nke ọma. Atụrụ ya makwa ya nke ọma, tụkwasịkwa ya obi.
Olee otú Jizọs si bụrụ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma . . .
n’ịchịkọta atụrụ ya?
n’iduzi atụrụ ya?
n’ichebe atụrụ ya?
n’inye atụrụ ya nri?