Ụwa Ọhụrụ Dị Ka Nkwa Chineke Si Dị
BIBLE, bụ́ Okwu Chineke e dere ede, na-enye anyị olileanya mgbe o kwuru, sị: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ndị anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume gajekwa ibi n’ime ha.”—2 Pita 3:13.
Gịnị bụ “eluigwe ọhụrụ”? Bible na-ejikọta eluigwe na ịchịisi. (Ọrụ 7:49) “Eluigwe ọhụrụ” bụ ọchịchị ọhụrụ nke ga-achị ụwa. Ọ dị ọhụrụ n’ihi na ọ ga-anọchị usoro ọchịchị dị ugbu a; ọ bụkwa ihe ọhụrụ ná mmezu nke nzube Chineke. Ọ bụ ya bụ Alaeze ahụ Jizọs ziri anyị ikpe ekpere maka ya. (Matiu 6:10) Ebe Chineke bụ Isi Iyi ya ma biri n’eluigwe, a na-akpọ ya ‘alaeze nke eluigwe.’—Matiu 7:21.
Gịnị bụ “ụwa ọhụrụ”? Ọ bụghị mbara ụwa ọhụrụ, ebe ọ bụ na Bible kwuru n’ụzọ doro anya na a ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. “Ụwa ọhụrụ” bụ ọha mmadụ ọhụrụ. Ọ ga-adị ọhụrụ n’ihi na a ga-ebibiworị ndị ajọ omume. (Ilu 2:21, 22) Ndị nile ga-adị ndụ mgbe ahụ ga na-asọpụrụ ma na-erubere Onye Okike ahụ isi, ha ga na-ebikwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya. (Abụ Ọma 22:27) A na-akpọ ndị si ná mba nile òkù ịmụta ụkpụrụ ndị ahụ nakwa ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị ahụ ugbu a. Ị̀ na-eme nke ahụ?
N’ụwa ọhụrụ Chineke, mmadụ nile ga-akwanyere ịchịisi Ya ùgwù. Ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ ọ̀ na-akwali gị irubere ya isi? (1 Jọn 5:3) Nke ahụ ọ̀ na-apụta ìhè n’ebe obibi gị? n’ebe ị na-arụ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ? n’ụzọ ị na-esi eji ndụ gị eme ihe?
N’ụwa ọhụrụ ahụ, mmadụ nile ga-adị n’otu n’ofufe nke ezi Chineke ahụ. Ị̀ na-efe Onye Okike nke eluigwe na ala? Ofufe gị ọ̀ na-eme ka gị na ndị gị na ha na-efekọ ofufe, bụ́ ndị si ná mba nile, agbụrụ nile, asụsụ nile, dịrị n’otu n’ezie?—Abụ Ọma 86:9, 10; Aịsaịa 2:2-4; Zefanaịa 3:9.
[Igbe nke dị na peeji nke 17]
Chi nke Na-ekwe Ihe Ndị A ná Nkwa
Ọ bụ Onye Okike nke eluigwe anya na-ahụ na mbara Ụwa. Ọ bụ onye Jizọs Kraịst kọwara dị ka “nanị ezi Chineke ahụ.”—Jọn 17:3.
Ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ na-asọpụrụ chi ndị ha ji aka ha mee. Ọtụtụ nde mmadụ na-akpọ isiala nye ihe oyiyi ndị na-adịghị ndụ. Ndị ọzọ na-eto òtù ndị ụmụ mmadụ guzobere, echiche ịhụ ihe onwunwe n’anya, ma ọ bụ ọchịchọ onwe ha. Ọ bụghịdị ndị nile na-azọrọ na ha na-eji Bible eme ihe na-asọpụrụ aha onye ahụ Bible kpọrọ “[ezi] Chineke.”—Deuterọnọmi 4:35.
Banyere onwe ya, Onye Okike ahụ kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m.” (Aịsaịa 42:5, 8) Aha a pụtara ihe dị ka ugboro 7,000 n’ime Bible n’asụsụ ndị mbụ e ji dee ya. Jizọs Kraịst kụziiri ụmụazụ ya ikpe ekpere, sị: “Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.”—Matiu 6:9.
Olee ụdị onye Chineke bụ? Ọ na-akọwa onwe ya dị ka onye “nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu” nakwa dị ka onye na-adịghị ụzọ ọ bụla ọ ga-esi agụ ndị kpachaara anya mebie iwu ya dị ka ndị ikpe na-amaghị. (Ọpụpụ 34:6, 7) Akụkọ banyere otú o si mesoo ihe a kpọrọ mmadụ na-egosipụta izi ezi nke nkọwa ahụ e nyere ya.
A ga-edo ma aha ahụ ma onye aha ahụ na-anọchite anya ya nsọ, ma ọ bụ mesoo ha n’ụzọ na-egosi na ha dị nsọ. Dị ka Onye Okike na Eze Eluigwe na Ala, o kwesịrị ịnata nrubeisi na ofufe anyị nile. Ị̀ na-enye ya ihe ndị a n’onwe gị?
[Igbe na Ihe Osise nke dị na peeji nke 18]
Olee Mgbanwe Ndị “Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ” Ga-eweta?
E mee ka ụwa ghọọ Paradaịs Luk 23:43
Ọha mmadụ zuru ụwa ọnụ, bụ́ ebe Jọn 13:35;
ndị si ná mba nile, agbụrụ nile, Mkpughe 7:9, 10
asụsụ nile dị n’otu n’ịhụnanya
Udo zuru ụwa ọnụ, ezi ịnọ ná Abụ Ọma 37:10, 11;
ntụkwasị obi maka mmadụ nile Maịka 4:3, 4
Ọrụ na-enye afọ ojuju, Aịsaịa 25:6; 65:17, 21-23
ụbara ihe oriri
E kpochapụ ọrịa, iru újú na ọnwụ Aịsaịa 25:8; Mkpughe 21:1, 4
Ụwa nke dị n’otu Mkpughe 15:3, 4
n’ofufe nke ezi Chineke ahụ
[Igbe na Ihe Osise Ndị dị na peeji nke 19]
Ị̀ Ga-erite Uru?
Chineke apụghị ikwu okwu ụgha!—Taịtọs 1:2.
Jehova kwuru, sị: ‘Okwu m agaghị alaghachikwute m n’efu, ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mezuo ihe tọrọ m ụtọ, wee gaa nke ọma n’ihe M zigara ya.’—Aịsaịa 55:11.
Jehova ekewelarị “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” Ọchịchị eluigwe amalitelarị. A tọọlarị ntọala “ụwa ọhụrụ.”
Mgbe o kwusịrị banyere ụfọdụ n’ime ihe ndị dị ebube “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ, Mkpughe na-ehota Chineke n’onwe ya, bụ́ Eze Eluigwe na Ala, dị ka onye na-asị: “Lee! Ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.” Ọzọ, ọ na-asị: “Dee ha, n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi ma bụrụ eziokwu.”—Mkpughe 21:1, 5.
Ajụjụ dị mkpa bụ, Ànyị na-eme mgbanwe ndị dị mkpa iji bụrụ ndị a ga-agụ ná ndị kwesịrị ịbụ akụkụ nke “ụwa ọhụrụ” ahụ nke dị n’okpuru “eluigwe ọhụrụ” ahụ?