Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jd isi 2 p. 14-28
  • Ndị Amụma Ozi Ha Pụrụ Imetụta Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Amụma Ozi Ha Pụrụ Imetụta Anyị
  • Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỊ AMỤMA IRI NA ABỤỌ AHỤ NA OGE HA DỊRỊ NDỤ
  • MGBALỊ E MERE ỊNAPỤTA MBA NDỊ NA-AKPỌ EKWO NKỤ
  • ỊTỤ ANYA ỌDACHI NA-ABỊANỤ
  • HA NA-AKPALI AKPALI, NA-ENYE NKASI OBI, MA BỤRỤ IHE ỊDỌ AKA NÁ NTỊ
  • ỊTỤ ANYA MESAYA
  • Ụbọchị Jehova—Okwu Dị Oké Mkpa
    Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
  • Jehova—Chineke nke Na-ekwu Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu ma Mezuo Ya
    Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
  • “Kpọsaanụ n’Etiti Mba Dị Iche Iche”
    Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
  • Ndị Eze Ọma na Ndị Eze Ọjọọ
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
jd isi 2 p. 14-28

ISI NKE ABỤỌ

Ndị Amụma Ozi Ha Pụrụ Imetụta Anyị

1. N’ihi gịnị ka i kwesịrị iji nwee mmasị n’ebe ndị amụma iri na abụọ ahụ nọ, bụ́ ndị dere akwụkwọ ndị ikpeazụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru?

Ị̀ GA-ACHỌ ịmata mmadụ iri na abụọ bụ́ ndị ozi Chineke? Mmadụ iri na abụọ a anyị na-ekwu okwu ha dịrị ndụ tupu Jizọs abịa n’ụwa. Ya mere, ị pụghị ịhụ ha ihu na ihu. Ma, ị pụrụ ịmata ha, matakwa otú ha si buru “oké ụbọchị Jehova” n’uche. Ihe ị ga-amụta dị Onye Kraịst ọ bụla nke ji amamihe na-agbalịsi ike ịnọgide na-eburu oké ụbọchị Jehova n’uche oké mkpa n’ezie.—Zefanaya 1:14; 2 Pita 3:12.

2, 3. Olee otú ihe anyị na-ahụ taa si yie ihe ndị amụma iri na abụọ ahụ hụrụ n’oge ha?

2 N’ime Akwụkwọ Nsọ, e nwere ọtụtụ ndị ikom a kpọrọ ndị amụma—ọtụtụ akwụkwọ Baịbụl na-aza aha ndị amụma. Dịkwa ka ọ dị banyere ndị amụma ndị ọzọ, ndị ikom iri na abụọ a anyị ga-atụle banyere ha bụ ezi ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi na obi ike. Ụfọdụ n’ime ha nwere nnọọ obi ụtọ ịhụ ka ozi ha kwusara mere ka ndị mmadụ gbanwee obi ha na uche ha ma mee ka ha laghachikwute Chineke. Ndị ọzọ nwere nkụda mmụọ dị ukwuu ịhụ ka ndị nnupụisi nọ na-emebi ụkpụrụ Jehova ma na-eme ihe na-abụghị uche ya. Ụfọdụ n’ime mmadụ iri na abụọ a nwere nkụda mmụọ ịhụ ka ndị na-ekwu na ha na-efe Jehova na-eme omume ọ̀ gbasara m ma na-eme ihe ọ bụla na-agụ ha.

Chaati dị na peeji nke 20 na 21

3 Dị nnọọ ka anyị, ndị amụma iri na abụọ a dịrị ndụ n’oge e nwere ọgba aghara ọchịchị, nsogbu obodo, nakwa n’oge okpukpe dakpọrọ adakpọ. Ebe ha bụ ndị ikom “nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe,” o doro anya na ha nwere ihe ndị tụrụ ha egwu, nweekwa ihe ịma aka dị iche iche. (Jems 5:17) N’agbanyeghị nke ahụ, ha setịpụụrụ anyị ezi ihe nlereanya, anyị kwesịkwara ịdị na-echeta ozi ha, ebe ọ bụ na e dekọrọ ha “n’amụma ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ” maka abamuru anyị, bụ́ “ndị ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị a bịakwasịworo.”—Ndị Rom 15:4; 16:26; 1 Ndị Kọrịnt 10:11.

NDỊ AMỤMA IRI NA ABỤỌ AHỤ NA OGE HA DỊRỊ NDỤ

Map dị na peeji nke 19

4. Gịnị ka ị chọpụtaworo banyere oge ndị amụma iri na abụọ ahụ dịgasịrị ndụ, oleekwa ndị nke Jehova bu ụzọ họpụta ka ha dọọ ndị ya aka ná ntị ma gbaa ha ume?

4 Ị pụrụ iche na usoro e ji depụta akwụkwọ Hosia ruo Malakaị n’ime Baịbụl gị na-egosi oge ndị amụma ndị a dịgasịrị ndụ. Ọ bụghị otú ahụ. Dị ka ihe atụ, ndị amụma bụ́ Jona, Joel, Emọs, Hosia, na Maịka dịrị ndụ na narị afọ nke itoolu nakwa na narị afọ nke asatọ T.O.A.a N’oge ahụ, ọtụtụ ndị eze ndị chịrị ma n’alaeze ebe ndịda nke Juda ma n’alaeze ebe ugwu nke Izrel ekwesịghị ntụkwasị obi. Ndị ha chịrị gbasoro ihe nlereanya ha, nke ahụ mekwara ka Chineke weso ha iwe. Ọ bụ n’oge a ka ndị Asiria chọrọ ịchị ụwa. E mesịa, ndị Babịlọn achọọkwa ịchị. Ndị Izrel amaghị na Jehova ga-eji mba abụọ ndị a chịrị ụwa mezuo ihe o kpere n’ikpe! Otú ọ dị, ị manụ na Chineke si n’ọnụ ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi dọọ Izrel na Juda aka ná ntị ugboro ugboro.

5. Olee ndị amụma kwusara ikpe Jehova mgbe Juda na Jeruselem na-eche mbibi ihu?

5 Ka oge Jehova ga-ama Juda na Jeruselem ikpe na-eru nso, o nyere ha ndị amụma ndị ọzọ dị ike, ndị bụ́ ọnụ na-ekwuru ya. Olee ndị bụ́ ndị amụma a? Ha bụ ndị amụma bụ́ Zefanaya, Nehọm, Habakọk na Obedaya. Ha niile buru amụma na narị afọ nke asaa T.O.A. Ọdachi kasị njọ nke mere n’oge ahụ bụ mbibi ndị Babịlọn bibiri Jeruselem n’afọ 607 T.O.A. nakwa ndọrọ a dọọrọ ndị Juu n’agha. O mezukwara dị nnọọ ka Chineke dọrọ ha aka ná ntị n’amụma ndị o buru site n’ọnụ ụfọdụ n’ime ndị ikom ndị a o zipụrụ ka ha gwa ha ihe o kwuru. Ha gbalịrị ime ka ndị ahụ mara ihe ndị bụ́ omume ọjọọ, dị ka ịṅụbiga mmanya ókè na ime ihe ike, ma ha achọghị ịgbanwe.—Habakọk 1:2, 5-7; 2:15-17; Zefanaya 1:12, 13.

6. Olee otú Jehova si gbaa ndị Izrel ahụ si n’ebe a dọọrọ ha n’agha laa lọta ume?

6 Ndị ndú ruru eru na nkasi obi nakwa ndụmọdụ nke ga-eme ka ha nọgide na-efe Chineke dị ndị Chineke mkpa mgbe ha si n’ebe a dọọrọ ha n’agha laa lọta. Ìgwè ndị amụma ọzọ—Hagaị, Zekaraya, na Malakaị—gboro mkpa ahụ. Ha jere ozi na narị afọ nke isii na nke ise T.O.A. Ka ị na-amatakwu ihe banyere mmadụ iri na abụọ a ndị kwadosiri oruru o ruuru Jehova ịbụ eze ike, na-amatakwukwa ọrụ ha rụrụ, ị ga-amụta ihe ndị dị mkpa ị pụrụ itinye n’ọrụ n’ozi gị n’oge anyị a dị ize ndụ. Ugbu a, ka anyị tụlee banyere ndị amụma ndị a, dabere n’oge ha jere ozi.

MGBALỊ E MERE ỊNAPỤTA MBA NDỊ NA-AKPỌ EKWO NKỤ

Ihe Osise dị na peeji nke 17

7, 8. Olee otú ihe mere Jona pụrụ isi bụụrụ anyị ihe agbamume iji merie enweghị obi ike?

7 Ọ̀ dịtụla mgbe ị na-enwechaghị obi ike, ma eleghị anya na-eche na okwukwe gị esikwaghị ike? Ya bụrụ otú ahụ, ihe mere Jona ga-abara gị uru nke ukwuu. Jona dịrị ndụ na narị afọ nke itoolu T.O.A. Ikekwe, ị maara na Chineke gwara Jona ka ọ gaa Ninive, bụ́ isi obodo Alaeze Ukwu Asiria nke ka na-ebilite ebilite. Ọrụ e nyere Jona bụ ịga gwa ndị Ninive ka ha kwụsị ajọ omume ha. Otú ọ dị, kama ịgawa ebe a gwara ya ka ọ gaa—ebe dị ihe dị ka narị kilomita itoolu n’akụkụ ọwụwa anyanwụ, n’ebe ugwu Jeruselem—Jona banyere ụgbọ mmiri nke na-aga n’otu ọdụ ụgbọ mmiri nke dị na Spen, ma eleghị anya. O tinyere isi n’ebe ọzọ, gawa ebe dị puku kilomita atọ na narị ise! Olee ihe i chere? Ọ̀ bụ egwu mere Jona ji gbaa ọsọ, ka ọ̀ bụ na o nweghị okwukwe mgbe ahụ? Ka ọ̀ bụ n’ihi na ọ na-ewe iwe na ndị Ninive nwere ike ichegharị wee bịa lụso ụmụ Izrel ọgụ mgbe e mesịrị? Baịbụl agwaghị anyị kpọmkwem ihe merenụ. Otú ọ dị, anyị ahụla ihe mere o ji dị mkpa ka anyị kpachara anya wee ghara ikwe ka echiche anyị gaa n’ihe na-ekwesịghị ekwesị.

8 Ị manụ ihe Jona mere mgbe Chineke baara ya mba. Mgbe Jona nọ n’afọ “otu nnukwu azụ̀” nke loro ya, o kwuru, sị: “Ọ bụ Jehova nwe nzọpụta.” (Jona 1:17; 2:1, 2, 9) Ozugbo e ji ọrụ ebube napụta Jona, ọ rụrụ ọrụ e nyere ya. Ma o wutere ya nke ukwuu mgbe Jehova na-ebibighị ndị Ninive n’ihi na ha ṅara ntị n’ozi Jona zisara wee chegharịa. Jehova ji ịhụnanya gbazie onye amụma ahụ ọzọ, bụ́ onye chere echiche banyere onwe ya naanị. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị pụrụ ilekwasị anya ná mmejọ Jona, Chineke weere ya dị ka ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi, nke na-erube isi.—Luk 11:29.

Ihe Osise dị na peeji nke 18

9. Olee uru ndị ị pụrụ irite n’ozi Joel ziri nke bụ́ amụma?

9 Ì nwetụwo nkụda mmụọ mgbe ndị mmadụ katọrọ ozi ị na-ezisa bụ́ nke si na Baịbụl, na-ekwu na ọ bụ imenye ndị mmadụ ụjọ? Ọ bụ otú ahụ ka ndị obodo Joel onye amụma, onye aha ya pụtara “Jehova bụ Chineke,” si were ozi ya. O yiri ka ọ̀ nọ na Juda dee amụma ya n’ihe dị ka n’afọ 820 T.O.A., n’oge Eze Ọzaya na-achị. O yiri ka Joel ọ̀ malitere ije ozi mgbe ozi Jona na-eru ná njedebe. Joel kwuru okwu banyere ìgwè igurube na-ebibi ihe nke ga-enubata ugboro ugboro iji bibie ala ahụ. Ee, ụbọchị dị egwu nke Chineke dị nso. Otú ọ dị, ị ga-ahụ na ọ bụghị naanị ozi banyere mbibi ka Joel ziri. Ọ bụkwa ihe na-agba ume ịhụ na o kwuru na ndị kwesịrị ntụkwasị obi ‘ga-abụ ndị gbapụrụ agbapụ.’ (Joel 2:32) Ndị chegharịrị ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi ngọzi Jehova nakwa n’ihi ịbụ ndị ọ gbaghaara mmehie ha. Lee ka o kwesịrị isi mesie anyị obi ike iburu n’uche na nke ahụ sokwa n’ozi anyị na-ezisa! Joel buru amụma na a ga-awụkwasị “ụdị anụ ahụ́ ọ bụla” mmụọ nsọ Chineke, ya bụ, ike ya nọ n’ọrụ. Ị̀ hụrụ otú amụma ahụ si gbasa gị? Joel mekwara ka otu ụzọ e ji n’aka e si enweta nzọpụta pụta ìhè: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova ga-alanahụ.”—Joel 2:28, 32.

Ihe Osise dị na peeji nke 18

10. Olee otú Jehova si jiri onye ọrụ ngo nkịtị mee ihe?

10 Ị pụrụ ịghọta ọnọdụ Emọs ma ọ bụrụ na otú ozi anyị na-ezisa dịruru mkpa na-emetụ gị n’ahụ́ mgbe ụfọdụ, ya bụ, ozi anyị na-ezisara ndị na-achọghị ịnụ ya. Emọs abụghị nwa onye amụma, o soghịkwa ná ndị amụma; ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ, ọ na-arụkwa ọrụ ngo ma oge ruo. O buru amụma n’oge Eze Ọzaya nke Juda na-achị, ná ngwụsị narị afọ nke itoolu T.O.A. N’agbanyeghị na Emọs (onye aha ya pụtara “Ịbụ Ibu; Ibu Ibu”) si n’ezinụlọ dara ogbenye, e ziri ya ozi dị oké mkpa ọ ga-ezi Juda, Izrel, na mba ndị gbara ha gburugburu. Ọ́ dịghị agba gị ume ịmara na Jehova pụrụ iji onye nkịtị rụọ nnukwu ọrụ dị otú ahụ?

Ihe Osise dị na peeji nke 21

11. Olee otú Hosia dịruru njikere ime uche Chineke?

11 Ị̀ jụtụwo onwe gị, sị: ‘Olee àjà ndị m ga-adị njikere ịchụ ka m wee mee uche Jehova?’ Cheedị echiche banyere Hosia, onye dịrị ndụ n’ihe dị ka n’oge Aịzaya na Maịka dịrị ndụ, onye jekwara ozi dị ka onye amụma ruo ihe dị ka afọ iri isii. Jehova gwara Hosia ka ọ lụọ Goma, bụ́ “nwaanyị nke ga-akwa iko.” (Hosia 1:2) N’ime ụmụ atọ Goma mesịrị mụọ, o yiri ka ọ̀ bụ naanị otu bụ nwa Hosia. Gịnị mere Jehova ga-eji gwa mmadụ ka o die mmechuihu nke inwe di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko na-eweta? Jehova ji ya akụziri anyị iguzosi ike n’ihe na ịgbaghara mmehie. Alaeze ebe ugwu ahụ ahapụwo Chineke, dị nnọọ ka nwaanyị na-akwa iko si ahapụ di ya. Ma, Jehova ga-egosi ndị ya ịhụnanya ma gbalịa inyere ha aka ka ha chegharịa. Ịmụ banyere nke ahụ na-enye anyị obi ụtọ.

Ihe Osise dị na peeji nke 22

12. Olee otú ị pụrụ isi rite uru n’ịtụle ihe nlereanya Maịka na n’ihe amụma ndị o buru rụpụtara?

12 Ọ̀ bụ na i kwetaghị na oge a nke dị oké egwu na-eme ka o siere gị ike inwe nkwuwa okwu na ịdabere kpamkpam n’ebe Jehova nọ? Ọ bụrụ na i nwee àgwà ndị a, ị ga-adị ka Maịka. Maịka, bụ́ onye ya na Hosia na Aịzaya dịkọrọ ndụ, kwupụtara ozi e ziri ya banyere ihe a ga-eme mba Juda na Izrel n’oge ọchịchị nke ndị eze Juda bụ́ Eze Jotam, Ehaz, na Hezekaya na narị afọ nke asatọ T.O.A. Omume rụrụ arụ na ikpere arụsị jọgburu onwe ya metọrọ alaeze ebe ugwu nke Izrel, e bibikwara ya mgbe Asiria meriri Sameria n’afọ 740 T.O.A. Juda na-erubere Jehova isi mgbe ụfọdụ. N’oge ndị ọzọ, ha adịghị ekwesị ntụkwasị obi. N’agbanyeghị ebelebe gaje igbu, Maịka nwetara nkasi obi mgbe ọ hụrụ na ozi ahụ o ziri nke si n’aka Chineke mere ka Juda kwụsịtụ imikpu onwe ha ná mmerụ ime mmụọ, ka ọdachi wee ghara ịdakwasị ha mgbe ahụ. Lee ka o si akasi anyị obi ịhụ na ụfọdụ ndị na-ege ntị n’ozi nzọpụta anyị na-ekwusa!

ỊTỤ ANYA ỌDACHI NA-ABỊANỤ

13, 14. (a) Olee otú ihe nlereanya Zefanaya pụrụ isi nyere gị aka n’ofufe ị na-efe Chineke? (b) Olee mgbanwe ọrụ Zefanaya rụrụ nyere aka mee ka e nwee n’ihe banyere ofufe?

13 Ka ikike nke mba ndị chịrị ụwa bụ́ Ijipt na Asiria na-ebelata, Babịlọn nọ na-adịwanye ike. N’oge na-adịghị anya, mbilite ọ ga-ebilite ga-enwe mmetụta dị ukwuu ná mba Juda. E nwere ndị amụma Chineke bụ́ ndị ga na-adọ ndị na-efe Jehova ofufe aka ná ntị ma na-adụ ha ọdụ. Chee echiche banyere ụfọdụ n’ime ndị amụma ahụ, burukwa n’uche na Ndị Kraịst na-ekwusakwa ozi ịdọ aka ná ntị taa.

Map dị na peeji nke 22
Ihe Osise dị na peeji nke 23

14 Ọ bụrụ na ọ dịtụla mgbe ị hapụrụ iso ezinụlọ gị mee ihe ha na-eme n’ihi na ị chọrọ ime uche Jehova, ị pụrụ ịghọta ihe mere Zefanaya. Ọ pụrụ ịbụ na Zefanaya bụ nwa nwa nke nwa Eze Hezekaya, bụrụkwa onye ikwu Eze Josaya, wee si otú a bụrụ onye si n’ezinụlọ nke ndị eze Juda. N’agbanyeghị nke ahụ, Zefanaya ji nrubeisi zie ozi ikpe ọmụma megide ndị ndú Juda, bụ́ ndị na-eme omume rụrụ arụ. Aha ya pụtara “Jehova Ezochiwo.” O mesiri ya ike na a pụrụ ‘izobe mmadụ n’ụbọchị iwe Jehova’ naanị site n’ebere Chineke. (Zefanaya 2:3) Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịmara na ozi Zefanaya ji obi ike zisaa rụpụtara ihe. Eze Josaya bụ́ onye ka na-eto eto mere ka e nwee mgbanwe ụfọdụ n’ihe banyere ofufe. O kpochapụrụ arụsị niile, rụzie ụlọ nsọ ahụ, meekwa ka a maliteghachi ofufe dị ọcha. (2 Ndị Eze, isi nke 22-23) Ọ ghaghị ịbụ na Zefanaya na ndị amụma ibe ya (Nehọm, Habakọk, na Jeremaya) na-enyere eze aka ma ọ bụ na-enye ya ndụmọdụ. N’ụzọ dị mwute, nchegharị nke ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu chegharịrị esighị ha n’obi. Mgbe Josaya nwụrụ n’agha, ha maliteghachiri ikpere arụsị. Afọ ole na ole mgbe e mesịrị, a dọọrọ ha n’agha laa Babịlọn.

Ihe Osise dị na peeji nke 24

15. (a) Gịnị mere ozi ikpe ọmụma Nehọm ziri ji kwesị Ninive? (b) Gịnị ka ị pụrụ ịmụta n’ihe mere Ninive?

15 Ị pụrụ iche na o nweghị uru ị bara, na ọ dịghị onye ma gị. Ndị Kraịst nwere ihe ùgwù dị ukwuu nke ịbụ ndị ha na Chineke “na-arụkọ ọrụ,” ma ihe ka ọtụtụ n’ime ha abụchaghị ndị a ma ama. (1 Ndị Kọrịnt 3:9) N’otu aka ahụ, ọ dịghị ihe ọ bụla anyị maara banyere onye amụma bụ́ Nehọm ma e wezụga na o si n’obodo nta a na-akpọ Elkọsh, nke dị na Juda ma eleghị anya. Otú ọ dị, ozi ya dị oké mkpa. N’ihi gịnị? Nehọm buru amụma ihe a ga-eme isi obodo Alaeze Ukwu Asiria, bụ́ Ninive. Ndị bi na ya gere ntị n’ihe Jona kwuru. Ma mgbe ntakịrị oge gasịrị, ha laghachiri n’omume mbụ ha. Nkume a tụrụ ihe na ha, bụ́ ndị e si n’ebe Ninive oge ochie dị weta, na-egosi na ọ bụ “obodo na-awụfu ọbara,” dị ka Nehọm kwuru. (Nehọm 3:1) Ihe ndị ahụ a tụrụ atụ́ na-egosi mmeso obi ọjọọ ha na-emeso ndị ha dọọrọ n’agha. Nehọm buru amụma n’ụzọ doro anya banyere mbibi a ga-ebibi Ninive kpamkpam. Ihe o kwuru mezuru, dịkwa ka ozi anyị na-ezisa taa ga-emezu.

Ihe Osise dị na peeji nke 25

16, 17. Ọ bụrụ na ihe anyị na-atụ anya ya banyere mgbe ọgwụgwụ emezuchabeghị, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’ihe banyere Habakọk?

16 Na narị afọ ndị gafeworonụ, ụfọdụ ndị na-agụ Baịbụl enwewo atụmanya na-emezughị emezu banyere ụbọchị Jehova. Ike pụrụ ịgwụ ndị ọzọ n’ihi na o yiri ka ikpe Chineke ọ̀ na-egbu oge. Gịnị ka i chere? Habakọk kwupụtara ihe na-echegbu ya, bụ́ nke kwere nghọta. Ọ jụrụ, sị: “Jehova, ruo ole mgbe ka m ga na-eti mkpu enyemaka, ma ị dịghị anụ ya? . . . Gịnị mere e ji na-ebukọrọ ihe ndị mmadụ, na-emekwa ihe ike n’ihu m?”—Habakọk 1:2, 3.

17 Habakọk buru amụma n’oge e nwere nnukwu nsogbu na Juda, mgbe ezigbo Eze Josaya chịsịrị. O bukwara amụma tupu e bibie Jeruselem n’afọ 607 T.O.A. Ikpe na-ezighị ezi na ime ihe ike jupụtara ebe niile. Habakọk dọrọ aka ná ntị na ịdụnyere Ijipt úkwù agaghị azọpụta ndị Juda n’aka ndị Babịlọn ndị ịwụfu ọbara na-agụ agụụ. Otú o si dee amụma ya doro anya ma na-akpali akpali. O kwukwara ihe na-enye nkasi obi nke bụ́ na “onye ezi omume ga-esi n’ikwesị ntụkwasị obi ya dị ndụ.” (Habakọk 2:4) Anyị aghaghị iwere okwu ndị ahụ dị ka ndị dị nnọọ mkpa, ebe ọ bụ na Pọl onyeozi kwughachiri ha n’akwụkwọ atọ so n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. (Ndị Rom 1:17; Ndị Galeshia 3:11; Ndị Hibru 10:38) Ọzọkwa, site n’ọnụ Habakọk, Jehova gwara anyị okwu na-emesi obi ike, sị: “Ọhụụ a bụ maka oge a kara aka . . . Ọ gaghị anọ ọdụ.”—Habakọk 2:3.

Ihe Osise dị na peeji nke 25

18. Gịnị mere Jehova ji gwa Obedaya ka o buo amụma ihe a ga-eme Idọm?

18 A ma Obedaya onye amụma dị ka onye dere akwụkwọ kasị nta n’Akwụkwọ Nsọ Hibru—o nwere naanị amaokwu iri abụọ na otu. Naanị ihe anyị maara banyere ya bụ na o buru amụma ihe a ga-eme Idọm. Ndị Idọm bụ ụmụ nwanne Jekọb. Ya mere, ha bụ ‘ụmụnne’ ndị Izrel. (Diuterọnọmi 23:7) Ma, ndị Idọm emesoghị ndị Chineke dị ka ụmụnne ha. N’afọ 607 T.O.A., ihe dị ka n’otu oge ahụ Obedaya dere akwụkwọ ya, ha nọchiiri ndị Juu ụzọ ma na-enyefe ndị nke na-agbapụ agbapụ n’aka ndị iro ha bụ́ ndị Babịlọn. Jehova buru amụma na a ga-ebibi Idọm kpamkpam, amụma ahụ mezukwara. Dị nnọọ ka anyị na-amachaghị banyere Nehọm, anyị amachaghị banyere Obedaya. Ma lee ka o si bụrụ ihe na-agba ume ịmara na Chineke pụrụ iji ndị yiri ka ò nweghị ihe ha bụ mere ndị ozi Ya!—1 Ndị Kọrịnt 1:26-29.

HA NA-AKPALI AKPALI, NA-ENYE NKASI OBI, MA BỤRỤ IHE ỊDỌ AKA NÁ NTỊ

Ihe Osise dị na peeji nke 26

19. Olee otú Hagaị si nye aka mee ka ndị Chineke dị ike?

19 Hagaị bụ onye mbụ n’ime ndị amụma atọ jere ozi mgbe ndị fọdụrụ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, si n’ebe a dọọrọ ha n’agha laa na Babịlọn, lọta n’afọ 537 T.O.A. O nwere ike ịbụ na Hagaị so ná ndị mbụ lọtara. Hagaị na Gọvanọ Zerọbabel na Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Jọshụa nakwa Zekaraya onye amụma gbalịrị ime ka ndị Juu ghara ikwe ka ndị mmegide bụ́ ndị mba ọzọ, tinyere àgwà achọghị ịma ha nwere n’ihi ịhụ ihe onwunwe n’anya, merie ha. Ọ dị mkpa ka ha mezuo ihe ha ji maka ya lọta: iwughachi ụlọ nsọ Jehova. Ozi anọ Hagaị ziri n’ezoghị ọnụ n’afọ 520 T.O.A. mesiri aha Jehova na oruru o ruuru Ya ịbụ eze ike. Ka ị na-agụ akwụkwọ ahụ, ị ga-ahụ okwu bụ́, “Jehova nke ụsụụ ndị agha” ugboro iri na anọ. Ozi siri ike nke Hagaị ziri kpaliri ndị ahụ ịmaliteghachi ọrụ iwu ụlọ nsọ ahụ. Ọ̀ bụ na ịmara na Jehova nwere ike a na-akparaghị ókè dị ka Eze Na-achị Isi, nweekwa ụsụụ ndị mmụọ ozi nọ n’okpuru ya, adịghị eme n’otu aka ahụ ka ị dị ike?—Aịzaya 1:24; Jeremaya 32:17, 18.

Ihe Osise dị na peeji nke 27

20. Olee àgwà jupụtara ebe niile nke Zekaraya gbasoro mgba?

20 Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ inwe nkụda obi n’ihi na ụfọdụ ndị na-ejere Chineke ozi enwekwaghị ịnụ ọkụ n’obi. Ya bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ịghọta ọnọdụ Zekaraya. Dị ka Hagaị, bụ́ onye ya na ya dịkọrọ ndụ, Zekaraya nwere ọrụ siri ike nke bụ́ ịkpali ndị ya na ha fekọrọ ofufe ka ha nọgide na-arụ ọrụ ruo mgbe e wusịrị ụlọ nsọ ahụ. Zekaraya gbalịsiri ike ịgba ụmụ Izrel ume ịrụ ọrụ ahụ nke bụ́ nnukwute ọrụ. N’agbanyeghị na ndị gbara ya gburugburu na-eme ihe ọ bụla nke na-agụ ha, ọ gbalịsiri ike ime ka ndị mmadụ nwee okwukwe siri ike na ịrụ ọrụ kwekọrọ na ya. O nwekwara ihe ịga nke ọma. Zekaraya dekọrọ ọtụtụ amụma banyere Kraịst. Anyị onwe anyị kwa pụrụ inweta ume n’ozi ahụ bụ́ na “Jehova nke ụsụụ ndị agha” agaghị echefu ndị na-achọ inweta ihu ọma ya.—Zekaraya 1:3.

ỊTỤ ANYA MESAYA

Ihe Osise dị na peeji nke 27

21. (a) N’ihi gịnị ka ozi Malakaị ji dị oké mkpa? (b) Olee okwu na-emesi obi ike nke akwụkwọ Malakaị ji mechie Akwụkwọ Nsọ Hibru?

21 Onye ikpeazụ ná ndị amụma iri na abụọ ahụ, bụ́ Malakaị, biri ndụ kwekọrọ n’aha ya, nke pụtara “Onye Ozi M.” Anyị amachaghị banyere onye amụma a, bụ́ onye dịrị ndụ n’etiti narị afọ nke ise T.O.A. Otú ọ dị, site n’amụma o buru, anyị maara na ọ bụ nwoke na-ekwu okwu n’atụghị egwu, onye baara ndị Chineke mba maka mmehie ha na omume ihu abụọ ha. Ọnọdụ ndị Malakaị kọwara yiri nnọọ ndị ahụ Nehemaya, bụ́ onye o yiri ka ya na Malakaị dịkọrọ ndụ, kwuru maka ha. N’ihi gịnị ka ozi Malakaị ji dị oké mkpa? Ịnụ ọkụ n’obi ahụ nke ndị amụma bụ́ Zekaraya na Hagaị mere ka e nwee n’iri afọ ole na ole gara aga adịkwaghị. Ọnọdụ ime mmụọ nke ndị Juu dị nnọọ njọ. Malakaị ji obi ike katọọ ndị nchụàjà dị mpako, ndị dịkwa ihu abụọ, katọọkwa ofufe ụmụ Izrel na-ejighị obi ha dum na-efe Chineke nakwa àjà ha na-achụ. N’agbanyeghị nke ahụ, dị nnọọ ka Okwu Chineke na-emesi anyị obi ike na a ga-enwe ọdịnihu mara mma, Malakaị buru amụma banyere ọbịbịa nke onye ahụ nke ga-abịa tupu Mesaya, ya bụ, Jọn Onye Na-eme Baptizim. O bukwara amụma na mgbe ọ bịasịrị, Kraịst n’onwe ya ga-abịa. Ozi Malakaị ji okwu ndị na-agba ume mechie Akwụkwọ Nsọ Hibru. O kwere anyị nkwa na ‘anyanwụ nke ezi omume ga-awakwasị’ ndị na-atụ egwu aha Chineke.—Malakaị 4:2, 5, 6.

22. Olee ihe ndị ị chọpụtara banyere ụdị mmadụ ndị amụma iri na abụọ ahụ bụ nakwa banyere ozi ha?

22 Ị hụlanụ na ndị ikom ndị dere akwụkwọ iri na abụọ ikpeazụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru nwere okwukwe na nkwenye siri ike. (Ndị Hibru 11:32; 12:1) Ihe nlereanya ha na ozi ha jere pụrụ ịkụziri anyị ihe ndị bara uru ka anyị na-atụsi anya “ụbọchị Jehova” ike. (2 Pita 3:10) Tụlezie ụzọ ozi ndị a bụ́ amụma pụrụ isi metụta ọdịnihu gị ruo mgbe ebighị ebi!

a Lee anya n’ebe ahụ e depụtara oge dị iche iche na peeji nke iri abụọ na nke iri abụọ na otu. Dị ka ihe atụ, ị ga-ahụ na Maịka na Hosia jere ozi n’oge Aịzaya bụ onye amụma Chineke na Jeruselem.

OLEE OTÚ Ị PỤRỤ ISI RITE URU?

  • Gịnị ka ị chọpụtara banyere usoro e ji depụta akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ n’ime Baịbụl?

  • Olee otú ị pụrụ isi rite uru n’ahụmahụ nke ndị amụma dị ka Jona na Emọs? —Ndị Hibru 11:32, 33, 39, 40.

  • Olee otú Hosia dịruru njikere ime uche Jehova?—Matiu 16:24.

IHE NDỊ Ị PỤRỤ IJI MEE IHE

  • Dị ka e kwuru banyere Zefanaya, mmetụta dị aṅaa ka ndị ohu Chineke pụrụ inwe n’ahụ́ ndị ọzọ?

  • N’ihi gịnị ka ozi Habakọk ji daba adaba n’oge a karịsịa?—2 Pita 3:12.

  • Olee otú ihe banyere ụfọdụ n’ime ndị amụma ahụ si egosipụta amara Jehova na-emere ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha?—Abụ Ọma 113:1, 6, 7; Aịzaya 57:15.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya