NKEBI NKE ATỌ
Na-eme Ihe Na-amasị Chineke Site n’Àgwà Gị na Omume Gị
Olee otú ị ga-esi zaa ajụjụ bụ́ “Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị?” (Maịka 6:8) Akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere na-enyere anyị aka ịghọta nke a. Dị ka ị ga-ahụ n’Isi nke Asatọ ruo n’Isi nke Iri n’akwụkwọ a, akwụkwọ ndị ahụ ha dere pụrụ inyere gị aka imeri ihe ịma aka ndị dị ka otú ị ga-esi na-ekwu eziokwu n’ihe niile ị na-ekwu nakwa otú ị ga-esi zere ime ihe ike. Ị ga-ahụkwa ndụmọdụ bara uru ha nyere banyere ndụ ezinụlọ, bụ́ ndụmọdụ ị pụrụ iji mee ihe ma eleghị anya.