Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ
1 “Oké ụbọchị Jehova dị nso. Ọ dị nso, o jikwa oké ọsọ na-abịa.” (Zef. 1:14) Zefanaya na ndị amụma iri na otu ndị ọzọ a na-akpọ Obere Ndị Amụma bu ụbọchị Jehova n’uche bie ndụ ha. Iji akwụkwọ Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ tụlee ihe ndị ha si n’ike mmụọ nsọ dee n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ anyị ga-enyere anyị aka ịkwado maka ụbọchị ahụ dị egwu.—Zef. 2:2, 3.
2 Ihe Ndị Pụrụ Iche Dị n’Akwụkwọ Ahụ: Kama ilekwasị anya n’ihe ihe dị n’akwụkwọ amụma iri na abụọ a pụtara n’ụzọ ihe atụ ma ọ bụkwanụ ịkọwa ha n’amaokwu n’amaokwu, akwụkwọ Ụbọchị Jehova kọwara otú akwụkwọ ndị a e dere n’ike mmụọ nsọ si emetụta ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. O mere ka anyị ghọta ihe mere mkpebi anyị na àgwà anyị kwesịrị iji gosi na anyị maara na ụbọchị Jehova dị ezigbo nso. O kwuru banyere ndụ ezinụlọ, otú anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị ga-esi na-emekọrịta ihe, ntụrụndụ ndị anyị ga-ahọrọ, ozi ndị Kraịst anyị, nakwa ọrụ ego ndị anyị ga-ahọrọ ịrụ.
3 Nkebi nke 1 nke akwụkwọ ahụ gwara anyị banyere ndị amụma iri na abụọ ahụ na ihe ndị ha dere. Olee ndị ha bụ? Olee otú ọnọdụ anyị na ha si yie? Nkebi nke 2 kwuru banyere Jehova na àgwà ya. Olee otú ndị amụma ahụ si mee ka anyị ghọtakwuo Jehova na àgwà ya nke ọma? Nkebi nke 3 kwuru banyere àgwà anyị na otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ ihe. Olee ihe ndị anyị nwere ike ịdị na-eme kwa ụbọchị iji mee Chineke obi ụtọ? Nkebi nke 4 kwuru otú anyị ga-esi na-enwe ọṅụ ka anyị na-atụ anya ụbọchị Jehova.
4 Mee Atụmatụ Ugbu A Irite Uru: Kpebie ugbu a irite uru zuru ezu mgbe a ga-amụ akwụkwọ Ụbọchị Jehova, nke ga-amalite n’izu nke August 4, 2008! Gbalịa ịga Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kwa izu. Kwadebe ihe ọmụmụ nke ọ bụla nke ọma, na-agụ amaokwu Baịbụl ndị dị na ya iji hụ otú ha si gbasa ihe a ga-amụ. Tụgharịa uche n’ihe ndị ị mụtara site n’ịjụ onwe gị, sị, ‘Olee otú m nwere ike isi mee ihe ndị e kwuru ebe a n’ụlọ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ebe ọrụ, n’ozi ọma, nakwa mgbe mụ na ụmụnna m Ndị Kraịst na-emekọ ihe?’ Kwadebe ihe ị ga-aza n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ akwadebe iji nwee ike ịgba ndị ọzọ ume, ha agbaakwa gị.—Rom 1:12.
5 Ka ọmụmụ anyị ga-amụ akwụkwọ Ụbọchị Jehova kwadebe anyị ugbu a, ka anyị wee nwee ike “iguzo” ‘n’ụbọchị Jehova, bụ́ oké ụbọchị nke dịkwa oké egwu.’ N’ezie, ụbọchị ahụ dị nso!—Joel 2:11.