Anyị Na-akụghasị Ihe Ndị Gbanyesiri Mgbọrọgwụ Ike
1 Kemgbe ọtụtụ narị afọ, Setan ejirila ozizi ụgha na aghụghọ kpọchie obi na uche ọtụtụ mmadụ. O meela ka ozizi ndị dị ka Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, na nke ọkụ ala mmụọ, gbasaa ebe niile. Ọ na-eme ka ndị mmadụ na-enwe obi abụọ ma Chineke ọ̀ dịkwa, nakwa ma Baịbụl ò sikwa n’aka Chineke. Ịkpa ókè agbụrụ na ịhụ mba n’anya sokwa n’ụzọ ndị ọzọ o si eme ka ndị mmadụ ghara ịhụ ìhè nke eziokwu. (2 Kọr. 4:4) Olee otú anyị nwere ike isi kụghasịa ozizi ndị ahụ gbanyesiri mgbọrọgwụ ike?—2 Kọr. 10:4, 5.
2 Ọ Na-esi Ike Nhapụ: Nkwenkwe okpukpe mmadụ nwerela ruo ogologo oge na-amara nnọọ onye ahụ ahụ́. Ụfọdụ ekwerela ozizi ụgha kemgbe ha bụ nwata. Iji nyere ndị dị otú ahụ aka, anyị kwesịrị ịgwa ha okwu otú ga-egosi na anyị na-akwanyere otú ha si ele ihe anya ùgwù.—1 Pita 3:15
3 Anyị nwere ike ịkwanyere ndị dị otú ahụ ùgwù site n’inye ha ohere ịkọwa ihe ndị ha kweere na ihe mere ha ji kwere ha. (Jems 1:19) Ma eleghị anya, ha kweere na mkpụrụ obi adịghị anwụ anwụ n’ihi na ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ ha, ya ana-agụkwa ha agụụ ịhụ ha ọzọ. Ma ọ bụkwanụ ha nwere ike ịdị na-eme ememme oge ezumike n’ihi na ọ na-atọ ha ụtọ iso ndị ezinụlọ ha nọkọọ n’oge ndị ahụ. Ige ntị n’ihe ndị ha ga-agwa anyị ga-eme ka anyị ghọta otú obi dị ha, nyekwara anyị aka ịgwa ha okwu ga-eru ha n’obi.—Ilu 16:23.
4 Ṅomie Jizọs: Jizọs bụụrụ anyị ihe atụ magburu onwe ya n’otú o si zaa otu nwoke, bụ́ onye maara Iwu, ajụjụ. Jizọs azaghị ajụjụ ndị ahụ kpọmkwem, bụ́ nke gaara esiri nwoke ahụ ike ịnabata n’ihi ihe ndị o kwenyesiri ike na ha. Kama nke ahụ, Jizọs zoro aka n’Akwụkwọ Nsọ, jụọ nwoke ahụ ihe o chere, ma kọọrọ ya otu akụkọ mere ka o chee echiche nke ọma.—Luk 10:25-37.
5 Eziokwu nke Okwu Chineke dị nnọọ ike karịa nkwenkwe okpukpe ụgha. (Hib. 4:12) Ọ bụrụ na anyị ejiri ndidi na-eru n’obi ndị mmadụ, anyị nwere ike inyere ha aka ịjụ ụgha ma nabata eziokwu nke nwere ike ime ka ha nwere onwe ha.—Jọn 8:32.