Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/08 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite na July 14
  • Izu Na-amalite na July 21
  • Izu Na-amalite na July 28
  • Izu Na-amalite n’August 4
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 7/08 p. 2

Usoro Ihe Omume Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite na July 14

Abụ nke 126

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa July. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu mee ihe ngosi nke otú a ga-esi nyefee Ụlọ Nche nke July 1 na Teta! July–September. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri aro nke mbụ a tụrụ maka otú a ga-esi nyefee Teta! mee ihe ngosi.

Nkeji 15: Ì Nwere “Nkwuwa Okwu”? Okwu dabeere n’Ụlọ Nche nke May 15, 2006, peeji nke 13-16. Mesie mkpa ọ dị ikwusa ozi ọma n’atụghị egwu ike.

Nkeji 20: “Buru Ụbọchị Jehova n’Uche Na-ebi Ndụ.”a Kwuo ihe ndị pụrụ iche dị n’akwụkwọ ahụ. Tụlee usoro a ga-eji mụọ akwụkwọ a n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na ntụziaka ndị dị na peeji nke 3 nke Ozi Alaeze Anyị a. Gbaa mmadụ niile ume ka ha na-abịachi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ anya ma na-eweli aka ịza ajụjụ. Jiri Nkeji ole na ole gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ bụ́ ndị a ma ama n’ịkwado ọmụmụ ihe akwado ajụjụ ọnụ ma jụọ ha ihe na-akpali ha ime otú ahụ.

Abụ nke 147

Izu Na-amalite na July 21

Abụ nke 95

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị na-ege ntị ka ha jiri Ụlọ Nche nke August 1 na Teta! nke July–September bịa Nzukọ Ije Ozi nke izu na-abịa abịa ma dị njikere ikwu otú e nwere ike isi nyefee ha n’ókèala unu.

Nkeji 15: Mkpa ọgbakọ.

Nkeji 20: “Ịkwado Akwado Bụ Ihe Bụ́ Isi Na-eme Ka Nletaghachi Na-arụpụta Ihe.”b Jiri Nkeji anọ mee ihe ngosi ebe onye nkwusa na-ekwupụta ihe ọ na-atụgharị n’obi ka ọ na-akwadebe ịga nletaghachi. O lere anya n’akwụkwọ o ji edekọ ihe ma kpebie na ọ dị ya mkpa ịkpọtụrụ mmadụ abụọ ná ngwụsị izu a. Ya atụlee ihe ya na onye nke ọ bụla n’ime ha kwurịtara n’oge gara aga, kpebie ihe o bu n’obi ịrụzu ma kwado otú ọ ga-esi rụzuo ya. Ọ kwadebere ịgwa otu onye n’ime ha na ya ga-achọ ka ya na ya malite ịmụ Baịbụl. Maka onye nke ọzọ, ọ kwadoro otú ọ ga-esi jiri otu aro dị na paragraf nke 5 kpalikwuo mmasị ya.

Abụ nke 189

Izu Na-amalite na July 28

Abụ nke 6

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ niile ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa July. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe n’August ma mee otu ihe ngosi nke otú e nwere ike isi nyefee ya.

Nkeji 15: Ịnọgide Na-eburu Ịdị Nso nke Ụbọchị Jehova n’Obi. Okwu a ga-eji ịnụ ọkụ n’obi kwuo nke dabeere n’Ụlọ Nche nke December 15, 2006, peeji nke 18-19, paragraf nke 17-21.

Nkeji 20: Jikere Inyefe Magazin Ndị Ọhụrụ. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Mgbe ị kọwatụchara isi ihe ndị dị na Teta! nke July–September na Ụlọ Nche nke August 1, jụọ ndị na-ege ntị isiokwu ndị nke nwere ike ịmasị ndị bi n’ókèala unu, na ihe mere ha ji chee otú ahụ. Jụọ ndị na-ege ntị kpọmkwem isi ihe ụfọdụ dị n’isiokwu ndị ahụ ha chọrọ iji enyefe magazin ndị ahụ. Olee ajụjụ e nwere ike iji malite nkwurịta okwu? Olee amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu ahụ bụ́ nke e nweziri ike ịgụ? Jiri otu n’ime aro ndị a tụrụ n’Ozi Alaeze Anyị, ma ọ bụ nke ndị na-ege ntị tụrụ, mee ihe ngosi nke otú e nwere ike isi nyefee magazin nke ọ bụla.

Abụ nke 106

Izu Na-amalite n’August 4

Abụ nke 222

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ.

Nkeji 15: Ụmụ Gị Hà Dị Njikere Imeri Nsogbu Ndị Ha Na-enwe n’Ụlọ Akwụkwọ Ha? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Kwuo ụfọdụ n’ime nsogbu Ndị Kraịst na-eto eto na-enwe n’ụlọ akwụkwọ. Kọwaa otú ndị mụrụ ụmụ na ụmụ ha nwere ike isi jiri akwụkwọ e ji eme nchọnchọ bụ́ Watch Tower Publications Index chọta ihe ga-enyere ha aka. Nye ihe atụ ụfọdụ. (Lee isiokwu bụ́ “Schools” [Ụlọ Akwụkwọ] na isiokwu nta bụ́ “experiences” [ahụmahụ].) Jụọ ndị na-ege ntị bụ́ ndị a zụlitere n’ezinụlọ Ndị Kraịst otú ndị mụrụ ha si kwadebe ha imeri nsogbu dị iche iche na ime ihe Baịbụl kwuru n’ụlọ akwụkwọ ha. Ha nwekwara ike ikwu otú ha si jiri isiokwu ndị si na Teta! kwadebe ihe odide a gwara ha dee n’ụlọ akwụkwọ. Jụọ ha otú ịgbara ụmụ akwụkwọ ibe ha àmà si chebe ha.

Nkeji 20: “Anyị Na-akụghasị Ihe Ndị Gbanyesiri Mgbọrọgwụ Ike.”c Jụọ ndị na-ege ntị otú onye mụụrụ ha Baịbụl si jiri ndidi nyere ha aka ịjụ ozizi okpukpe ụgha ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike n’ime ha.

Abụ nke 83

[Ihe odide ala ala peeji]

a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

b Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

c Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji. Malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya