NKEBI NKE MBỤ
Chineke Pụrụ Inyere Gị Aka Ijikere Maka Oké Ụbọchị Ya
Onye amụma Chineke kwuru na “oké ụbọchị Jehova dị nso.” (Zefanaya 1:14) Ụbọchị ahụ ji ọsọ na-abịaru nso. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị buru nke ahụ n’uche ka anyị na-ebi ndụ. Ị̀ maara na akwụkwọ ndị ahụ a na-akpọ akwụkwọ Obere Ndị Amụma nwere ihe dị mkpa ha kwuru banyere oké ụbọchị ahụ? Isi nke Mbụ ruo n’Isi nke Atọ n’akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịmatakwu ndị amụma iri na abụọ ahụ nakwa ihe ha kwuru maka ha n’akwụkwọ ha. N’ụzọ dị otú a, ị pụrụ irite uru n’ihe ha dere. Ị ga-amụtakwa ihe ndị ga-abara gị uru ná ndụ.