NKEBI NKE ANỌ
Jiri Ọṅụ Na-echere Ụbọchị Jehova
Jehova ji ndị amụma ya dọọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere ihe ga-eme n’ọdịnihu—mgbe ọ ga-awụpụ iwe ya. Ma anyị ekwesịghị iwere Chineke dị ka onye iwe. Ọ na-enwe “obi ụtọ na aṅụrị n’ebe [ndị ya] nọ.” Ka anyị na-atụ anya oké ụbọchị ya, anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji ‘jiri obi anyị dum ṅụrịa ọṅụ ma nwee obi ụtọ.’ (Zefanaya 3:14, 17) Olee otú ị pụrụ isi gosi nke a n’omume gị nakwa n’otú i si eche echiche? N’ihi gịnịkwa ka ị pụrụ iji nwee ekele maka ihe ị na-atụle n’akwụkwọ amụma iri na abụọ ahụ?