Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bm nkebi 9 p. 12
  • Ụmụ Izrel Kwuru na Ha Chọrọ Eze

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụmụ Izrel Kwuru na Ha Chọrọ Eze
  • Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọ Bụ Jehova Nwe Agha A”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • “Kụziere M Ime Uche Gị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Devid na Sọl
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Dabere Na Mmụọ Chineke N’ime Ihe Banyere Mgbanwe Ndị A Na-enwe Ná Ndụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
bm nkebi 9 p. 12

Nkebi nke 9

Ụmụ Izrel Kwuru na Ha Chọrọ Eze

Sọl, bụ́ eze mbụ nke Izrel, nupụụrụ Jehova isi. Devid nọchiri ya. Chineke na Devid gbara ndụ, ya ekwe Devid nkwa na alaeze ya ga-adịru mgbe ebighị ebi

MGBE Samsịn nwụchara, Samuel ghọrọ onye amụma na onye ikpe n’Izrel. Ụmụ Izrel nọgidere na-agwa ya na ha chọrọ inwe eze bụ́ mmadụ dị ka mba ndị ọzọ nwere. N’agbanyeghị na ihe ahụ ụmụ Izrel rịọrọ were Jehova iwe, ọ gwara Samuel ka o mee ihe ha rịọrọ. Chineke họpụtara Sọl bụ́ nwoke dị umeala n’obi ka ọ bụrụ eze ha. Ma ka oge na-aga, Eze Sọl ghọrọ onye mpako na onye nnupụisi. Jehova kwuru na ya achọghịzi ka ọ bụrụ eze. Ọ gwara Samuel ka ọ họpụta onye ọzọ, ya bụ, otu nwa okorobịa aha ya bụ Devid. Ma ọtụtụ afọ gafere tupu Devid aghọọ eze.

Mgbe Devid ka na-eto eto, ọ gara hụ ụmụnne ya ndị so ná ndị agha Sọl. Ndị agha Sọl niile tụrụ otu onye iro ha bụ́ dike ụjọ. Aha nwoke ahụ bụ Golayat, ọ gbara nnọọ dimkpa. Ọ nọ na-akparị ndị agha Sọl na Chineke ha. O were Devid iwe, nke mere ka o kweta ịga buso dike ahụ agha. O weere naanị èbè na nkume ole na ole gaa ibuso onye iro ya agha, bụ́ onye karịrị amaụkwụ itoolu n’ogologo. Mgbe Golayat mere Devid akaje, ọ gwara Golayat na ihe ya ji bịa ibuso ya agha karịrị nke ya, n’ihi na ọ bụ aha Jehova Chineke ka Devid ji ebuso ya agha! Devid ji naanị otu nkume gbuo Golayat, ma were mma agha dike ahụ bepụ ya isi. Ụjọ bịara ndị agha Filistia, ha agbalaga.

Na mbụ, obi tọrọ Sọl ụtọ n’ihi obi ike Devid nwere, ya emee nwa okorobịa ahụ onyeisi ndị agha ya. Ma ihe ịga nke ọma Devid nwere mere ka Sọl nwewere ya anyaụfụ. Devid gbapụrụ ka ọ ghara igbu ya, ma na-agba ọsọ ndụ ruo ọtụtụ afọ. N’agbanyeghị nke ahụ, Devid ka nọ na-asọpụrụ eze ahụ chọrọ igbu ya. O kwuru na ọ bụ Jehova Chineke mere Sọl eze. Sọl mechara nwụọ n’agha. N’oge na-adịghị anya, Devid ghọrọ eze dị ka Jehova kwuru.

Mgbe Devid ghọrọ eze, ọ chọsiri ike ịrụrụ Jehova ụlọ nsọ. Ma Jehova gwara ya na ọ bụ otu nwa ya ga-arụrụ ya ụlọ. Ọ bụ nwa Devid bụ́ Sọlọmọn rụrụ ụlọ nsọ ahụ. Ma Chineke gọziri Devid, ya na ya agbaa ndụ na a ga-esi n’ezinụlọ ya nweta ọchịchị pụrụ iche. Ọ bụ n’agbụrụ ya ka a ga-esi nweta Onye Nnapụta ma ọ bụ Mkpụrụ ahụ e kwere nkwa ya n’Iden. Onye ahụ ga-abụ Mesaya, nke pụtara “Onye E Tere Mmanụ,” onye Chineke họpụtara. Jehova kwere nkwa na Mesaya ahụ ga-abụ Eze n’otu ọchịchị ma ọ bụ Alaeze nke ga-adịru mgbe ebighị ebi.

Obi tọrọ Devid ụtọ, ya ekpokọta ọtụtụ ngwá ọrụ na ọlaọcha na ọlaedo a ga-eji rụọ ụlọ nsọ ahụ. O jikwa ike mmụọ nsọ dee ọtụtụ abụ. Mgbe ọ na-aga ịnwụ, o kwuru, sị: “Ọ bụ mmụọ Jehova kwuru okwu site n’ọnụ m, okwu ya dịkwa n’ire m.”—2 Samuel 23:2.

—O si na Samuel nke Mbụ na nke Abụọ; Ihe E Mere nke Mbụ; Aịzaya 9:7; Matiu 21:9; Luk 1:32; Jọn 7:42.

◼ Gịnị mere Jehova ji jụ Eze Sọl ma họrọ Devid?

◼ Olee àgwà ndị Devid nwere tupu ya aghọọ eze?

◼ Ònye bụ Mkpụrụ ma ọ bụ Onye Nnapụta ahụ e kwere ná nkwa, nke e buru n’amụma na ọ ga-esi n’agbụrụ Devid?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 12]

‘M ga-eme ka ocheeze nke alaeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.’—2 Samuel 7:13

[Chaatị dị na peeji nke 12]

Jenesis

Ọpụpụ

Levitikọs

Ọnụ Ọgụgụ

Diuterọnọmi

Jọshụa

Ndị Ikpe

Rut

● 1 Samuel

● 2 Samuel

1 Ndị Eze

2 Ndị Eze

● 1 Ihe E Mere

2 Ihe E Mere

Ezra

Nehemaya

Esta

Job

Abụ Ọma

Ilu

Ekliziastis

Abụ Sọlọmọn

Aịzaya

Jeremaya

Hagaị

Zekaraya

Malakaị

Matiu

Mak

Luk

Jọn

Ọrụ Ndịozi

Ndị Rom

1 Ndị Kọrịnt

2 Ndị Kọrịnt

Ndị Galeshia

Ndị Efesọs

Ndị Filipaị

Ndị Kọlọsi

1 Ndị Tesalonaịka

2 Ndị Tesalonaịka

1 Timoti

2 Timoti

Taịtọs

Faịlimọn

Ndị Hibru

Jems

1 Pita

2 Pita

1 Jọn

2 Jọn

3 Jọn

Jud

Mkpughe

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya