Nkebi nke 10
Sọlọmọn Bụ Eze Maara Ihe
Jehova nyere Eze Sọlọmọn obi amamihe; oge Sọlọmọn na-achị, ụmụ Izrel nwere udo na ọganihu na-enweghị atụ
OLEE otú ndụ ga-adị ma ọ bụrụ na mmadụ niile nọ n’obodo na ndị ọchịchị ha ekwe ka Jehova chịwa ha ma na-edebe iwu ya? A zara ajụjụ ahụ n’ime afọ iri anọ Eze Sọlọmọn chịrị.
Tupu Devid anwụọ, ọ họpụtara nwa ya nwoke bụ́ Sọlọmọn ka ọ nọchie ya. Chineke gwara Sọlọmọn ná nrọ ka ọ rịọ ya ihe ọ bụla ọ chọrọ. Sọlọmọn rịọrọ ya amamihe na ihe ọmụma ọ ga-eji na-ekpe ụmụ Izrel ikpe ziri ezi. Obi tọrọ Jehova ụtọ, ya emee ka Sọlọmọn nwee amamihe na nghọta. Jehova kwekwara ya nkwa akụnụba, ebube na ogologo ndụ ma ọ bụrụ na ọ nọgide na-erubere ya isi.
Ikpe ndị Sọlọmọn ji amamihe kpee mere ka a mara ya amara. Otu oge, ụmụ nwaanyị abụọ nọ na-azọ otu nwatakịrị nwoke a mụrụ ọhụrụ. Sọlọmọn nyere iwu ka a kpọwaa nwa ahụ abụọ ma nye onye nke ọ bụla ọkara ya. Otu kwetara, ma onye nke mụrụ nwa ahụ rịọrọ ozugbo ka e kunye ya nwaanyị nke ọzọ. Sọlọmọn ghọtaziri na ọ bụ nwaanyị ahụ na-achọghị ka e gbuo nwa ahụ mụrụ ya ma kunye ya nwa ahụ. N’oge na-adịghị anya, ụmụ Izrel niile nụrụ ikpe ahụ Sọlọmọn kpere, ha aghọta na o nwere amamihe Chineke.
Otu n’ime ihe kachanụ Sọlọmọn rụrụ bụ ụlọ nsọ Jehova, ya bụ, ụlọ mara mma dị egwu a rụrụ na Jeruselem, bụ́ ebe bụ́ isi a ga na-aga efe Jehova n’Izrel. Mgbe a na-enyefe Jehova ụlọ nsọ ahụ, Sọlọmọn kpere ekpere, sị: “Lee! Eluigwe, ee, eluigwe nke eluigwe apụghị ịba gị, ma ya fọdụzie ụlọ a m wuru!”—1 Ndị Eze 8:27.
Akụkọ banyere Sọlọmọn gbasara ebe niile, ruodị Shiba nke dị n’Arebia. Eze nwaanyị Shiba bịara ka ọ hụ ebube na akụnụba Sọlọmọn nakwa ka ọ chọpụta otú ọ maruru ihe. Obi tọrọ eze nwaanyị ahụ ụtọ mgbe ọ hụrụ amamihe Sọlọmọn na ọganihu Izrel nwere, ya etoo Jehova maka ime ka eze maara ihe otú ahụ chịwa Izrel. N’eziokwu, Jehova gọziri Sọlọmọn, e nweghị eze ọzọ chịrị Izrel nke e nwere udo na ọganihu n’ọchịchị ya otú e nwere n’ọchịchị Sọlọmọn.
Ma ọ dị mwute na Sọlọmọn ekweghị ka amamihe Jehova nọgide na-eduzi ya. O leghaara iwu Chineke anya ma lụọ ọtụtụ narị ụmụ nwaanyị, ndị ọtụtụ n’ime ha na-efe chi ọzọ. Ha ji nwayọọ nwayọọ mee ka obi ya pụọ n’ife Jehova, ya efewezie arụsị. Jehova gwara Sọlọmọn na a ga-anapụ ya ebo ụfọdụ ọ na-achị. Chineke kwuru na ọ bụ naanị ebo abụọ ga-afọdụrụ ezinụlọ ya, n’ihi nkwa o kwere Devid bụ́ nna Sọlọmọn. N’agbanyeghị na Sọlọmọn kwụsịrị ife Jehova, Jehova echefughị ọgbụgba ndụ Alaeze ya na Devid gbara.
—O si ná Ndị Eze nke Mbụ, isi nke 1 ruo na nke 11; Ihe E Mere nke Abụọ, isi nke 1 ruo na nke 9; Diuterọnọmi 17:17.
◼ Olee otú Chineke si meere Sọlọmọn ihe ọ rịọrọ ya?
◼ Olee otú Sọlọmọn si gosi na o nwere amamihe?
◼ Gịnị mere Sọlọmọn ji kwụsị ife Jehova, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?
Chaatị dị na peeji nke 13]
Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze ●
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere ●
Ezra
Nehemaya
Esta
Job
Abụ Ọma
Ilu
Ekliziastis
Abụ Sọlọmọn
Aịzaya
Jeremaya
Abụ Ákwá
Ezikiel
Daniel
Hosia
Joel
Emọs
Obedaya
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya