Nkebi nke 11
Abụ Ndị A Bụrụ n’Ike Mmụọ Nsọ Bụ́ Ndị Na-akasi Obi ma Na-ezi Ihe
Devid na ndị ọzọ dere abụ ndị e ji na-efe Jehova. E dere otu narị na iri ise n’ime ha n’akwụkwọ Abụ Ọma
A CHỊKỌTARA abụ ndị dị nsọ n’akwụkwọ kacha ibu na Baịbụl. Ide abụ ndị ahụ were ihe dị ka otu puku afọ. N’akwụkwọ Abụ Ọma, e dere ụfọdụ okwu ndị kacha gbaa ọkpụrụkpụ, nakwa ndị kacha eme ka okwukwe mmadụ sie ike. Ọ kọrọ ọtụtụ ụzọ ụmụ mmadụ si egosi otú obi dị ha, dị ka ọṅụ, otuto, ekele, iru uju, mwute nakwa nchegharị. O doro anya na ndị dere abụ ndị ahụ tụkwasịrị Chineke obi, ha na ya dịkwa n’ezigbo mma. Ka anyị lee ụfọdụ ihe e kwuru n’abụ ndị ahụ.
Ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị, ọ bụ ya ka e kwesịrị ife ma too. Abụ Ọma 83:18 kwuru, sị: “Gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.” Ọtụtụ abụ ndị e dere n’akwụkwọ Abụ ọma na-eto Jehova maka ihe ndị o kere, dị ka eluigwe nke jupụtara na kpakpando, ihe ndị dị ịtụnanya o kere n’ụwa, nakwa ụzọ dị ebube o si kee ahụ́ mmadụ. (Abụ Ọma 8, 19, 139, 148) Abụ ndị ọzọ toro Jehova n’ihi na ọ bụ Chineke nke na-eji ike ya azọpụta ma na-echebe ndị na-erubere ya isi. (Abụ Ọma 18, 97, 138) E nwekwara abụ ndị toro Chineke n’ihi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi, na-anapụta ndị a na-emegbu emegbu ma na-enye ndị ajọ omume ntaramahụhụ.—Abụ Ọma 11, 68, 146.
Jehova na-enyere ndị hụrụ ya n’anya aka ma na-akasi ha obi. Ikekwe, abụ ọma a kacha mara amara bụ Abụ Ọma nke iri abụọ na atọ, bụ́ ebe Devid kwuru na Jehova bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ nke hụrụ atụrụ ya n’anya, na-eduzi ha, na-echebe ha, ma na-elekọta ha. Abụ Ọma 65:2 na-echetara ndị na-efe Chineke na Jehova bụ “Onye na-anụ ekpere.” Abụ Ọma nke 39 na nke 51 agbaala ọtụtụ ndị mere mmehie dị oké njọ ume. N’ebe ahụ, Devid kwuru okwu ndị gosiri na o ji obi ya dum chegharịa ná mmehie ndị dị oké njọ o mere ma gosi na obi siri ya ike na Jehova ga-agbaghara ya. Abụ Ọma 55:22 gbara anyị ume ịtụkwasị Jehova obi ma tụkwasị ya ibu arọ anyị niile.
Jehova ga-eji Alaeze Mesaya gbanwee ụwa. Abụ ọma ụfọdụ kwuru banyere Mesaya, bụ́ Eze ahụ e buru n’amụma. Abụ Ọma nke abụọ buru amụma na Onye Ọchịchị ahụ ga-ebibi mba ndị na-eme ihe ọjọọ, bụ́ ndị na-emegide ya. Abụ Ọma nke iri asaa na abụọ kwuru na Eze ahụ ga-ewepụ agụụ, ikpe na-ezighị ezi, na mmegbu. Abụ Ọma 46:9 gosiri na Chineke ga-eji Alaeze Mesaya mee ka agha kwụsị, bibiekwa ngwá agha niile. N’Abụ Ọma nke iri atọ na asaa, e kwuru na a ga-ebibi ndị ajọ omume, ma ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Udo na ịdị n’otu ga-adịkwa n’ụwa niile.
—O si n’akwụkwọ Abụ Ọma.
◼ Olee otú Abụ Ọma si kwado na ọ bụ Jehova kwesịrị ịchị?
◼ Olee abụ ọma ndị gosiri otú Chineke si enyere ndị hụrụ ya n’anya aka ma na-akasi ha obi?
◼ Olee otú akwụkwọ Abụ Ọma si gosi otú Chineke ga-esi gbanwee ụwa?
Igbe dị na peeji nke 14]
ABỤ NKE ABỤ
N’Abụ Sọlọmọn, eze Sọlọmọn mere ka a mata na ọtụtụ akụ̀ o nwere emeghị ka nwaanyị ọ bụla ọ chọrọ hụ ya n’anya. O dere otú o si gbalịa inweta obi otu ọmarịcha nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, nke kwere otu nwa okorobịa na-azụ atụrụ nkwa ọlụlụ. Abụ a e dere n’ike mmụọ nsọ na-egosi na nwoke na nwaanyị hụrụ ibe ha n’anya ekwesịghị ikwe ka ịhụnanya mee ka ha tinye aka n’omume rụrụ arụ. Mmadụ abụọ ahụ kwere ibe ha nkwa ọlụlụ jidere onwe ha, ha emeghị omume rụrụ arụ, ha ahapụghịkwa ibe ha chụwa onye ọzọ.
[Chaatị dị na peeji nke 14]
Jenesis
Ọpụpụ
Levitikọs
Ọnụ Ọgụgụ
Diuterọnọmi
Jọshụa
Ndị Ikpe
Rut
1 Samuel
2 Samuel
1 Ndị Eze
2 Ndị Eze
1 Ihe E Mere
2 Ihe E Mere
Ezra
Nehemaya
Esta
Job
● Abụ Ọma
Ilu
Ekliziastis
● Abụ Sọlọmọn
Aịzaya
Jeremaya
Abụ Ákwá
Ezikiel
Daniel
Hosia
Joel
Emọs
Obedaya
Jona
Maịka
Nehọm
Habakọk
Zefanaya
Hagaị
Zekaraya
Malakaị
Matiu
Mak
Luk
Jọn
Ọrụ Ndịozi
Ndị Rom
1 Ndị Kọrịnt
2 Ndị Kọrịnt
Ndị Galeshia
Ndị Efesọs
Ndị Filipaị
Ndị Kọlọsi
1 Ndị Tesalonaịka
2 Ndị Tesalonaịka
1 Timoti
2 Timoti
Taịtọs
Faịlimọn
Ndị Hibru
Jems
1 Pita
2 Pita
1 Jọn
2 Jọn
3 Jọn
Jud
Mkpughe